Ndị A Kpagburu n’Ihi Ezi Omume
Ndị A Kpagburu n’Ihi Ezi Omume
“Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume.”—MATIU 5:10.
1. N’ihi gịnị ka Jizọs ji bịa n’ihu Pọntịọs Paịlet, gịnịkwa ka Jizọs kwuru?
“Ọ BỤ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Mgbe Jizọs kwuru okwu ndị a, ọ nọ n’ihu Pọntịọs Paịlet, Gọvanọ Judia bụ́ onye Rom. Jizọs gara ebe ahụ ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ ịga ebe ahụ, ọ bụghịkwa n’ihi na Paịlet kpọrọ ya òkù. Kama nke ahụ, ọ nọ ebe ahụ n’ihi na ndị ndú okpukpe ndị Juu boro ya ebubo ụgha nke ịbụ onye mmehie kwesịrị ọnwụ.—Jọn 18:29-31.
2. Gịnị ka Jizọs mere, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
2 Jizọs maara nke ọma na Paịlet nwere ikike ịtọhapụ ya ma ọ bụ igbu ya. (Jọn 19:10) Ma nke ahụ emeghị ka ọ ghara ịgwa Paịlet okwu banyere Alaeze ahụ n’atụghị egwu. Ọ bụ ezie na ndụ Jizọs nọ n’ihe ize ndụ, o jiri ohere ahụ mee ihe iji gbaara onye ọchịchị kachasịnụ e nwere n’ógbè ahụ àmà. N’agbanyeghị àmà ahụ ọ gbara, a mara Jizọs ikpe ma gbuo ya, ọ nwụkwara ọnwụ ahụhụ n’osisi ịta ahụhụ n’ihi okwukwe ya.—Matiu 27:24-26; Mak 15:15; Luk 23:24, 25; Jọn 19:13-16.
Onye Àmà Ka Ọ̀ Bụ Onye Nwụrụ n’Ihi Okwukwe Ya?
3. Gịnị ka okwu Bekee ahụ a sụgharịrị ịbụ “onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya” pụtara n’oge Bible, ma gịnị ka ọ pụtara taa?
3 Ọtụtụ ndị taa na-eji onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya atụnyere onye na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè, onye bu okpukpe n’isi. A na-enyokarị ndị dị njikere ịnwụ n’ihi ihe ha kweere, karịsịa n’ihi nkwenkwe okpukpe, enyo dị ka ndị na-eyi ọha egwu ma ọ bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ dị ka ndị bụ́ ihe ize ndụ nye ọha na eze. Otú ọ dị, okwu Bekee a sụgharịrị ịbụ onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya sitere n’okwu Grik (marʹtys) nke pụtara n’oge Bible, “onye àmà,” onye na-agba akaebe banyere eziokwu ma ọ bụ ihe o kweere, ma eleghị anya mgbe a na-ekpe ikpe n’ụlọikpe. Ọ bụ mgbe e mesịrị ka okwu ahụ bịaziri pụta “onye nyere ndụ ya n’ihi ịgba àmà,” ma ọ bụ ọbụna mmadụ ịgba àmà site n’inye ndụ ya.
4. N’ụzọ bụ́ isi, olee otú okwu Grik ahụ bụ́ marʹtys si metụta Jizọs?
4 N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ihe mbụ okwu Grik ahụ Jọn 2:23; 8:30) Ìgwè mmadụ n’ozuzu ha na karịsịa ndị ndú okpukpe meghachikwara omume n’ụzọ siri ike—ma dị njọ. Jizọs gwara ndị ikwu ya na-ekweghị ekwe, sị: “Ụwa enweghị ihe mere ọ ga-eji kpọọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị, n’ihi na m na-agba àmà banyere ya na ọrụ ya dị njọ.” (Jọn 7:7) Site n’ịgbara eziokwu ahụ àmà, ndị ndú nke mba ahụ wesara Jizọs iwe, bụ́ nke dugara n’ọnwụ ya. N’ezie, ọ bụ “ezi onye àmà ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi (marʹtys).”—Mkpughe 3:14.
