Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ “Na-agba Ndụdụ Ndị E Ji Achị Anụ Ụkwụ”?

Ị̀ “Na-agba Ndụdụ Ndị E Ji Achị Anụ Ụkwụ”?

Ị̀ “Na-agba Ndụdụ Ndị E Ji Achị Anụ Ụkwụ”?

N’OGE Bible, ndụdụ e ji achụ ehi—ogologo osisi, nke a na-etinyekarị mpekele ígwè kapịrị ọnụ—bụ nke e ji achụ ma na-eduzi ụmụ anụmanụ e ji adọkpụ ibu dị arọ. Ọ bụrụ na anụmanụ ahụ ejiri isi ike jụ nduzi nke ndụdụ ahụ site n’ịgba ya ụkwụ, gịnị na-esi na ya apụta? Kama inweta ahụ efe, nanị ihe ọ na-akpatara onwe ya bụ ihe mgbu.

Jizọs Kraịst ahụ si n’ọnwụ bilie kwuru banyere ndụdụ ndị e ji achị anụ mgbe ọ pụtara n’ihu otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye na-aga ijide ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs. Site n’etiti ìhè na-ekpu ìsì, Sọl nụrụ ka Jizọs sịrị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m? Ịnọgide na-agba ndụdụ ndị e ji achị anụ ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike.” Site n’imegbu Ndị Kraịst, Sọl n’ezie na-alụso Chineke ọgụ, na-agbaso ụzọ nke pụrụ imerụ ya onwe ya ahụ́.—Ọrụ 26:14.

Ànyị nwere ike n’amaghị ama “na-agba ndụdụ ndị e ji achị anụ ụkwụ”? Bible ji “okwu ndị maara ihe” tụnyere ndụdụ e ji achụ ehi nke na-akpali anyị ịga n’ihu n’ụzọ ziri ezi. (Eklisiastis 12:11) Ndụmọdụ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke pụrụ ịkpali ma duzie anyị n’ụzọ ziri ezi—ma ọ bụrụ na anyị ekwe ya. (2 Timoti 3:16) Iguzogide nkwali ya pụrụ nanị imerụ anyị ahụ́.

Sọl nabatara okwu Jizọs, gbanwee ụzọ ya ma ghọọ Onye Kraịst ahụ a hụrụ n’anya bụ́ Pọl onyeozi. N’otu aka ahụ, anyị ịnabata ndụmọdụ Chineke ga-ewetara anyị ngọzi ebighị ebi.—Ilu 3:1-6.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

L. Chapons/Illustrirte Familien-Bibel nach der deutschen Uebersetzung Dr. Martin Luthers