Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Kwesị Ịdị Na-ekpe Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Kwesị Ịdị Na-ekpe Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Kwesị Ịdị Na-ekpe Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị?

“Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Na-enyenụ ekele banyere ihe ọ bụla.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18.

1, 2. Olee otú Daniel si gosi na ya ji ihe ùgwù nke ikpe ekpere kpọrọ ihe, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke ahụ nwere ná mmekọrịta ya na Chineke?

DANIEL onye amụma nwere omume nke ikpegara Chineke ekpere ugboro atọ n’ụbọchị. Ọ na-esekpuru ala na windo nke ụlọ elu ya bụ́ nke chere ihu n’obodo Jeruselem ma na-arịọ arịrịọ ya. (1 Ndị Eze 8:46-49; Daniel 6:10) Ọbụna mgbe iwu eze nyere machibidoro ikpegara onye ọzọ ekpere ma ọ́ bụghị Daraịọs, bụ́ eze Midian, Daniel atụghị egwu ma ọlị. Ma ime otú ahụ ọ̀ ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ ma ọ bụ na ọ gaghị, nwoke a ji ekpere kpọrọ ihe rịọrọ Jehova arịrịọ n’akwụsịghị akwụsị.

2 Olee otú Jehova si lee Daniel anya? Mgbe mmụọ ozi Gebriel bịara ịza otu n’ime ekpere Daniel, ọ kọwara onye amụma ahụ dị ka “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” ma ọ bụ “onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Daniel 9:20-23; The New English Bible) N’amụma Izikiel, Jehova kpọrọ Daniel, onye ezi omume. (Ezikiel 14:14, 20) N’oge ndụ Daniel, ihe àmà na-egosi na ekpere ya mere ka ya na Chineke nwee mmekọrịta chiri anya, eziokwu nke ọbụna Daraịọs kwetara.—Daniel 6:16.

3. Dị ka ahụmahụ nke otu onye ozi ala ọzọ gosiri, olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe?

3 Ikpechi ekpere anya pụkwara inyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa ndị siri ike. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Harold King, bụ́ onye ozi ala ọzọ na China, nke a mara ikpe ịga mkpọrọ afọ ise n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ. Nwanna King na-ekwu banyere ahụmahụ ya, sị: “A pụrụ ikewapụ m n’ebe mmadụ ibe m nọ, ma ọ dịghị onye pụrụ ikewapụ m n’ebe Chineke nọ. . . . N’ihi ya, m na-esekpu ala ugboro atọ n’ụbọchị n’ebe onye ọ bụla na-agafe n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m ga-ahụ m, na-ekpe ekpere n’olu dara ụda, na-echeta Daniel, bụ́ onye Bible kwuru banyere ya. . . . O yiri ka n’oge ndị dị otú ahụ, mmụọ Chineke ò duziri uche m gaa n’ihe ndị kasị baa uru ma mee ka ahụ́ ruo m ala. Lee ume ime mmụọ na nkasi obi nke ekpere wetaara m!”

4. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ekpere ka a ga-atụle n’isiokwu a?

4 Bible na-ekwu, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Na-enyenụ ekele banyere ihe ọ bụla.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18) N’ihi ndụmọdụ a, ka anyị tụlee ajụjụ ndị na-esonụ: N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ilebara ekpere anyị anya? Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-ejekwuru Jehova mgbe nile? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ dị anyị ka anyị erughị eru ikpegara Chineke ekpere n’ihi adịghị ike anyị?

Zụlite Ọbụbụenyi Site n’Ekpere

5. Ọbụbụenyi dị aṅaa pụrụ iche ka ekpere na-enyere anyị aka inwe?

5 Ọ̀ ga-amasị gị ka Jehova were gị dị ka enyi ya? Ọ kpọrọ nna ochie bụ́ Ebreham enyi ya. (Aịsaịa 41:8; Jems 2:23) Jehova chọrọ ka anyị soro ya na-enwe ụdị mmekọrịta ahụ. Ọ na-akpọ anyị òkù n’ezie ịbịaru ya nso. (Jems 4:8) Ọ̀ bụ na ọkpụkpọ òkù ahụ ekwesịghị ime ka anyị tụgharịa uche ná ndokwa magburu onwe ya nke ikpe ekpere? Lee ka o si esi ike inweta ikike ịgwa onye dị mkpa n’ọchịchị okwu ma ya fọdụ ịbụ enyi ya! Ma Onye Okike nke eluigwe na ala na-agba anyị ume ịbịakwute ya n’ekpere n’enweghị ihe mgbochi, mgbe ọ bụla anyị chọrọ ma ọ bụ mgbe ọ bụla ọ dị anyị mkpa ime otú ahụ. (Abụ Ọma 37:5) Anyị ikpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị na-enyere anyị aka iso Jehova na-enwe mkpakọrịta chiri anya.

