Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Iwu Onye Maara Ihe”—Isi Iyi nke Ndụ

“Iwu Onye Maara Ihe”—Isi Iyi nke Ndụ

“Iwu Onye Maara Ihe”—Isi Iyi nke Ndụ

“LEE ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke! Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta!” ka Pọl onyeozi kwuru. (Ndị Rom 11:33) Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job kwuru, sị: “[Jehova Chineke] nwere obi nke maara ihe.” (Job 9:4) Ee, amamihe nke Onye Okike nke eluigwe na ala enweghị atụ. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere iwu, ma ọ bụ Okwu e dere ede, nke Onye Okike dị otú ahụ?

Onye ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi. Ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ; ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè.” (Abụ Ọma 19:7, 8) Lee ka Eze Solomọn nke Izrel oge ochie ga-esiworị ghọta eziokwu nke okwu ndị ahụ! Ọ sịrị: “Iwu onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe gị.” (Ilu 13:14) N’amaokwu 13 ndị bu ụzọ n’Ilu isi 13, Solomọn gosiri ụzọ ndụmọdụ ndị dị n’Okwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka ime ka ọdịdị nke ndụ anyị ka mma ma zere itinye ya n’ihe ize ndụ.

Bụrụ Onye A Pụrụ Izi Ihe

“Nwa nke maara ihe na-anụ ịdọ aka ná ntị nna ya, ma onye na-akwa emo anụghị ịbasi mba ike,” ka Ilu 13:1 na-ekwu. Ịdọ aka ná ntị si n’aka nna pụrụ ịdị nro ma ọ bụ sie ike. Ọ pụrụ ịbịa n’ụdị ọzụzụ na mbụ, ma ọ bụrụ na a jụ ya, ya abịa dị ka ntaramahụhụ n’ikpeazụ. Nwa na-abụ onye maara ihe mgbe ọ na-anara ịdọ aka ná ntị nna ya.

“Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị,” ka Bible na-ekwu, ọzọ, “ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara dị ka nwa ya ihe.” (Ndị Hibru 12:6) Otu ụzọ Nna anyị nke eluigwe si adọ anyị aka ná ntị bụ site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible. Mgbe anyị ji nkwanye ùgwù na-agụ Bible ma na-etinye ihe ndị anyị na-amụta n’ime ya n’ọrụ, Okwu ya n’ezie na-adọ anyị aka ná ntị. Nke a bụ maka ọdịmma anyị, n’ihi na ihe nile Jehova kwuru bụ maka abamuru anyị.—Aịsaịa 48:17.

Ịdọ aka ná ntị pụkwara ịbịara anyị dị ka mgbazi nke si n’aka onye kwere ekwe ibe anyị nwere mmasị n’ọdịmma ime mmụọ anyị. Okwu ndụmọdụ ọ bụla bara uru nke kwekọrọ n’Okwu Chineke bụ nke a pụrụ ile anya, ọ bụghị dị ka nke sitere n’aka onye ahụ, kama dị ka nke sitere n’aka Isi Iyi ukwu nke eziokwu. Anyị ga-abụ ndị mara ihe ịnara ya dị ka nke sitere n’aka Jehova. Mgbe anyị mere nke ahụ ma kwe ka ọ kpụzie echiche anyị, ka o mee ka anyị ghọtakwuo Akwụkwọ Nsọ, nakwa ka ọ gbazie ụzọ anyị, anyị na-erite uru site n’ịdọ aka ná ntị. Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere ndụmọdụ anyị na-anata ná nzukọ Ndị Kraịst na site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ime ihe banyere ihe ndị anyị na-amụta site n’okwu ndị ahụ e dere ede ma ọ bụ e kwuru ekwu bụ ụdị ọzụzụ onwe onye magburu onwe ya.

N’aka nke ọzọ, onye na-akwa emo adịghị eme ihe banyere ịdọ aka ná ntị. “N’ihi na ọ na-eche na ọ maara ihe kasị mma,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, ọ “bụghị onye a pụrụ izi ihe.” Ọ naghị eme ihe banyere mba a basiiri ya ike—ụdị ịdọ aka ná ntị nke siri ike karị. Ma ọ̀ pụrụ igosi na ịdọ aka ná ntị Nna ya ezighị ezi? Jehova emetụbeghị ihe na-ezighị ezi, ọ gaghị emekwanụ. Site n’ịjụ ịdọ aka ná ntị, onye na-akwa emo na-eme onwe ya ihe ịkwa emo. N’iji okwu ole na ole a họọrọ nke ọma mee ihe, lee ka Solomọn si gosi n’ụzọ mara mma uru ịbụ onye a pụrụ izi ihe bara!

