Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Echeta Ụfọdụ Ndị

Otú E Si Echeta Ụfọdụ Ndị

Otú E Si Echeta Ụfọdụ Ndị

IHE dị ka puku afọ atọ gara aga, Devid si n’ihu Eze Sọl nke Izrel na-agbapụ. Devid zigaara Nebal, bụ́ ọgaranya nke na-azụ ewu na atụrụ ozi, na-arịọ maka ihe oriri na mmiri. N’ezie, Nebal kwesịrị imere Devid na ndị ikom ya ihe ọma n’ihi nchebe ha chebere ìgwè atụrụ Nebal. Otú ọ dị, Nebal jụrụ ile ha ọbịa. Ọbụna ọ kpọrọ ndị ikom Devid iyi. Nebal ji ọkụ na-egwuri egwu n’ihi na Devid abụghị onye e ji eti epele.—1 Samuel 25:5, 8, 10, 11, 14.

Àgwà Nebal ekwekọghị n’omume e ji mara ndị bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ ile ndị nleta na ndị a na-amabughị ọbịa. Ya mere, ụdị aha dị aṅaa ka Nebal meere onwe ya? Ihe ndekọ Bible na-ekwu na o “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile” bụrụkwa “nwoke jọgburu onwe ya.” Aha ya pụtara “nzuzu,” n’ezie, o mekwara ihe kwekọrọ n’aha ya. (1 Samuel 25:3, 17, 25) Ị̀ ga-achọ ka e si otú ahụ na-echeta gị? Ị̀ dị aka ike ma ọ bụ bụrụ onye na-adịghị ekwenye ekwenye mgbe gị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, karịsịa ma ọ bụrụ na o yiri ka ị karịrị ha? Ka ị̀ dị obiọma, nwee mmụọ ile ọbịa, ma na-echebara ndị ọzọ echiche?

Abigail—Nwanyị Nwere Ezi Uche

N’ihi àgwà obi ọjọọ ya, Nebal ejirila isi kota ebu. Devid na ndị ikom 400 ya kere mma agha ha n’úkwù ma gawa igosi Nebal ihe ọkụ ji ntị òké eme. Abigail, bụ́ nwunye Nebal, nụrụ ihe merenụ. Ọ maara na ọgụ na-aga ịda. Gịnị ka ọ pụrụ ime? Ọ gbaara gaa kwadebe ihe oriri na ihe ndị ọzọ n’ụba ma gawa izute Devid na ndị ikom ya. Mgbe o zutere ha, ọ rịọrọ Devid ka ọ ghara ịwụsị ọbara n’efu. Obi jụụrụ Devid. O gere ntị n’arịrịọ ya ma nakwere ya. Nwa oge ka ihe a mesịrị, Nebal nwụrụ. Devid, n’ịchọpụta àgwà ọma ndị Abigail nwere, lụrụziiri ya dị ka nwunye.—1 Samuel 25:14-42.

Ụdị aha dị aṅaa ka Abigail meere onwe ya? O nwere “ezi uche,” ma ọ bụ “ọgụgụ isi,” dị ka e si sụgharịa ya na Hibru mbụ. O doro anya na o nwere ezi uche ma na-eme ihe n’ụzọ dị irè, marakwa otú e si ebute ụzọ n’ihe na mgbe e kwesịrị ime otú ahụ. O ji iguzosi ike n’ihe mee ihe iji chebe di ya bụ́ onye nzuzu na ezinụlọ ya pụọ n’ọdachi. N’ikpeazụ ọ nwụrụ, ma o meere onwe ya aha dị ịrịba ama dị ka nwanyị nwere ezi uche.—1 Samuel 25:3.

Aha Dị Aṅaa Ka Pita Meere Onwe Ya?

Ka anyị gaa n’ihu ruo na narị afọ mbụ O.A., ma tụlee ihe banyere ndịozi 12 nke Jizọs. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onye kasị nwee nkwuwa okwu na onye kasị eme ihe ná mkpali n’ime ha bụ Pita, ma ọ bụ Sifas, onye bụ́bu onye ọ́kụ̀ azụ̀ na Galili. Ihe ama na-egosi na ọ bụ onye ume dị n’ahụ́ nke egwu na-adịghị atụ ikwupụta mmetụta ya. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. Olee otú Pita si meghachi omume mgbe e rutere n’ebe ọ nọ ịsa ya ụkwụ?

Pita jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-asa m ụkwụ?” Jizọs zara ya, sị: “Ị dịghị aghọta ugbu a ihe m na-eme, ma ị ga-aghọta ya mgbe ihe ndị a gasịrị.” Pita zaghachiri, sị: “N’ezie, ị gaghị asa m ụkwụ ma ọlị.” Rịba ama otú Pita si meghachi omume n’ike ma bụrụ ná mkpali. Gịnị ka Jizọs zaghachiri?

