Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkparịta Ụka Ndị Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-ewuli Elu

Mkparịta Ụka Ndị Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-ewuli Elu

Mkparịta Ụka Ndị Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-ewuli Elu

“Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta, kama okwu ọ bụla dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.”—NDỊ EFESỌS 4:29.

1, 2. (a) Ruo ókè ha aṅaa ka ikwu okwu nke mmadụ bara uru? (b) Olee otú ndị ohu Jehova kwesịrị isi jiri ire ha na-eme ihe?

“OKWU mmadụ bụ ihe omimi; ọ bụ onyinye Chineke, ọrụ ebube.” Ka Ludwig Koehler, bụ́ onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu dere. Ikekwe, anyị adịghị ejicha onyinye a dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Chineke akpọrọ ihe. (Jems 1:17) Ma cheedị banyere ihe dị oké ọnụ ahịa nke na-efu mgbe ọrịa strok mere ka onye a hụrụ n’anya kwụsị ikwu okwu nke ọma. “Anyị na-enwebu nkwurịta okwu mgbe nile, nke ahụ mekwara nnọọ ka anyị dị n’otu,” ka Joan bụ́ onye di ya dara ọrịa strok n’oge na-adịbeghị anya na-akọwa. “Lee ka mkparịta ụka ndị anyị na-enwebu si na-agụsi m agụụ ike!”

2 Mkparịta ụka pụrụ ime ka ọbụbụenyi sie ike, mee ka e dozie nghọtahie, gbaa onye dara mbà n’obi ume, mee ka okwukwe sie ike, ma mee ka ndụ dị ụtọ—ma ọ bụghị na mberede. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Dị ka ndị ohu Jehova, o kwesịrị ka mkparịta ụka anyị na-agwọ agwọ ma na-ewuli elu kama ịkpasu iwe na ịkụda mmụọ. O kwesịkwara ka anyị jiri ire anyị na-eto Jehova, ma n’ozi anyị na-eje maka ọha ma mgbe anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Chineke ka anyị jiworo nyaa isi ogologo ụbọchị nile, ọ bụkwa aha Gị ka anyị ga-ekele ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 44:8.

3, 4. (a) Nsogbu dị aṅaa ka anyị nile na-eche ihu mgbe a bịara n’ikwu okwu? (b) N’ihi gịnị ka okwu ọnụ anyị ji nwee ihe o mere?

3 “Ire,” ka Jems onye na-eso ụzọ na-adọ aka ná ntị, “ọ dịghị otu n’ime ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịzụta ya.” Ọ na-echetara anyị, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2, 8) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke zuru okè. N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị pụrụ ibu ezi ihe n’obi, ọ bụghị mgbe nile ka okwu anyị na-ewuli ndị ọzọ elu ma ọ bụ na-ewetara Onye Okike anyị otuto. Ya mere, anyị aghaghị ịmụta ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu. Ọzọkwa, Jizọs sịrị: “Okwu ọ bụla na-abaghị uru nke ụmụ mmadụ na-ekwu, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’Ụbọchị Ikpe; n’ihi na a ga-esite n’okwu gị kpọọ gị onye ezi omume, a ga-esitekwa n’okwu gị maa gị ikpe.” (Matiu 12:36, 37) Ee, anyị ga-aza ezi Chineke ahụ ajụjụ maka ihe ndị anyị na-ekwu.

4 Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi zere ikwu ihe ndị na-akpasu iwe bụ ịzụlite àgwà nke inwe mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ. Isiokwu a ga-atụle otú anyị pụrụ isi na-eme nke ahụ, ụdị ihe anyị pụrụ ịdị na-ekwurịta, na uru ndị anyị ga-erite site n’ikwu okwu ndị na-ewuli elu.

Lebara Obi Gị Anya

5. Olee otú obi si ekere òkè bụ́ isi n’ịkwalite mkparịta ụka ndị na-ewuli elu?

5 N’ịzụlite àgwà nke inwe mkparịta ụka ndị na-ewuli elu, anyị aghaghị ibu ụzọ mata na okwu ọnụ anyị na-egosi ihe dị anyị n’obi. Jizọs kwuru, sị: “Site n’ihe jupụtara n’obi ka ọnụ na-ekwu.” (Matiu 12:34) Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ na-amasị anyị ikwu okwu banyere ihe ndị dị anyị mkpa. Mgbe ahụ, ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka mkparịta ụka m na-ekpughe banyere ọnọdụ obi m? Mgbe mụ na ndị ezinụlọ m ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe m nọ, mkparịta ụka m ọ̀ na-adabere n’ihe ime mmụọ ka ọ̀ na-abụ banyere egwuregwu, uwe, ihe nkiri sịnịma, nri, ihe ndị m zụtara ọhụrụ, ma ọ bụ ụfọdụ ihe ndị ọzọ na-adịghị mkpa?’ Ikekwe n’amaghị ama, ndụ anyị na echiche anyị na-ehiwe isi n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Ịhazigharị ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ ga-eme ka mkparịta ụka anyị nakwa ndụ anyị ka mma.—Ndị Filipaị 1:10.

