Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ọtụtụ ebe n’ụwa, inye ndị na-agba akwụkwọ onyinye bụ omenala. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịtụle mgbe anyị na-enye ma ọ bụ na-anara ụdị onyinye ndị ahụ?

Bible na-akwado inye onyinye mgbe e bu ezi ihe n’obi nye ya nakwa mgbe e enyere ya n’oge kwesịrị ekwesị. N’ihe banyere inye ihe, Bible na-agba ezi Ndị Kraịst ume ka ha na-eṅomi Onye ji mmesapụ aka na-egbo mkpa ha, bụ́ Jehova. (Jems 1:17) Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ dị Chineke ezi mma.” Ya mere, a gbara Ndị Kraịst ume ịdị na-emesapụ aka.—Ndị Hibru 13:16; Luk 6:38.

Ná mba ụfọdụ, ihe a na-emekarị bụ na mmadụ abụọ ndị na-akwadebe ịgba akwụkwọ na-edenye aha n’otu ụlọ ahịa site n’ilere ngwa ahịa ndị e nwere n’ebe ahụ ma depụta ihe ndị ha ga-achọ ka e jiri nye ha onyinye. A na-agwa ndị ikwu na ndị enyi nke mmadụ abụọ a ka ha gaa n’ụlọ ahịa ahụ ma zụta otu n’ime onyinye ndị ha depụtara ka e jiri nye ha onyinye. N’ile ya anya n’ụzọ dị mma, idepụta ihe ndị a ga-eji nye onyinye ga-atọpụ onye na-enye ihe ná nsogbu nke iji ọtụtụ awa na-achọgharị ihe ọ ga-eji nye onyinye, ebe ndị a ga-enye onyinye ahụ ga-agbanarị nsogbu nke iweghachi onyinye ndị ha na-achọghị n’ụlọ ahịa ahụ.

Ma mmadụ abụọ na-achọ ịlụ di na nwunye hà ga-edepụta onyinye a ga-enye ha ma ọ bụ na ha agaghị eme otú ahụ bụ mkpebi dịịrị ha. Otú ọ dị, Onye Kraịst kwesịrị ịkpachara anya iji zere omume ọ bụla pụrụ imegide ụkpụrụ Bible. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ abụọ kwekọrịtara ịlụ onwe ha edepụta nanị ihe ndị dị oké ọnụ? N’ọnọdụ dị otú ahụ, ndị na-enwechaghị ego nwere ike ha agaghị ewetali onyinye, ma ọ bụ ha pụrụ iche na ọ ga-akara ha mma ịhapụ ịza òkù agbamakwụkwọ ahụ ma si otú a zere ihere nke iweta onyinye dị ọnụ ala. Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst dere, sị: “Ọ na-aghọzị ibu arọ. Agbalịwo m ịdị na-emesapụ aka ma n’oge ndị a, adịghịzi m enwe obi ụtọ nile m na-enwebu site n’inye ihe.” Lee nnọọ ihe mwute ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na oge agbamakwụkwọ abịa bụrụ ihe na-akpata nkụda mmụọ!

N’ezie, e kwesịghị ime ka ndị na-enye ihe chee na ka onyinye ha bụrụ nke a ga-anabata, ọ ga-abụrịrị nke a zụtara n’otu ụlọ ahịa a kpọrọ aha ma ọ bụ na ọ ga-anọ n’agbata ọnụ ego a kpọrọ aha. E kwuwerị, Jizọs Kraịst gosipụtara na ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke bụ ọnọdụ obi onye na-enye ihe, ọ bụghị ọnụ ego nke onyinye ya. (Luk 21:1-4) N’otu aka ahụ, banyere onyinye ebere a na-enye ndị nọ ná mkpa, Pọl onyeozi dere sị: “Ka onye ọ bụla na-eme dị nnọọ ka o kpebiworo n’obi ya, ọ bụghị n’enweghị ọchịchọ ime ihe ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.

Dị ka Bible si ele ihe anya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ gosi na ọ bụ ya nyere onyinye, eleghị anya site n’ide aha ya n’elu onyinye ahụ. Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, ọ bụ omenala ógbè ịkpọ aha onye nyere ihe n’ihu ndị nile bịaranụ. Omenala dị otú a nwere ike iduga n’ọtụtụ nsogbu. Ndị na-enye onyinye pụrụ ịchọ ka a ghara ịkpọ aha ha iji zere ịdọta uche ndị ọzọ n’ebe ha nọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ndị dị otú ahụ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ dị na Matiu 6:3, ebe Jizọs kwuru, sị: “Ma gị onwe gị, mgbe ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka aka ekpe gị mara ihe aka nri gị na-eme.” Ndị ọzọ pụrụ iche na inye onyinye bụ okwu dịịrị onwe onye nke kwesịrị ịdị n’etiti onye na-enye onyinye na onye ọ na-enye ya. Ọzọkwa, ịkpọ aha onye nyere ihe pụrụ iduje n’iji otu onyinye na-atụnyere onyinye ọzọ, “na-akpali ịsọ mpi.” (Ndị Galeshia 5:26) Obi abụọ adịghị ya na Ndị Kraịst kwesịrị izere imenye onye ọ bụla ihere site n’ịkpọ aha ndị nyere ihe n’ihu ọha.—1 Pita 3:8.

Ee, site n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ dị n’Okwu Chineke, inye onyinye ga-anọgide na-abụ ihe na-akpata obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.