bụ́ marʹtys pụtara metụtara Jizọs. Dị ka ọ gwara Paịlet, ọ bịara ‘ịgbara eziokwu ahụ àmà.’ Ịgba àmà ya mere ka ndị mmadụ meghachi nnọọ omume n’ụzọ dịgasị iche. Ihe ụfọdụ n’etiti ndị nkịtị nụrụ ma hụ kpaliri ha n’ụzọ dị ukwuu, ha nwekwara okwukwe n’ebe Jizọs nọ. (‘A Ga-akpọ Unu Asị’
5. Ná mmalite nke ozi ya, gịnị ka Jizọs kwuru banyere mkpagbu?
5 Ọ bụghị nanị na Jizọs n’onwe ya nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, kamakwa o bu ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na ha ga-enwetakwa mkpagbu. Ná mmalite nke ozi ya, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.”—Matiu 5:10-12.
6. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jizọs nyere mgbe ọ na-ezipụ ndịozi 12 ahụ?
6 Ka e mesịrị, mgbe Jizọs na-ezipụ ndịozi 12, ọ gwara ha, sị: “Nọrọnụ na nche maka ụmụ mmadụ; n’ihi na ha ga-enyefe unu n’ụlọikpe obodo, ha ga-apịakwa unu ihe n’ụlọ nzukọ ha. N’ezie, a ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.” Ma ọ bụghị nanị ndị ndú okpukpe ga-akpagbu ndị ahụ na-eso ụzọ. Jizọs kwukwara, sị: “Nwanne ga-enyefe nwanne Matiu 10:17, 18, 21, 22) Akụkọ ihe mere eme nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-agba akaebe na okwu ndị a bụ eziokwu.
ya n’aka ọnwụ, nna ga-enyefekwa nwa ya, ụmụ ga-ebilikwa megide nne na nna, ha ga-emekwa ka e gbuo ha. Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m; ma onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Ihe Ndekọ nke Iji Ikwesị Ntụkwasị Obi Atachi Obi
7. Gịnị mere ka Stivin bụrụ onye nwụrụ n’ihi okwukwe ya?
7 N’oge na-adịghị anya ka Jizọs nwụsịrị, Stivin ghọrọ Onye Kraịst mbụ nwụrụ n’ihi ịgbara eziokwu ahụ àmà. O ‘jupụtara n’amara na ike, ọ nọkwa na-eme oké ihe àmà ndị dị ebube na ihe ịrịba ama n’etiti ndị mmadụ.’ Ndị okpukpe bụ́ ndị iro ya “apụghị iguzogide amamihe na mmụọ o ji na-ekwu okwu.” (Ọrụ 6:8, 10) N’ịbụ ndị ekworo juru obi, ha kpụpụrụ Stivin na Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu ndị Juu, ebe e boro ya ebubo ụgha, ọ gbakwara àmà siri ike. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ndị iro Stivin gburu nwoke a ji ikwesị ntụkwasị obi gbaa àmà.—Ọrụ 7:59, 60.
8. Olee otú ndị ahụ na-eso ụzọ nọ na Jeruselem si meghachi omume ná mkpagbu bịakwasịrị ha mgbe Stivin nwụsịrị?
8 Mgbe e gbusịrị Stivin, “mkpagbu dị ukwuu bilitere megide ọgbakọ ahụ dị na Jeruselem; a chụsasịrị mmadụ nile n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria, ma e wezụga ndịozi.” (Ọrụ 8:1) Mkpagbu ọ̀ kwụsịrị ịgba àmà nke Ndị Kraịst? N’ụzọ megidere nke ahụ, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na “ndị ahụ a chụsasịworo gazuru ala ahụ na-akpọsa ozi ọma banyere okwu ahụ.” (Ọrụ 8:4) Ha aghaghị inweworị mmetụta Pita onyeozi nwere mgbe o kwuru tupu mgbe ahụ, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’agbanyeghị mkpagbu ahụ, ndị na-eso ụzọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi obi kara nọgidere n’ọrụ nke ịgbara eziokwu ahụ àmà, ọ bụ ezie na ha maara na nke a ga-akpatakwuru ha ihe isi ike.—Ọrụ 11:19-21.