“Ọ gwụla ma m̀ sara gị ya,” ka Jizọs zara, “mụ na gị enwekọghị ihe ọ bụla.” Saịmọn Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụghị nanị ụkwụ m, kamakwa aka m na isi m.” Ugbu a, Pita mebigaziri ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ! Ọ dịghị mgbe ọ na-esi ike ịma ebe Pita kwụ. Ọ dịghị aghụghọ ma ọ bụ nwee ihu abụọ.—Jọn 13:6-9.

A na-echetakwa Pita maka adịghị ike ya ndị gosiri nnọọ na ọ bụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọ gọnahụrụ Kraịst ugboro atọ n’ihu ndị na-ebo ya ebubo na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs onye Nazaret nke a maworo ikpe ọnwụ. Mgbe Pita ghọtara na ya ehiewo ụzọ, o bere ákwá dị ilu. Egwu atụghị ya igosipụta mwute na ịkwa ụta ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ịrịba ama na ndị dere Oziọma ndị ahụ dekọrọ agọ ahụ Pita gọrọ—ma eleghị nnọọ anya n’ihi ihe ọmụma nke Pita nyere n’onwe ya! Ọ dị nnọọ umeala n’obi ruo n’ókè nke ikweta mmejọ ya. Ì nwere àgwà ọma dị otú ahụ?—Matiu 26:69-75; Mak 14:66-72; Luk 22:54-62; Jọn 18:15-18, 25-27.

Mgbe izu ole na ole gasịrị ka Pita gọnahụsịrị Kraịst, n’ịbụ onye mmụọ nsọ kpaliri, o ji anya ike kwusaara ìgwè ndị Juu ozi ọma na Pentikọst. N’ezie, nke a bụ ihe àmà na-egosi na Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite tụkwasịrị ya obi.—Ọrụ 2:14-21.

N’oge ọzọ, Pita dabara n’ọnyà dị iche. Pọl onyeozi kọwara na tupu ụmụnna bụ́ ndị Juu abịarute Antiọk, Pita anọwo na-eso ndị Jentaịl kwere ekwe na-emekọrịta ihe n’enweghị ihe mgbochi. Otú ọ dị, o kewapụrụ onwe ya n’ebe ha nọ “n’ihi egwu nke ndị ahụ e biri úgwù” bụ́ ndị ka si Jeruselem bịa. Pọl gbara ụkpụrụ abụọ Pita na-agbaso n’anwụ.—Ndị Galeshia 2:11-14.

Otú ọ dị, ònye n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs kwupụrụ okwu n’otu oge dị mkpa mgbe o yiri ka ọtụtụ n’ime ụmụazụ Jizọs hà na-achọ ịgbahapụ ya? Oge ahụ bụ mgbe Jizọs kpughere otu ihe dị ọhụrụ, bụ́ mkpa ọ dị iri ahụ́ ya na ịṅụ ọbara ya. O kwuru, sị: “Ọ gwụla ma ùnu riri anụ ahụ́ nke Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs sụrụ ngọngọ ma sị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ igere ya?” Gịnịzi mere? “N’ihi nke a ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ndị ha hapụrụ ahapụ, kwụsịkwa iso ya na-ejegharị.”—Jọn 6:50-66.

N’oge a dị mkpa, Jizọs lere ndịozi 12 ahụ anya ma jụọ ha ajụjụ a na-emetụ nnọọ n’ahụ́, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita zara, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi; anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”—Jọn 6:67-69.

Ụdị aha dị aṅaa ka Pita meere onwe ya? Onye na-agụ ihe ndekọ banyere ya aghaghị inwe mmasị n’àgwà ezi obi na nke ezoghị ọnụ ya, na n’iguzosi ike n’ihe ya, nakwa n’ịdị njikere ya ịnakwere adịghị ike ya. Lee aha ọma o meere onwe ya!

Gịnị Ka Ndị Mmadụ Chetara Banyere Jizọs?

Ozi elu ala Jizọs were nanị afọ atọ na ọkara. N’agbanyeghị nke ahụ, olee otú ụmụazụ ya si cheta ya? Ọ̀ dị mpako n’ihi na ọ bụ onye zuru okè nke na-emeghị mmehie? Ò buliri onwe ya elu n’ihi na ọ maara na ya bụ Ọkpara Chineke? Ọ̀ majara ụmụazụ ya ma ọ bụ manye ha irubere ya isi? Ò ji onwe ya kpọrọ oké ihe nke na o nweghị ihu ọchị? Ò ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na o nweghị ohere maka ndị na-adịghị ike na ndị ọrịa ma ọ bụ ụmụaka? Ò ledara ndị agbụrụ ọzọ na ndị inyom anya, dị ka ndị ikom na-emekarị n’oge ahụ? Gịnị ka ihe ndekọ banyere ya na-agwa anyị?

