Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Pụrụ Inyere Alụmdi na Nwunye Gị Aka

Bible Pụrụ Inyere Alụmdi na Nwunye Gị Aka

Bible Pụrụ Inyere Alụmdi na Nwunye Gị Aka

ALỤMDI NA NWUNYE—nye ọtụtụ ndị, okwu ahụ na-enye obi ụtọ. Nye ndị ọzọ, ọ na-eweta obi mgbawa. “Ọ na-adị m ka m bụ onye a gbara alụkwaghịm,” ka otu nwunye kwara n’arịrị. “Ọ na-adị m mgbe nile ka m bụ onye e leghaara anya na onye owu na-ama.”

Gịnị na-eme ka mmadụ abụọ kweburu nkwa na ha ga-ahụ onwe ha n’anya ma na-elekọta onwe ha ghọọ nnọọ ndị na-ahụkwaghị onwe ha n’anya? Otu ihe kpatara ya bụ na ha amụtaghị ihe alụmdi na nwunye gụnyere. “Anyị na-abanye n’alụmdi na nwunye n’enwetatụghị ọzụzụ,” ka otu odeakụkọ ihe metụtara ahụ́ ike kwuru.

Otu nchọpụta nke Ngalaba Atụmatụ Alụmdi na Nwunye Mba, bụ́ òtù nnyocha nke Mahadum Rutgers dị na New Jersey, U.S.A., mere, na-egosi na ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ihe ọmụma banyere alụmdi na nwunye. “Ọ bụ ndị nne na nna na-enweghị obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha ma ọ bụ ndị gbara alụkwaghịm zụlitere ọtụtụ n’ime ndị e ji mee nnyocha a,” ka ndị duziri nnyocha ahụ kwuru. “Ha maara n’ezie ihe alụmdi na nwunye na-adịghị enye obi ụtọ bụ, ma ha ejichaghị n’aka ihe alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ bụ. Ụfọdụ pụrụ nanị ịkọwa alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ dị ka ‘ihe dị iche na nke ndị mụrụ m.’”

À gụpụrụ Ndị Kraịst ná nsogbu ndị a na-enwe n’alụmdi na nwunye? Ee e. N’ezie, ọ dị ụfọdụ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ mkpa ka e nye ha ndụmọdụ a kapịrị ọnụ ka ha “kwụsị ịchọ ntọhapụ” n’alụmdi na nwunye ha. (1 Ndị Kọrint 7:27) N’ụzọ doro anya, alụmdi na nwunye nke mmadụ abụọ na-ezughị okè ga-enwerịrị nsogbu nke ya, ma anyị nwere ihe inyeaka. Ndị di na ndị nwunye pụrụ ime ka mmekọrịta ha ka mma site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

N’eziokwu, Bible abụghị akwụkwọ nduzi alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na o sitere n’aka Onye malitere ndokwa alụmdi na nwunye, anyị pụrụ ịtụ anya na ụkpụrụ ndị dị na ya ga-enye aka. Jehova Chineke kwuru site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.

Ịhụnanya dịbu n’etiti gị na onye òtù ọlụlụ gị ọ̀ malitewo ịjụ oyi? Ọ̀ na-adị gị ka ị tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ? Otu onye bụworo nwunye ruo afọ 26 kwuru, sị: “Ọ pụrụ isi nnọọ ike ịkọwa ihe mgbu a na-enweta n’ụdị mmekọrịta a. Ọ dịghị akwụsị akwụsị.” Kama ịnakwere alụmdi na nwunye na-adịghị enye obi ụtọ, gịnị ma i kpebie ime ihe banyere ya? Isiokwu na-esonụ ga-egosi ndị di na ndị nwunye otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere ha aka n’alụmdi na nwunye ha n’otu akụkụ kpọmkwem—nke bụ́ mkpebi siri ike.