Jehova Na-eche Banyere Anyị Mgbe Nile
Akụkọ Ndụ
Jehova Na-eche Banyere Anyị Mgbe Nile
DỊ KA ENELESI MZANGA SI KỌỌ
Ọ bụ na 1972. Ụmụ okorobịa iri, ndị so n’Òtù Ndị Ntorobịa nke Malawi, tibatara n’ụlọ anyị, jide m ma dọkpụrụ m gaa n’ọdọ okpete. Mgbe ha ruru n’ebe ahụ, ha tiri m ihe ma hapụ m chee na mụ anwụọla.
A wakporo ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ na Malawi n’ụzọ obi ọjọọ dị ka nke a. N’ihi gịnị ka e ji kpagbuo ha? Gịnị nyeere ha aka ịtachi obi? Biko chere ka m kọọrọ gị ahụmahụ ezinụlọ m.
A MỤRỤ m na December 31, 1921, n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe. Nna m bụ pastọ nke Chọọchị Central African Presbyterian. Etolitere m na Nkhoma, bụ́ ntakịrị obodo dị nso na Lilongwe, bụ́ isi obodo Malawi. Mgbe m dị afọ 15, aghọrọ m nwunye Emmas Mzanga.
Otu ụbọchị otu enyi papa m, onye bụ́kwa pastọ, bịara na nke anyị. Ọ chọpụtawo na Ndịàmà Jehova bi nso n’ụlọ anyị ma dọọ anyị aka ná ntị ka anyị na ha ghara imekọ ihe. Ọ gwara anyị na Ndịàmà bụ ndị mmụọ ọjọọ ji nakwa na ọ bụrụ na anyị elezighị anya, mmụọ ọjọọ pụrụ ijidekwu anyị. Ịdọ aka ná ntị ahụ menyere anyị egwu nke ukwuu nke na anyị kwagara n’obodo ọzọ, bụ́ ebe Emmas chọtara ọrụ dị ka onye na-ere ihe n’ụlọ ahịa. Ma n’oge na-adịghị anya, anyị chọpụtara na ebe obibi ọhụrụ anyị dị nso n’ebe Ndịàmà Jehova bi!
Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, mmasị miri emi Emmas nwere n’ebe Bible dị kpaliri ya iso otu n’ime Ndịàmà kwurịta okwu. Mgbe o nwetasịrị azịza ndị doro anya nye ọtụtụ ajụjụ ndị o nwere, Emmas kwere ka Ndịàmà na-amụrụ ya Bible. Ná mmalite, a na-anọ n’ụlọ
ahịa ebe ọ na-arụ ọrụ eduziri ya ọmụmụ Bible ahụ, ma ka e mesịrị, ha malitere ịnọ n’ụlọ anyị enwe ọmụmụ ihe ahụ ha na-enwe kwa izu. Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova bịara, ana m esi n’ụlọ anyị pụọ n’ihi na m na-atụ ha egwu. Otú o sina dị, Emmas nọgidere na-amụ Bible. Ihe dị ka ọnwa isii ka ọ malitesịrị ịmụ ihe, e mere ya baptizim n’April 1951. Otú ọ dị, ọ gwaghị m banyere ya n’ihi na ọ tụrụ egwu na ịgwa m banyere ya ga-eme ka alụmdi na nwunye anyị bie.Izu Ndị Tara Akpụ
Otú ọ dị, otu ụbọchị, enyi m bụ́ Ellen Kadzalero gwara m na e meela di m baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọnụma juru m obi! Site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, akwụsịrị m ikwusara di m okwu na isiri ya nri. Akwụsịkwara m ikute na isiri ya mmiri o ji asa ahụ́—ọrụ dịịrị onye bụ́ nwunye dị ka omenala anyị si dị.
