Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-adọta Ndị Dị Umeala n’Obi n’Eziokwu Ahụ

Jehova Na-adọta Ndị Dị Umeala n’Obi n’Eziokwu Ahụ

Akụkọ Ndụ

Jehova Na-adọta Ndị Dị Umeala n’Obi n’Eziokwu Ahụ

Ị KA ASANO KOSHINO SI KỌỌ

N’afọ 1949, nanị afọ ole na ole ka Agha Ụwa nke Abụọ bisịrị, otu onye ala ọzọ topụrụ etopụ nke nwere omume enyi, bịara leta ezinụlọ m na-arụrụ ọrụ na Kobe City. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ mbụ nke Ndịàmà Jehova bịara Japan. Nleta ya nyere m ohere nke ịbụ onye a dọtara n’ebe eziokwu nke Bible dị. Ma ka m buru ụzọ kọọrọ gị otú m si tolite.

A MỤRỤ m n’afọ 1926 n’obodo nta nke dị n’ebe ugwu Okayama Prefecture. Abụ m nwa nke ise n’ime ụmụ asatọ. Papa m kwenyesiri ike na chi Shinto nke ógbè ahụ. N’ihi ya, ememe na mgbakọta nke ndị òtù ezinụlọ anyị n’oge ememe okpukpe n’oge nile n’afọ na-atọ anyị bụ́ ụmụaka ụtọ.

Ka m na-etolite, enwere m ọtụtụ ajụjụ banyere ndụ, ma ihe kasị echegbu m bụ ọnwụ. Ọdịnala anyị bụ na mmadụ ga-anwụ n’ụlọ nakwa na ụmụaka ga-anọ ya mgbe onye òtù ezinụlọ ha na-achọ ịnwụ. O wutere m nke ukwuu mgbe nne m ochie nwụrụ na mgbe nwanne m nwoke na-erubeghị otu afọ nwụrụ. Obi na-amapụ m mgbe ọ bụla m chetara na nne m na nna m ga-anwụ otu ụbọchị. ‘Nke a ọ̀ bụ n’ezie njedebe nke ihe nile? Ọ̀ dị uru ọzọ ndụ bara?’ Achọsiri m ike ịmara.

N’afọ 1937, mgbe m nọ na klass nke isii n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, Agha Ndị China na Ndị Japan malitere. A malitere idebanye aha ụmụ nwoke n’òtù ndị agha na iziga ha n’ihu agha na China. Ụmụ akwụkwọ na-edupụ nna ha na ụmụnne ha, na-eti mkpu na-asị, “banzai!” eze ukwu (ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi). Ndị mmadụ kwenyesiri ike na Japan ga-emeri, bụ́ obodo ha sịrị na ọ bụ chi na-achị ya, nakwa na eze ukwu ya bụ chi dị ndụ.

N’oge na-adịghị anya, ezinụlọ dị iche iche malitere inweta ozi ọnwụ site n’ihu agha. Ezinụlọ ndị mmadụ nwụnahụrụ ekweghị ka a kasie ha obi. Ịkpọasị malitere itolite n’ime obi ha, ha na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ọ bụla nnukwu ọdachi dakwasịrị ndị iro ha. Ma n’otu oge ahụ, echere m, sị, ‘Ọ ghaghị ịbụ na ndị iro anyị na-atakwa ahụhụ dị ka anyị onwe anyị na-ata mgbe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ.’ Ka ọ na-erule mgbe m gasịrị ụlọ akwụkwọ praịmarị, agha ahụ nọ na-agbasawanye, na-abanyekwu n’ime China.

Izute Onye Mba Ọzọ

Dị ka ndị ọrụ ugbo, ezinụlọ anyị anọwo na-abụ ndị ogbenye, ma papa m kwere ka m gụọ akwụkwọ ma ọ bụrụhaala na ọ gaghị efu ego. N’ihi ya, n’afọ 1941, abanyere m n’ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị nke dị n’Okayama City, nke dị ihe dị ka 100 kilomita site n’ụlọ anyị. E mere ụlọ akwụkwọ ahụ iji kụziere ụmụ agbọghọ otú e si abụ ezigbo ndị nwunye na ezigbo ndị nne, a na-ekenyekwa ụmụ akwụkwọ ahụ ịga soro ezinụlọ ndị bara ọgaranya biri n’obodo ukwu dị ka ndị na-amụ ọrụ ilekọta ụlọ. N’ụtụtụ, ụmụ akwụkwọ ahụ na-amụ ihe site n’ịrụ ọrụ n’ụlọ ndị a, n’oge ehihie kwa, ha na-aga akwụkwọ.