6. Gịnị ka ihe nlereanya Jizọs na-akụziri anyị banyere mkpa ọ dị ‘ikpe ekpere mgbe nile’?

6 Otú ọ dị, lee ka o si dị mfe anyị ileghara ekpere anya! Nanị ịnagide nrụgide a na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị pụrụ ịdọrọ uche anyị nke ukwuu nke na anyị adịghị eme mgbalị ịgwa Chineke okwu. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha “na-ekpe ekpere mgbe nile,” o mekwara otú ahụ n’onwe ya. (Matiu 26:41) Ọ bụ ezie na o ji nnọọ ọrụ n’aka site n’ụtụtụ ruo n’abalị, o wepụtara oge iji gwa Nna ya nke eluigwe okwu. Mgbe ụfọdụ, Jizọs na-ebili “n’isi ụtụtụ kwa, mgbe ọchịchịrị ka gbara,” iji kpee ekpere. (Mak 1:35) N’oge ndị ọzọ, ọ gara n’ebe nanị ya ga-anọ n’oge uhuruchi iji gwa Jehova okwu. (Matiu 14:23) Jizọs wepụtara oge mgbe nile iji kpee ekpere, otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịdị na-eme.—1 Pita 2:21.

7. Ọnọdụ ndị dị aṅaa kwesịrị ịkpali anyị ịgwa Nna anyị nke eluigwe okwu kwa ụbọchị?

7 Anyị na-enwe ọtụtụ ohere kwa ụbọchị ikpe ekpere onwe onye ka anyị na-eche nsogbu dị iche iche ihu, na-ezute ọnwụnwa, ma na-eme mkpebi. (Ndị Efesọs 6:18) Mgbe anyị na-achọ nduzi Chineke n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ, ọbụbụenyi anyị na ya na-esikwu ike. Ọ bụrụ na ndị enyi abụọ alụsoo otu nsogbu ọgụ, nke ahụ ọ́ dịghị eme ka ọbụbụenyi ha siwanye ike? (Ilu 17:17) Otú ahụ ka ọ na-adịkwa mgbe anyị dabeere na Jehova ma nweta enyemaka ya.—2 Ihe E Mere 14:11.

8. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya nke Nehemaịa, Jizọs, na Hana banyere otú ekpere onwe onye anyị kwesịrị ịha?

8 Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Chineke ekwughị ogologo oge anyị ga-eji agwa ya okwu n’ekpere ma ọ bụ ugboro ole anyị ga-eme otú ahụ! Nehemaịa kpere ekpere ngwa ngwa n’obi tupu ya arịọwa eze Peasia arịrịọ. (Nehemaịa 2:4, 5) Jizọs kpekwara ekpere dị mkpirikpi mgbe ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike iji kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. (Jọn 11:41, 42) N’aka nke ọzọ, Hana “kpere ọtụtụ ekpere n’ihu Jehova” mgbe ọ na-agwa Ya ihe nile dị ya n’obi. (1 Samuel 1:12, 15, 16) Ekpere onwe onye anyị pụrụ ịdị mkpirikpi ma ọ bụ too ogologo na-adabere ná mkpa na ọnọdụ e nwere.

9. N’ihi gịnị ka ekpere anyị ji kwesị ịgụnye otuto na ekele maka ihe nile Jehova na-emere anyị?

9 Ọtụtụ ekpere ndị e dekọrọ na Bible na-egosipụta ekele sitere n’obi maka ọnọdụ dị nnọọ elu nke Jehova na ọrụ ya ndị dị ebube. (Ọpụpụ 15:1-19; 1 Ihe E Mere 16:7-36; Abụ Ọma nke 145) N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ ndị okenye 24—ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọnọdụ ha n’eluigwe—ka ha na-eto Jehova, na-asị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” (Mkpughe 4:10, 11) Anyị onwe anyị nwekwara ihe mere anyị ga-eji na-eto Onye Okike anyị mgbe nile. Lee ka ndị nne na nna si enwe obi ụtọ mgbe nwa ha ji obi ya kelee ha maka ihe ha meere ya! Iji ekele na-atụgharị uche n’obiọma Jehova ma na-egosipụta ekele sitere n’ala ala obi anyị nwere maka ha bụ ụzọ dị mma isi mee ka ekpere anyị ka mma.