Mgbe Emmas disịrị mmeso a ruo izu atọ, o ji obiọma gwa m ka mụ na ya kparịta ụka, ọ gwaziri m ihe mere o ji kpebie ịghọ Onyeàmà. Ọ gụrụ ma kọwaa ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ, dị ka 1 Ndị Kọrint 9:16. Ihe ọ gụrụ kpaliri m n’ụzọ dị ukwuu nke na m nwere mmetụta na ọ dị mkpa ka m sorokwuo na-ekwusa ozi ọma ahụ. N’ihi ya, ekpebiri m ịmalite iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. N’uhuruchi ahụ, n’ụzọ nyere di m hụrụ m n’anya obi ụtọ, esiiri m ya nri dị ụtọ.
Iso Ndị Ezinụlọ na Ndị Enyi Kerịta Eziokwu Ahụ
Mgbe ndị mụrụ anyị nụrụ na anyị esowela Ndịàmà Jehova, ha kpagburu anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị ezinụlọ m detaara anyị akwụkwọ ozi na-agwa anyị ka anyị ghara ịbịakwa na-eleta ha. Mmeghachi omume ha wutere anyị, ma anyị tụkwasịrị obi ná nkwa Jizọs kwere na anyị ga-enwe ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ime mmụọ na ndị nna na ndị nne ime mmụọ.—Matiu 19:29.
Enwere m ọganihu ngwa ngwa n’ọmụmụ Bible m, e meekwa m baptizim n’August 1951, nanị ọnwa atọ na ọkara ka e mesịrị di m baptizim. A kpaliri m iso enyi m nwanyị bụ́ Ellen kerịta eziokwu ahụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o kweere ka m mụọrọ ya Bible. Na May 1952, e mere Ellen baptizim, ya aghọọkwa nwanna nwanyị ime mmụọ m, bụ́ nke mere ka ọbụbụenyi anyị sikwuo ike. Taa, anyị ka bụ ezigbo enyi.
Na 1954, a họpụtara Emmas iletagasị ọgbakọ dị ka onye nlekọta sekit. N’oge ahụ, anyị amụọlarị ụmụ isii. N’oge ahụ, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke nwere ezinụlọ na-eji otu izu eleta ọgbakọ ma sorozie nwunye ya na ụmụ ya nọkọọ n’izu na-eso ya. Otú ọ dị, mgbe Emmas na-eme njegharị, ọ na-ahụ mgbe nile na m duziri ọmụmụ Bible ezinụlọ. Anyị gbalịrị ime ka ọmụmụ ihe ahụ na-atọ ụmụ anyị ụtọ. Anyị jikwa nkwenye sitere n’obi na-ekwu banyere ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa maka eziokwu ahụ nke sitere n’Okwu ya, anyị na-ekerekwa òkè n’ọrụ nkwusa dị ka ezinụlọ. Ọzụzụ ime mmụọ a wusiri okwukwe nke ụmụ anyị ike ma kwadebe ha maka mkpagbu nke anyị na-aga iche ihu.
Mkpagbu Okpukpe Amalite
Na 1964, Malawi ghọrọ mba nweere onwe ya. Mgbe ndị isi nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achị n’oge ahụ chọpụtara nnọpụiche anyị n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha gbalịrị ịmanye anyị ịzụrụ kaadị e ji amata ndị so n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. * Ebe ọ bụ na mụ na Emmas jụrụ ime otú ahụ, ndị so n’Òtù Ndị Ntorobịa bibiri ugbo ọka anyị—bụ́ ebe bụ́ isi anyị ga-esi enweta nri n’afọ na-abịanụ. Ka ndị Òtù Ndị Ntorobịa ahụ na-egbutusị ọka anyị, ha nọ na-agụ, sị: “Ndị nile jụrụ ịzụ kaadị Kamuzu [President Banda], àkị́kà ga-ata ọka ndụ ha, ha ga-ebekwa ákwá n’ihi ya.” N’agbanyeghị na ihe oriri anyị efunahụwo anyị, obi ekoropụghị anyị. Anyị nwere mmetụta na Jehova na-eche banyere anyị. O ji ịhụnanya wusie anyị ike.—Ndị Filipaị 4:12, 13.
