Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Amamihe Dị na Ha?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Amamihe Dị na Ha?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Amamihe Dị na Ha?

“KA ONYE maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya,” ka Solomọn bụ́ eze Izrel oge ochie kwuru. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị emetụla mkpebi ndị amamihe na-adịghị na ha nanị n’ihi na anyị aṅaghị ntị na ndụmọdụ nke ndị ọzọ nyere anyị.—Ilu 1:5.

E mesịrị detuo okwu Solomọn ndị ahụ n’ime Bible, tinyere ‘puku ilu atọ’ ndị ọzọ ọ tụrụ. (1 Ndị Eze 4:32) Ànyị pụrụ irite uru site n’ịmara na ịṅa ntị n’okwu amamihe ya? Ee. Ha na-enyere anyị aka “ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị; ịghọta okwu ọnụ nile nke nghọta; ịnara ịdọ aka ná ntị nke inwe ezi uche, na ezi omume na ikpe na izi ezi.” (Ilu 1:2, 3) Ka anyị tụlee ụkpụrụ nduzi ise dabeere na Bible ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha.

Tụlee Ihe Ndị Na-adịte Aka Ga-esi na Ya Pụta

Mkpebi ụfọdụ ga-enwe ihe buru ibu ga-esi na ha pụta. N’ihi ya, gbalịa ibu ụzọ chọpụta ihe ha ga-abụ. Ekwela ka ihe ndọrọ nke uru ndị na-adịghị adịte aka mee ka ị ghara ịhụ ihe ndị dị njọ na-adịte aka pụrụ isi na ha pụta. “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha,” ka Ilu 22:3 dọrọ aka ná ntị.

Ọ pụrụ inye aka idetu ihe ihe ndị ahụ na-adịghị adịte aka na ihe ndị ahụ na-adịte aka ga-abụ. Ihe ndị na-adịghị adịte aka na-esi n’ịhọrọ ọrụ ụfọdụ pụta pụrụ ịbụ ụgwọ ọrụ buru ibu na ọrụ na-enye obi ụtọ. Ma ihe ndị na-adịte aka pụrụ isi na ya pụta ọ̀ pụrụ ịgụnye ịrụ ọrụ na-adịghị eweta ọganihu? Ọ̀ pụrụ imesị chọọ ka ị kwaga ebe ọzọ, ikekwe ebe ndị enyi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị na-anọghị nso? Ọ̀ pụrụ ime ka ị nọrọ n’ebe ndị dị ize ndụ ma ọ bụ bụrụ nke na-agaghị enye gị obi ụtọ ma mee ka i nwee nkụda mmụọ? Tụlee uru na ọghọm ndị dị na ya, ma kpebizie ihe i kwesịrị ibute ụzọ.

Wepụtara Ya Oge Zuru Ezu

Mkpebi ndị e mere ọkụ ọkụ pụrụ n’ụzọ dị mfe ịghọ ndị amamihe na-adịghị na ha. Ilu 21:5 na-adọ aka ná ntị, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru: ma echiche nile nke onye ọ bụla nke na-eme ngwa na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.” Dị ka ihe atụ, ndị nọ n’afọ iri na ụma nwere ịhụnanya nzuzu kwesịrị icheretụ tupu ha ana-ekpebi ime ka mmekọrịta ha bụrụ nke na-adịgide adịgide site n’ịbanye n’alụmdi na nwunye. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-ahụ ịbụ eziokwu nke ihe ahụ William Congreve, bụ́ onye England na-ede egwuregwu nke biri ndụ ná mmalite narị afọ nke 18 kwuru: “Ọ bụrụ na anyị alụọ di na nwunye ọkụ ọkụ, anyị pụrụ ichegharị mgbe anyị tụsaara ahụ́.”

Otú ọ dị, iwepụtara ya oge zuru ezu apụtaghị igbu oge. Mkpebi ụfọdụ dị nnọọ oké mkpa nke na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime ha ngwa ngwa o kwere mee. Igbu oge n’ụzọ na-enweghị isi pụrụ ifu ma anyị ma ndị ọzọ oké ihe. Iyigharị ime mkpebi pụrụ ịbụ mkpebi n’onwe ya—ikekwe nke amamihe na-adịghị na ya.

