Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Too Jehova ‘n’Etiti Mkpọkọta Ya’

Too Jehova ‘n’Etiti Mkpọkọta Ya’

Too Jehova ‘n’Etiti Mkpọkọta Ya’

NZUKỌ Ndị Kraịst bụ ndokwa Jehova mere iji mee ka ndị ya gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ. Site n’ịdị na-agachi nzukọ anya, anyị na-egosipụta ekele anyị nwere maka ndokwa ndị Jehova na-eme. Ọzọkwa, ọ na-enyere anyị aka ‘ịkpali ụmụnna anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ’ nke bụ́ ụzọ dị mkpa isi gosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ. (Ndị Hibru 10:24; Jọn 13:35) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi kpalie ụmụnna anyị ná nzukọ?

Mee Nkwupụta Ihu Ọha

Eze Devid dere banyere onwe ya, sị: “Aga m akọrọ ụmụnne m aha Gị: n’etiti mkpọkọta Gị ka m ga-eto Gị. N’ebe Ị nọ ka otuto m si bịa n’ime mkpọkọta Gị bara ụba.” “M ga-ekele Gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti ndị nwere ume ka m ga-eto Gị.” “Ezisawo m ozi ọma nke ezi omume n’ime mkpọkọta Gị bara ụba; lee, adịghị m egbochi egbugbere ọnụ m abụọ.”—Abụ Ọma 22:22, 25; 35:18; 40:9.

N’otu aka ahụ, n’oge Pọl onyeozi, mgbe Ndị Kraịst zukọtara maka ofufe, ha mere nkwupụta ihu ọha nke okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ na banyere ebube ya. N’ụzọ dị otú a, ha gbarịtara ibe ha ume ma kpalirịta ibe ha ịhụ n’anya na ịrụ ezi ọrụ. N’oge anyị, ọtụtụ narị afọ ka ma Devid ma Pọl nwụsịrị, anyị “na-ahụ ụbọchị [Jehova] ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Usoro ihe Setan ji nke nta nke nta eru mbibi nso, nsogbu nọgidekwara na-arịwanye elu. “Ntachi obi dị [anyị] mkpa” ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Ndị Hibru 10:36) Olee ndị pụrụ ịgba anyị ume ịtachi obi ma e wezụga ụmụnna anyị?

Taa, dịkwa ka ọ dị n’oge ochie, e mewo ndokwa ka ndị kwere ekwe n’otu n’otu na-ekwupụta okwukwe ha ‘n’etiti mkpọkọta Jehova.’ Otu ohere mmadụ nile nwere bụ ịza ajụjụ ndị a na-ajụ ndị na-ege ntị ná nzukọ ọgbakọ. Ya adịla mgbe ị ga-eleda ezi ihe nke a pụrụ ịrụpụta anya. Dị ka ihe atụ, azịza ndị na-egosi otú e si emeri ma ọ bụ otú e si ezere nsogbu dị iche iche na-eme ka mkpebi ụmụnna anyị ịgbaso ụkpụrụ Bible sikwuo ike. Azịza ndị na-akọwa akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha a na-ehotaghị ehota, ma ọ bụ ndị na-agụnye echiche ndị e nwetara mgbe a na-eme nchọpụta onwe onye pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịzụlite àgwà ọmụmụ ihe ka mma.

Ịmata na anyị na ndị ọzọ ga-erite uru ma ọ bụrụ na anyị azaa ajụjụ ná nzukọ kwesịrị ịkwali Ndịàmà Jehova nile imeri ihere. Ọ dị mkpa karịsịa ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-aza ajụjụ ná nzukọ ebe ọ bụ na a na-atụ anya ka ha na-ebute ụzọ n’ikere òkè ná nzukọ ọgbakọ, nakwa n’ịbịachi nzukọ anya. Otú ọ dị, olee otú mmadụ pụrụ isi meziwanye ihe ma ọ chọpụta na akụkụ a nke ọrụ ya dị ka Onye Kraịst na-esiri ya ike?