N’etiti otu abalị n’August 1964, nanị mụ na ụmụ anyị nọ n’ụlọ. Anyị nọ na-ehi ụra, ma abụ a nọ na-abụ n’ebe dị anya kpọtere m. Ọ bụ òtù Gulewamkulu, bụ́ òtù nzuzo a na-atụ egwu nke ndị na-agba egwú ọdịnala bụ́ ndị na-awakpo ndị mmadụ ma na-eme ka a ga-asị na ọ bụ mmụọ nke ndị nna ochie nwụrụ anwụ mere ya. Ndị Òtù Ndị Ntorobịa ahụ ezitewo ndị Gulewamkulu ịbịa wakpo anyị. Akpọtere m ụmụ m ngwa ngwa, tupu ndị mwakpo ahụ erutekwa n’ụlọ anyị, anyị gbabara n’ime ọhịa.
Site n’ebe anyị zoro, anyị hụrụ ìhè ọkụ na-enwusi ike. Ndị Gulewamkulu esunyela ụlọ akịrịka anyị ọkụ. Ọ gbara ọkụ ruo ala, ya na ihe nile anyị nwere. Ka ndị mwakpo ahụ si n’ụlọ anyị ka na-akwụ anwụrụ na-apụ, anyị nụrụ ka ha kwuru, sị, “Anyị amụnyerela Onyeàmà ahụ ezigbo ọkụ ọ ga-anyara.” Lee ka anyị si nwee ekele n’ebe Jehova nọ na anyị gbapụrụ n’emerụghị ahụ́! N’eziokwu, ha bibiri ihe nile anyị nwere, ma ha ebibighị mkpebi anyị siri ike ịtụkwasị Jehova obi karịa mmadụ.—Abụ Ọma 118:8.
Anyị chọpụtara na ndị Gulewamkulu ahụ mesoro ezinụlọ Ndịàmà Jehova ise bi n’ógbè anyị otu omume obi ịta mmiri ahụ. Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na ekele mgbe ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị anyị na ha gbara agbata obi gbataara anyị ọsọ enyemaka! Ha wughachiiri anyị ụlọ anyị ma nye anyị ihe oriri ruo ọtụtụ izu.
Mkpagbu Esiwanye Ike
Na September 1967, a malitere ijide Ndịàmà Jehova nile nọ ná mba a. Iji chọta anyị, ụmụ okorobịa ndị obi tara mmiri—ndị Òtù Ndị Ntorobịa na òtù Malawi Young Pioneers, ndị jicha mma—chọgharịrị Ndịàmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbe ha chọtara ha, ụmụ okorobịa ndị ahụ gwara ha na ha ga-eresị ha kaadị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Mgbe ha rutere n’ụlọ anyị, ha jụrụ anyị ma anyị nwere kaadị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ekwuru m, sị: “Ee e, ọ dịbeghị nke m zụtara. Agajeghị m ịzụ ya ugbu a, agajeghịkwa m ịzụ nke ọ bụla n’ọdịnihu.” Mgbe ahụ ha jidere mụ na di m ma kpọga anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, n’ekweghị ka anyị were ihe ọ bụla. Mgbe ụmụ anyị ndị obere si ụlọ akwụkwọ lọta, ha ahụghị anyị, ha malitekwara inwe nnọọ nchegbu. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, nwa anyị nwoke nke okenye, bụ́ Daniel, lọtara n’oge na-adịghị anya ha lọtasịrị ma chọpụta site n’aka ndị agbata obi anyị ihe merenụ. Ọ kpọọrọ ụmụnne ya ndị obere bịawa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ozugbo. Ha bịarutere kpọmkwem mgbe ndị uwe ojii na-akwakpuju anyị na gwongworo iji kpọga anyị Lilongwe. Ụmụ anyị sokwa anyị gaa.
Na Lilongwe, e kpere anyị ikpe iwu na-akwadoghị n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ndị uwe ojii ahụ jụrụ anyị, sị, “Ùnu ga-anọgide na-abụ Ndịàmà Jehova?” Anyị zara “Ee!” n’agbanyeghị na azịza a pụtara nnọọ na a ga-ama anyị ikpe ịga mkpọrọ afọ asaa. Nye “ndị isi” nke nzukọ a, ọmụma ikpe ha bụ afọ 14.