Na-anakwere Ndụmọdụ

Ebe ọ bụ na ọ dịghị ọnọdụ abụọ bụ́ nnọọ otu, mmadụ abụọ apụghị ime otu ụdị mkpebi mgbe nile ka ha na-eche nsogbu ndị yiri ibe ha ihu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe na-enye aka ịnụrụ otú ndị ọzọ si mee mkpebi n’ọnọdụ ndị yiri nke anyị. Jụọ ha otú ha si ele mkpebi ndị ha mere anya ugbu a. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-ahọrọ ọrụ ị ga-arụ, jụọ ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ ka ha gwa gị akụkụ ndị dị mma na ndị na-adịghị mma nke ọrụ ahụ. Olee ihe ndị ha hụtaworo dị ka uru ndị dị n’ọrụ ahụ ha họọrọ, oleekwa ọghọm ndị ha nweworo ma ọ bụ ihe ndị pụrụ ịbụ ihe ize ndụ ndị dị na ya?

“Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị,” ka a dọrọ anyị aka ná ntị, “ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.” (Ilu 15:22) N’ezie, mgbe anyị na-achọ ndụmọdụ ma na-amụta ihe site n’ahụmahụ ndị ọzọ, anyị kwesịrị ime otú ahụ na-aghọta n’ụzọ zuru ezu na anyị onwe anyị aghaghị ime mkpebi ikpeazụ ma buru ihe ga-esi na ya pụta.—Ndị Galeshia 6:4, 5.

Na-aṅa Akọ na Uche A Zụrụ nke Ọma Ntị

Akọ na uche pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị bụ́ isi ndị anyị họọrọ iji bie ndụ. Nye Onye Kraịst, nke a pụtara ịzụ akọ na uche ya ka o kwekọọ n’echiche Chineke. (Ndị Rom 2:14, 15) Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “N’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:6) N’ezie, n’akụkụ ụfọdụ, mmadụ abụọ—ndị nwere akọ na uche a zụrụ nke ọma—pụrụ iru ná nkwubi okwu dịgasị iche ma si otú ahụ mee mkpebi ndị dịgasị iche.

Otú ọ dị, akọ na uche a zụrụ nke ọma ga-eme ka a ghara inwe ọdịiche dị otú ahụ mgbe ihe a na-eme mkpebi na ya bụ nnọọ ihe Okwu Chineke katọrọ. Dị ka ihe atụ, akọ na uche a na-ejibeghị ụkpụrụ Bible zụọ pụrụ inye ohere ka nwoke na nwanyị chọpụta ma hà kwekọrọ tupu ha abanye n’alụmdi na nwunye site n’ibikọ ọnụ. Ha pụrụ iche na ha mere mkpebi amamihe dị na ya, na-eche na ọ ga-eme ka ha ghara iji ọkụ ọkụ banye n’alụmdi na nwunye amamihe na-adịghị na ya. O nwere ike akọ na uche ha adịghị ama ha ikpe. Ma onye na-ele mmekọahụ na alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ha agaghị eme mkpebi ịbanye n’ụdị ndokwa ahụ na-anaghị adịgide adịgide na nke rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrint 6:18; 7:1, 2; Ndị Hibru 13:4.

Otú Mkpebi Gị Si Emetụta Ndị Ọzọ

Ọtụtụ mgbe, mkpebi gị pụrụ imetụta ndị ọzọ. Ya mere, ya adịla mgbe ị ga-akpachara anya mee mkpebi amamihe na-adịghị na ya—ọbụna nke nzuzu—nke pụrụ itinye mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke gị na ndị enyi gị na ndị ikwu gị ma ọ bụ, karịsịa, Chineke n’ihe ize ndụ. Ilu 10:1 kwuru, sị: “Nwa nke maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa: ma nwa dị nzuzu bụ iru újú nne ya.”

N’aka nke ọzọ, ghọta na mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ ihe dị mkpa ịgbanwe ndị enyi gị. Iji maa atụ, ị pụrụ ikpebi ịjụ echiche okpukpe ndị i nweburu bụ́ ndị ị maara ugbu a na ha na-emegide Akwụkwọ Nsọ. Ma ọ bụ ị pụrụ ikpebi ime mgbanwe dị ukwuu n’àgwà gị n’ihi ọchịchọ i nwere ime ka ndụ gị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke bụ́ ndị ị nakwerewooro ugbu a. Mkpebi i mere nwere ike ọ gaghị amasị ụfọdụ ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu gị, ma mkpebi ọ bụla na-atọ Chineke ụtọ bụ mkpebi amamihe dị na ya.

