Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Martin Luther—Nwoke ahụ na Ihe Ọ Hapụrụ

Martin Luther—Nwoke ahụ na Ihe Ọ Hapụrụ

Martin Luther—Nwoke ahụ na Ihe Ọ Hapụrụ

“E KWURU na e wepụ nna ya ukwu bụ́ Jizọs Kraịst, e dewo ọtụtụ akwụkwọ banyere [Martin Luther] karịa onye ọ bụla ọzọ.” Otú a ka magazin bụ́ Time si kwuo. Okwu na omume Luther nyere aka mee ka e nwee Ndozigharị ahụ—ndozigharị okpukpe nke a kọwara dị ka “mgbanwe kasị pụta ìhè n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.” O si otú a nye aka ịgbanwe usoro okpukpe e nwere na Europe ma weta Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya ná njedebe na kọntinent ahụ. Luther tọkwara ntọala maka inwe ụkpụrụ e ji ede asụsụ German. Nsụgharị Bible ya nọgidere bụrụ nke a kasị nnọọ mara n’asụsụ German.

Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Martin Luther bụ? Olee otú o si bịa nwee mmetụta dị otú ahụ n’ihe omume ndị Europe?

Luther Aghọọ Ọkà Mmụta

A mụrụ Martin Luther na Eisleben, Germany, na November 1483. Ọ bụ ezie na nna ya na-arụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ọla kọpa, ọ gbalịrị ịkpata ego ga-ezuru ya iji zụọ Martin n’ụlọ akwụkwọ. N’afọ 1501, Martin ghọrọ nwa akwụkwọ na Mahadum Erfurt. N’ọ́bá akwụkwọ mahadum ahụ, ọ gụrụ Bible na nke mbụ ya. “Akwụkwọ ahụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu,” ka o kwuru, “ọ gụkwara m agụụ inwe ihe ùgwù nke inweta akwụkwọ ahụ otu ụbọchị.”

Mgbe Luther dị afọ 22, ọ banyere n’ebe obibi ndị mọnk nke Augustine dị n’Erfurt. O mechara gụọ akwụkwọ na Mahadum Wittenberg, ma nweta akara mmụta doctorate na nkà mmụta okpukpe. Luther weere onwe ya dị ka onye na-erughị eru inweta ihu ọma Chineke, mgbe ụfọdụkwa, obi amamikpe mere ka ọ daa mbà n’obi. Ma ọmụmụ Bible, ekpere, na ntụgharị uche nyeere ya aka ịghọtakwu otú Chineke si ele ndị mmehie anya. Luther ghọtara na a pụghị ịrụta ihu ọma Chineke n’ọrụ. Kama nke ahụ, a na-eji obiọma na-erughịrị mmadụ enye ya ndị na-egosipụta okwukwe.—Ndị Rom 1:16; 3:23, 24, 28.

Olee otú Luther si mara na nghọta ọhụrụ ya ziri ezi? Kurt Aland, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme nke chọọchị oge mbụ na nnyocha nke okwu ndị dị n’Agba Ọhụrụ, dere, sị: “Ọ tụgharịrị uche n’akụkụ Bible nile, iji wee chọpụta ma nghọta Bible ọhụrụ a ọ̀ pụrụ ikwekọ n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Bible, ọ chọpụtakwara na nghọta ya ziri ezi n’akụkụ nile.” Ozizi nke ịbụ onye a gụrụ n’onye ezi omume, ma ọ bụ nzọpụta, site n’okwukwe, ọ bụghị site n’ọrụ ma ọ bụ ọpịpịa, nọgidere bụrụ isi ozizi Luther.

