Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa, Na-ejenụ Ije n’Ụzọ Kwesịrị Jehova

Ndị Ntorobịa, Na-ejenụ Ije n’Ụzọ Kwesịrị Jehova

Ndị Ntorobịa, Na-ejenụ Ije n’Ụzọ Kwesịrị Jehova

ỤFỌDỤ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ahapụwo ezinụlọ ha na ọgbakọ dị n’obodo ha ruo nwa oge. Ụfọdụ emewo nke a iji mụbaa ozi ha. Ụfọdụ ahapụwo ụlọ ha n’ihi nnọpụiche ha n’ihe omume nke ụwa a. (Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16) N’ala ụfọdụ, “Siza” atụwo ndị ntorobịa na-eguzosi ike n’ezi ihe mkpọrọ ma ọ bụ manye ha ịrụ ọrụ obodo. *Mak 12:17; Taịtọs 3:1, 2.

Ka ha nọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ha, a pụrụ ime ka ndị ntorobịa a na ndị nnupụisi nọkọta ọnụ ruo ogologo oge. Ịnọ n’ebe na-abụghị ụlọ ha n’ihi ihe ndị ọzọ amanyewokwa ndị ntorobịa ịrụ ọrụ na gburugburu ebe ndị rụrụ arụ. Olee otú Ndị Kraịst a na-eto eto ma ọ bụ ndị ọzọ a manyere ịnọ n’ọnọdụ dị otú ahụ pụrụ isi nagide nrụgide na ihe isi ike ndị ha na-eche ihu ka ha na-agbalị ‘ịnọgide na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Chineke?’ (1 Ndị Tesalọnaịka 2:12) Olee otú ndị mụrụ ha pụrụ isi nyere ha aka ịkwadebe maka ọnọdụ ọjọọ ọ bụla pụrụ ịdapụta?—Ilu 22:3.

Ihe Ịma Aka Ndị Ntorobịa A Nwere

“Ịpụ ná nlekọta dị nchebe nke ndị mụrụ m na nke ndị okenye na-ahụ n’anya bụ́ ndị maara m nke ọma siri ike ma na-emenye ụjọ,” ka Tákis dị afọ 21 kwuru, bụ́ onye na-aghaghị ịnọ ọnwa 37 n’ebe na-abụghị ụlọ ha. * Ọ na-agbakwụnye, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m bụ onye na-enweghị enyemaka ma ọlị.” Pétros dị afọ 20 aghaghị ịhapụ ụlọ ha ruo ihe karịrị afọ abụọ. Ọ na-ekweta, sị: “Na nke mbụ ya ná ndụ m, aghaghị m ime nhọrọ n’onwe m banyere ntụrụndụ na mkpakọrịta, ọ bụghịkwa mgbe nile ka nhọrọ ndị m na-eme na-abụ ndị amamihe dị na ha.” O kwuziri, sị: “Mgbe ụfọdụ, ahụ́ adịghị eru m ala n’ihi ibu ọrụ nke inwerekwu onwe m wetara.” Tássos, Onye Kraịst bụ́ okenye nke na-adị eleta ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ kwuru, sị: “Okwu na-adịghị ọcha, nnupụisi, na ime ihe ike nke ndị ọgbọ na-ekweghị ekwe pụrụ inwe mmetụta n’ahụ́ ndị ntorobịa na-anọghị na nche na ndị na-anọghị ná nchebe.”

Ka ha na ndị na-adịghị erubere ụkpụrụ Bible isi na-ebikọ ma na-arụkọ ọrụ, ọ dị ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst dị otú ahụ mkpa iche nche megide ọnwụnwa nke iṅomi omume rụrụ arụ na ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, bụ́ ndị ndị ọgbọ ha na-eme. (Abụ Ọma 1:1; 26:4; 119:9) Ịnọgide na-enwe usoro ihe omume dị mma nke ọmụmụ ihe onwe onye, ịga nzukọ, na ije ozi ubi pụrụ iyi ihe siri ike. (Ndị Filipaị 3:16) Isetịpụ na ịrụ ọrụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ pụkwara isi ike.

N’ezie, ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-achọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ site n’àgwà na okwu ọnụ ha. Ha na-eji iguzosi ike n’ihe agbalị ige ntị n’ọkpụkpọ òkù ahụ na-adọrọ mmasị nke Nna ha nke eluigwe, bụ́: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Ha na-aghọta na ọdịdị na àgwà ha na-emetụta otú ndị ọzọ si ele Jehova na ndị ya anya.—1 Pita 2:12.