Mgbe anyị nọsịrị otu abalị n’erighị nri, n’ezughịkwa ike, ndị uwe ojii kpọgara anyị n’Ụlọ Mkpọrọ Maula. Ndị mmadụ karịrị akarị n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ndị dị n’ebe ahụ nke na anyị apụghịdị ịhụ ebe anyị ga-ehi ụra n’ala ụlọ! Ebe a na-aga mposi bụ nanị n’otu bọket e debere n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nke ọ bụla bụ́ ebe ndị mmadụ juru. Òkè nri anyị pere nnọọ mpe, a dịghịkwa esi ha nke ọma. Mgbe izu abụọ gasịrị, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ ghọtara na anyị bụ ndị udo ma kwe ka anyị jiri mbara èzí ụlọ mkpọrọ bụ́ ebe a na-anọ emegharị ahụ́ na-eme ihe. Ebe ọtụtụ n’ime anyị nọkọtara ọnụ, anyị nwere ohere kwa ụbọchị ịgbarịta ibe anyị ume na ịgbara ndị mkpọrọ ndị ọzọ àmà. N’ụzọ tụrụ anyị n’anya, mgbe anyị nọsịrị ọnwa atọ n’ụlọ mkpọrọ, a tọhapụrụ anyị n’ihi nrụgide ọchịchị Malawi nwetara site n’aka mba ndị ọzọ.
Ndị uwe ojii gwara anyị ka anyị laghachi n’ụlọ anyị, ha gwakwara anyị na a
machibidowo Ndịàmà Jehova iwu na Malawi. Mmachibido iwu a malitere n’October 20, 1967 ma dịgide ruo August 12, 1993—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 26. Afọ ndị ahụ siri ike, ma Jehova nyeere anyị aka inwe ike ịnọgide na-anọpụ nnọọ iche.Ndị A Na-achụgharị Dị Ka Ụmụ Anụmanụ
N’October 1972, otu iwu gọọmenti nyere kpalitere mkpagbu ọzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Iwu ahụ kwuru na a ga-achụ Ndịàmà Jehova nile n’ọrụ nakwa na a ga-achụpụ Ndịàmà nile bi n’ime obodo n’ụlọ ha. A chụgharịrị Ndịàmà dị ka ụmụ anụmanụ.
N’oge ahụ, otu nwanna Onye Kraịst bụ́ onye ntorobịa bịara n’ụlọ anyị izi Emmas otu ozi chọrọ ime ihe ngwa ngwa, na-asị, ‘Òtù Ndị Ntorobịa na-eme atụmatụ igbupụ gị isi, kwụnye ya na poolu, ma wegara ya ndị ichie.’ Emmas si n’ụlọ anyị pụọ ngwa ngwa, ma o bu ụzọ mee ndokwa ka anyị sochie ya azụ ngwa ngwa o kwere omume. Emere m ọsọ ọsọ zipụ ụmụ anyị. Mgbe e mesịrị, kpọmkwem ka m na-achọ ịpụ, mmadụ iri n’ime ndị Òtù Ndị Ntorobịa bịara, na-achọ Emmas. Ha tibatara n’ụlọ anyị ma chọpụta na Emmas apụọla. Ụmụ okorobịa ahụ ji iwe dọkpụụrụ m banye n’ọdọ okpete nke dị nso, bụ́ ebe ha gbara m ụkwụ ma jiri okpete tie m ihe. Ha hapụrụ m na-eche na mụ anwụọla. Mgbe m nwetasịrị onwe m, egbeere m igbe laghachi n’ụlọ.
N’abalị ahụ, mgbe ọchịchịrị gbara, Emmas tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ site n’ịlaghachi n’ụlọ ịchọ m. Mgbe ọ hụrụ na e tikasịrị m ahụ́, Emmas na otu enyi ya nke nwere ụgbọala jiri nwayọọ tinye m n’ụgbọala. Anyị gbagaziri na nke otu nwanna nwoke bi na Lilongwe, bụ́ ebe m nọ jiri nwayọọ gbakee site ná mwakpo ahụ, Emmas malitekwara ime atụmatụ isi ná mba a gbapụ.