“Na-ekpenụ Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị”—N’ihi Gịnị?

10. Òkè dị aṅaa ka ekpere na-ekere n’ime ka okwukwe anyị sikwuo ike?

10 Ikpechi ekpere anya dị mkpa nye okwukwe anyị. Mgbe Jizọs kọwasịrị mkpa ọ dị “ikpe ekpere mgbe nile ma ghara ịda mbà,” ọ jụrụ sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe ahụ n’elu ụwa?” (Luk 18:1-8) Ekpere nwere nzube ma site n’obi na-ewulite okwukwe. Mgbe nna ochie ahụ bụ́ Ebreham na-eme agadi ma ọ mụtabeghị nwa, ọ gwara Chineke okwu banyere nke ahụ. Ná nzaghachi, Jehova bu ụzọ gwa ya ka o lelie anya n’eluigwe ma gụọ kpakpando ọnụ ma ọ bụrụ na ọ ga-emeli ya. Chineke mesiziri Ebreham obi ike, sị: “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.” Gịnị si na ya pụta? Ebreham “wee kwere na Jehova; O wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” (Jenesis 15:5, 6) Ọ bụrụ na anyị agwa Jehova ihe nile dị anyị n’obi n’ekpere, nakwere mmesi obi ike ọ na-enye site na Bible ma rubere ya isi, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.

11. Olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nsogbu?

11 Ekpere pụkwara inyere anyị aka idozi nsogbu. Ndụ ọ̀ na-esiri anyị ike, ọnọdụ ndị anyị na-eche ihu ataakwa akpụ? Bible na-agwa anyị, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Mgbe anyị nwere mkpebi ndị siri ike ime, anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya Jizọs. O ji otu abalị zuru ezu kpee ekpere onwe onye tupu ya ahọpụta ndịozi 12 ya. (Luk 6:12-16) N’abalị ahụ bọtakwara ụbọchị ọ nwụrụ, Jizọs kpesiri ekpere ike nke na “ọsụsọ ya dịkwa ka ntapụ ọbara nke na-atapụsị n’ala.” (Luk 22:44) Gịnị si na ya pụta? “E jikwa ihu ọma nụrụ olu ya n’ihi egwu Chineke o nwere.” (Ndị Hibru 5:7) Ikpesi ekpere ike na ikpe ya n’akwụsịghị akwụsị ga-enyere anyị aka ịnagide ọnọdụ na ọnwụnwa ndị siri ike.

12. Olee otú ekpere si egosi na Jehova nwere mmasị onwe onye n’ebe anyị nọ?

12 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji bịaruo Jehova nso site n’ekpere bụ n’ihi na ya onwe ya ga-abịarukwa anyị nso. (Jems 4:8) Mgbe anyị gwara Jehova ihe nile dị anyị n’obi n’ekpere, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe mmetụta na o nwere mmasị ná mkpa anyị ma na-elekọta anyị n’ụzọ dị nro? Anyị na-enwe mmetụta na Chineke hụrụ anyị onwe anyị n’anya. Jehova ekenyebeghị onye ọ bụla ọzọ ọrụ nke ịnụ ekpere nile ndị ohu ya na-ekpegara ya dị ka Nna ha nke eluigwe. (Abụ Ọma 66:19, 20; Luk 11:2) Ọ na-agwakwa anyị ka anyị ‘na-atụkwasị nchegbu nile anyị n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere anyị.’—1 Pita 5:6, 7.

13, 14. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị?

13 Ekpere pụrụ ime ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi maka ozi a a na-eje maka ọha ma wusie anyị ike mgbe enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide pụrụ ime ka anyị kwụsị. (Ọrụ 4:23-31) Ekpere pụkwara ichebe anyị pụọ ná “nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11, 17, 18) Mgbe anyị na-adọga ịnagide ọnwụnwa ndị anyị na-enweta kwa ụbọchị, anyị pụrụ ịnọgide na-arịọ Chineke ka ọ na-ewusi anyị ike. Ekpere nlereanya nke Jizọs gụnyere arịrịọ ka Jehova “gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu.—Matiu 6:13.