Aro Maka Imeziwanye Ihe

Cheta na o metụtara Jehova. Otu nwanna nwanyị Onye Kraịst nke bi na Germany kọwara otú o si ele azịza ndị ọ na-aza anya. “Ha bụ azịza nke m nye mgbalị Setan igbochi ndị nke Chineke ikwupụta okwukwe ha.” Otu onye e mere baptizim ọhụrụ nke nọkwa n’otu ọgbakọ ahụ kwuru, sị: “A bịa n’ịza ajụjụ, ana m ekpe ekpere ọtụtụ ugboro.”

Kwadebe nke ọma. Ọ bụrụ na ị mụghị isiokwu a ga-amụ tupu oge eruo, ọ ga-esiri gị ike ịza ajụjụ, azịza gị agaghịkwa adịcha irè. A tụrụ aro banyere otú a ga-esi na-aza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 70. *

Setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịza otu ajụjụ ma ọ dịkarịa ala. Nke a pụtara na ị ga-akwadebe ihe karịrị otu azịza ebe ọ bụ na ka ị na-eweli aka ọtụtụ ugboro, otú a ka o yikarịrị ka nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe ọ̀ ga-akpọ gị. Ị pụkwara ịgwa ya ajụjụ ndị ị chọrọ ịza tupu oge eruo. Nke a ga-enye aka karịsịa ma ọ bụrụ na ị bụ onye ka na-amalite amalite. Ebe ọ bụ na ị pụrụ ịdị na-ala azụ n’iweli aka ‘ná mkpọkọta bara ụba,’ ịmata na nke ahụ bụ paragraf nke gị, nakwa na nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ ga na-ele anya ịhụ aka gị ga-agba gị ume ịza ajụjụ.

Zaa ajụjụ ná mmalite. Iyigharị ọrụ siri ike adịghị eme ka ọrụ ahụ dị mfe. Ịza ajụjụ ná mmalite nke nzukọ pụrụ inye aka. Ị ga-ahụ otú ọ ga-esi dịrị gị mfe karị ịza ajụjụ nke ugboro abụọ ma ọ bụ nke ugboro atọ ozugbo i jisiri ike zaa nke mbụ.

Nọrọ ọdụ n’ebe kwesịrị ekwesị. Ọ na-adịrị ụfọdụ ndị mfe karị ịza ajụjụ ma ha nọrọ n’oche ihu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. A dịghị enwekarị ihe ndọpụ uche, o yikarịkwaghị ka onye na-eduzi ọmụmụ ihe ọ̀ ga-eleghara ha anya. Ọ bụrụ na ị nwalee nke a, cheta kwusie okwu ike ka mmadụ nile nwee ike ịnụ ihe ị na-ekwu, karịsịa ma ọ bụrụ na ọgbakọ ahụ enweghị ígwè okwu e ji agagharị agagharị.

Gee ntị nke ọma. Nke a ga-enyere gị aka izere ikwughachi ihe onye ọzọ kwuru. Ọzọkwa, azịza ndị ọzọ nyere pụrụ ichetara gị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ otu isi ihe nke pụrụ ime ka echiche dị n’azịza ahụ a ka zapụrụ pụtakwuo ìhè. Mgbe ụfọdụ, ahụmahụ dị mkpirikpi pụrụ igosipụta ihe a na-ekwu. Azịza ndị dị otú ahụ bara uru nke ukwuu.

Mụta ịza ajụjụ n’okwu nke aka gị. Ịgụpụta azịza site n’akwụkwọ ahụ a na-amụ pụrụ igosi na ị chọtawo nke bụ́ azịza ziri ezi, ọ pụkwara ịbụ ụzọ kasị mma isi malite ịza ajụjụ. Ma, ito eto ruo n’ókè nke ịza ajụjụ n’okwu nke aka gị na-egosi na ị ghọtara isi ihe a na-ekwu. Ọ dịghị mkpa ịgụpụtaghachi ihe ndị dị n’akwụkwọ anyị kpọmkwem dị ka e sị dee ha. Ndịàmà Jehova adịghị ekwughachi nnọọ ihe akwụkwọ ha kwuru.