9. Mkpagbu dị aṅaa nọgidere na-abịakwasị ụmụazụ Jizọs?
9 N’ezie, ihe isi ike ebelataghị. Nke mbụ, anyị mụtara na Sọl—bụ́ onye kwadoro ntugbu a tụgburu Stivin—“n’ịbụ onye ka na-ekupụ iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru nnukwu onye nchụàjà ma rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji gaa ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs, ka o wee kpụta onye ọ bụla bụ́ onye òtù Ụzọ Ahụ n’agbụ bịa Jeruselem, ma ndị ikom ma ndị inyom.” (Ọrụ 9:1, 2) Mgbe ahụ, n’ihe dị ka afọ 44 O.A., “Herọd bụ́ eze weliri aka ya imeso ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ mmeso ọjọọ. O ji mma agha gbufuo Jems nwanne Jọn.”—Ọrụ 12:1, 2.
10. Ihe ndekọ dị aṅaa nke mkpagbu ka anyị na-achọta n’Ọrụ Ndịozi na Mkpughe?
10 Akụkụ ndị fọdụrụnụ nke akwụkwọ Ọrụ Ndịozi nwere ihe ndekọ nke ule, ịtụ mkpọrọ, na mkpagbu ndị ndị kwesịrị ntụkwasị obi tachiri obi na ha, ndị dị ka Pọl, onye bụbu onye mkpagbu mesịrị ghọọ onyeozi, bụ́ onye o yikwara ka Eze Ukwu Rom bụ́ Nero gburu n’ihi okwukwe ya n’ihe dị ka 65 O.A. (2 Ndị Kọrint 11:23-27; 2 Timoti 4:6-8) N’ikpeazụ, n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke e dere ná ngwụsị narị afọ mbụ, anyị hụrụ na a tụrụ Jọn onyeozi meworo agadi mkpọrọ n’àgwàetiti a na-achụga ndị mkpọrọ nke Patmọs “n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.” Ná Mkpughe e kwukwara banyere “Antipas, bụ́ onye àmà m, onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ onye e gburu” na Pagamọm.—Mkpughe 1:9; 2:13.
11. Olee otú ọnọdụ Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na ihe Jizọs kwuru banyere mkpagbu bụ eziokwu?
Jọn 15:20) Ndị Kraịst oge mbụ kwesịrị ntụkwasị obi dị njikere iche ule kasịnụ ihu, ọnwụ—site ná mmekpọ ọnụ, site n’ịbụ ndị a tụbaara anụ ọhịa, ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ—iji rụzuo ọrụ ahụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nyere ha: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.
11 Ihe ndị a nile gosiri ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (12. Gịnị mere na mkpagbu nke Ndị Kraịst abụghị nanị ihe mere n’oge gara aga?
12 Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ụdị mmeso obi ọjọọ a e mesoro ụmụazụ Jizọs bụ ihe mere nanị n’oge gara aga, o hiere nnọọ ụzọ. Pọl bụ́ onye, dị ka anyị hụworo, tachiri obi n’ọtụtụ ihe isi ike dere, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Banyere mkpagbu, Pita sịrị: “N’eziokwu, ọ bụ n’ụzọ a ka a kpọrọ unu, n’ihi na ọbụna Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Ọbụna ruo “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a, a nọgidewo na-akpagbu ma na-emeso ndị Jehova mmeso obi ọjọọ. (2 Timoti 3:1) N’akụkụ nile nke ụwa, n’okpuru ọchịchị aka ike na nke onye kwuo uche ya, Ndịàmà Jehova, n’otu n’otu ma n’ozuzu, enwetawo mkpagbu n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Kpọọ Ha Asị Ma Na-akpagbu Ha?