Iwe n’Ihi Ịndọljens

Nghọta Luther nke otú Chineke si ele ndị mmehie anya kpatara esemokwu n’etiti ya na ndị Chọọchị Roman Katọlik. N’oge ahụ, ọtụtụ kwenyere na ọ bụrụ na onye mmehie anwụọ, ọ ga na-ata ahụhụ ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, e kwuru na a pụrụ ibelata oge a site n’inye ịndọljens, bụ́ nke a na-enye site n’ikike Popu n’ego. Ndị na-ere indọljens, dị ka Johann Tetzel, onye jere ozi dị ka onye nnọchianya nke Achịbishọp Albert nke Mainz, ji iresị ndị nkịtị ịndọljens kpaa ezigbo ego. Ọtụtụ na-ewere ịdọljens dị ka ihe mkpuchi maka mmehie ndị ha ga-eme n’ọdịnihu.

Luther were iwe n’ihi orire a na-ere ịndọljens. Ọ maara na ndị mmadụ apụghị ikwe Chineke ọnụ ahịa. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 1517, o dere ihe odide nwere arụmụka 95, bụ́ nke a maara nke ọma, na-ebo chọọchị ebubo nke iji ego, ozizi, na okpukpe eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ịnwa ịgba ume ka e nwee ndozigharị, ọ bụghị nnupụisi, Luther zigaara Achịbishọp Albert nke Mainz na ọtụtụ ndị ọkà mmụta ihe odide ya ahụ. Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme weere afọ 1517 ma ọ bụ oge ndị gbara ya gburugburu dị ka mmalite nke Ndozigharị ahụ.

Ọ bụghị nanị Luther kwara arịrị banyere ihe ọjọọ ndị a na-eme na chọọchị. Otu narị afọ tupu oge ahụ, onye Czechoslovakia bụ́ onye ndozigharị okpukpe bụ́ Jan Hus akatọọlarị orire a na-ere ịndọljens. Ọbụna tupu Hus emee nke a, John Wycliffe nke England ekwuwo na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ememe okpukpe ụfọdụ ndị chọọchị na-eme. Ndị ha na Luther dịkọrọ ndụ bụ́ Erasmus nke Rotterdam na Tyndale nke England tụrụ aro ka e nwee ndozigharị. Ma site n’enyemaka nke ígwè obibi akwụkwọ nwere mkpụrụ akwụkwọ a na-edogharị edogharị nke Johannes Gutenberg mepụtara na Germany, olu Luther dara ụda, ruokwa ebe dị anya karịa nke ndị ndozigharị ndị ọzọ.

Ígwè obibi akwụkwọ Gutenberg nke dị na Mainz nọ na-arụ ọrụ n’afọ 1455. Ka ọ na-erule mmalite nke narị afọ ahụ, e nweela ígwè obibi akwụkwọ n’obodo 60 nke Germany nakwa n’ala 12 ndị ọzọ dị na Europe. Na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ọha na eze pụrụ ịnụ okwu ndị metụtara ha ngwa ngwa. Ikekwe, n’ebughị ụzọ nweta nkwado Luther, e bipụtara ma kesaa ihe odide ya ahụ nke nwere arụmụka 95. Okwu banyere ndozigharị nke chọọchị abụghịzi ihe a maara nanị n’otu ebe. Ọ ghọrọ okwu a maara ebe nile, na mberede, Martin Luther ghọrọ onye a kasị mara amara na Germany.

“Anyanwụ na Ọnwa” Emeghachi Omume

Ruo ọtụtụ narị afọ, Europe anọwo n’okpuru òtù abụọ dị ike: Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ na Chọọchị Roman Katọlik. “Eze Ukwu na popu na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka anyanwụ na ọnwa,” ka Hanns Lilje, onye bụbu onyeisi oche nke Njikọ Òtù Lutheran n’Ụwa Nile kwuru. Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe na-edochaghị anya banyere onye bụ anyanwụ na onye bụ ọnwa. Ka ọ na-erule ná mmalite nke narị afọ nke 16, ike agwụwala òtù abụọ ahụ. A na-aga inwe mgbanwe.

