Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka inwe “ndụ n’ime onwe ya” pụtara?

Bible na-ekwu banyere Jizọs Kraịst dị ka onye nwere “ndụ n’ime onwe ya” na ndị na-eso ụzọ ya dị ka ndị nwere ‘ndụ n’ime onwe ha.’ (Jọn 5:26; 6:53) Otú ọ dị, akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ ndị a apụtaghị otu ihe.

“Dị nnọọ ka Nna m nwere ndụ n’ime onwe ya,” ka Jizọs kwuru, “otú ahụ ka o meworo ka Ọkpara ya nwee ndụ n’ime onwe ya.” Tupu Jizọs ekwuo okwu a dị ịrịba ama, ọ sịrị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye na-anụ okwu m ma na-ekwere onye ahụ nke zitere m nwere ndụ ebighị ebi . . . Oge awa na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ṅawokwara ntị ga-adị ndụ.” N’ebe a, Jizọs na-ezo aka n’ike pụrụ iche nke Nna ya nyere ya—ike nke ime ka ụmụ mmadụ nweta nguzo dị mma n’ihu Chineke. Ọzọkwa, Jizọs nwere ike ịkpọlite ndị nọ n’ụra ọnwụ ma nye ha ndụ. Nye Jizọs, inwe “ndụ n’ime onwe ya” pụtara na e nyere ya ike ndị a. Dị ka Nna ya, Ọkpara ahụ nwekwara ‘onyinye nke ndụ n’ime onwe ya,’ bụ́ otú ọzọ a pụkwara isi sụgharịa okwu ahụ. (Jọn 5:24-26) Gịnị banyere ndị na-eso ụzọ ya?

Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ọ gwụla ma ùnu riri anụ ahụ́ nke Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu. Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 6:53, 54) N’ebe a, Jizọs gosiri na inwe “ndụ n’ime onwe unu” na inweta “ndụ ebighị ebi” bụ otu ihe. A na-achọta okwu ndị ọzọ a hazikwara ụtọ asụsụ ha dị ka nke inwe “ndụ n’ime onwe unu” n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Abụọ n’ime ha bụ, “Nweenụ nnu n’ime onwe unu” na “na-enweta n’ime onwe ha nkwụghachi ụgwọ zuru ezu.” (Mak 9:50; Ndị Rom 1:27) N’ebe ndị a, ahịrịokwu ndị ahụ adịghị enye echiche nke ike ime ka ndị ọzọ nwee nnu ma ọ bụ ịkwụghachi onye ọ bụla ụgwọ. Kama nke ahụ, ọ na-egosi izu ezu n’ime. N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “ndụ n’ime onwe unu” nke e ji mee ihe na Jọn 6:53 pụtara nanị inweta ndụ zuru nnọọ ezu.

N’izo aka n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ dị ka ndị nwere ndụ n’ime onwe ha, Jizọs kwuru banyere anụ ahụ́ na ọbara ya. Ka e mesịrị, mgbe ọ na-eguzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jizọs kwukwara ọzọ banyere anụ ahụ́ na ọbara ya ma gwa ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị na-aga ịba n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka ha rie ihe nnọchianya nke achịcha na-ekoghị eko na mmanya. Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ nanị Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ha na Jehova Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ga-enweta ndụ zuru ezu dị otú ahụ? Ee e. Jizọs kwuru okwu nke abụọ ahụ otu afọ ka o kwusịrị nke mbụ ahụ. Ndị nụrụ okwu Jizọs e dekọrọ na Jọn 6:53, 54 amaghị banyere ememe a na-eme kwa afọ nke a na-eji ihe nnọchianya nke ahụ́ na ọbara Kraịst eme ihe na ya.

Dị ka Jọn isi 6 si kwuo, Jizọs bu ụzọ jiri ahụ́ ya tụnyere mana, na-asị: “Ndị nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma, n’agbanyeghị nke ahụ, nwụọkwa. Nke a bụ achịcha ahụ nke si n’eluigwe abịa, ka onye ọ bụla wee rie ya ma ghara ịnwụ. Abụ m achịcha ahụ dị ndụ nke si n’eluigwe bịa; ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Ahụ́ Jizọs na ọbara ya karịrị mana nkịtị. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na e nyere ahụ́ ya maka “ndụ nke ụwa,” na-eme ka ndụ ebighị ebi kwe omume. * Ya mere, ihe ahụ e kwuru banyere inwe “ndụ n’ime onwe unu” dị na Jọn 6:53 bụ maka ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi—n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.—Jọn 6:48-51.

Olee mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enweta ndụ n’ime onwe ha, ma ọ bụ ndụ zuru ezu? Nye ndị nketa Alaeze e tere mmanụ, nke a na-eme mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe dị ka ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ. (1 Ndị Kọrint 15:52, 53; 1 Jọn 3:2) “Atụrụ ọzọ” Jizọs ga-enweta ndụ zuru ezu n’ọgwụgwụ Ọchịchị Puku Afọ ya. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, a ga-eleworị ha ule, chọpụta na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ha abụrụkwa ndị a gụrụ ná ndị ezi omume maka ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs.—Jọn 10:16; Mkpughe 20:5, 7-10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’ala ịkpa ahụ, mana dị ma ndị Izrel ma “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” mkpa iji dị ndụ. (Ọpụpụ 12:37, 38; 16:13-18) N’otu aka ahụkwa, iji dị ndụ ebighị ebi, Ndị Kraịst nile, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na ha abụghị, aghaghị inweta mana ahụ si n’eluigwe site n’inwe okwukwe n’ikike mgbapụta nke anụ ahụ́ na ọbara Jizọs bụ́ ndị e ji chụọ àjà.—Lee Ụlọ Nche nke April 15, 1988, peeji nke 30-31.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ezi Ndị Kraịst nile pụrụ inwe ‘ndụ n’ime onwe ha’