Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka

Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka

Mgbe Nkwa Bụ Ihe E Ji n’Aka

AKỤKỌ ihe mere eme jupụtara ná nkwa ndị a na-emezughị emezu. Mgbe mgbe, mba dị iche iche ajụwo ime ihe kwekọrọ ná nkwekọrịta alụrịtaghị agha ndị ha bịanyere nnọọ aka na ha, si otú a na-eduje ndị ala ha n’agha ndị dị egwu. Napoleon kwuru n’otu oge, sị: “Ndị ọchịchị na-emezu nkwa ha nanị mgbe a manyere ha ime otú ahụ, ma ọ bụ mgbe ha ga-erite uru na ya.”

Gịnị banyere nkwa nke ụmụ mmadụ? Lee ka o si abụ ihe na-akụda obi mgbe mmadụ na-emezughị nkwa ya! Ọ na-adị otú ahụ karịsịa mgbe onye ahụ bụ onye ị maara ma tụkwasị obi. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ụmụ mmadụ enweghị ike ma ọ bụ na ha achọghị imezu nkwa ha.

Leenụ ọdịiche dị n’etiti nkwa ụmụ mmadụ na nke Chineke! Nkwa Chineke bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị a pụrụ ịdabere na ha kpam kpam. Nkwa ọ bụla Jehova Chineke kwere bụ ihe e ji n’aka. Ọ ga-emezurịrị. N’ikwu banyere okwu Chineke nke na-adịghị ada ada, Aịsaịa 55:11 na-ekwu, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta, ọ gaghị alaghịchikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”

Ya mere, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele nkwa Chineke ndị e dekọrọ na Bible anya? Anyị pụrụ ịdabere na ha n’ezie. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Ị pụrụ ịnụ ụtọ ngọzi ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na i mee ihe ndị kwekọrọ n’okwu Jizọs bụ́: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ I zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.