Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ezi Okpukpe Ndị Kraịst—Ihe Dị Adị

Otu Ezi Okpukpe Ndị Kraịst—Ihe Dị Adị

Otu Ezi Okpukpe Ndị Kraịst—Ihe Dị Adị

JIZỌS KRAỊST guzobere nanị otu chọọchị ma ọ bụ ọgbakọ. Ọgbakọ ahụ bụ òtù ime mmụọ, ezinụlọ ime mmụọ. Ihe anyị na-ekwu bụ na ọ bụ nchịkọta nke ndị e ji mmụọ nsọ Chineke họpụta—ndị Chineke nakwerechaara ịbụ “ụmụ” ya.—Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Galeshia 3:26.

Jizọs kụziri na ọ bụ nanị otu ụzọ ka Chineke si eduga ndị mmadụ n’eziokwu ahụ na ná ndụ. Iji mee ka eziokwu ahụ dị mkpa pụta ìhè, Jizọs ji ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi tụnyere okporo ụzọ. O kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye; n’ihi na okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi sara mbara ma dị obosara, ndị na-esikwa na ya abanye dị ọtụtụ; ma ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:13, 14; Jọn 14:6; Ọrụ 4:11, 12.

Ọgbakọ Dị n’Otu

Anyị ekwesịghị iche na ọgbakọ ahụ e nwere na narị afọ mbụ bụ “òtù zuru ụwa ọnụ a haziri ahazi dị ka a na-ebu n’uche taa mgbe a na-ekwu banyere chọọchị katọlik,” ka akwụkwọ bụ́ The New Dictionary of Theology na-ekwu. N’ihi gịnị? Ọ na-ekwu na “ọ bụ nnọọ n’ihi na òtù dị otú ahụ a haziri ahazi nke zuru ụwa ọnụ adịghị adị n’oge ahụ.”

Ọ dịghị onye ga-agbagha eziokwu ahụ bụ́ na ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ ahụ eyitụghị chọọchị ndị e guzobere eguzobe anyị na-ahụ taa. Ma a haziri ya ahazi. Ọgbakọ dị iche iche adịghị eme ihe dị iche n’ihe ibe ha na-eme. Ha nile nakweere ịbụisi nke òtù na-achị isi e nwere na Jeruselem. Òtù ahụ—nke ihe mejupụtara ya bụ ndịozi na ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem—nyere aka mee ka ọgbakọ ahụ, nke bụ́ “otu ahụ́” nke Kraịst, nọgide na-adị n’otu.—Ndị Efesọs 4:4, 11-16; Ọrụ 15:22-31; 16:4, 5.

Gịnị mere otu ezi ọgbakọ ahụ? Ọ̀ bụ ya ghọrọ nnukwu Chọọchị Katọlik? Ọ̀ bụ ya mụpụtasịrị ọtụtụ òtù okpukpe Protestant kewasịrị ekewasị anyị na-ahụ taa? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ mere ya?

“Ọka Wit” na “Ata”

Iji nweta azịza ha, ka anyị jiri nlezianya tụlee ihe Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru ga-eme. Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na Jizọs tụrụ anya na ọgbakọ ya ga-apụ n’anya nakwa na ya ga-ekwe ka ọnọdụ ọjọọ ahụ dịgide ruo ọtụtụ narị afọ.

N’iji ọgbakọ ya tụnyere “alaeze nke eluigwe,” o kwuru, sị: “Alaeze nke eluigwe dị ka nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya. Mgbe ụmụ mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụkwasị ata n’etiti ọka wit ahụ, ma pụọ. Mgbe akwụkwọ ya pulitere wee mịa mkpụrụ, mgbe ahụ ata ndị ahụ pulitekwara. Ya mere ndị ohu nke onyeisi ezinụlọ ahụ pụtara wee sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ́ bụghị mkpụrụ dị mma ka ị ghara n’ubi gị? Oleezi otú o si nwee ata?’ Ọ sị ha, ‘Onye iro, bụ́ mmadụ, mere ihe a.’ Ha asị ya, ‘Ị̀ chọrọ ka anyị pụọ gaa chịkọta ha? Ọ sị, ‘Ee e; ka ọ ghara ịbụ na mgbe unu na-achịkọta ata ahụ, unu efopụkọta ha na ọka wit ahụ. Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ, e mesia unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”—Matiu 13:24-30.