Popu Leo nke Iri meghachiri omume banyere ihe odide ahụ nwere arụmụka 95 site n’iyi Luther egwu na a ga-achụpụ ya na chọọchị ma ọ bụrụ na ọ jụghị ihe ahụ o dere. N’achọghị ịma, Luther nọ n’ihu ọha gbaa iwu popu e dere ede ọkụ ma bipụtakwuo akwụkwọ ndị ọzọ na-agba ndị obodo ume idozigharị chọọchị ọbụna ma a sị na popu ekweghị. N’afọ 1521, Popu Leo nke Iri chụpụrụ Luther na chọọchị. Mgbe Luther kwuru na a mara ya ikpe n’ebughị ụzọ nụrụ olu ya, Eze Ukwu Charles nke Ise gwara onye ndozigharị ahụ ka ọ wụchaa n’ihu nnọkọ ndị isi e nwere na Worms. Njem were ụbọchị 15 nke Luther mere site na Wittenberg ruo Worms n’April 1521 yiri njem mmeri. Ọha na eze kwadoro ya, ndị si ebe nile chọkwara ịhụ ya anya.

Na Worms, Luther guzoro n’ihu eze ukwu ahụ, ndị ọchịchị, na onye nnọchianya popu. E kpewo Jan Hus ụdị ikpe a na Constance n’afọ 1415, gbaakwa ya ọkụ n’elu osisi. N’ịbụ onye chọọchị na alaeze ukwu ahụ lekwasịziri anya, Luther ekweghị ajụ ihe o dere, ọ gwụla ma ndị na-emegide ya hà ji Bible gosi na ihe o dere ezighị ezi. Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha nke nweruru ihe ọmụma o nwere banyere Akwụkwọ Nsọ. Ihe odide a kpọrọ Iwu nke Worms kwuru ihe si n’ikpe ahụ pụta. Ọ kpọsara Luther dị ka onye a mapụrụ n’iwu, machibidokwa akwụkwọ ya iwu. N’ịbụ onye popu chụpụrụ na onye eze ukwu mapụrụ n’iwu, ndụ ya nọzi n’ihe ize ndụ.

Ihe omume ndị a na-atụghị anya ha maliteziri ime. Mgbe ọ na-alaghachi Wittenberg, Luther dabara n’ihe e mere ka o yie ntọrọ nke nwoke obiọma bụ́ Frederick nke Saxony haziri. Nke a mere ka ndị iro Luther ghara ịkpara ya aka. E zopụrụ Luther gaa ná nnukwu ụlọ zoro ezo dị na Wartburg, bụ́ ebe ọ nọ gbaa afụ ọnụ ma nwee ihu ọhụrụ—nke nwoke ahụ a ma ama a na-akpọ Junker Jörg.

A Chọsie Bible September Ike

Ruo ọnwa iri sochirinụ, Luther biri ná nnukwu ụlọ ahụ dị na Wartburg dị ka onye gbara ọsọ ndụ n’ihi eze ukwu na popu. Akwụkwọ bụ́ Welterbe Wartburg na-akọwa na “oge ọ nọ na Wartburg bụ otu n’ime oge ndị ọ kasị chepụta ma rụpụta ihe ná ndụ ya nile.” N’ebe ahụ ka ọ nọ sụgharịchaa ihe odide Eramus nke Akwụkwọ Nsọ Grik gaa n’asụsụ German, nke bụ́ otu n’ime ihe ndị kasịnụ ọ rụzuru. N’ịbụ nke e bipụtara na September 1522 n’ekwughị na ọ bụ Luther sụgharịrị ya, a bịara mara ya dị ka Bible September. Ọnụ ego ya bụ 1 guilder na ọkara—ihe ya na ụgwọ ọnwa otu afọ nke nwa odibo ha nhata. Otú ọ dị, ọchịchọ a na-achọ Bible September bịara dị ukwuu. N’ime ọnwa 12, e bipụtara mkpụrụ 6,000 ná mbipụta 2, n’afọ 12 ọzọ sochirinụ, e wepụtakwara ma ọ dịkarịa ala mbipụta ya 69.