Jizọs nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Ịmụ banyere ozi ya na-ekpughe na n’ọtụtụ oge, ọ gwọrọ ndị ngwụrọ na ndị ọrịa. Ọ gbalịsiri ike inyere ndị nọ ná mkpa aka. O gosiri mmasị n’ebe ụmụaka nọ, na-agwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Mgbe ahụ, Jizọs “kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” Ị̀ na-ewepụta oge iji soro ụmụaka na-anọkọ, ka ị̀ na-eji nnọọ ọrụ n’aka nke na ị dịghịdị ama na ha nọ ya?—Mak 10:13-16; Matiu 19:13-15.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ụkpụrụ na iwu okpukpe ndị karịrị ihe ndị Iwu ahụ chọrọ nọ na-anyịgbu ndị Juu. Ndị ndú okpukpe ha ji ibu ndị dị arọ na-ebogbu ndị mmadụ, ebe ha onwe ha na-adịghị eji mkpịsị aka ha enutụ ha. (Matiu 23:4; Luk 11:46) N’ihi ya, lee ka Jizọs si dị nnọọ iche! O kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.”—Matiu 11:28-30.

Ndị mmadụ na-enwe ume ọhụrụ ma ha na Jizọs nọrọ. Ọ dịghị mgbe ọ majara ndị na-eso ụzọ ya, nke na ha tụrụ egwu ikwupụta obi ha. N’ezie, ọ jụrụ ajụjụ iji chọpụta ihe dị ha n’obi. (Mak 8:27-29) Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta kwesịrị ịjụ onwe ha, sị: ‘Àna m enwe mmetụta dị otú ahụ n’ahụ́ ndị kwere ekwe ibe m? Ndị okenye ndị ọzọ hà na-agwa m ihe bụ echiche ha, ka hà na-ala azụ ime otú ahụ?’ Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ mgbe ndị nlekọta bụ ndị dị mfe mbịakwute, ndị na-ege ndị ọzọ ntị, ma nọgide bụrụ ndị na-ekwenye ekwenye! Nanị ihe enweghị ezi uche na-eme bụ igbochi nkwurịta okwu e ji ezi obi enwe na nke na-enweghị ihe mgbochi.

Ọ bụ ezie na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, ọ dịghị mgbe o ji ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Kama nke ahụ, o sooro ndị na-ege ya ntị tụgharịa uche. Otú ahụ ka o mere mgbe ndị Farisii gbalịrị iji ajụjụ aghụghọ mata ya n’ọnyà, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?” Jizọs gwara ha ka ha gosi ya otu mkpụrụ ego ma jụọ ha, sị: “Onyinyo na ihe odide ònye ka nke a bụ?” Ha zara ya, sị: “Nke Siza.” Ọ gwaziri ha, sị: “Ya mere kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachịnụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:15-21) Nanị ihe o ji mee ihe bụ arụmụka dị mfe.

Jizọs ò nwere omume ịkpa ọchị? Ụfọdụ ndị na-agụ banyere Jizọs pụrụ ịhụ ihe na-egosi nke ahụ mgbe ha gụtara ebe Jizọs kwuru na ọ dị mfe kamel isi n’anya agịga gafere karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke. (Matiu 19:23, 24) Kpọmkwem echiche nke kamel ịnwa isi n’anya agịga e ji adụ ákwà gafee bụ ikwubiga okwu ókè. Ihe atụ ọzọ nke ikwubiga okwu ókè dị otú ahụ bụ nke mmadụ ịhụ irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna ya ma ghara ịhụ ntụhị dị n’anya nke ya. (Luk 6:41, 42) Ee e, Jizọs abụghị onye na-enye ntaramahụhụ n’eleghị anya n’azụ. O nwere omume enyi. Nye Ndị Kraịst taa, inwe omume ịkpa ọchị pụrụ ime ka ihu mmadụ gbachapụ n’oge nsogbu.

Ọmịiko Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Inyom Nọ

Olee mmetụta ndị inyom na-enwe ma ha na Jizọs nọrọ? N’ezie, o nwere ọtụtụ ndị inyom na-eguzosi ike n’ihe ndị bụ́ ụmụazụ ya, gụnyere nne ya, bụ́ Meri. (Luk 8:1-3; 23:55, 56; 24:9, 10) Ahụ́ na-eru ndị inyom ala ịbịakwute Jizọs ruo n’ókè nke na n’otu oge, otu nwanyị ‘a maara dị ka onye mmhie’ ji anya mmiri ya saa ụkwụ Jizọs ma tee ha mmanụ na-esi ísì ụtọ. (Luk 7:37, 38) Nwanyị ọzọ, bụ́ onye rịaworo ọrịa oruru ọbara ruo ọtụtụ afọ, gbalịsiri ike isi n’etiti ìgwè mmadụ gaa metụ uwe ya aka ka e wee gwọọ ya. Jizọs jara ya mma n’ihi okwukwe ya. (Matiu 9:20-22) Ee, ndị inyom lere Jizọs anya dị ka onye a pụrụ ịbịaru nso.