Kwaa Ire Gị Nga!

Iji igosi ịdị mkpa nke ịbụ ndị Okwu Chineke na-eduzi n’okwu ọnụ ha, eze Izrel ji ọnụ tụnyere osisi na-amị mkpụrụ. Ọ na asị: “Site ná mkpụrụ nke ọnụ ya ka onye ọ bụla ga-eri ezi ihe, ma mkpụrụ obi ndị na-aghọgbu aghọgbu ga-eri ime ihe ike.” (Ilu 13:2) Mkpụrụ nke ọnụ bụ okwu e kwuru ekwu. Mmadụ na-aghọrọ mkpụrụ nke o ji okwu ọnụ ya kụọ. “Ọ bụrụ na okwu ọnụ ya bụ ndị o ji obiọma kwuo, bụ́ ndị o kwuru iji kwalite mmekọrịta enyi n’etiti ya na ndị agbata obi ya,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu, “ọ ga-eri ezi ihe, dị ndụ nke obi ụtọ na udo.” N’akụkụ nke onye na-aghọgbu aghọgbu, ọnọdụ ahụ dị iche. Ọ na-achọ ime ihe ike na imerụ ndị ọzọ ahụ́. Ọ na-akpa nkata ime ihe ike, ọ na-aghọtakwa mkpụrụ ya. Ọnyà nile nke ọnwụ dị n’ọnụ ụzọ ya.

“Onye na-eche ọnụ ya nche na-edebe ndụ ya,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu. “Onye na-asaghepụ egbugbere ọnụ ya abụọ, mbibi ga-adịrị ya.” (Ilu 13:3) Aha e mebiri emebi, mkpasu iwe, mmekọrịta e mebiri emebi, na ọbụna mmerụ ahụ́ nkịtị bụcha ihe okwu nzuzu a na-echeghị eche kwuo nwere ike ịrụpụta. Egbugbere ọnụ a saghepụrụ asaghepụ pụrụ ịkpatara anyị iwe Chineke, n’ihi na onye ọ bụla ga-aza Chineke ajụjụ banyere okwu ya. (Matiu 12:36, 37) N’ezie, iche ọnụ anyị nche ga-azọpụta anyị ná mbibi. Ma olee ụzọ anyị pụrụ isi mụta iche ọnụ anyị nche?

Otu ụzọ dị mfe isi mee nke a bụ ịghara ịdị na-ekwu ọtụtụ okwu. “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 10:19) Ụzọ ọzọ bụ iche echiche tupu anyị ekwuo okwu. Onye edemede ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” (Ilu 12:18) Mgbe a na-ebughị ụzọ chebara ihe a na-achọ ikwu echiche, a pụrụ ịkpatara ma onye na-ekwu okwu ma ndị na-ege ya ntị mwute. N’ihi ya, Bible na-enye anyị ndụmọdụ a dị ire: ‘Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.’—Ilu 15:28.

Bụrụ Onye Dị Uchu

“Ọ na-achọsi ike, ma ọ dịghị ihe o nwere, bụ́ mkpụrụ obi onye umengwụ,” ka Solomọn na-ekwu, “ma mkpụrụ obi nke ndị [dị uchu, NW], a ga-eme ka ọ maa abụba.” (Ilu 13:4) “Ihe [ilu a] na-arụtụ aka na ya bụ na ọchịchọ nkịtị bụ nnọọ ihe efu,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, “ihe dị mkpa bụ ịrụsi ọrụ ike. Ndị umengwụ bụ ndị ọchịchọ ha . . . na-eripịa, ha adịghịkwa enwe ihe ọ bụla ha na-arụpụta.” Ma otú ọ dị, mkpụrụ obi, ma ọ bụ ọchịchọ nke ndị dị uchu ka a ga-eme ka afọ ju—ka ha maa abụba.

Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ndị na-ala azụ ịrara onwe ha nye Jehova n’ihi na ha na-achọ izere ibu ọrụ? Ha pụrụ igosipụta onwe ha ịbụ ndị agụụ ibi ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke na-agụ, ma hà dị njikere ime ihe banyere ya? Otu ihe a chọrọ n’aka ndị “si n’oké mkpagbu ahụ na-apụta” bụ na ha ga-egosipụtawo okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs, rara onwe ha nye Jehova ma gosipụta nraranye ha site na baptizim ime mmiri.—Mkpughe 7:14, 15.

