Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Nanị Otu ‘Ezi Chọọchị’?

È Nwere Nanị Otu ‘Ezi Chọọchị’?

È Nwere Nanị Otu ‘Ezi Chọọchị’?

“DỊ NNỌỌ ka e nwere otu Kraịst, otú ahụ ka e nwere otu ahụ́ Kraịst na otu Nwunye Kraịst: ‘otu Chọọchị Katọlik, nke sitekwara n’aka ndịozi.’”—Dominus Iesus.

Otú ahụ ka otu kadinal Roman Katọlik bụ́ Joseph Ratzinger si kọwaa ozizi okpukpe ya nke na-ekwu na a pụrụ inwe nanị otu ezi chọọchị. O kwuru na chọọchị ahụ bụ “otu Chọọchị nke Kraịst, nke bụ́ Chọọchị Katọlik.”

“Abụghị Chọọchị n’Ezie”

Ọ bụ ezie na Popu John Paul nke Abụọ kwusiri ike na ọ dịghị ihe ọ bụla e dere n’akwụkwọ ahụ bụ́ Dominus Iesus nke ‘na-egosi na anyị chere na okpukpe anyị karịrị nke ndị ọzọ ma ọ bụ na anyị adịghị akwanyere ha ùgwù,’ ndị ndú chọọchị Protestant meghachiri omume n’ụzọ siri ike na nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ná Nzukọ Ezumezu nke Chọọchị Presbyterian nwere na Belfast, Northern Ireland, na June 2001, otu ụkọchukwu kwuru na akwụkwọ ahụ bụ aka ọrụ nke “òtù dị ike dị na Chọọchị Roman Katọlik . . . bụ́ ndị ụjọ ji n’ihi mmụọ uche ghere oghe nke Nzukọ Vatican nke Abụọ mere ka a malite inwe.”

Robin Eames, Bishọp Ukwu nke Chọọchị nke Ireland, kwuru na ọ “ga-ewute ya nke ukwuu” ma ọ bụrụ na akwụkwọ ahụ bụ “ịkpọghachi anyị azụ n’echiche e nwere tupu e nwee nzukọ Vatican nke Abụọ.” N’ikwu banyere nzọrọ nzukọ Vatican ahụ zọọrọ na chọọchị ndị jụrụ nkwenkwe ụfọdụ nke ndị Katọlik “abụghị Chọọchị n’ezie,” Eames kwuru, sị: “Nye m, nke ahụ bụ mkparị.”

Gịnị mere e ji bipụta akwụkwọ ahụ bụ́ Dominus Iesus? O yiri ka òtù Ndị Isi Roman Katọlik hà nwere nchegbu n’ihi ihe a sịrị na ọ bụ onye na uche ya n’ihe metụtara okpukpe. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Irish Times si kwuo, “mmalite a malitere inwe echiche bụ́ na okpukpe nile dị mma—ikwu nnọọ na otu okpukpe dị mma dị ka ibe ya . . . na-enye nnọọ Kadinal Ratzinger nsogbu n’obi.” O yiri ka ọ bụ echiche a kpaliri ya ikwu ihe o kwuru banyere otu ezi chọọchị.

Ihe Dị Mkpa Ọ̀ Bụ Chọọchị Ị Nọ na Ya?

N’ezie, nye ụfọdụ ndị, echiche nke “onye na uche ya n’ihe metụtara okpukpe” ma ọ bụ nke na “okpukpe nile dị mma” bụ ihe ezi uche dị na ya na nke dị mma karịa ihe ọ bụla na-enye echiche na a pụrụ inwe nanị otu ezi chọọchị. Nye ha, okpukpe kwesịrị ịdabere ná nhọrọ onwe onye. ‘Mee elu mee ala,’ ka ha na-ekwu, ‘ihe dị mkpa abụghị chọọchị ị nọ na ya.’

Nke ahụ pụrụ iyi echiche ka egosi omume ikwe ibe nọrọ—ọ bụ ezie na otu ihe ọ kpatara bụ inwe ọtụtụ òtù okpukpe ndị kewasịrị ekewasị. ‘Ndịrịta iche dị otú ahụ e nwere n’ihe banyere okpukpe,’ ka ọtụtụ ndị na-ekwu, ‘adịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị mmadụ iji nnwere onwe ya eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.’ Otú ọ dị, dị ka onye edemede bụ́ Steve Bruce si kwuo, n’ezie, omume dị otú ahụ nke “ikwe okpukpe ọzọ nọrọ” adịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị “enweghị mmasị n’okpukpe.”—A House Divided: Protestantism, Schism, and Secularization.

Oleezi nke bụ́ echiche ziri ezi? È nwere nanị otu ezi chọọchị? Ọ̀ bụ Chọọchị Roman Katọlik? Chineke ọ̀ na-anakwerekwa chọọchị ndị ọzọ? Ebe ọ bụ na ajụjụ ndị a metụtara mmekọrịta anyị na Onye Okike anyị, n’ezie, ọ dị mkpa ịmata echiche ya n’okwu a. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Ọ bụ site n’ileba anya n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (Ọrụ 17:11; 2 Timoti 3:16, 17) Ka anyị tụlee ihe o nwere ikwu n’okwu a bụ́ banyere otu ezi okpukpe.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Mark Gibson/Index Stock Photography