6. Òkè dị aṅaa ka ntụgharị uche na-ekere ná mkparịta ụka anyị?

6 Ntụgharị uche nwere nzube bụ ụzọ ọzọ isi na-ekwu ihe ndị na-ewuli elu karị. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ịdị na-eche echiche banyere ihe ime mmụọ, anyị ga-achọpụta na mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ ga na-abịara onwe ha. Eze Devid chọpụtara na nke a bụ eziokwu. Ọ bụrụ, sị: “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova.” (Abụ Ọma 19:14) Ọbụ abụ ahụ bụ́ Esaf kwukwara, sị: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị [Chineke] nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:12) Obi na uche nke na-eche nnọọ banyere eziokwu nke Okwu Chineke ga na-ekwu nnọọ okwu ndị kwesịrị ịja mma. Jeremaịa apụghị ịla azụ ikwu banyere ihe ndị Jehova kụziwooro ya. (Jeremaịa 20:9) Otú ahụ ka ọ pụrụ ịdị anyị ma ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche mgbe nile n’ihe ime mmụọ.—1 Timoti 4:15.

7, 8. Olee ihe ụfọdụ ndị dị mma a pụrụ iji na-enwe mkparịta ụka ndị na-ewuli elu?

7 Inwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma na-eme ka anyị nwee ọtụtụ isiokwu anyị pụrụ iji na-enwe mkparịta ụka ndị na-ewuli elu. (Ndị Filipaị 3:16) Mgbakọ ukwu na mgbakọ nta, nzukọ ọgbakọ, akwụkwọ ndị ọhụrụ, ihe mmụta dịịrị ụbọchị ndị na-adabere n’Akwụkwọ Nsọ na nkọwa ha e bipụtara ebipụta na-eme ka anyị nwee ihe ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa anyị pụrụ ikwurịta. (Matiu 13:52) Leekwa ka ahụmahụ ndị e nwetara n’ozi Ndị Kraịst anyị pụrụ isi bụrụ ihe na-akpali akpali n’ụzọ ime mmụọ!

8 Ụdị dịgasị iche iche nke osisi, ụmụ anụmanụ, ụmụ nnụnụ, na azụ ndị Eze Solomọn hụrụ n’Izrel masịrị ya. (1 Ndị Eze 4:33) O nwere obi ụtọ inwe mkparịta ụka dabeere n’ihe ndị Chineke kere. Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ọ na-atọ ndị ohu Jehova ụtọ ikwurịta ihe dịgasị iche iche, ma isiokwu ndị dabeere n’ihe ime mmụọ na-emekarị ka mkparịta ụka nke ndị ji ihe mmụọ kpọrọ ihe na-ewuli elu.—1 Ndị Kọrint 2:13.

“Nọgidenụ Na-atụle Ihe Ndị A”

9. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Filipaị?

9 N’agbanyeghị ihe anyị na-ekwurịta, mkparịta ụka anyị ga-ewuli ndị ọzọ elu ma ọ bụrụ na ha kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ndị Filipaị. O dere, sị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche, ihe ọ bụla nke bụ́ ezi omume, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, nọgidenụ na-atụle ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Ihe ndị Pọl kpọtụrụ uche dị nnọọ oké mkpa nke na o kwuru ka a ‘nọgide na-atụle ihe ndị a.’ Anyị kwesịrị iji ha mejupụta uche na obi anyị. Ya mere, ka anyị hụ otú ilebara nke ọ bụla n’ime ihe asatọ ahụ Pọl kpọtụrụ uche anya pụrụ isi nyere anyị aka ná mkparịta ụka anyị.

10. Olee otú mkparịta ụka anyị pụrụ isi gụnye ihe ndị bụ́ eziokwu?

10 Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu gụnyere ihe karịrị ihe ọmụma bụ́ eziokwu na nke na-abụghị ụgha. Ọ na-ezo aka n’ihe ziri ezi na ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, dị ka eziokwu nke Okwu Chineke. N’ihi ya, mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ banyere eziokwu Bible ndị masịrị anyị, okwu ihu ọha ma ọ bụ okwu ndị ọzọ gbara anyị ume, ma ọ bụ ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị nyeere anyị aka, anyị na-atụle ihe ndị bụ́ eziokwu. N’aka nke ọzọ, anyị na-ajụ ihe “a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha,” bụ́ nke na-eyi nanị ka ọ bụ eziokwu. (1 Timoti 6:20) Anyị na-ezerekwa ịgbasa asịrị ma ọ bụ ịkọsa ahụmahụ ndị a na-enyo enyo bụ́ ndị a na-apụghị ịnwapụta na ha bụ eziokwu.