N’oge ọzọ, Jizọs gwara nwanyị Sameria okwu n’akụkụ olulu mmiri. O juru nwanyị ahụ anya nke ukwuu nke na o kwuru, sị: “Olee otú gị onwe gị, n’agbanyeghị na ị bụ onye Juu, si na-arịọ ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ ebe m bụ nwanyị Sameria?” Ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọrịta ihe. Jizọs gara n’ihu ịkụziri ya eziokwu magburu onwe ya banyere “mmiri nke na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.” Ahụ́ na-eru ya ala ma ya na ndị inyom nọrọ. Ọ naghị adị ya ka ọ na-ewetu onwe ya ala.—Jọn 4:7-15.

A na-echetakwa Jizọs maka ọmịiko dị ukwuu o nwere, gụnyere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ọ bụ ịhụnanya Chineke n’onwe ya. Jizọs setịpụrụ ụkpụrụ maka ndị nile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. Ruo ókè ha aṅaa ka ị na-eṅomi ihe nlereanya ya n’ụzọ chiri anya?—1 Ndị Kọrint 13:4-8; 1 Pita 2:21.

Olee Otú E Si Echeta Ndị Kraịst nke Oge A?

N’oge a, ọtụtụ puku Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi anwụwo, ọtụtụ nwụrụ mgbe ha meworo agadi, ndị ọzọ nwụrụ mgbe ha ka na-eto eto. Ma ha emeworo onwe ha ezi aha. A na-echeta ụfọdụ, dị ka Crystal, bụ́ onye nwụrụ mgbe o meworo agadi, maka ịhụnanya na omume enyi ha nwere. A na-echeta ndị ọzọ, dị ka Dirk, bụ́ onye nwụrụ mgbe ọ dị afọ 40 na ụma, maka inwe ihu ọchị na mmụọ afọ ofufo ha.

E nwekwara ihe banyere José nke si Spen. Laa azụ n’afọ ndị 1960, mgbe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu ná mba ahụ, José lụrụ nwunye ma mụta ụmụ agbọghọ atọ. O nwere ọrụ e ji n’aka na Barcelona. Ma n’oge ahụ, e nwere mkpa maka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye tozuru okè n’ebe ndịda Spen. José hapụrụ ọrụ ya e ji n’aka ma kpọrọ ezinụlọ ya kwaga Málaga. Ha aghaghị ịnagide oge ndị ha nwere ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọtụtụ mgbe, ọ na-anọ n’enweghị ọrụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, a maara José maka ikwesị ntụkwasị obi ya na ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya n’ihe banyere ozi, marakwa ya maka ịzụlite ụmụ ya ndị nwanyị atọ n’ụzọ kwesịrị nṅomi, bụ́ ihe ndị ọ rụzuru site n’enyemaka nke nwunye ya na-enye nkwado, bụ́ Carmela. Mgbe a chọrọ onye ga na-ahazi mgbakọ Ndị Kraịst a na-enwe n’ógbè ahụ, José na-ewepụta nnọọ onwe ya. N’ụzọ dị mwute, mgbe ọ ka dị afọ 50 na ụma, ọ dara ọrịa siri ike bụ́ nke gburu ya. Otú ọ dị, o meere onwe ya aha dị ka onye na-arụsi ọrụ ike nke a pụrụ ịtụkwasị obi na di na nna na-ahụ n’anya.

Ya mere, olee otú a ga-esi na-echeta gị? A sị na ị nwụrụ ụnyaahụ, gịnị ka ndị mmadụ gaara na-ekwu banyere gị taa? Nke a bụ ajụjụ nke pụrụ ịkpali anyị nile imezi omume anyị.

Gịnị ka anyị pụrụ ime iji meere onwe anyị ezi aha? Anyị pụrụ igosipụtakwu mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ịhụnanya, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị nwayọọ, njide onwe onye na ndị ọzọ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ezie, “ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esì ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.”—Eklisiastis 7:1; Matiu 7:12.

[Foto dị na peeji nke 5]

A na-echeta Abigail maka inwe ezi uche

[Foto dị na peeji nke 7]

A na-echeta Pita maka àgwà nke ịbụ onye na-eme ihe ná mkpali ma bụrụ onye nwere ezi obi

[Foto dị na peeji nke 8]

Jizọs wepụtara oge iji soro ụmụaka nọkọọ