N’afọ 1525, Martin Luther lụrụ Katharina von Bora, onye bụbu nọn. Katharina maara ka e si arụ ọrụ ụlọ nke ọma, o nwekwara ike ịrụzu ihe mmesapụ aka di ya chọrọ. Ezinụlọ Luther bịara gụnye ihe karịrị nwunye ya na ụmụ ya isii, ọ gụnyekwara ndị enyi, ndị ọkà mmụta, na ndị gbara ọsọ ndụ. Mgbe Luther mere okenye, o nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye ndụmọdụ nke na ndị ọkà mmụta nọ dị ka ọbịa n’ụlọ ya na-eji mkpịsị akwụkwọ na akwụkwọ edetu ihe ndị ọ na-ekwu. Ha jikọtara ihe ndị ha dere ọnụ n’akwụkwọ ha kpọrọ Luthers Tischreden (Ihe Ndị Luther Kwuru na Tebụl Nri). Ruo oge ụfọdụ, ọ ghọrọ akwụkwọ e dere n’asụsụ German nke a kasị kesaa ma e wepụ Bible.

Onye Nsụgharị Bụ́ Ọkà na Onye Edemede Ụbụrụ Na-aghọ Nkọ

Ka ọ na-erule afọ 1534, Luther asụgharịchaala Akwụkwọ Nsọ Hibru. O nwere nkà nke ime ka ụzọ e si ede okwu, ndakọrịta okwu, na ìgwè okwu daba adaba. Ihe si na ya pụta bụ Bible nke ndị nkịtị pụrụ ịghọta. N’ikwu banyere otú o si mee nsụgharị ya, Luther dere, sị: “Anyị kwesịrị ịjụ nne nọ n’ụlọ ya, ụmụaka nọ n’okporo ámá, ndị nkịtị nọ n’ụlọ ahịa ajụjụ ma gezie ha ntị nke ọma iji hụ otú ha si ekwu okwu, mgbe ahụ mee ka nsụgharị anyị kwekọọ na ya.” Nsụgharị Bible Luther nyere aka n’ịtọ ntọala maka inwe usoro e ji ede asụsụ German bụ́ nke e mesịrị nakwere na Germany nile.

E jikọtara nkà Luther dị ka onye nsụgharị na ikike ya dị ka onye edemede. A sịrị na ọ na-ede otu akụkọ n’izu abụọ ọ bụla n’oge nile ike ka dị ya. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndị a na-akpalitekwa arụmụka dị ka onye dere ha. Ọ bụrụ na ihe odide ya ndị mbụ na-agba agba, afọ ndụ Luther emetụtaghị nkà ide ihe ya. Edemede ndị o mechara dee bịara sikwuo ike karị. Dị ka akwụkwọ bụ́ Lexikon für Theologie und Kirche si kwuo, ihe odide Luther kpughere “iwe oké iwe” na “adịghị umeala n’obi ya na enweghị ịhụnanya ya” nakwa “echiche nke iji ọrụ ya kpọrọ ihe.”

Mgbe Agha Ndị Nkịtị ahụ malitere, e gbuokwa ọtụtụ ndị mmadụ, a jụrụ Luther ihe bụ́ echiche ya banyere agha ahụ. Ọ̀ dị ezi ihe mere ndị nkịtị ga-eji mee mkpesa megide ndị nna ha ukwu? Luther anwaghị ịdọtara onwe ya mmadụ site n’ikpelara ndị ka ọtụtụ. O kweere na ndị ohu Chineke kwesịrị ịdị na-erubere ndị na-achị achị isi. (Ndị Rom 13:1) N’ikwu ya hoo haa, Luther kwuru na e kwesịrị ịkwụsị agha nnupụisi ahụ n’ike. “Onye ọ bụla obi kara, ya maa mmà, ya gbuo mmadụ,” ka o kwuru. Hanns Lilje kwuru na azịza a mere ka Luther “gharazie ịbụ onye ọha mmadụ nwere mmasị n’ebe ọ nọ.” Ọzọkwa, ihe odide ndị Luther dere banyere ndị Juu jụrụ ịghọ Ndị Kraịst, karịsịa On the Jews and Their Lies, mere ka ọtụtụ were onye dere ya dị ka onye iro ndị Juu.