Ndị Na-agba Ọsọ Ndụ Na-enweghị Ebe Ha Ga-agbaga
Nwa anyị nwanyị bụ́ Dinesi na di ya nwere gwongworo na-ebu ibu dị tọn ise n’arọ. Ha were otu onye ọkwọ ụgbọala onye sobu n’òtù Malawi Young Pioneers ma bụrụ onye maliteworo imetere anyị ebere n’ihi ọnọdụ anyị n’ọrụ. O wepụtara onwe ya inyere anyị na Ndịàmà ndị ọzọ aka. Ọtụtụ uhuruchi, ọkwọ ụgbọala ahụ kwọọrọ Ndịàmà n’ebe ndị ha meworo ndokwa izo. Ọ na-eyirizi uwe ndị Malawi Young Pioneers ma kwọrọ gwongworo ya gafee ọtụtụ ebe ndị uwe ojii na-eche nche. O tinyere onwe ya n’ihe ize ndụ dị ukwuu iji nyere ọtụtụ narị Ndịàmà aka ịgafe ókè mba a ma banye na Zambia.
Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ndị ọchịchị Zambia gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi laghachi Malawi; ma, anyị apụghị ịlaghachi n’obodo anyị. E zuchaala ihe ndị anyị hapụrụ gbaa ọsọ ndụ. Ọbụna e wepụla gbamgbam dị n’elu
ụlọ anyị. Ebe anyị na-enweghị ebe dị nchebe anyị ga-aga, anyị gbagara Mozambique ma nọrọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị na Mlangeni ruo ihe dị ka afọ abụọ na ọkara. Otú ọ dị, na June 1975, ọchịchị ọhụrụ nke malitere ịchị Mozambique mechiri ogige ahụ ma manye anyị ịlaghachi Malawi, bụ́ ebe ọnọdụ na-agbanwebeghị maka ndị Jehova. Anyị enweghị ihe ọzọ anyị ga-eme ma ọ bụghị ịgbaghachi Zambia. Anyị rutere n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dị na Chigumukire.Ọnwa abụọ ka e mesịrị, anyị hụrụ ka a dọsara ọtụtụ bọs na gwongworo ndị agha n’okporo ụzọ, ọtụtụ narị ndị soja Zambia ji ngwá agha tibatara n’ogige ahụ. Ha gwara anyị na e wuworo anyị ọmarịcha ụlọ nakwa na ha ga-akwọga anyị n’ebe ahụ. Anyị maara na nke ahụ abụghị eziokwu. Ndị soja ahụ kwakpujuru anyị na gwongworo na bọs ndị ahụ, ahụ́ malitekwara ịma onye ọ bụla jijiji. Ndị soja ndị ahụ malitere iji égbè na-awụpụ mgbọ n’akwụsịghị akwụsị na-agbali mgbọ elu, ọtụtụ puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị gbasasịkwara n’ụjọ.
N’oge ahụ e nwere ọgba aghara, a kwaturu Emmas n’amaghị ama ma zọọ ya ụkwụ, ma otu nwanna nwoke nyeere ya aka ibilite. Anyị chere na nke a bụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ. Ndị nile na-agba ọsọ ndụ gbaghachiri Malawi. Mgbe anyị ka nọ na Zambia, anyị rutere n’otu osimiri, ụmụnna jikọtachakwara aka iji nyere onye ọ bụla aka ịgafe n’udo. Mgbe anyị ruru n’ófè nke ọzọ nke osimiri ahụ, ndị soja Zambia jidere anyị ma kpọghachi anyị Malawi.
Mgbe anyị lọghachiri Malawi, anyị amaghị ebe anyị ga-aga. Anyị chọpụtara na ná nzukọ achụmnta vootu na n’akwụkwọ akụkọ, a dọwo ndị mmadụ aka ná ntị ka ha nọrọ na nche banyere “ihu ọhụrụ” ndị na-abata n’obodo, na-ezo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. N’ihi ya, anyị kpebiri ịga n’isi obodo nke mba a, bụ́ ebe anyị na-agaghị apụtacha ìhè nke ọma dị ka anyị ga-apụta n’ime obodo. Anyị nwetaliri obere ụlọ, Emmas maliteghachikwara ọrụ nleta ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche na nzuzo dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.