Mgbe ememe e ji nabata anyị gasịrị, onye nkụzi m, bụ́ onye yi uwe ogologo ndị Japan, kpọọrọ m gaa n’otu nnukwu ụlọ. Ma n’ihi ihe m na-amaghị, nwanyị nwe ụlọ ahụ anabataghị m. “Ànyị nweziri ike ịga n’ụlọ Oriakụ Koda?” ka onye nkụzi ahụ jụrụ. Ọ kpọọrọ m gaa n’ụlọ a rụrụ dị ka nke ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ma pịa mgbịrịgba ọnụ ụzọ ya. N’oge na-adịghị anya, otu nwanyị toro ogologo, nke ntutu isi ya na-acha awọ awọ pụtara. Ahụ kụnwụrụ m! Ọ bụghị onye Japan, ahụtụbeghịkwa m onye si Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ná ndụ m. Onye nkụzi ahụ kọwaara Oriakụ Maud Koda onye m bụ ma pụọ ozugbo ahụ. Eji m ahụ́ ịma jijiji dọkpụrụ akpa m banye n’ụlọ ahụ. Emechara m mata na Oriakụ Maud Koda bụ onye America nke lụrụ onye Japan gụrụ akwụkwọ na United States. Ọ na-akụzi asụsụ Bekee n’ụlọ akwụkwọ kọmashal.

Ọrụ biiri ọkụ n’ụtụtụ echi ya. Di Oriakụ Koda na-arịa àkwụ́kwụ̀, aghaghịkwa m inye aka ilekọta ya. Ebe ọ bụ na mụ adịghị aghọta asụsụ Bekee ma ọlị, ahụ́ eruchaghị m ala. Ahụ́ na-eru m ala ma Oriakụ Koda jiri asụsụ Japanese gwa m okwu. Kwa ụbọchị, ana m anụ ka ha na-eji asụsụ Bekee ekwurịta okwu, nke nta nke nta, ịnụ asụsụ ahụ malitekwara ịmara m ahụ́. Udo e nwere n’ebe obibi ahụ masịrị m.

Otú Maud si etinye onwe ya n’ilekọta di ya na-arịa ọrịa masịrị m nke ukwuu. Di ya nwere mmasị n’ịgụ Bible. Emechara m chọpụta na di na nwunye ahụ zụtara akwụkwọ bụ́ The Divine Plan of the Ages n’asụsụ Japanese site n’ebe a na-ere akwụkwọ ndị mere ochie nakwa na ha atụwo ọda Ụlọ Nche Bekee ruo ọtụtụ afọ.

Otu ụbọchị, e nyere m Bible dị ka onyinye. Obi dị m ụtọ n’ihi na nke ahụ bụ nke mbụ ná ndụ m m na-enwe Bible nke m. Ana m agụ ya mgbe m na-aga na mgbe m na-alọta akwụkwọ ma adịghị m aghọtacha ihe m na-agụ. Ebe ọ bụ na a zụlitere m dị ka onye Shinto nke Japan, amaghị m ihe ọ bụla banyere Jizọs Kraịst. Amaghị m na nke ahụ bụ mmalite nke ihe ga-emesị duje m n’ịnata eziokwu Bible, bụ́ nke ga-aza ajụjụ ndị m nwere banyere ndụ na ọnwụ.

Ihe Mwute Atọ

Afọ abụọ nke ịmụ ọrụ m bịara ná njedebe n’oge na-adịghị anya, aghaghịkwa m ịsị ndị ezinụlọ ahụ nọdụ nke ọma. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, esonyeere m òtù girls brigade ma kere òkè n’ịkwa ákwà ndị agha ụgbọ mmiri. Ụgbọelu B-29 nke ndị America na-atụ bọmbụ malitere ime mwakpo, a tụkwara bọmbụ atọm na Hiroshima n’August 6, 1945. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, enwetara m ozi teligram na mama m nọ n’oké ọrịa. Eso m ụgbọ okporo ígwè nke mbụ laa. Mgbe m si n’ụgbọ okporo ígwè rịtuo, otu onye ikwu m bịakwutere m ma gwa m na mama m anwụọla. Ọ nwụrụ n’August 11. Ihe m na-atụ ụjọ ya kemgbe ọtụtụ afọ emeela! Ọ gakwaghị na-ekwunyere m okwu ma ọ bụ na-achịsara m ọchị.

N’August 15, e meriri Japan. N’ihi ya, echere m ihe omume atọ na-akpata mwute ihu, ha nile n’ụbọchị iri nanị: bọmbụ atọm nke mbụ gbawaranụ, ọnwụ mama m na mmeri mere ihe akụkọ e meriri Japan. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmata na ndị mmadụ agaghịzi na-anwụ n’agha ahụ. Eji m oké mwute hapụ ụlọ ọrụ ahụ ma laghachi n’obodo m.

