Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye ka Jehova na-ezo aka n’ebe ọ nọ dị ka “otu onye n’ime anyị” na Jenesis 3:22?

O yiri ka Jehova Chineke ọ̀ na-ezo aka n’ebe ya na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya nọ mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ ahụ aghọwo ihe dị ka otu onye n’ime anyị, n’ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:22) Ka anyị tụlee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Jehova kwuru okwu ndị a mgbe ọ masịrị di na nwunye mbụ ahụ ikpe. Ụfọdụ aghọtawo okwu ahụ bụ́ “otu onye n’ime anyị” dị ka nnọchiaha maka ihe karịrị otu bụ́ nke e ji eme ihe maka onye nọ n’ọchịchị. Otú ọ dị, banyere Jenesis 1:26 na 3:22, ọkà mmụta Bible bụ́ Donald E. Gowan kwuru, sị: “Ọ dịghị nkwado ọ bụla e nwere n’A[gba] O[chie] maka ihe ka ọtụtụ ná nkọwa ndị ahụ e nyere: ‘anyị’ nke onye eze ji eme ihe, . . . ma ọ bụ ihe ọ bụla nke na-egosi ihe karịrị otu onye n’otu Chineke. . . . Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime nkọwa ndị a nke yiri ihe ezi uche dị na ya na 3:22, bụ́ ebe na-ekwu banyere ‘otu onye n’ime anyị.’”

Ọ̀ pụrụ ịbụ na Jehova na-ezo aka n’ebe Setan bụ́ Ekwensu nọ, bụ́ onye malitewororị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ “ezi ihe na ihe ọjọọ,” bụ́kwa onye kpaliworo mmadụ abụọ mbụ ahụ ime otu ihe ahụ? Ọ bụtụghị ya. N’ebe a, ọ bụ Jehova ji okwu ahụ bụ́ ‘otu onye n’ime anyị’ mee ihe. Setan esoghịzi n’ìgwè ndị mmụọ ozi na-ekwesi ntụkwasị obi nke Jehova, n’ihi ya, ọ pụghị iso ná ndị nọ n’akụkụ Jehova.

Chineke ọ̀ na-ezo aka n’ebe ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nọ? Anyị apụghị ikwu kpọmkwem na ọ bụ ha. Otú ọ dị, myirịta nke okwu ndị dị na Jenesis 1:26 na 3:22 na-atụpenyetụ anyị azụ. Na Jenesis 1:26, anyị na-agụ na Jehova kwuru, sị: ‘Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị.’ Ònye ka ọ na-agwa okwu ndị a? N’izo aka n’ebe mmụọ ahụ e kere eke ghọrọ mmadụ ahụ zuru okè bụ́ Jizọs nọ, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụ onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya, onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke; n’ihi na e sitere n’aka ya kee ihe ndị ọzọ nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Ee, o yiri ihe ezi uche dị na ya na ọ bụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ “onye ọkà” nke nọ n’akụkụ ya mgbe ọ na-eke eluigwe na ala, ka Jehova na-agwa okwu na Jenesis 1:26. (Ilu 8:22-31) Otú nke a na okwu ndị ahụ dị na Jenesis 3:22 si yie na-enye echiche na ọ bụ onye kasị nọrọ ya nso, Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka Jehova na-agwa okwu ọzọ.

O yiri ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya ọ̀ maara “ezi ihe na ihe ọjọọ.” Site ná mkpakọrịta dịteworo aka ma chie anya nke ya na Jehova, ọ mụtara nnọọ ụzọ iche echiche, ụkpụrụ na omume nke nna ya nke ọma. N’ịbụ onye nwere obi ike na Ọkpara ya maara ihe ndị a, nakwa na ọ na-eguzosi ike na ha, ọ pụrụ ịbụ na Jehova nyere ya ohere ịhụ maka ihe ụfọdụ n’ebughị ụzọ kpọtụrụ Ya n’oge nke ọ bụla. Ya mere, ruo n’ókè a, Ọkpara ahụ nwere ikike nke ikpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Otú ọ dị, n’adịghị ka Setan, Adam, na Iv, o guzobeghị ụkpụrụ omume nke megidere nke Jehova.