Ịga Nzukọ Ọgbakọ
Gịnị nyeere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ nzukọ ọgbakọ! N’ogige ndị gbara ọsọ ndụ ndị dị na Mozambique na Zambia, anyị gara nzukọ ọgbakọ n’enweghị ihe mgbochi, bụ́ nzukọ ndị e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị mfe e ji akịrịka kpuchie elu ha. Izukọta maka nzukọ na Malawi dị ize ndụ ma sie ike—ma, o ruru mgbalị ndị e mere maka ha mgbe nile. Iji zere ịbụ ndị a hụrụ, anyị na-enwekarị nzukọ anyị n’etiti abalị n’ebe dịpụrụ adịpụ. Iji ghara ime ka ndị mmadụ mata ebe anyị gbakọrọ, anyị adịghị akụ aka iji gosipụta ekele anyị maka ọkà okwu kama ihe anyị na-eme bụ nanị ịhịọkọta aka anyị ọnụ.
E ji etiti abalị eme baptizim. E mere nwa anyị nwoke bụ́ Abiyudi baptizim n’otu n’ime oge ndị ahụ. Mgbe e kwusịrị okwu baptizim, e duuru ya na ndị ọzọ a na-aga ime baptizim n’ọchịchịrị ahụ gawa n’ebe apịtị dị bụ́ ebe e gwuworo olulu. E mere ha baptizim n’ebe ahụ.
Obere Ụlọ Anyị, Ebe Dị Nchebe
N’afọ ndị ikpeazụ nke mmachibido iwu ahụ nke ọchịchị machibidoro anyị, e ji ụlọ anyị nke dị na Lilongwe mere ebe ndọba akwụkwọ dị nchebe. A na-ebute akwụkwọ ozi na akwụkwọ ndị sitere n’alaka ụlọ ọrụ Zambia n’ụlọ anyị na nzuzo. Ụmụnna ndị na-eje ozi dị ka ndị obu ozi bụ́ ndị na-eji ịnyịnya ígwè aga na-abịa n’ụlọ anyị eburu ihe ndị e si Zambia bubata ma bugazie akwụkwọ ozi na akwụkwọ ndị ahụ n’akụkụ nile nke Malawi. Ọdịdị magazin Ụlọ Nche ndị e kesara pere mpe n’ihi na e ji akwụkwọ ndị e ji ebi Bible bipụta ha. Nke a mere ka o kwe ndị obu ozi ahụ omume iburu ùkwù magazin ji okpukpu abụọ karịa ka ha gaara enwe ike ibu ma a sị na e ji akwụkwọ e jibu ebi magazin ndị ahụ bie ha. Ndị obu ozi ahụ kesakwara magazin Ụlọ Nche ndị pere mpe bụ́ ndị nwere nanị isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ. Ọ dị mfe izochi magazin ahụ pere mpe n’akpa uwe n’ihi na ọ dị n’otu mpempe akwụkwọ.
Ndị obu ozi a tinyere nnwere onwe na ndụ ha n’ihe ize ndụ mgbe ha ji ịnyịnya ígwè ha na-agba n’ime ọhịa, mgbe ụfọdụ, na-eme otú
ahụ n’etiti abalị, na-ebu ọtụtụ katọn nke akwụkwọ a machibidoro iwu n’elu ịnyịnya ígwè ha. N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ebe ndị uwe ojii na-eche nche na ihe ize ndụ ndị ọzọ, ha mere njem ruo ọtụtụ narị kilomita n’ọnọdụ ihu igwe ọ bụla iji bugara ụmụnna ha nri ime mmụọ. Lee ka ndị obu ozi ahụ anyị hụrụ n’anya si bụrụ ndị obi kara!Jehova Na-eche Banyere Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ
Na December 1992, ka Emmas na-ekwu okwu ihu ọha n’oge ọ na-eleta ọgbakọ dị ka onye nlekọta sekit, ọ dara ọrịa strok. Mgbe e mesịrị, o nweghịzi ike ikwu okwu. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ọ dara ọrịa strok ọzọ, bụ́ nke kpọnwụrụ otu akụkụ ahụ́ ya. Ọ bụ ezie na o siiri ya ike ịnagide ọrịa ya, nkwado ịhụnanya anyị nwetara site n’aka ọgbakọ anyị belatara obi nkoropụ m. Elekọtara m di m n’ụlọ ruo mgbe ọ nwụrụ na November 1994, mgbe ọ dị afọ 76. Anyị abụwo di na nwunye ruo afọ 57, Emmas hụkwara mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ tupu ya anwụọ. Ma m ka na-eru újú ọnwụ nke enyi m na-ekwesị ntụkwasị obi.