Tụleekwa ihe iru eru ịbụ onye nlekọta n’ọgbakọ gụnyere. Agụụ iru eru maka ezi ọrụ a bụ n’ezie ihe e kwesịrị ịja mma ma bụrụ nke Akwụkwọ Nsọ gbara ume ya. (1 Timoti 3:1) Otú ọ dị, mmadụ igosi agụụ ezi ọrụ ezughị. Iru eru maka otu ọnọdụ chọrọ ịzụlite agwa na ikike ndị dị mkpa. Nke ahụ chọrọ mmadụ iji ịdị uchu na-eme mgbalị.

Ezi Omume—Ihe Nchebe

Onye ezi omume na-azụlite àgwà nsọpụrụ Chineke ma na-ekwu eziokwu. Ọ na-achọpụta na ịgha ụgha megidere iwu Jehova. (Ilu 6:16-19; Ndị Kọlọsi 3:9) N’ihe banyere nke a, Solomọn kwuru, sị: “Okwu ụgha ka onye ezi omume na-akpọ asị, ma onye na-emebi iwu na-esi ísì, wee nwee ihu ihere.” (Ilu 13:5) Ihe onye ezi omume na-eme abụghị nanị izere ịgha ụgha; ọ kpọrọ ya asị n’ezie. Ọ maara na n’agbanyeghị otú o yiruru ka ọ dịghị ihe o mere, ụgha na-ebibi ezi mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ibe ya. Ọzọkwa, onye na-aghakarị ụgha na-abụ onye a na-apụghị ịtụkwasị obi. Onye na-emebi iwu na-esi ísì site n’ịgha ụgha ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, si otú a na-ebutere onwe ya ihu ihere.

Iji gosi na ime ihe dị mma n’anya Chineke bara uru, eze ahụ maara ihe kwuru, sị: “Ezi omume na-echebe onye zuru okè n’ụzọ, ma mmebi iwu na-eme ka onye mmehie kpuo ihu.” (Ilu 13:6) Dị ka ebe e wusiri ike, ezi omume na-echebe mmadụ, ebe mmebi iwu na-ebibi ya.

Emela Onwe Gị Ihe Ị Na-abụghị

N’igosi nghọta ọ ghọtara ọdịdị mmadụ, eze Izrel na-ekwu, sị: “O nwere onye na-eme onwe ya ọgaranya, ma ọ dịghị ihe ọ bụla o nwere; o nwere onye na-eme onwe ya ogbenye, ma akụ̀ ya bara ụba.” (Ilu 13:7) Mmadụ nwere ike ọ bụghị ihe o yiri ka ọ bụ. Ụfọdụ ndị ogbenye pụrụ ịdị na-eme ka hà bụ ọgaranya—eleghị anya iji mee oké ngosi, mee ka a ga-asị na ihe na-agaziri ha, ma ọ bụ iji chebe ùgwù ha. Onye ọgaranya pụrụ ime ka ọ̀ bụ ogbenye, nanị ka o wee zochie akụ̀ na ụba ya.

Ma mmadụ ime ka ọ̀ bụ ihe ọ na-abụghị ma ọ bụ mmadụ ikpuchi ihe ọ bụ adịghị mma. Ọ bụrụ na anyị enwechaghị ego, ibi ndụ okomoko, na-emefusị ego nanị iji mee ka anyị yie ndị nwere ego, pụrụ ime ka anyị na ndị ezinụlọ anyị ghara inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Mmadụ ime ka ọ̀ bụ ogbenye ebe o nwere akụ̀ na ụba pụrụ ime ya onye aka ntagide, na-anapụ onwe ya ùgwù ruuru ya na obi ụtọ a na-enweta site n’imesapụ aka. (Ọrụ 20:35) Ime ihe n’eziokwu na-eme ka mmadụ bie ụdị ndụ ka mma.

Achọla Oké Ihe

“Ihe mgbapụta nke ndụ onye ọ bụla bụ akụ̀ ya,” ka Solomọn na-ekwu, “ma ogbenye anụghị ịbasi mba ike.” (Ilu13:8) Olee ihe mmụta dị n’okwu amamihe a?