Ịbụ Onye A Dọtara n’Eziokwu Ahụ

Otu ụbọchị, n’ụzọ m na-atụghị anya ya, enwetara m akwụkwọ ozi site n’aka Maud Koda n’Okayama. Ọ jụrụ ma m nwere ike ịbịa nyere ya aka n’ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ ebe ọ bụ na ọ chọrọ imepe ụlọ akwụkwọ Bekee. Echere m ihe m ga-eme, ma anakweere m ọkpụkpọ òkù ya. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, agara m binyere ndị ezinụlọ Koda na Kobe.

Ná mmalite oge okpomọkụ nke afọ 1949, otu nwa amadị topụrụ etopụ nke nwere omume enyi letara ezinụlọ Koda. Aha ya bụ Donald Haslett, o siwokwa Tokyo bịa Kobe ịchọ ebe ndị ozi ala ọzọ ga-ebi na Kobe. Ọ bụ ya bụ onye ozi ala ọzọ mbụ nke Ndịàmà Jehova bịara Japan. Ọ chọtara ụlọ, na November 1949 kwa, ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ batara na Kobe. Otu ụbọchị, ise n’ime ha bịara ileta ndị ezinụlọ Koda. Abụọ n’ime ha, Lloyd Barry na Percy Iszlaub, n’otu n’otu gwara ndị nile nọ n’ụlọ ahụ okwu n’asụsụ Bekee ruo ihe dị ka minit iri. A maara Maud dị ka nwanna nwanyị Onye Kraịst nke ndị ozi ala ọzọ ahụ, o dokwara anya na mkpakọrịta dị otú ahụ gbara ya ume. Ọ bụ n’oge ahụ ka a kwaliri m ịmụ asụsụ Bekee.

Site n’enyemaka nke ndị ozi ala ọzọ ahụ na-anụ ọkụ n’obi, abịara m mụta eziokwu Bible ndị bụ́ isi. Achọtara m azịza nye ajụjụ ndị m nwere site n’oge m ka bụ nwata. Ee, Bible na-enye olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala na olileanya nke mbilite n’ọnwụ nke “ndị nile nọ n’ili ncheta.” (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:1, 4) Ekelere m Jehova maka ime ka olileanya ahụ kwe omume site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst.

Ọrụ Ọchịchị Chineke Na-enye Obi Ụtọ

Malite na December 30, 1949, ruo January 1, 1950, e mere mgbakọ ọchịchị Chineke mbụ na Japan n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Kobe. Mụ na maud so gaa. Ọ bụ onye Nazi nwebu nnukwu ụlọ ahụ, nke a na-anọ na ya ahụ Oké Osimiri Inland na àgwàetiti mara mma nke Awaji. N’ihi inwe ihe ọmụma Bible dị nta, aghọtachaghị m ihe e kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndị ozi ala ọzọ ahụ, bụ́ ndị sooro ndị Japan na-akpakọrịta n’enweghị ihe mgbochi, masịrị m nke ukwuu. Ngụkọta nke mmadụ 101 bịara nụrụ okwu ihu ọha ná mgbakọ a.

Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, ekpebiri m iso gaa ozi ubi. Obi ike dị m mkpa iji gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ebe ọ bụ na abụ m onye ihere site n’ọmụmụ. N’otu ụtụtụ, Nwanna Lloyd Barry bịara n’ụlọ anyị ịkpọrọ m gaa ozi. Ọ malitere n’ụlọ dị n’akụkụ ụlọ Nwanna Nwanyị Koda. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na m na-ezo n’azụ ya ka m na-ege ihe ọ na-agwa ndị nwe ụlọ. Mgbe m pụtara ozi nke ugboro abụọ, mụ na ndị ozi ala ọzọ abụọ ọzọ rụrụ. Otu nwanyị onye Japan meworo agadi nabatara anyị, gee ntị, ma mesịa nye anyị otu iko mmiri ara ehi n’otu n’otu. Ọ nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi ma mesịa ghọọ Onye Kraịst e mere baptizim. Ọ bụ ihe na-agba ume ịhụ ọganihu ya.