N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa dị otú ahụ na-agbalịsi ike iṅomi ụmụnna ha ndị nke narị afọ mbụ, bụ́ ndị Pọl onyeozi kpere ekpere banyere ha, sị: “Na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-anọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla . . . iji wee tachie obi n’ụzọ zuru ezu ma jiri ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 1:9-11) Bible na-enye ọtụtụ ihe atụ nke ndị ntorobịa tụrụ egwu Chineke, bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ije ije n’ụzọ kwesịrị Chineke na gburugburu ebe ha na-amaghị, ebe ndị na-enweghị omume enyi, na ebe a na-ekpere arụsị.—Ndị Filipaị 2:15.

“Jehova Nọnyeere Josef”

N’oge ọ ka bụ nwata, Josef, nwa Jekọb na Rechel ha hụrụ n’anya, chọtara onwe ya n’ebe dị nnọọ anya n’ụlọ dị nchebe nke nna ya na-atụ egwu Chineke. E rere ya ịbụ ohu n’Ijipt. Josef setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya dị ka nwa okorobịa na-arụsi ọrụ ike, onye a pụrụ ịtụkwasị obi, na onye nwere omume ọma. N’agbanyeghị na ọ na-agbara Pọtịfa ohu—bụ́ onye na-adịghị efe Jehova—Josef ji nlezianya na ịdị uchu rụọ ọrụ nke na nna ya ukwu tinyere ihe nile dị n’ụlọ ya n’aka ya. (Jenesis 39:2-6) Josef nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova, mgbe nke a mekwara ka a tụọ ya mkpọrọ, o kwubighị, sị: “Olee uru ọ baara m?” Ọbụna mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o gosipụtara ezi àgwà, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọrọ onye nlekọta nke ọtụtụ ihe a na-eme n’ụlọ mkpọrọ ahụ. (Jenesis 39:17-22) Chineke gọziri ya, dịkwa ka e kwuru na Jenesis 39:23, “Jehova nọnyeere [Josef].”

Lee otú ọ ga-esiworị dịrị Josef bụ́ onye ya na ezinụlọ ya na-atụ egwu Chineke na-anọghị mfe ịmalite ibi ụdị ndụM̀ ndị ahụ na-ekpere arụsị gbara ya gburugburu na-ebi, na-eṅomi ụzọ ndụ rụrụ arụ nke ndị Ijipt! Kama nke ahụ, ọ rapagidesiri ike n’ụkpụrụ Chineke ma jigide nguzo ya dị ọcha n’agbanyeghị ule ndị siri oké ike o chere ihu. Mgbe nwunye Pọtịfa nọgidere na-arịọ ya ka ya na ya nwee mmekọahụ, azịza ya siri ike bụ: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?”—Jenesis 39:7-9.

Taa, Ndịàmà na-eto eto na-erube isi na ndụmọdụ ndị dabeere na Bible banyere mkpakọrịta na-ezighị ezi, ntụrụndụ rụrụ arụ, ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na egwú rụrụ arụ. Ha na-aghọta na “n’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ́ ezi mmadụ nche.”—Ilu 15:3.

Mozis Jụrụ “Ịnụ Ụtọ Mmehie”

Mozis tolitere n’ụlọ Fero, bụ́ ebe a na-ekpere arụsị na ebe a na-achọ ihe ụtọ. Bible kwuru banyere ya, sị: “Site n’okwukwe, Mozis . . . jụrụ ịbụ onye a kpọrọ nwa ada Fero, na-ahọrọ ịbụ onye a na-emeso ya na ndị Chineke n’ụzọ ọjọọ kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.”—Ndị Hibru 11:24, 25.

Ịbụ enyi nke ụwa pụrụ iweta abamuru ụfọdụ, ma ọ dịghị adịte aka. Ọ dịkarịa anya, ọ nọruo nanị nwa oge fọdụụrụ ụwa a. (1 Jọn 2:15-17) Ọ́ gaghị aka mma ịgbaso ihe nlereanya Mozis? Bible kwuru na “ọ nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Hibru 11:27) O lekwasịrị anya n’ihe nketa ime mmụọ nke ndị nna nna ya na-atụ egwu Chineke. O mere nzube Jehova nzube ya ná ndụ, na-esetịpụ ime uche Chineke dị ka ihe mgbaru ọsọ ya.—Ọpụpụ 2:11; Ọrụ 7:23, 25.