E nwere uru ndị dị n’ịba ọgaranya, ma inwe akụ̀ na ụba abụghị ngọzi kasịnụ. N’oge nsogbu ndị a anyị bi na ha, ndị ọgaranya na-ahụtakarị onwe ha na ndị ezinụlọ ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a tọọrọ ma jide iji nara ihe mgbapụta. Mgbe ụfọdụ, onye ọgaranya pụrụ ịkwụ ihe mgbapụta iji zụtaghachi ndụ ya ma ọ bụ nke onye ezinụlọ ya. Ma ọtụtụ mgbe, a na-egbu onye ahụ a tọọrọ. Ihe iyi egwu dị otú ahụ bụ ihe ndị ọgaranya na-eche ihu mgbe nile.

Onye ogbenye enweghị ụdị nchegbu ahụ. Ọ bụ ezie na o nwere ike ghara inwe ihe ndị na-eme ka ndụ dị ụtọ na ihe onwunwe ndị ọgaranya ji eme onwe ha obi ụtọ, o yikarịghị ka ndị ntọrọ mmadụ hà ga-elekwasị ya anya. Nke a bụ otu abamuru na-esite n’abụghị ndị na-achọ oké ihe na ndị ji oge na ume anyị nile na-achụso akụ̀ na ụba.—2 Timoti 2:4.

Ṅụrịa Ọṅụ ‘n’Ìhè’

Solomọn gakwara n’ihu igosi na ime ihe n’ụzọ Jehova bụ ihe kasị mma maka ọdịmma anyị. “Ìhè ndị ezi omume na-aṅụrị ọṅụ,” ka o kwuru, “ma oriọna ndị na-emebi iwu— ga-anyụ.”Ilu 13:9.

Oriọna bụ ihe atụ nke ihe anyị na-adabere na ya iji mee ka okporo ụzọ anyị nwee ìhè. ‘Okwu Chineke bụ oriọna dịịrị ụkwụ onye ezi omume, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ ya.’ (Abụ Ọma 119:105) O nwere ihe ọmụma na amamihe na-adịghị agwụ agwụ nke Onye Okike. Ka anyị na-aghọtakwu uche na nzube Chineke, otú ahụ ka ìhè ime mmụọ na-edu anyị na-enwusiwanye ike. Lee nnọọ ihe na-enye ọṅụ nke ahụ bụ! Gịnị mere amamihe ụwa ma ọ bụ ihe bụ́ “‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha” ga-eji dọpụ uche anyị?—1 Timoti 6:20; 1 Ndị Kọrint 1:20; Ndị Kọlọsi 2:8.

Ma n’akụkụ nke onye na-emebi iwu, n’agbanyeghị otú oriọna ya si yie ka ọ̀ na-enwusi ike na otú o si yie ka ọ̀ baruru n’ọgaranya, oriọna ya ga-anyụ. Ọ ga-emesị nọrọ n’ọchịchịrị, bụ́ ebe ọgwụ ga-akpọrịrị ya n’ụkwụ. Ọzọkwa, “ọdịnihu agaghị adịrị” ya.—Ilu 24:20.

Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe ọ na-edochaghị anyị anya ihe anyị kwesịrị ime n’otu ọnọdụ? Gịnị ma ọ bụrụ na anyị ejichaghị n’aka ma ànyị nwedịrị ikike ime ihe banyere ya? Ilu 13:10 na-adọ aka ná ntị, sị: “Nanị na nganga ka ịlụ ọgụ na-apụta.” Ime ihe n’ejighị ihe ọmụma ma ọ bụ ime ihe a na-enyeghị anyị ikike ime bụ nganga ma bụrụ ihe ga-ebuterịrị anyị na ndị ọzọ nsogbu. Ọ́ gaghị aka mma ijekwuru ndị ọzọ nwere ihe ọmụma na nghọta? “N’aka ndị a dụworo ọdụ ka amamihe dị,” ka eze ahụ maara ihe na-ekwu.

Lezie Anya Maka Atụmanya Ụgha

Ego pụrụ ịba uru. Inwe ego ka mma karịa ịnọ n’ụkọ ma ọ bụ ịbụ ogbenye. (Eklisiastis 7:11, 12) Otú ọ dị, ihe e chere na ọ bụ uru a na-enweta n’akụ̀ na ụba a kpatara n’ụzọ ọjọọ pụrụ ịbụ ihe na-eduhie eduhie. Solomọn dọrọ aka ná ntị, sị, “Akụ̀ nke sitere n’ihe efu ga-ebelata, ma onye ji aka ya achịkọta ihe ga-aba ụba.”Ilu 13:11.