11. Olee ihe ndị kwesịrị nchebara echiche ndị anyị pụrụ itinye ná mkparịta ụka anyị?

11 Ihe ọ bụla kwesịrị nchebara echiche bụ ihe ndị dị ùgwù na ndị dị mkpa, ọ bụghị ihe ndị na-adịchaghị mkpa ma ọ bụ ndị na-abachaghị uru. Ha gụnyere nchegbu banyere ozi Ndị Kraịst anyị, oge a pụrụ iche nke anyị bi n’ime ya, na mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe àgwà dị mma. Mgbe anyị na-ekwurịta ihe ndị dị otú ahụ kwesịrị nchebara echiche, anyị na-eme ka mkpebi anyị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe na ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ siwanye ike. N’ezie, ahụmahụ ndị na-akpali mmasị anyị nwere n’ozi anyị na ihe ndị na-eme ugbu a bụ́ ndị na-echetara anyị na anyị bi na mgbe ikpeazụ bụ isiokwu dịgasị iche iche anyị pụrụ iji na-enwe mkparịta ụka ndị na-akpali akpali.—Ọrụ 14:27; 2 Timoti 3:1-5.

12. N’ihi ndụmọdụ Pọl nyere ka a na-atụle ihe ndị bụ́ ezi omume na ndị dị ọcha, ihe ndị dị aṅaa ka e kwesịrị ịdị na-ezere?

12 Okwu ahụ bụ́ ezi omume pụtara izi ezi n’anya Chineke—imezu ihe ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. Ihe dị ọcha na-enye echiche nke ịdị ọcha n’echiche na n’omume. Nkwutọ, okwu ndị rụrụ arụ, ma ọ bụ okwu njakịrị ndị metụtara mmekọahụ ekwesịghị ịbata ná mkparịta ụka anyị. (Ndị Efesọs 5:3; Ndị Kọlọsi 3:8) N’ebe ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, Ndị Kraịst na-eji amamihe apụ mgbe mkparịta ụka gawara n’akụkụ a.

13. Nye ihe atụ nke mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ndị na-akpali ịhụnanya na ndị a na-ekwu okwu ọma banyere ha.

13 Mgbe Pọl tụrụ aro ka a na-atụle ihe ndị na-akpali ịhụnanya, ọ na-ezo aka n’ihe ndị dị ụtọ ná ntị na ndị a pụrụ ikwere ekwere ma ọ bụ ndị na-akwali mmadụ ịhụ n’anya, ọ bụghị ihe ndị na-akpali ịkpọasị, obi ilu, ma ọ bụ esemokwu. Ihe ndị a na-ekwu okwu ọma banyere ha na-ezo aka n’ihe ọmụma ndị ziri ezi ma ọ bụ ndị a na-akọ akụkọ ọma banyere ha. Akụkọ ọma ndị dị otú ahụ ga-agụnye akụkọ ndụ nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-apụta mgbe nile na magazin Ụlọ Nche na Teta! Gịnị ma ị gwa ndị ọzọ banyere mmetụta isiokwu ndị a na-ewusi okwukwe ike nwere n’ahụ́ gị ozugbo ị gụsịrị ha? Leekwa ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịnụ banyere ihe ndị ọzọ rụzuru n’ụzọ ime mmụọ! Mkparịta ụka ndị dị otú ahụ ga-eme ka e nwee ịhụnanya na ịdị n’otu n’ọgbakọ.

14. (a) Gịnị ka ime omume ọma na-achọ n’aka anyị? (b) Olee otú okwu ọnụ anyị pụrụ isi gụnye ihe ndị kwesịrị otuto?