13. Gịnị ka ndị ohu Jehova nke oge a kwesịrị iburu n’uche banyere mkpagbu?
13 Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị taa nwetụụrụ onwe anyị ịrụ ọrụ nkwusa na izukọta n’udo, anyị aghaghị ịṅa ntị n’ihe ncheta Bible nke bụ́ na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Ihe pụrụ ịgbanwe ngwa ngwa nke na ọ gwụla ma ànyị kwadebere onwe anyị n’uche, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ, ọ pụrụ ịdị mfe anyị ịsụ ngọngọ. Mgbe ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ime iji chebe onwe anyị? Ụzọ kasị irè isi chebe onwe anyị bụ iburu n’uche ihe mere e ji kpọọ Ndị Kraịst hụrụ udo n’anya ma na-erube isi n’iwu asị ma na-akpagbu ha.
14. Gịnị ka Pita kwuru na ọ bụ ihe mere e ji akpagbu Ndị Kraịst?
14 Pita onyeozi kwuru okwu banyere nke a n’akwụkwọ ozi ya nke mbụ, bụ́ nke o dere n’ihe dị ka 62-64 O.A., mgbe Ndị Kraịst nọ n’Alaeze Ukwu Rom nọ na-enweta ule na mkpagbu. Ọ sịrị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-agba n’etiti unu, nke na-eme ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ihe a na-amaghị ama na-adakwasị unu.” Iji kọwaa ihe o bu n’uche, Pita gara n’ihu ikwu, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ dị ka onye na-egbu ọchụ ma ọ bụ onye ohi ma ọ bụ onye ajọ omume ma ọ bụ dị ka onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na ọ na-ata ahụhụ dị ka Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya, kama ka ọ nọgide na-enye Chineke otuto n’aha nke a.” Pita mere ka o doo anya na ha na-ata ahụhụ, ọ bụghị n’ihi na ha mere ihe ọjọọ ọ bụla, kama n’ihi ndị ha bụ. Ọ bụrụ na ha nọ na-awagharị “n’otu ndụ ịla n’iyi a” dị ka ndị mmadụ gbara ha gburugburu na-eme, ha gaara anabata ha. Ma n’ezie, ha na-ata ahụhụ n’ihi na ha na-agbalị ịrụzu ọrụ ha dị ka ụmụazụ Kraịst. Otú ahụkwa ka ọ dị ezi Ndị Kraịst taa.—1 Pita 4:4, 12, 15, 16.
15. Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-emegiderịta onwe ha ka a na-ahụ ná mmeso a na-emeso Ndịàmà Jehova taa?
15 N’ọtụtụ akụkụ ụwa, a na-eto Ndịàmà Jehova n’ihu ọha n’ihi ịdị n’otu na ịrụkọ ọrụ ọnụ ha na-egosipụta ná mgbakọ ha na n’ebe ndị ha na-ewu ihe owuwu, n’ihi ịkwụwa aka ọtọ na ịdị uchu ha, n’ihi omume ọma na ndụ ezinụlọ ha kwesịrị nṅomi, nakwa ọbụna n’ihi ọdịdị ha dị mma na ụzọ ha si akpa àgwà. * N’aka nke ọzọ, mgbe a na-ede isiokwu a, e nwere ihe na-adịghị ala karịa ala 28 ebe a machibidoro ọrụ ha iwu ma ọ bụ gbochie ya, a na-etikwa ọtụtụ n’ime Ndịàmà ihe, ihe ndị ha nwere na-efunahụkwa ha n’ihi okwukwe ha. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọnọdụ ndị a na-emegiderịta nnọọ onwe ha? N’ihi gịnịkwa ka Chineke ji kwere ka ọ dị otú ahụ?
16. Olee ihe mbụ mere Chineke ji kwere ka a na-akpagbu ndị ya?
16 Nke mbụ, anyị kwesịrị iburu n’uche ihe ahụ dị n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Ee, ọ bụ n’ihi ihe iseokwu nọworo ogologo oge nke ọbụbụeze eluigwe na ala. N’agbanyeghị ọtụtụ ihe àmà nke ndị nile gosipụtaworo iguzosi ike n’ihe ha nye Jehova kemgbe ọtụtụ narị afọ nyeworo, Setan akwụsịbeghị ịta Jehova ụta dị ka o mere n’oge onye ezi omume ahụ bụ́ Job. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Obi abụọ adịghị ya na Setan na-agbasi mbọ ike ná mgbalị ikpeazụ ya ịkwado nzọrọ ya ugbu a e guzobeworo Alaeze Chineke, Alaeze ahụ enweekwa ndị ọ na-achị na ndị nnọchiteanya na-eguzosi ike n’ihe gburugburu ụwa. Ndị a nile hà ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ahụhụ na ihe isi ike pụrụ ịbịakwasị ha? Nke a bụ ajụjụ nke ohu Jehova ọ bụla na-aghaghị ịza n’onwe ya.—Mkpughe 12:12, 17.
17. Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na “ọ ga-aghọrọ unu ohere iji gbaa àmà”?
17 N’ịgwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ ná “ngwụsị nke usoro ihe a,” Jizọs gosiri ihe ọzọ mere Jehova ji kwere ka mkpagbu na-abịakwasị ndị ohu ya. Ọ gwara ha, sị: “A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m. Ọ ga-aghọrọ unu ohere iji gbaa àmà.” (Matiu 24:3, 9; Luk 21:12, 13) Jizọs n’onwe ya gbaara Herọd na Pọntiọs Paịlet àmà. A kpụgakwara Pọl onyeozi “n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ.” N’ịbụ onye Onyenwe anyị Jizọs Kraịst duziri, Pọl chọsiri ike ịgbara onye ọchịchị kasị ike nke oge ahụ àmà mgbe o kwuru, sị: “Ana m arịọ ka Siza kpegharịa ikpe m!” (Ọrụ 23:11; 25:8-12) N’otu aka ahụ taa, ọnọdụ ndị na-ama aka arụpụtawo ịgbara ma ndị ọchịchị ma ọha na eze àmà. *
18, 19. (a) Olee otú ịnagide ule ga-esi baara anyị uru? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
18 N’ikpeazụ, ịnagide ule na mkpagbu pụrụ ịbara anyị onwe anyị uru. N’ụzọ dị aṅaa? Jems onye na-eso ụzọ chetaara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Gụọnụ ya dị ka nanị ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na ọdịdị okwukwe unu a bụ́ nke e lere ule na-arụpụta ntachi obi.” Ee, mkpagbu pụrụ ịnụcha okwukwe anyị ma wusikwuo ntachi obi anyị ike. Ya mere, anyị adịghị atụ ya ụjọ, anyị adịghịkwa achọ iji ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị zere ya ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị. Kama nke ahụ, anyị na-aṅa ntị na ndụmọdụ Jems, bụ́: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu ma gbasie ike n’ụzọ nile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.”—Jems 1:2-4.
19 Ọ bụ ezie na Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere e ji akpagbu ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi na ihe mere Jehova ji kwere ka ọ dị otú ahụ, nke ahụ adịghị emecha ka ọ dị mfe ịnagide mkpagbu. Gịnị pụrụ iwusi anyị ike ịnagide ya? Gịnị ka anyị pụrụ ime mgbe mkpagbu chere anyị ihu? Anyị ga-atụle isi ihe ndị a dị mkpa n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Lee Ụlọ Nche nke December 15, 1995, peeji nke 27-29; April 15, 1994, peeji nke 16-17; na Teta! (Bekee) nke December 22, 1993, peeji nke 6-13.
^ par. 17 Lee Teta! nke January 8, 2003, peeji nke 3-11.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• N’ụzọ bụ́ isi, olee otú okwu Grik ahụ bụ́ marʹtys si metụta Jizọs?
• Mmetụta dị aṅaa ka mkpagbu nwere n’ahụ́ Ndị Kraịst narị afọ mbụ?
• Dị ka Pita kọwara, n’ihi gịnị ka e ji kpagbuo Ndị Kraịst oge mbụ?
• Olee ihe ndị mere Jehova ji kwere ka mkpagbu na-abịakwasị ndị ohu ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]
Ndị Kraịst narị afọ mbụ tara ahụhụ, ọ bụghị n’ihi na ha mere ihe ọjọọ ọ bụla, kama n’ihi ndị ha bụ
PỌL
JỌN
ANTIPAS
JEMS
STIVIN