Otú Chineke Si Ele Ndị Nwụrụ Anwụ Anya
Otú Chineke Si Ele Ndị Nwụrụ Anwụ Anya
ỌNWỤ onye a hụrụ n’anya na-agbawa obi n’ezie. Ịtọgbọrọ chakoo, owu ọmụma, na mfu a na-enwe na-adị ukwuu. Ịbụ onye mmadụ nwụnahụrụ pụrụ ime ka mmadụ nwee uche mgbasasị, n’ihi na n’agbanyeghị ókè mmadụ nweruru akụ̀ na ụba, ike, ma ọ bụ mmetụta, ọ dịghị onye ọ bụla bi n’ụwa ugbu a pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ dịghachi ndụ.
Otú ọ dị, Onye Okike anyị na-ele ihe anya n’ụzọ dị iche. N’ịbụ onye ji ájá sitere n’ala kee mmadụ mbụ, o nwekwara ike ikeghachi onye nwụrụ anwụ. N’ihi nke a, Chineke pụrụ ile ndị nwụrụ anwụ anya dị ka ha dị ndụ. Jizọs kwuru banyere ndị ohu Chineke nwụrụ anwụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, sị: “Nye ya, ha nile dị ndụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha nile dị ndụ n’ụzọ Chineke si ele ihe anya.—Luk 20:38.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nyere ya ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:21) N’ihi ya, o nwere otu echiche ahụ Nna ya nwere banyere ndị nwụrụ n’ịkwesị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, mgbe enyi ya nwoke bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M na-eje . . . ịkpọte ya n’ụra.” (Jọn 11:11) Dị ka mmadụ si ele ihe anya, Lazarọs nwụrụ anwụ, ma nye Jehova na Jizọs, Lazarọs nọ na-ehi ụra.
N’ọchịchị Alaeze nke Jizọs, a gaje inwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) N’ikpeazụ, ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-enweta mmụta sitere n’aka Chineke ma nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Jọn 5:28, 29.
Ee, ọnwụ onye a hụrụ n’anya pụrụ ịkpata obi mgbawa na iru újú dị ukwuu, bụ́ nke pụrụ ịdịgide ruo ọtụtụ afọ. Ka o sina dị, ile ndị nwụrụ anwụ anya dị ka Chineke si ele ha pụrụ iwetara anyị nkasi obi dị ukwuu ma mee ka anyị nwee olileanya.—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.