14 Pọl kwuru okwu banyere “omume ọma ọ bụla dịnụ.” Omume ọma na-ezo aka n’ịdị mma ma ọ bụ n’omume magburu onwe ya. Anyị aghaghị ilezi anya ịhụ na ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ na-achịkwa okwu ọnụ anyị nakwa na anyị adịghị ahapụ ikwu ihe ndị ziri ezi, ndị dị ọcha, na ndị na-egosi omume ọma. Kwesịrị otuto pụtara “kwesịrị ịja mma.” Ọ bụrụ na ị nụ okwu dị mma ma ọ bụ chọpụta onye na-egosi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi n’ọgbakọ, kwuo okwu banyere ya—gwa ya onye ahụ, gwakwa ya ndị ọzọ. Pọl onyeozi jara ndị ya na ha na-efekọ ofufe mma ugboro ugboro maka àgwà ọma ha. (Ndị Rom 16:12; Ndị Filipaị 2:19-22; Faịlimọn 4-7) N’eziekwa, ọrụ aka Onye Okike anyị kwesịrị nnọọ ịja mma. Anyị na-ahụ ọtụtụ ihe anyị ga-eji enwe mkparịta ụka ndị na-ewuli elu n’ọrụ aka ya.—Ilu 6:6-8; 20:12; 26:2.

Na-enwe Mkparịta Ụka Ndị Na-ewuli Elu

15. Iwu dị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ mere ka iwu jide ndị nne na nna iso ụmụ ha na-enwe mkparịta ụka nwere nzube?

15 Deuterọnọmi 6:6, 7 na-ekwu, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” N’ụzọ doro anya, iwu a na-achọ ka ndị nne na nna soro ụmụ ha na-enwe mkparịta ụka ndị nwere nzube na ndị dabeere n’ihe ime mmụọ.

16, 17. Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke Jehova na Ebreham?

16 Ka anyị cheedị banyere mkparịta ụka were ogologo oge nke Jizọs na Nna ya nke eluigwe na-aghaghị inwewo mgbe ha na-ekwurịta banyere ozi elu ala ya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nna m n’onwe ya bụ́ onye zitere m enyewo m iwu banyere ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu.” (Jọn 12:49; Deuterọnọmi 18:18) Ọ ghaghị ịbụ na nna ochie ahụ bụ́ Ebreham jiri ọtụtụ awa soro nwa ya bụ́ Aịzik kwurịta otú Jehova siworo gọzie ha na ndị nna ha ochie. N’ezie, mkparịta ụka ndị dị otú ahụ nyeere ma Jizọs ma Aịzik aka iji obi umeala nakwere uche Chineke.—Jenesis 22:7-9; Matiu 26:39.

17 Mkparịta ụka ndị na-ewuli elu dịkwa ụmụ anyị mkpa. Ndị nne na nna aghaghị iwepụta oge n’agbanyeghị na ha na-eji nnọọ ọrụ n’aka, iji soro ụmụ ha na-ekwurịta okwu. Ọ bụrụ na o kwe omume, gịnị ma i mee ndokwa ka unu na-erikọ nri ọnụ dị ka ezinụlọ ọ dịkarịa ala otu ugboro n’ụbọchị? Mgbe unu na-eri nri dị otú ahụ ma ọ bụ mgbe unu richara, unu ga-enwe ohere inwe nkwurịta okwu na-ewuli elu bụ́ nke pụrụ ịba uru maka ahụ́ ike ime mmụọ nke ezinụlọ unu.

18. Kọọ otu ahụmahụ nke na-egosi uru ndị a na-erite site na ndị nne na nna na ụmụ ha inwe ezi nkwurịta okwu.

18 Alejandro, bụ́ onye ọsụ ụzọ nke nọ ná mmalite afọ ndị 20 ya, chetara obi abụọ o nwere mgbe ọ dị afọ 14. Ọ na-akọ, sị: “N’ihi mmetụta nke ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị nkụzi na-enwe n’ahụ́ m, enwere m obi abụọ banyere ịdị adị nke Chineke na izi ezi nke Bible. Ndị mụrụ m wepụtara ọtụtụ awa jiri ndidi soro m tụgharịa uche. Ọ bụghị nanị na mkparịta ụka ndị dị otú a nyeere m aka n’oge ahụ m nwere ihe isi ike kamakwa ha nyeere m aka ime ezi mkpebi ná ndụ m.” Gịnịkwa banyere ugbu a? Alejandro gara n’ihu ikwu, sị: “M ka bi n’ụlọ anyị. Ma ọrụ anyị na-eji nnọọ n’aka na-eme ka o siere papa m ike iso m kwurịta okwu. Ya mere anyị abụọ na-erikọ nri ọnụ otu ugboro n’izu n’ebe ọ na-arụ ọrụ. Eji m mkparịta ụka ndị a kpọrọ ihe n’ezie.”