Jizọs kọwara na ọ bụ ya bụ ‘onye ahụ ghara mkpụrụ.’ “Mkpụrụ ọma ahụ” na-ese onyinyo ezi ndị na-eso ụzọ ya. “Onye iro” ya bụ Setan bụ́ Ekwensu. “Ata ahụ” bụ Ndị Kraịst adịgboroja bụ́ ndị gbebatara n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge mbụ. O kwuru na ya ga-ahapụ “ọka wit ahụ” na “ata ahụ” ka ha tokọọ ruo “owuwe ihe ubi,” bụ́ nke ga-abụ “ná ngwụsị nke usoro ihe.” (Matiu 13:37-43) Gịnị ka ihe a nile pụtara?

E Merụọ Ọgbakọ Ndị Kraịst

Ozugbo ndịozi nwụsịrị, ndị ozizi si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị sitere n’ọgbakọ ahụ malitere ịchịkwa ya. Ha kwuru “ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:29, 30) N’ihi ya, ọtụtụ Ndị Kraịst ‘si n’okwukwe dapụ.’ E mere ka ha “chigharịa gaa n’akụkọ ụgha.”—1 Timoti 4:1-3; 2 Timoti 4:3, 4.

Akwụkwọ bụ́ The New Dictionary of Theology na-ekwu na ka ọ na-erule narị afọ nke anọ O.A., “Iso Ụzọ Kraịst Katọlik ghọrọ . . . okpukpe nke Alaeze Ukwu Rom.” E nwere “njikọ nke okpukpe na ndị na-achị achị”—njikọ nke Chọọchị na ọchịchị bụ́ nke megidere nnọọ nkwenkwe nke Ndị Kraịst oge mbụ. (Jọn 17:16; Jems 4:4) Otu akwụkwọ ahụ na-ekwu na ka oge na-aga, a gbanwere ọdịdị nke chọọchị ahụ kpam kpam, gbanweekwa ọtụtụ n’ime nkwenkwe ya ndị bụ́ isi n’ụzọ dị egwu “site ná njikọ na-ekwesịghị ekwesị na nke e ji nlezianya jikọọ ozizi A[gba] Ọ[hụrụ] na nke nkà mmụta Plato nke ọgbara ọhụrụ.” Dị ka Jizọs Kraịst buru n’amụma, ezi ndị na-eso ụzọ ya pụrụ n’anya ka Ndị Kraịst adịgboroja mụbara.

Ndị na-ege Jizọs ntị maara otú o si esi ike ịmata ọdịiche dị n’etiti ezigbo ọka wit na ata, dị ka ụdị ata na-egbu mmadụ a na-akpọ darnel, bụ́ nke na-eyi nnọọ ọka wit mgbe ọ na-eto. N’ihi ya, Jizọs nọ na-akọwa na ruo oge ụfọdụ, ọ ga-esi ike ịmata ezi Ndị Kraịst n’etiti ndị nke adịgboroja. Nke a apụtaghị na ọgbakọ Ndị Kraịst kwụsịrị ịdị adị, n’ihi na Jizọs kwere nkwa ịnọgide na-eduzi ụmụnna ime mmụọ ya “ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20) Jizọs kwuru na ọka wit ahụ ga-anọgide na-eto. N’agbanyeghị nke ahụ, ruo ọtụtụ narị afọ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ezi Ndị Kraịst—n’otu n’otu ma ọ bụ n’ìgwè—mere ike ha nile ịgbaso ozizi nke Kraịst. Ma ha abụghịzi otu òtù, ma ọ bụ nzukọ gbapụrụ iche a na-ahụ anya. N’ezie, ha adịghị ka okpukpe si n’ezi ofufe dapụ ndị a na-ahụ anya, bụ́ ndị nanị ihe ha nọworo na-eme kemgbe ụwa bụ iwetara aha Jizọs Kraịst nkọcha.—2 Pita 2:1, 2.