Ihe Luther Hapụrụ

Ndozigharị ahụ, bụ́ nke ndị dị ka Luther, Calvin, na Zwingli kpalitere dugara ná nhiwe nke okpukpe a kpọrọ Protestant. Ihe bụ́ isi Luther hapụụrụ ndị Protestant bụ ozizi ya bụ́ isi nke ịgụ mmadụ n’onye ezi omume site n’okwukwe. Obodo nke ọ bụla na Germany sonyeere okpukpe Protestant ma ọ bụ Katọlik. Okpukpe Protestant gbasara ma bụrụ nke a kasị mara na Scandinavia, Switzerland, England, nakwa na Netherlands. Taa, e nwere ọtụtụ narị nde ndị na-ekpe ya.

Ọtụtụ ndị na-ekwenyeghị n’ozizi nile nke Luther na-akwanyere ya ùgwù. Ebe ndị bụbu German Democratic Republic, nke gụnyere Eisleben, Erfurt, Wittenberg, na Wartburg na ókèala ha nile, mere ememe ncheta ọmụmụ Luther nke 500 ya na 1983. Mba Socialist a weere ya dị ka onye pụtara ìhè n’akụkọ ihe mere eme nile na ọdịnala nke Germany. Ọzọkwa, otu onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik nke afọ ndị 1980 chịkọtara mmetụta Luther nwere ma kwuo, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla dịrị ndụ mgbe Luther nwụsịrị nke pụrụ ịdị ka ya.” Prọfesọ Aland dere, sị: “Kwa afọ, a na-enwe ma ọ dịkarịa ala mbipụta 500 ndị ọhụrụ banyere Martin Luther na Ndozigharị ahụ—a na-ebipụtakwa ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’asụsụ nile bụ́ isi e nwere n’ụwa.”

Martin Luther nwere ọgụgụ isi dị nkọ, ikike icheta ihe bụ́ ịgba, ikike ikwu okwu, nakwa àgwà nke ịrụsi ọrụ ike. Ọ dịghịkwa enwe ndidi, ọ na-akparị mmadụ, ọ na-akatọkwa nnọọ ihe ọ bụla o lere anya dị ka omume ihu abụọ. Mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ n’Eisleben na February 1546, ndị enyi Luther jụrụ ya ma ọ̀ ka guzosikwara ike na nkwenkwe ndị ọ kụziiri ndị ọzọ. “Ee,” ka ọ zaghachiri. Luther nwụrụ, ma ọtụtụ ndị ka rapagidesiri ike n’ozizi ndị ahụ.

[Foto dị na peeji nke 27]

Luther megidere orire a na-ere ịndọljens

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mit freundlicher Genehmigung: Wartburg-Stiftung

[Foto dị na peeji nke 28]

Luther ekweghị ajụ ihe o dere ọ gwụla ma ndị na-emegide ya hà ji Bible gosi na ihe o dere ezighị ezi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Story of Liberty, 1878

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ọnụ ụlọ Luther ná Nnukwu Ụlọ dị na Wartburg, bụ́ ebe ọ nọ sụgharịa Bible

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise abụọ a: Mit freundlicher Genehmigung: Wartburg-Stiftung

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Site n’akwụkwọ bụ́ Martin Luther The Reformer, Mbipụta nke Atọ, nke Toronto Willard Tract Depository, Toronto, Ontario, bipụtara

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Site n’akwụkwọ bụ́ The History of Protestantism (Mpịakọta nke Mbụ)