Dị ka ihe atụ, tụlee ọnwụnwa nke ịgba chaa chaa. Onye na-agba chaa chaa nwere ike imefucha ego nile ọ tara ahụhụ kpata, na-enwe olileanya irite ego buru ibu. Ma lee otú nke a si abụkarị site n’ịchụ ọdịmma nke ezinụlọ ya n’àjà! Gịnịkwanụ ma onye ahụ gbara chaa chaa rite ego? Ebe ọ bụ na ọ dịịrị ya mfe inweta ego ahụ, ọ naghị ejikarị ya akpọrọ ihe. Ọzọkwa, o nwere ike ọ gaghị ama ihe ọ ga-eji ego ahụ o ritere mee. Ego ahụ ó yighị ka ọ̀ ga-agwụ ọsọ ọsọ n’otu ụzọ ahụ o si nweta ya? N’aka nke ọzọ, akụ̀ e ji nwayọọ kpakọta—nke nta nke nta site n’ịrụ ezi ọrụ—na-eji nwayọọ buo ibu ma bụrụ nke a pụrụ iji mee ihe bara uru.

“Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa,” ka Solomọn na-ekwu, “ma osisi nke na-enye ndụ ka ihe a na-achọsi ike bụ, mgbe ọ bịaruworo.” (Ilu 13:12) Atụmanya ndị a na-emezughị na-ebute ịda mbà n’obi nke na-eme ka obi na-arịa ọrịa. Nke a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ banyere atụmatụ ndị gbadosiri ụkwụ ike n’Okwu Chineke. Anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi siri ike na ha ga-emezu. Ọbụna ihe ndị yiri ịnọ ọdụ eyikarịghị ka hà ga-akpatara anyị ịda mbà n’obi.

Dị ka ihe atụ, anyị maara na ụwa ọhụrụ Chineke dị nso. (2 Pita 3:13) N’ịnụ ọkụ n’obi, anyị ji ọṅụ na-ele anya mmezu nkwa ndị a nke Chineke. Gịnị na-eme mgbe anyị ji oge nchere a na-arụsi ọrụ ike “n’ọrụ Onyenwe anyị,” na-agba ndị kwere ekwe ibe anyị ume, na-emekwa ka mmekọrịta anyị na Jehova chie anya karị? Kama ịbụ ndị ‘na-arịa ọrịa n’obi,’ anyị ga-abụ ndị jupụtara n’ọṅụ. (1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Hibru10:24, 25; Jems 4:8) Mgbe e nwetara ihe a tụrụ anya ya ogologo oge, ọ bụ osisi nke ndụ—n’ezie nke na-akpali akpali ma na-enye ume ọhụrụ.

Iwu Chineke—Isi Iyi nke Ndụ

N’ịkọwa mkpa ọ dị irubere Chineke isi, Ilu 13:13 (NW) na-ekwu, sị: “Onye ledaworo iwu anya, a ga-anapụta ya ihe onye ụgwọ ji nara ibé, ma onye na-atụ egwu ihe e nyere n’iwu ka a ga-akwụghachi ụgwọ.” Ọ bụrụ na onye ụgwọ eleda iwu anya site n’ịghara ịkwụghachi ego ọ gbaziiri, ihe o jiri gbara ibé ga-efunahụ ya. N’otu aka ahụ, anyị ga-enwekwa mfu ma ọ bụrụ na anyị ajụ irubere iwu Chineke isi. Mfu dị aṅaa?

“Iwu onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezuga onwe gị.” (Ilu 13:14) Ịdị ndụ n’agbasoghị iwu nke Chineke kasị mara ihe, bụ́ Jehova, bụ ịnapụ onwe anyị nduzi nke pụrụ inyere anyị aka ibi ndụ ka mma ma dị ogologo. Lee nnọọ oké mfu nke ahụ ga-abụ! Mgbe ahụ, ụzọ amamihe dị na ya bụ anyị ige ntị n’Okwu Chineke ma kwe ka o metụta echiche, okwu ọnụ na akparamagwa anyị.—2 Ndị Kọrint 10:5; Ndị Kọlọsi 1:10.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ime ihe banyere ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ ụdị ọzụzụ onwe onye magburu onwe ya

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

“Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu”

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ịrụsi ọrụ ike “n’ọrụ Onyenwe anyị” na-eme ka obi anyị jupụta n’ọṅụ