Mgbe m ghọsịrị nwanyị di ya nwụrụ, di nwa m nakweere ibu ọrụ nke ilekọta, ọ bụghị nanị nwunye ya na ụmụ ya ise, kamakwa mụ onwe m. N’ụzọ dị mwute, mgbe ọ rịasịrị ọrịa ruo nwa oge, ọ nwụrụ n’August 2000. Olee otú nwa m nwanyị ga-esi enwetara anyị nri na ebe obibi? Achọpụtara m ọzọ na Jehova na-eche banyere anyị nakwa na ọ bụ n’ezie “Nna nke ụmụ mgbei, na onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.” (Abụ Ọma 68:5) Site n’aka ndị ohu ya nọ n’ụwa, Jehova nyere anyị ọmarịcha ụlọ ọhụrụ. Olee otú nke ahụ si mee? Mgbe ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ anyị, ha wuuru anyị ụlọ n’ime nanị izu ise! Ụmụnna na-edo blọkụ bụ́ ndị sitere n’ọgbakọ ndị ọzọ bịara nye aka. Ịhụnanya na obiọma Ndịàmà a nile gosipụtara riri anyị ọnụ n’ihi na ụlọ ha wuuru anyị ka ndị nke ọtụtụ n’ime ha bi mma. Ịhụnanya a ọgbakọ gosipụtara gbara ezi àmà n’agbata obi anyị. Mgbe ọ bụla m lakpuru ụra n’abalị, ọ na-adị m ka m nọ na Paradaịs! Ee, e ji brik na simenti a gwara agwa wuo ọmarịcha ụlọ ọhụrụ anyị, ma dị ka ọtụtụ ndị kwuworo, ọ bụ n’ezie ụlọ e ji ịhụnanya wuo.—Ndị Galeshia 6:10.
Jehova Nọgidere Na-eche Banyere Anyị
Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, ọ na-afọ nke nta ka m nwee oké obi nkoropụ, Jehova anọwo na-enyere m aka. Mmadụ asaa n’ime ụmụ m itoolu ka dị ndụ, ezinụlọ m dịkwa mmadụ 123 ugbu a. Lee ka m si nwee ekele na ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi!
Taa, ka m gbaworo afọ 82, obi na-ejupụta m n’ọṅụ mgbe m hụrụ ihe mmụọ Chineke rụzuworo na Malawi. Nanị n’ime afọ anọ gara aga, ahụwo m ka ọnụ ọgụgụ Ụlọ Nzukọ Alaeze e nwere mụbara site n’otu ruo ihe karịrị 600. Anyị nwekwara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na Lilongwe, anyị na-enwetakwa nri ime mmụọ na-ewusi okwukwe ike n’enweghị ihe mgbochi. Ọ dị m n’ezie ka ahụwo m mmezu nke nkwa Chineke e dekọrọ n’Aịsaịa 54:17, bụ́ ebe e mesiri anyị obi ike, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma.” Ka m jewooro Jehova ozi ruo ihe karịrị afọ 50, ekwenyesiri m ike na n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla anyị pụrụ iche ihu, Jehova na-eche banyere anyị mgbe nile.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova na Malawi, lee 1999 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 149-223, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 24]
E mere di m, bụ́ Emmas, baptizim n’April 1951
[Foto dị na peeji nke 26]
Ìgwè ndị obu ozi obi kara
[Foto dị na peeji nke 28]
Ụlọ e ji ịhụnanya wuo