‘E Kpughee Onye ahụ Na-emebi Iwu’

Pọl onyeozi buru ihe ọzọ a ga-eji mata okpukpe adịgboroja ndị a n’amụma. O dere, sị: “Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na [ụbọchị Jehova agaghị] abịa ọ gwụla ma ndapụ n’ezi ofufe ahụ ò bu ụzọ bịa, e kpugheekwa onye ahụ na-emebi iwu.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:2-4) ‘Onye a na-emebi iwu’ adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị òtù ndị ụkọchukwu bụ́ ndị na-ebuli onwe ha gaa n’ọnọdụ nke ịchị ọgbakọ “Ndị Kraịst.” *

Ndapụ n’ezi ofufe ahụ malitere n’oge Pọl onyeozi. Ọ mụbawanyere n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ozugbo ndịozi ahụ nwụsịrị, mgbochi ha na-egbochi ya akwụsịkwa. Pọl kwuru na ihe a ga-eji mata ya bụ “ịrụ ọrụ nke Setan . . . , na-eji ọrụ ọ bụla dị ike na ihe ịrịba ama na ihe àmà dị ebube nke ụgha, jirikwa aghụghọ ajọ omume.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:6-12) Lee ka nke ahụ si nnọọ na-akọwa ọrụ nke ọtụtụ ndị ndú okpukpe nọworo na-arụ kemgbe ụwa!

Iji kwado nzọrọ ha na Okpukpe Roman Katọlik bụ otu ezi chọọchị ahụ, ndị ndú Katọlik kwuru na ndị bishọp ha ‘na ndịozi mbụ ahụ nwere njikọ site n’usoro nnọchi bụ́ nke malitere n’oge ndịozi.’ N’eziokwu, nzọrọ ha nke ịnọchi ndịozi enweghị ihe ndabere n’akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ n’Akwụkwọ Nsọ. E nweghị ezi ihe àmà ọ bụla na-egosi na ọ dị mgbe mmụọ nsọ Chineke duziri chọọchị ndị malitere ịdị mgbe ndịozi Jizọs nwụsịrị.—Ndị Rom 8:9; Ndị Galeshia 5:19-21.

Gịnịkwanụ banyere chọọchị ndị ọzọ pulitere ka ero mgbe ihe ahụ a sị na ọ bụ oge Ndozigharị gasịrị? Hà gbasoro ụkpụrụ e ji mee ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ ahụ? Hà mere ka ọgbakọ Ndị Kraịst dịghachi ọcha dị ka ọ dị n’oge mbụ ahụ? N’eziokwu, mgbe Ndozigharị ahụ gasịrị, ọtụtụ ndị nkịtị bịara nwee Bible n’asụsụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, akụkọ ihe mere eme na-egosi na chọọchị dị iche iche nọgidere na-akụzi nkwenkwe ụgha. *Matiu 15:7-9.

Otú ọ dị, rịba nke a ama. Jizọs Kraịst kwuru hoo haa na a ga-eweghachi otu ezi ọgbakọ n’oge ọ kpọrọ ngwụsị nke usoro ihe. (Matiu 13:30, 39) Mmezu nke amụma dị iche iche nke Bible na-egosi na anyị bi n’oge ahụ ugbu a. (Matiu 24:3-35) Ebe nke ahụ bụ eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ, sị, ‘Olee nke bụ́ otu ezi chọọchị ahụ?’ O kwesịrị ịpụtawanye ìhè ma dịwanye mfe mmata.

Eleghị anya ị na-eche na ị chọtawo chọọchị, ma ọ bụ ọgbakọ ahụ. Ọ dị mkpa ka i jide n’aka na i mewo otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, a pụrụ inwe nanị otu ezi chọọchị. Ì wepụtawo oge iji jide n’aka na chọọchị gị na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ setịpụrụ nakwa na o ji iguzosi ike n’ihe na-agbaso ozizi ndị Jizọs Kraịst ziri? Gịnị ma i nyochaa nke a ugbu a? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ime nke ahụ kpọmkwem.—Ọrụ 17:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 A pụrụ ịchọtakwu ihe ọmụma banyere otú e si amata “onye ahụ na-emebi iwu” n’Ụlọ Nche nke February 1, 1990, peeji nke 10-14.

^ par. 20 Lee isiokwu bụ́ “Ọdịnihu Okpukpe Site n’Ileba Anya n’Oge Ya Gaworo Aga—Okpukpe Ndị Protestant Ọ̀ Bụ Mgbanwe Usoro?” nke dị na Teta! October 8, 1991 peeji nke 17-21.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Gịnị ka ihe atụ Jizọs nke ọka wit na ata ahụ na-akụziri anyị banyere ezi ọgbakọ ahụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Chọọchị gị ọ̀ na-agbaso ụkpụrụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ setịpụrụ n’ime nkwusa na n’ịmụ ihe?