14 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka iji na-achịkwa ọchịchọ mmehie anyị, anyị ga-enweta enyemaka Jehova. Anyị nwere mmesi obi ike a: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Pọl onyeozi nwetara nlekọta na-ewusi ike site n’aka Jehova n’ọnọdụ dịgasị iche iche. “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike,” ka o kwuru.—Ndị Filipaị 4:13; 2 Ndị Kọrint 11:23-29.

Nọgidesie Ike n’Ekpere n’Agbanyeghị Adịghị Ike

15. Gịnị pụrụ ime mgbe àgwà anyị na-erughị ihe Chineke chọrọ?

15 Ka e wee jiri ihu ọma nụ ekpere anyị, anyị agaghị ajụ ndụmọdụ nke Okwu Chineke. “Anyị na-anatakwa ihe ọ bụla anyị rịọrọ n’aka ya,” ka Jọn onyeozi dere, “n’ihi na anyị na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu, na-emekwa ihe ndị dị mma n’anya ya.” (1 Jọn 3:22) Otú ọ dị, gịnị pụrụ ime mgbe àgwà anyị na-erughị ihe Chineke chọrọ? Adam na Iv zoro onwe ha mgbe ha mesịrị mmehie n’ogige Iden. Anyị pụkwara ịchọ izopụ “n’ihu Jehova” ma kwụsị ikpere ekpere. (Jenesis 3:8) “Achọpụtawo m nnọọ na ihe mbụ na-ezighị ezi ndị si n’ebe Jehova na nzukọ ya nọ kpapụ na-eme bụ na ha na-akwụsị ikpe ekpere,” ka Klaus, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke nwere ahụmahụ na-ekwu. (Ndị Hibru 2:1) Nke a bụ ihe mere n’ọnọdụ José Ángel. Ọ na-ekwu, sị: “Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asatọ, o siiri m ike ikpegara Jehova ekpere. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru ịgwa ya okwu, ọ bụ ezie na m ka weere ya dị ka Nna m nke eluigwe.”

16, 17. Nye ihe atụ otú ikpechi ekpere anya pụrụ isi nyere anyị aka imeri adịghị ike ime mmụọ.

16 Ụfọdụ n’ime anyị pụrụ iche na ha erughị eru ikpe ekpere n’ihi adịghị ike ime mmụọ ma ọ bụ n’ihi na ha mere mmehie. Ma, ọ bụ mgbe ahụ kpọmkwem ka ọ dị anyị mkpa iji ndokwa nke ikpe ekpere mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Jona gbara ọsọ site n’ọrụ e kenyere ya. Ma ‘Jona si n’ahụhụ ya kpọkuo Jehova O wee za ya, si n’ime Shiol tikuo Ya, Jehova nụrụ olu ya.’ (Jona 2:2) Jona kpere ekpere, Jehova zara ekpere ya, Jona gbakekwara n’ụzọ ime mmụọ.

17 José Ángel kpesikwara ekpere ike maka enyemaka. Ọ na-echeta, sị: “Eji m obi m dum rịọ Chineke mgbaghara. O nyekwaara m aka n’ezie. Echeghị m na m gaara alaghachi n’eziokwu ahụ ma e wezụga enyemaka m nwetara site n’ekpere. M na-ekpechizi ekpere anya kwa ụbọchị, m na-atụkwa anya oge ndị m ji ekpe ekpere.” Anyị kwesịrị inwere onwe anyị mgbe nile ịgwa Chineke banyere njehie anyị n’ezoghị ọnụ ma jiri obi umeala rịọ ya mgbaghara. Mgbe Eze Devid kwupụtasịrị mmehie ya, Jehova gbaghaara ya mmehie ya. (Abụ Ọma 32:3-5) Jehova chọrọ inyere anyị aka, ọ bụghị ịkatọ anyị. (1 Jọn 3:19, 20) Ekpere nke ndị okenye nọ n’ọgbakọ pụkwara inyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na arịrịọ ndị dị otú ahụ nwere “ike dị ukwuu.”—Jems 5:13-16.