Mgbe ndị na-eto eto na-atụ egwu Chineke hụtara onwe ha n’ebe a na-adịghị atụ egwu Chineke na nke na-enweghị omume enyi, ha pụrụ iwusikwu mmekọrịta ha na Jehova ike site n’ọmụmụ ihe onwe onye, na-amatakwu “Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya” nke ọma. Usoro ihe omume zuru ezu nke Ndị Kraịst, nke gụnyere ịgachi nzukọ na ozi ubi anya, ga-enyere ndị a na-eto eto aka itinye uche ha n’ihe ime mmụọ. (Abụ Ọma 63:6; 77:12) Ha kwesịrị ịgbalị ịzụlite okwukwe na olileanya siri ike dị ka nke Mozis. Ha ga-eme nke ọma ime ka echiche na akparamàgwà ha kwekọọ n’uche Jehova, na-enwe obi ụtọ na ha bụ enyi ya.

O Ji Ire Ya Too Chineke

Onye na-eto eto ọzọ nke ghọrọ ezi ihe nlereanya mgbe ọ na-anọghị n’ụlọ ha bụ nwa agbọghọ nta Izrel nke ndị Siria dọọrọ n’agha n’oge onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịsha. Ọ ghọrọ ohu nke nwunye onyeisi usuu ndị agha Siria, bụ́ Neaman. Nwa agbọghọ ahụ gwara nne ya ukwu, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma, ma a sị na onyenwe m nọ n’ihu onye amụma nke nọ na Sameria! Mgbe ahụ ọ ga-eme ka o si n’ekpenta ya dị ọcha.” N’ihi àmà ya, Neaman gakwuuru Ịlaịsha n’Izrel, e meekwa ka o si n’ekpenta ya dị ọcha. Ọzọkwa, Neaman ghọrọ onye na na-efe Jehova.—2 Ndị Eze 5:1-3, 13-19.

Ihe atụ nke nwa agbọghọ a na-emesi ike mkpa ọ dị ndị ntorobịa iji ire ha na-eme ihe n’ụzọ na-ewetara Chineke otuto, ọbụna mgbe ha na ndị mụrụ ha na-anọghị. A sị na ikwu “okwu nzuzu” ma ọ bụ “okwu njakịrị rụrụ arụ” amarawo nwa agbọghọ ahụ ahụ́, ọ̀ gaara adịrị ya mfe iji ire ya mee ihe n’ụzọ bara uru dị ka o mere mgbe ohere dapụtara? (Ndị Efesọs 5:4; Ilu 15:2) Níkos, otu nwa okoro nke nọ ná mmalite afọ ndị 20 ya, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ya, na-echeta, sị: “Mgbe mụ na ụmụnna ụfọdụ na-eto eto nọ n’ụlọ mkpọrọ ebe a na-arụ ọrụ ubi, bụ́ ebe a na-enweghị ịbụisi ndị nne na nna na nke ọgbakọ, anyị malitere ịdị na-ekwu okwu ndị rụrụ arụ. Nke ahụ ewetaghịrị Jehova otuto ma ọlị.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nyeworo Níkos na ndị ọzọ aka ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl banyere nke a: “Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ.”—Ndị Efesọs 5:3.

Jehova Dị Adị Nye Ha

Ahụmahụ nke ndị enyi Daniel atọ bụ́ ndị Hibru nwere na Babịlọn oge ochie na-egosi ịbụ eziokwu nke ụkpụrụ ahụ Jizọs kwupụtara nke bụ́ na ikwesị ntụkwasị obi n’ihe nta na-eduga n’ikwesị ntụkwasị obi n’oké ihe. (Luk 16:10) Mgbe ha chere nsogbu nke iri nri ndị Iwu Mozis machibidoro ihu, ha gaara ekpebi na ha bụ ndị a dọọrọ n’agha gaa n’ala na-abụghị nke ha, n’ihi ya kwa na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime n’okwu ahụ. Ma lee ngọzi ha nwetara n’ihi iji ọbụna ihe pụrụ iyi ihe dị nta kpọrọ ihe! Ha gbasiri ike ma nwekwuo amamihe karịa ndị ọzọ a dọtara n’agha, bụ́ ndị nọgidere na-eri nri eze. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ikwesị ntụkwasị obi n’ihe ndị a dị nta wusiri ha ike, nke na mgbe ha chere ule ka ukwuu nke ịkpọ isiala ala nye ihe oyiyi arụsị ahụ ihu, ha jụrụ ime otú ahụ.—Daniel 1:3-21; 3:1-30.

Jehova dị nnọọ adị nye ndị ntorobịa atọ a. N’agbanyeghị na ha nọ n’ebe dị anya pụọ n’ebe obibi ha na ebe bụ́ isi nke ofufe Chineke, ha kpebisiri ike ịnọ n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị. (2 Pita 3:14) Mmekọrịta ha na Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya ha nke na ha dị njikere iji ndụ ha chụọ àjà n’ihi ya.