19. N’ihi gịnị ka mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ ji dị anyị nile mkpa?

19 Ọ̀ bụ na anyị adịghị eji ohere anyị nwere iso ndị kwere ekwe ibe anyị enwe mkparịta ụka na-ewuli elu akpọrọ ihe? Anyị na-enwe ohere ndị a ná nzukọ, n’ozi, nakwa ná nnọkọ ntụrụndụ na mgbe anyị na-eme njem. Pọl tụrụ anya iso Ndị Kraịst nọ na Rom kwurịta okwu. “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu,” ka o degaara ha, “ka unu wee gbarịta onwe unu ume, onye nke ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Ndị Rom 1:11, 12) “Iso Ndị Kraịst ibe anyị na-enwe mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ na-egbo ezigbo mkpa,” ka Johannes, bụ́ Onye Kraịst bụ́ okenye kwuru. “Ha na-eme ka e nwee obi ụtọ ma na-ebelata ibu arọ a na-ebu kwa ụbọchị. M na-agwakarị ndị agadi ka ha gwa m banyere ndụ ha nakwa banyere ihe ndị nyewooro ha aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ruo ọtụtụ afọ, esorowo m ọtụtụ n’ime ha kwurịta okwu, nke ọ bụla n’ime ha emewo ka m nwee amamihe ma ọ bụ ihe ọmụma ụfọdụ ndị meworo ka ndụ m nwee nzube karị.”

20. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị ezute onye na-eme ihere?

20 Gịnị ma ọ bụrụ na o yie ka ọ dị onye na-enweghị mmasị mgbe i welitere isokwu ndị dabeere n’ihe ime mmụọ? Adala mbà. Ikekwe ị pụrụ ịchọta oge ka kwesị ekwesị mgbe e mesịrị. “Mkpụrụ osisi apụl ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ,” ka Solomọn kwuru. (Ilu 25:11) Na-egosi nchebara echiche n’ebe ndị na-eme ihere nọ. “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” * (Ilu 20:5) Karịsịa, ekwela ka àgwà nke ndị ọzọ dọlaa gị azụ ikwu okwu banyere ihe ndị metụrụ gị n’obi.

Mkparịta Ụka Ndị Dabeere n’Ihe Ime Mmụọ Na-aba Uru

21, 22. Olee uru ndị anyị na-erite site n’inwe mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ?

21 “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ, “kama okwu ọ bụla dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee nye ndị na-anụ ya ihe dị ụtọ.” (Ndị Efesọs 4:29; Ndị Rom 10:10) Ọ pụrụ ịchọ mgbalị iji mee ka mkparịta ụka dabere n’ihe ndị kwesịrị ekwesị, ma uru ọ na-aba dị ọtụtụ. Mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ na-enyere anyị aka ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere ma na-ewuli òtù ụmụnna anyị elu.

22 N’ihi ya, ka anyị jiri onyinye nke ikwu okwu na-ewuli ndị ọzọ elu ma na-ewetara Chineke otuto. Mkparịta ụka ndị dị otú ahụ ga-abụrụ anyị ihe na-enye afọ ojuju, bụrụkwa ihe na-agba ume nye ndị ọzọ. Karịsịa, ha ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa n’ihi ọ na-ege ntị ná mkparịta ụka anyị, ọ na-enwekwa ọṅụ mgbe anyị ji ire anyị eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 139:4; Ilu 27:11) Mgbe mkparịta ụka anyị dabeere n’ihe ime mmụọ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị echezọ anyị. N’ikwu banyere ndị na-ejere Jehova ozi n’oge anyị, Bible na-asị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” (Malakaị 3:16; 4:5) Lee ka o si dị oké mkpa ka mkparịta ụka anyị bụrụ nke na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Olulu mmiri ụfọdụ dị n’Izrel miri nnọọ emi. Na Gibiọn, ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo nnukwute olulu mmiri nke dị mita 25 n’omimi. O nwere steepụ e ji arịba na ya iji sere mmiri.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka mkparịta ụka anyị na-ekpughe banyere anyị?

• Olee ihe ndị na-ewuli elu anyị pụrụ ikwurịta?

• Ọrụ dị aṅaa dị mkpa ka mkparịta ụka na-arụ n’ezinụlọ na n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

• Abamuru ndị dị aṅaa ka mkparịta ụka ndị na-ewuli elu na-eweta?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Mkparịta ụka ndị na-ewuli elu na-adabere na . . .

“ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu”

“ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche”

“ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto”

“ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Mkpọ kaseeti vidio, Stalin: Foto Ndị Agha U.S.; Ihu akwụkwọ Creator, Eagle Nebula: J. Hester na P. Scowen (AZ State Univ.), NASA

[Foto dị na peeji nke 13]

Oge nri na-eme ka e nwee ohere ndị magburu onwe ha iji na-enwe mkparịta ụka ndị dabeere n’ihe ime mmụọ