Ahapụla ihe a na-atụle. Inye azịza ndị na-emetụtaghị isiokwu a na-amụ, ma ọ bụ nke dị iche n’isi ihe a na-atụle ekwesịghị ekwesị. Nke a pụtara na azịza gị kwesịrị ikwekọ n’isiokwu a na-atụle. Mgbe ahụ, ha ga-atụnye ụtụ ná ntụle na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ nke isiokwu ahụ.

Buru ịgba ndị ọzọ ume n’uche. Ebe ọ bụ na otu isi ihe mere anyị ji aza ajụjụ bụ iji gbaa ndị ọzọ ume, anyị aghaghị ịgbalị izere ikwu ihe ndị ga-akụda ha mmụọ. Ọzọkwa, azachala ihe nile dị na paragraf nke na ọ dịghịzi ihe ga-afọdụrụ ndị ọzọ ikwu. Azịza ndị toro ogologo ma ọ bụ ndị na-edochaghị anya pụrụ ime ka a ghọtahie ihe ha pụtara. Azịza ndị dị mkpirikpi, ndị gụnyere nanị okwu ole na ole pụrụ ịdị nnọọ irè, ha ga-emekwa ka ndị ọhụrụ nwee ike ịza ajụjụ dị mkpirikpi.

Ọrụ Dịịrị Ndị Na-eduzi Nzukọ

Onye na-eduzi nzukọ nwere ibu ọrụ dị ukwuu ma a bịa n’ihe banyere ịgba ume. Ọ na-egosi ezi mmasị n’azịza nke ọ bụla site n’ige ntị nke ọma na iji nkwanye ùgwù na-elegide onye ahụ na-aza ajụjụ anya kama ịdị na-eme ihe ọzọ. Lee otú ọ na-agaghị esi kwesị ekwesị ya ikwughachi nnọọ ihe mmadụ kwupụrụ ma ọ bụ ịjụghachi ajụjụ a ka zapụrụ n’ihi na o geghị ntị nke ọma!

Ọ ga-abụ ihe na-akụda mmụọ ma onye nduzi na-ekwughachi mgbe nile ihe dịtụ iche n’azịza onye ọzọ nyere, dị ka à ga-asị na a zatachaghị ajụjụ ahụ. N’aka nke ọzọ, lee ihe na-agba ume ọ bụ mgbe azịza ndị e nyere mere ka e kwukwuo okwu n’isi ihe dị mkpa. ‘Olee otú anyị pụrụ isi tinye nke a n’ọrụ n’ọgbakọ anyị?’ ma ọ bụ, ‘Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị na paragraf a nke kwadoro ihe a e kwuru ugbu a?’ bụ ụdị ajụjụ ndị na-eme ka e nye azịza ndị dị mma, bụ́ ndị na-atụnye ụtụ bara uru n’ihe a na-atụle.

N’ezie, e kwesịrị nnọọ ịja ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-eme ihere mma ma ha zaa ajụjụ. Onye nduzi pụrụ ime nke a mgbe nanị ya na ha na-ekwurịta okwu iji zere imechu ha ihu na iji nwee ike ịtụ aro mgbe o kwesịrị ekwesị.

Ná mkparịta ụka nkịtị, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ nanị ya na-ekwu okwu adịghị akwalite nkwurịta okwu. Ndị na-ege ya ntị na-ewere ya na ọ dịghị mkpa ikwupụta echiche ha. Ha adịghị eji obi ha nile ege ntị ma ọ bụrụdị na ha na-ege ege. Ihe yiri nke a pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye nduzi na-ekwucha ihe nile nanị ya site n’ikwu okwu ọtụtụ mgbe. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, onye na-eduzi nzukọ pụrụ ịchọ ịmata echiche ndị na-ege ntị ma kpalie ha iche echiche site n’ịjụ ajụjụ ntụkwasị. E kwesịghị ịdị na-eji ajụjụ ntụkwasị ndị dị otú ahụ eme ihe mgbe nile.