18. Obi ike dị aṅaa ka ndị ohu Chineke pụrụ inwe n’agbanyeghị ebe ha kpafururu?

18 Olee nna nke ga-ajụ nwa ya nke ji obi umeala bịakwute ya maka enyemaka na ndụmọdụ mgbe o hiesịrị ụzọ? Ilu nke nwa mmefu ahụ na-egosi na n’agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịkpafuru, Nna anyị nke eluigwe na-enwe ọṅụ mgbe anyị laghachiri. (Luk 15:21, 22, 32) Jehova na-agba ndị nile hiere ụzọ ume ịkpọku ya, ‘ọ ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụba.’ (Aịsaịa 55:6, 7) Ọ bụ ezie na Devid mere ọtụtụ mmehie ndị dị oké njọ, ọ kpọkuru Jehova, na-asị: “Gee ntị n’ekpere m, Chineke; ezonahụkwala Onwe gị n’arịrịọ amara m.” O kwukwara, sị: “Anyasị, na ụtụtụ, na etiti ehihie, ka m ga-atụgharị uche, sụkwaa oké ude: [Jehova] ga-anụkwa olu m.” (Abụ Ọma 55:1, 17) Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-emesi obi ike!

19. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwubie na ekpere ndị o yiri ka a zaghị ha bụ ihe na-egosi na anyị enweghị ihu ọma Chineke?

19 Gịnị ma ọ bụrụ na a zaghị ekpere anyị ozugbo? Mgbe ahụ, anyị aghaghị ijide n’aka na arịrịọ anyị kwekọrọ n’uche Jehova nakwa na anyị rịọrọ ya n’aha Jizọs. (Jọn 16:23; 1 Jọn 5:14) Jems onye na-eso ụzọ kwuru banyere ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị a na-adịghị aza ekpere ha n’ihi na ha “na-arịọ maka nzube na-ezighị ezi.” (Jems 4:3) N’aka nke ọzọ, anyị ekwesịghị ịdị ngwa ikwubi na ekpere ndị yiri ka a zaghị ha bụ mgbe nile ihe na-egosi na anyị enweghị ihu ọma Chineke. Mgbe ụfọdụ, Jehova pụrụ ikwe ka ndị na-efe ya ofufe na-ekwesị ntụkwasị obi nọgide na-ekpe ekpere banyere otu ihe ruo oge ụfọdụ tupu ya azaa ha. “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu,” ka Jizọs kwuru. (Matiu 7:7) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’—Ndị Rom 12:12.

Na-ekpechi Ekpere Anya

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịdị na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a? (b) Gịnị ka anyị ga-enweta mgbe anyị na-abịaru ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova nso kwa ụbọchị?

20 Nrụgide na nsogbu na-amụba amụba “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a e ji “oge pụrụ iche nke siri ike obibi” mara. (2 Timoti 3:1) Ọnwụnwa pụkwara ịdọrọ nnọọ uche anyị n’ụzọ dị mfe. Otú ọ dị, ikpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị ga-enyere anyị aka ime ka ndụ anyị hiwe isi n’ihe ime mmụọ n’agbanyeghị nsogbu, ọnwụnwa, na ịda mbà n’obi ndị anyị nọgidere na-enwe. Ekpere anyị na-ekpegara Jehova kwa ụbọchị pụrụ inye anyị ezi nkwado dị anyị mkpa.

21 Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” adịghị mgbe ọ na-eji ọrụ n’aka gabiga ókè ige anyị ntị. (Abụ Ọma 65:2) Ka anyị ghara iji ọrụ n’aka gabiga ókè ịgwa ya okwu. Ọbụbụenyi anyị na Chineke bụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere. Ka anyị ghara iji ya gwurie egwu. “Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu na-abịaru nso n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ, ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.”—Ndị Hibru 4:16.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’aka Daniel onye amụma banyere uru ekpere bara?

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ọbụbụenyi anyị na Jehova sikwuo ike?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị?

• N’ihi gịnị ka inwe mmetụta nke erughị eru na-ejighị kwesị igbochi anyị ikpegara Jehova ekpere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Nehemaịa kpere ekpere dị mkpirikpi n’obi tupu ya agwa eze okwu

[Foto dị na peeji nke 17]

Hana “kpere ọtụtụ ekpere n’ihu Jehova”

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jizọs ji otu abalị zuru ezu kpee ekpere tupu ya ahọpụta ndịozi 12 ya

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Anyị na-enwe ọtụtụ ohere ikpe ekpere n’ụbọchị