Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”

“Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Nke A Bụ Ihe Ọhụrụ!”

DOROTA, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova na Poland, sooro nwa ya nwoke dị afọ 14 gaa na nke dọkịta ụlọ akwụkwọ ha maka ile ahụ́ a na-eme mgbe nile. Mgbe dọkịta ahụ, bụ́ Janina, * na-ele nwa Dorota ahụ́, ọ jụrụ ya ihe nwa ya nwoke na-arụ n’ụlọ.

“Mgbe m na-enweghị ike isi nri, nwa m nwoke na-akwadebe ihe oriri maka anyị mmadụ isii nile nọ n’ezinụlọ anyị,” ka Dorota zara. “Ọ na-ehichakwa ụlọ ma na-enye aka n’idozi ihe ndị mebiri emebi n’ebe obibi anyị. Ọ na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ. Ọ bụ ezigbo nwata akwụkwọ.”

“Nke ahụ dị ịtụnanya,” ka Janina kwuru. “Anọwo m na-arụ ọrụ n’ebe a ruo afọ 12, anụtụbeghịkwa m ihe dị ka nke a.”

N’ịchọpụta na nke a bụ ohere iji gbaa àmà, Dorota kọwara, sị: “Ọtụtụ ndị nne na nna taa adịghị enye ụmụ ha ọzụzụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ya mere ụmụ ha adịchaghị enwe ùgwù onwe onye.”

“Olee otú i si mara ihe a nile?” ka Janina jụrụ. “Ọtụtụ ndị nne na nna amaghị ihe ndị a.”

“Bible bụ ebe dị oké ọnụ ahịa e si enweta ihe ọmụma dị otú a,” ka Dorota zara. “Dị ka ihe atụ, Deuterọnọmi 6:6-9 na-egosi na inye ụmụ anyị ọzụzụ na-amalite n’inye onwe anyị ọzụzụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ibu ụzọ kụnye n’ime onwe anyị ụkpụrụ ndị anyị chọrọ ịkụnye n’ime ụmụ anyị?”

“Nke a dị ịtụnanya,” ka Janina kwuru. “Nke a dị ịtụnanya!” Ọ jụziri Dorota otú Bible si nyere ya aka ịzụlite ụmụ ya na ịkụziri ha ihe.

“Anyị na-eso ụmụ anyị amụ Bible kwa izu,” ka Dorota kọwara. “Anyị na-eji akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè eme ihe.” * Ọ gaziri n’ihu ịkọwa akwụkwọ ahụ ma kwuo ụfọdụ isiokwu ndị dị na ya.

“Nke a bụ ihe ọhụrụ!” ka Janina kwuru. “M̀ pụrụ ịhụ akwụkwọ ahụ?”

Mgbe otu awa gasịrị, Dorota ji akwụkwọ ahụ lọghachi.

“Olee okpukpe ị na-ekpe?” ka Janina jụrụ ka ọ na-enyocha akwụkwọ ahụ.

“Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

“Olee otú Ndịàmà Jehova si emeso ndị okpukpe ọzọ ihe?”

“Dị nnọọ ka m si mesoo gị—n’ụzọ nkwanye ùgwù,” ka Dorota zara, ọ gbakwụnyere, sị: “N’ezie, ọ na-adị anyị ka ya bụrụ na ha ga-abịa mara eziokwu Bible.”

“Enweedịla m afọ ojuju,” ka Janina kwupụtara.

Mgbe nleta ahụ bịara ná njedebe, Dorota gbara Janina ume ka ọ na-agụ Bible. “Ọ ga-eme ka ndụ gị nwee nzube ma nyere gị aka n’ọrụ gị.”

“Ị gbawo m ume n’ezie ime otú ahụ,” ka Janina kwetara.

Site n’iji akọ eme ihe na site n’ikpebisi ike ime ya, Dorota gbanwere ọgịga ọ na-aga n’ọfis dọkịta ahụ mgbe nile maka ile ahụ́ ịbụ ohere iji gbaa ezi àmà.—1 Pita 3:15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

^ par. 10 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.