Ọ bụghị iwu na onye nduzi ahụ ga-akpọrịrị onye bu ụzọ welie aka. Nke a pụrụ ịkụda mmụọ nke ndị ọ na-ewetụ oge iji chepụta ihe ha ga-aza n’okwu nke aka ha. Site n’icheretụ nke nta, ọ ga-enye onye na-azabeghị ajụjụ ohere ịza. Ọ ga-egosikwa nghọta site n’ịhapụ ịjụ ụmụaka ajụjụ n’isiokwu ndị karịrị ha.

Gịnị ma ọ bụrụ na a zataghị ajụjụ ahụ? Onye nduzi ahụ kwesịrị izere imechu onye zara ajụjụ ahụ ihu. Azịza ọ bụla, a sịgodị na o zighị ezi, nwere eziokwu dị n’ime ya. Site n’iji akọ họrọ ihe ziri ezi n’azịza ahụ, site n’ịjụ ajụjụ ahụ n’ụzọ ọzọ, ma ọ bụ site n’ịjụ ajụjụ ntụkwasị, onye nduzi ahụ pụrụ ịgbazi azịza ahụ n’emechughị onye zara ya ihu.

Iji gbaa ndị na-ege ntị ume ịza ajụjụ, onye na-eduzi nzukọ kwesịrị izere ịjụ ajụjụ ndị dị ka, ‘Ọ̀ dị onye ọzọ nwere ihe ọ ga-ekwu?’ Ị pụrụ ibu ezi ihe n’obi jụọ ajụjụ dị ka, ‘Olee onye na-azabeghị ajụjụ? Nke a bụ ohere ikpeazụ i nwere!’ ma ọ gaghị akwali mmadụ ikwupụta echiche ya ma ọlị n’ihu ọha. E kwesịghị ime ka ụmụnna nwee obi amamikpe na ha azaghị ajụjụ ná mmalite nke ọmụmụ ihe. Kama nke ahụ, e kwesịrị ịgba ha ume isoro ibe ha kerịta ihe ha maara n’ihi na isoro ndị ọzọ kerịta ihe bụ ngosipụta nke ịhụnanya. Tụkwasị na nke ahụ, mgbe onye nduzi kpọrọ mmadụ ịza ajụjụ, o kwesịghị ikwu, sị, “Onye a zachaa, anyị ga-ege Nwanna dị otú a nakwa Nwanna Nwanyị dị otú a ntị ịza.” Onye nduzi ahụ kwesịrị ibu ụzọ gee ntị n’azịza ahụ, mgbe ahụ kpebizie ma azịza ọzọ ọ dị mkpa.

Ịza Ajụjụ Bụ Ihe Ùgwù

Ịga nzukọ Ndị Kraịst bụ ihe dị mkpa n’ụzọ ime mmụọ; ịza ajụjụ na ha bụ ihe ùgwù. Ruo n’ókè anyị na-ekere òkè n’ito Jehova n’ụzọ a pụrụ iche ‘n’etiti mkpọkọta ya,’ ruo n’ókè ahụ ka anyị na-agbaso ihe nlereanya Devid ma na-aṅa ntị na ndụmọdụ Pọl. Òkè anyị na-ekere ná nzukọ dị iche iche na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, nakwa na anyị bụ akụkụ nke ọgbakọ Jehova buru ibu. Olee ebe ọzọ ị ga-achọ ịnọ “ka [ị] na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-abịaru nso”?—Ndị Hibru 10:25.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ma ige ntị ma ịza ajụjụ dịcha mkpa ná nzukọ Ndị Kraịst

[Foto dị na peeji nke 21]

Onye nduzi na-egosi ezi mmasị n’azịza nke ọ bụla