Jehova Agaghị Ahapụ Unu

Mgbe ndị ntorobịa na-anọghị ndị ha hụrụ n’anya na ndị ha tụkwasịrị obi nso, n’ụzọ doro anya, ha pụrụ inwe mmetụta nke anọghị ná nchebe, amaghị ihe ọdịnihu ga-eweta na ụjọ. Otú ọ dị, ha pụrụ iche ule na ọnwụnwa ha ihu, na-enwe obi ike zuru ezu na ‘Jehova agaghị aha ha aka.’ (Abụ Ọma 94:14) Ọ bụrụ na ndị ntorobịa dị otú ahụ “ataa ahụhụ n’ihi ezi omume,” Jehova ga-enyere ha aka ịnọgide na-aga “n’ụzọ ezi omume.”—1 Pita 3:14; Ilu 8:20.

Jehova wusiri Josef, Mozis, nwa agbọghọ nta Izrel bụ́ ohu na ndị ntorobịa Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ike ugboro ugboro ma kwụghachi ha ụgwọ n’ụba. Taa, ọ na-eji mmụọ nsọ ya, Okwu ya, na nzukọ ya akwagide ndị ‘na-alụ ezi ọgụ nke okwukwe,’ na-esetịpụrụ ha ụgwọ ọrụ nke “ndụ ebighị ebi.” (1 Timoti 6:11, 12) Ee, ije ije n’ụzọ kwesịrị Jehova ga-ekwe omume, ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ime.—Ilu 23:15, 19.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee Ụlọ Nche nke May 1, 1996, peeji nke 18-20.

^ par. 5 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 25]

NDỊ NNE NA NNA—KWADEBENỤ ỤMỤ UNU!

“Dị ka akụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị.” (Abụ Ọma 127:4) Akụ́ apụghị ịgaru ebe a gbajere ya ná ndapụta. A ghaghị iji nkà tụọ ya. N’otu aka ahụ, ụmụaka agaghị adị njikere iche ihe ndị a na-ahụ ná ndụ ihu n’enweghị ezi nduzi nke ndị nne na nna.—Ilu 22:6.

Ndị na-eto eto na-enwekarị ọchịchọ nke ime ihe ná mkpali ma ọ bụ ịdaba ‘n’ọchịchọ nke oge ntorobịa.’ (2 Timoti 2:22) Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mkpanaka na ịba mba na-enye amamihe: ma nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Akparaghị omume ụmụaka ókè ga-eme ka ụmụaka ghara ịdị njikere maka ihe ndị ndụ chọrọ na nrụgide ndị ha ga-enweta mgbe ha hapụrụ ụlọ.

N’ụzọ doro anya na nke na-egosi iji ihe akpọrọ ihe, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ka ụmụ ha mata ihe isi ike, nrụgide na ihe ndị ha ga-ahụ ná ndụ n’usoro ihe a. N’abụghị ndị na-enweghị olileanya ma ọ bụ na-ekwu ihe ndị na-akụda mmụọ, ha pụrụ ịkọwa ihe isi ike onye ntorobịa pụrụ iche ihu ma ọ gaa biri nanị ya. Ọzụzụ a, ya na amamihe Chineke na-enye, ‘ga-enye ndị na-enweghị uche ezi uche, nyekwa nwa okorobịa ihe ọmụma na izuzu.’—Ilu 1:4.

Ndị nne na nna bụ́ ndị na-akụnye ụkpụrụ Chineke na ụkpụrụ omume ndị dị mma n’ime obi nke ụmụ ha na-enyere ha aka ịnagide ihe ịma aka nke ndụ. Ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya, nkwurịta okwu si n’obi, na inwe mmasị n’ebe ụmụ ha nọ ga-ekpebi ma à ga-enwe ọganihu ma ọ bụ ọdịda. Ndị nne na nna kwesịrị inye ụmụ ha ọzụzụ ịtụ egwu Chineke n’ụzọ guzoziri eguzozi ma bụrụ nke ziri ezi na nke ezi uche dị na ya, na-akwadebe ha iguzoro n’onwe ha mgbe ha tolitere. Site n’ihe nlereanya nke ha, ndị nne na nna pụrụ ịkụziri ụmụ ha na ọ ga-ekwe omume ịnọ n’ụwa ma ghara ịbụ akụkụ nke ụwa.—Jọn 17:15, 16.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụfọdụ ndị ntorobịa Ndị Kraịst aghaghị ịhapụ ụlọ ha

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Site n’iguzogide ọnwụnwa, ndị ntorobịa pụrụ iṅomi Josef ma dị ọcha n’omume

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ṅomie nwa agbọghọ nta Izrel ahụ bụ́ ohu onye ji ire ya wetara Jehova otuto