N’April 1951, Nwanna Nathan H. Knorr, onye si n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, letara Japan nke mbụ ya. Ihe dị ka mmadụ 700 bịara gere okwu ihu ọha o kwuru n’Ụlọ Mgbakọ Kyoritsu na Kanda, Tokyo. Ná nzukọ a pụrụ iche, ndị nile bịaranụ ṅụrịrị ọṅụ ná mwepụta nke Ụlọ Nche n’asụsụ Japanese. N’ọnwa na-esonụ, Nwanna Knorr bịara Kobe, ná nzukọ pụrụ iche e nwekwara n’ebe ahụ, e mere m baptizim ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova.

Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, a gbara m ume ịbanye n’ozi oge nile, ọrụ ọsụ ụzọ. E nwere nanị ndị ọsụ ụzọ ole na ole na Japan n’oge ahụ, echekwara m echiche banyere otú m ga-esi na-akwado onwe m. Echekwara m banyere olileanya m nke ịlụ di. Ma abịara m ghọta na ijere Jehova ozi kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ, n’ihi ya, abanyere m n’ozi ọsụ ụzọ n’afọ 1952. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, m na-arụrụ Nwanna Nwanyị Koda ọrụ nwa oge, na-asụkwa ụzọ.

Ihe dị ka n’oge ahụ, nwanne m nwoke, bụ́ onye m chere na ọ nwụrụ n’agha si Taiwan kpọrọ ezinụlọ ya lọta. Ezinụlọ m egositụbeghị mmasị n’Iso Ụzọ Kraịst, ma n’ihi ịnụ ọkụ n’obi m dị ka onye ọsụ ụzọ, amalitere m izigara ha magazin na akwụkwọ nta anyị dị iche iche. Ka e mesịrị, nwanne m nwoke na ezinụlọ ya kwagara Kobe n’ihi ọrụ ya. “Ùnu agụwo magazin ndị ahụ?” ka m jụrụ nwunye nwanne m nwoke. N’ụzọ tụrụ m n’anya, ọ zaghachiri, sị, “Magazin ndị ahụ dị ụtọ ọgụgụ.” Ya na otu n’ime ndị ozi ala ọzọ malitere ịmụ Bible, nwanne m nwanyị nke obere nke ya na ha bi malitekwara isonyere ya n’ọmụmụ ihe ya. Ka oge na-aga, ha abụọ ghọrọ Ndị Kraịst e mere baptizim.

Ịbụ Onye Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ Dọtara Mmasị Ya

N’oge na-adịghị anya ka nke ahụ gsịrị, ọ tụrụ m n’anya mgbe a kpọrọ m ịga Klas nke 22 nke Watchtower Bible School of Gilead. Mụ na Nwanna Tsutomu Fukase bụ ndị mbụ a kpọrọ maka ụlọ akwụkwọ ahụ site na Japan. N’afọ 1953, tupu ụlọ akwụkwọ ahụ amalite, anyị gara Mgbakọ nke Òtù Ụwa Ọhụrụ na Yankee Stadium, New York. Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị Jehova masịrị m nnọọ nke ukwuu.

N’ụbọchị nke ise nke mgbakọ ahụ, ndị si Japan bịa, karịsịa ndị ozi ala ọzọ ga-eyi uwe ogologo ndị Japan. Ebe ọ bụ na uwe ogologo nke m m tinyere n’ụgbọ erutebeghị, agbaziiri m nke Nwanna Nwanyị Knorr. Mgbe ihe omume ahụ na-aga n’ihu, mmiri malitere izo, ụjọ malitekwara ịtụ m na mmiri ga-ama uwe ogologo ahụ. Ozugbo ahụ, otu onye bịara si n’azụ yinye m uwe mmiri. “Ị maara onye ọ bụ?” ka otu nwanna nwanyị guzo n’akụkụ m jụrụ. Emechara m chọpụta na ọ bụ Nwanna Frederick W. Franz, onye so n’Òtù Na-achị Isi. Lee otú m siri nweta mmetụta na-ekpo ọkụ nke nzukọ Jehova!

Klas nke 22 nke Gilead bụ n’ezie nke mba nile, na-enwe ụmụ akwụkwọ 120 ndị sitere ná mba 37. Ọ bụ ezie na e nwere ihe mgbochi ụfọdụ n’ihi asụsụ, anyị nụrụ ụtọ mkpakọrịta ụmụnna ndị sitere ná mba nile n’ụzọ zuru ezu. N’ụbọchị snow na-ada na February 1954, agụchara m akwụkwọ, e zighachikwa m Japan. Nwa klas m bụ́ Inger Brandt, onye Sweden bụ onye ọrụ ibe m na Nagoya City. N’ebe ahụ, anyị sonyeere ìgwè ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị a kpọpụrụ na Korea n’ihi agha. Afọ ole na ole ahụ m jere ozi dị ka onye ozi ala ọzọ dị oké ọnụ ahịa nye m.

