Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Ji Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Meworo Agadi Akpọrọ Ihe?

Ì Ji Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Meworo Agadi Akpọrọ Ihe?

Ì Ji Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Meworo Agadi Akpọrọ Ihe?

MGBE ndị Izrel oge ochie na Chineke nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, e nyere ha iwu, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị.” (Levitikọs 19:32) Ya mere, ịkwanyere ndị agadi ùgwù bụ ọrụ dị nsọ, nke e jikọtara ya na ido onwe onye n’okpuru Chineke. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nke oge a anọghịzi n’okpuru Iwu Mozis, ọ na-echetara anyị na Jehova na-ele ndị agadi na-ejere ya ozi anya dị ka ndị bara uru ma dị oké ọnụ ahịa. (Ilu 16:31; Ndị Hibru 7:18) Ànyị na-ele ha anya dị ka Jehova si ele ha? Ànyị ji ụmụnna anyị Ndị Kraịst ndị nwoke na ndị nwanyị meworo agadi akpọrọ ihe?

O Jiri Enyi Ya Meworo Agadi Kpọrọ Ihe

A na-achọta ihe ndekọ Bible nke na-enye ihe atụ nke ịkwanyere ndị agadi ùgwù n’akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ. Ọ kọwara otú onye amụma na-akatabeghị ahụ́ bụ́ Ịlaịsha si nọchie anya Ịlaịja onye amụma. Tụlee ihe mere n’ụbọchị ikpeazụ Ịlaịja jere ozi dị ka onye amụma n’alaeze ebo iri nke Izrel.

N’ụbọchị ahụ, Jehova nyere onye amụma ahụ meworo agadi ntụziaka ka o si Gilgal gaa Betel, si Betel gaa Jeriko, ma sitezie Jeriko gaa Osimiri Jọdan. (2 Ndị Eze 2:1, 2, 4, 6) Mgbe ha na-eme njem ahụ fọrọ nke nta ka o ruo kilomita 50, Ịlaịja gwara Ịlaịsha ugboro atọ ka ọ kwụsị iso ya. Otú ọ dị, dị nnọọ ka nwa agbọghọ ahụ bụ́ Rut jụwara isi ịhapụ Naomi ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Ịlaịsha jụrụ ịhapụ onye amụma ahụ meworo agadi. (Rut 1:16, 17) Ịlaịsha kwuru ugboro atọ, sị: “Jehova na-adị ndụ, mkpụrụ obi gị na-adịkwa ndụ, m gaghị ahapụ gị ma ọlị.” (2 Ndị Eze 2:2, 4, 6) Ruo mgbe ahụ, Ịlaịsha anọwo na-enyere Ịlaịja aka ruo ihe dị ka afọ isii. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọrọ iso Ịlaịja jekọọ ozi ruo ogologo oge o kwere omume. N’ezie, ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “O ruo na, mgbe ha nọ na-eje, na-eje ije na-ekwukwa okwu, lee, . . . Ịlaịja wee rịgoro.” (Amaokwu nke 11) Ịlaịja na Ịlaịsha nọ na-akparịta ụka ruo kpọmkwem ná ngwụsị nke ozi Ịlaịja n’Izrel. O doro anya na onye amụma ahụ na-akatabeghị ahụ́ chọsiri ike ịnụrụ ọtụtụ okwu ntụziaka na nke agbamume ruo ókè o kwere omume site n’ọnụ onye amụma ahụ meworo agadi ma nwee ahụmahụ karịa ya. N’ụzọ doro anya, o ji enyi ya meworo agadi kpọrọ ihe.

‘Dị Ka Ndị Nna na Ndị Nne’

O sighị ike ịhụ ihe mere Ịlaịsha ji hụ onye amụma ahụ meworo agadi n’anya dị ka enyi—ọbụna dị ka nna ime mmụọ. (2 Ndị Eze 2:12) Kpọmkwem tupu ọrụ e nyere Ịlaịja ịrụ n’Izrel abịa ná njedebe, ọ gwara Ịlaịsha, sị: “Rịọ ihe m ga-emere gị, tupu e wepụ m n’ebe ị nọ.” (Amaokwu nke 9) Ya mere ruo kpọmkwem ná njedebe, Ịlaịja nwere nchegbu maka ọdịmma ime mmụọ nke onye ga-anọchi ya nakwa maka ọganihu nke ọrụ Chineke.

Taa, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ka ụmụnna anyị Ndị Kraịst ndị nwoke na ndị nwanyị meworo agadi na-egosi otu ụdị nchegbu ahụ yiri nke nna na nke nne ka ha ji obi ha dum na-akụnye ihe ọmụma na amamihe ha n’ime ndị na-eto eto. Dị ka ihe atụ, ndị ọrụ afọ ofufo jeworo ozi ruo ogologo oge n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-eji ọchịchọ obi enyere ndị ọhụrụ so n’ezinụlọ Betel aka inweta nkà ndị dị ha mkpa iji na-eje ozi ha. N’otu aka ahụkwa, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha, bụ́ ndị nọworo na-eleta ọgbakọ dị iche iche ruo ọtụtụ afọ, na-eji obi ụtọ eme ka ndị a na-enye ọzụzụ ije ozi dị ka ndị ozi na-ejegharị ejegharị na-amụta ihe site n’ahụmahụ dị ukwuu ha nwere. Ọzọkwa, n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, e nwere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị meworo agadi bụ́ ndị nọworo na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ iri afọ bụ́kwa ndị ji ọṅụ na-eme ka ndị ọhụrụ nọ n’ọgbakọ na-amụta ihe site n’ezi amamihe na ahụmahụ ha.—Ilu 2:7; Ndị Filipaị 3:17; Taịtọs 2:3-5.

Nchegbu sitere n’obi nke Ndị Kraịst ndị a a hụrụ n’anya meworo agadi na-egosipụta na-eme ka ịkwanyere ha ùgwù bụrụ ihe na-enye obi ụtọ n’ezie. N’ihi ya, anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Ịlaịsha n’iji ndị kwere ekwe ibe anyị meworo agadi akpọrọ ihe nke ukwuu. Dị ka Pọl onyeozi na-echetara anyị, ka anyị nọgide na-emeso “nwoke meworo okenye . . . dị ka nna” na “ụmụ nwanyị meworo okenye dị ka ndị nne.” (1 Timoti 5:1, 2) Site n’ime otú ahụ, anyị na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’ime ka ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ ọrụ nke ọma ma na-enwe ọganihu n’ụwa nile.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ịlaịsha chọrọ iso Ịlaịja jekọọ ozi ruo ogologo oge o kwere omume

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ndị na-eto eto na-erite uru dị ukwuu site n’aka Ndị Kraịst meworo agadi