Iji Ọṅụ Eje Ozi Dị Ka Di na Nwunye

Na September 1957, a kpọrọ m ije ozi na Betel dị na Tokyo. Ọ bụ otu ụlọ elu e ji osisi rụọ nke dị okpukpu abụọ ka e ji mere alaka ụlọ ọrụ Japan. N’alaka ahụ, e nwere nanị mmadụ anọ, gụnyere Nwanna Barry bụ́ onye nlekọta alaka ahụ. Ndị òtù ezinụlọ ndị ọzọ nile bụzi ndị ozi ala ọzọ. E kenyere m ịrụ ọrụ ná ngalaba nsụgharị na ngụgharị, nakwa ná ngalaba na-ahụ maka ịdị ọcha, ebe a na-asụ ákwà, kichin, nakwa n’ebe ndị ọzọ.

Ọrụ e nwere na Japan nọ na-amụba, a kpọkwara ụmụnna ndị ọzọ ịbịa Betel. Otu n’ime ha ghọrọ onye nlekọta n’ọgbakọ m nọ na ya. N’afọ 1966, mụ na nwanna ahụ bụ́ Junji Koshino lụrụ di na nwunye. Mgbe anyị gbachara akwụkwọ, e nyere Junji ọrụ sekit. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmata ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ ka anyị na-aga ọgbakọ dị iche iche. Ebe ọ bụ na e nyere m ọrụ ịsụgharị ihe ụfọdụ, ana m eme ya n’ebe ọ bụla anyị nọ n’izu ahụ. Ka anyị na-agagharị, anyị na-ebu akwụkwọ ọkọwa okwu ndị dị arọ, tinyere akpa ákwà anyị na akpa ndị ọzọ.

Anyị rụrụ ọrụ sekit ruo afọ anọ ma hụ ka nzukọ a nọgidere na-amụba. E bufere alaka ahụ na Numazu, ka ọtụtụ afọ gasịkwara, e bufere ya Ebina, bụ́ ebe alaka ahụ dị ugbu a. Mụ na Junji anọwo na-anụ ụtọ ọrụ Betel ruo ogologo oge, ugbu a anyị sokwa ezinụlọ Betel ahụ nwere ihe ruru mmadụ 600 na-arụ ọrụ. Na May 2002, ndị enyi m na Betel ji obi ọma mee ememe ncheta afọ 50 m nọworo n’ozi oge nile.

Inwe Obi Ụtọ Ịhụ Mmụba

Mgbe m malitere ijere Jehova ozi laa azụ n’afọ 1950, e nwere nanị ndị nkwusa ole na ole na Japan. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 210,000. N’ezie, a dọtawo ọtụtụ puku ndị yiri atụrụ n’ebe Jehova nọ dịkwa ka a dọtara m.

Ndị ozi ala ọzọ anọ ahụ bịara n’ụlọ Nwanna Nwanyị Koda n’afọ 1949, nakwa Nwanna Nwanyị Maud Koda n’onwe ya ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi jechaa ozi ha. Otú a kwa ka ọ dị nwanne m nwoke, bụ́ onye jere ozi dị ka ohu na-eje ozi, nakwa nwunye nwanne m nwoke, bụ́ onye sụrụ ụzọ ruo afọ 15. Gịnị ga-abụ olileanya dịịrị ndị mụrụ m n’ọdịnihu, bụ́ ndị m tụrụ ụjọ ọnwụ ha n’oge m bụ nwata? Nkwa Bible nke mbilite n’ọnwụ na-enye m olileanya na nkasi obi.—Ọrụ 24:15.

Ka m na-eleghachi anya azụ, ana m eche na nzute m zutere Maud na 1941 bụ oge oké mgbanwe ná ndụ m. A sị na ezuteghị m ya n’oge ahụ, ma ọ bụ na anakwereghị m òkù ahụ ọ kpọrọ m ịrụrụ ya ọrụ ọzọ mgbe agha biri, agaara m anọ n’ugbo anyị n’ime ime obodo, ọ gaghịkwa enwe otú mụ na ndị ozi ala ọzọ ahụ ga-esi mata n’oge ahụ. Lee ka m si nwee ekele dị ukwuu nye Jehova maka ndọta ọ dọtara m n’eziokwu ahụ site n’aka Maud na ndị ozi ala ọzọ oge mbụ ahụ!

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na Maud Koda na dị ya. Anọ m n’ihu n’aka ekpe

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na ndị ozi ala ọzọ si Japan na Yankee Stadium na 1953. Anọ m n’isi isi aka ekpe

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Mụ na di m bụ́ Junji na Betel