Jiri Amamihe Mee Mkpebi Kachasị Mkpa

Ihe ndị mmadụ n’ozuzu ha na-amaghị bụ na onye ọ bụla dị ndụ taa na-eche ime mkpebi n’etiti ọnwụ na ndụ ihu. Ọnọdụ yiri nke ahụ chere ndị Izrel oge ochie mara ụlọikwuu ha n’ókè Ala Nkwa ahụ na 1473 T.O.A. ihu. N’ịrụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuchitere Chineke, Mozis gwara ha, sị: “Ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya: n’ihi na Ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị: ka i wee biri n’elu ala ahụ nke Jehova ṅụụrụ nna gị ha iyi, bụ́ Ebreham, na Aịzik, na Jekọb, inye ha.”—Deuterọnọmi 30:19, 20.

Amụma na ọgụgụ oge Bible na-egosi na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi’ nakwa na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (2 Timoti 3:1; 1 Ndị Kọrint 7:31) Mgbanwe ahụ e buru amụma ya ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu ná mbibi nke usoro ihe ụmụ mmadụ a na-enweghị ihe dị na ya, bụ́ nke a ga-eji ụwa ọhụrụ Chineke nke ezi omume dochie.

Anyị nọ n’ọnụ ọnụ nke ụwa ọhụrụ ahụ. Ị̀ ga-aba iji nụ ụtọ ndụ ebighị ebi n’ụwa n’okpuru Alaeze Chineke? Ka à ga-ewepụ gị n’ụwa mgbe a ga-ebibi usoro ihe Setan? (Abụ Ọma 37:9-11; Ilu 2:21, 22) Mkpebi banyere ihe ị ga-eme dịịrị gị ugbu a, n’ezie, ọ bụ mkpebi nke ga-apụta ndụ ma ọ bụ ọnwụ. Ị̀ ga-achọ ka e nyere gị aka n’ime mkpebi ziri ezi, nke amamihe dị na ya?

Ikpebi ịdị ndụ na-agụnye ibu ụzọ mụta ihe ndị Chineke chọrọ n’aka anyị. N’akụkụ ka ukwuu, chọọchị adawo n’ime ka a mata n’ụzọ ziri ezi ihe ndị a a chọrọ. Ndị ndú ha eduhiewo ndị mmadụ ọtụtụ ugboro ikwere ụgha na ime ihe ndị na-adịghị atọ Chineke ụtọ. Ha elegharawo ịkọwara ndị mmadụ mkpa ọ dị ime mkpebi ife Chineke ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu” anya. (Jọn 4:24) N’ihi ya, ihe ka ọtụtụ n’etiti ụmụ mmadụ adịghị eme otú ahụ. Ma rịba àmà ihe Jizọs kwuru: “Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m, onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.”—Matiu 12:30.

Ndịàmà Jehova na-eji ọṅụ enyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Ha na-eso ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ n’ìgwè enwe nkwurịta okwu ndị dabeere na Bible mgbe nile n’oge na n’ebe ha chọrọ. Ndị chọrọ irite uru ná ndokwa a kwesịrị ịkpọtụrụ Ndịàmà nọ n’ógbè ha ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta Ụlọ Nche akwụkwọ.

N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ enwetawo ihe ọmụma bụ́ isi nke ihe ndị Chineke chọrọ. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ha ekwetawo na Bible bụ eziokwu nakwa na ọ bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha anọwo na-eyigharị ime mkpebi nke ịrara ndụ ha nye Chineke. N’ihi gịnị? A pụrụ inwe ọtụtụ ihe ndị kpatara ya.

Ọ̀ pụrụ ịbụ na ha amaghị mkpa ọ dị ime otú ahụ? Jizọs kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze nke eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba.” (Matiu 7:21) Nanị inwe ihe ọmụma Bible ezughị; ọ chọrọ ọrụ. Ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ setịpụụrụ anyị ihe nlereanya na nke a. Anyị na-agụ banyere ụfọdụ ndị narị afọ mbụ, sị: “Mgbe ha kweere Filip, bụ́ onye nọ na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke na banyere aha Jizọs Kraịst, e wee mee ha baptizim, ma ndị ikom ma ndị inyom.” (Ọrụ 2:41; 8:12) Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ya nile nabata Okwu Chineke, kwere n’ihe ọ na-ekwu ma mee ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, olee ihe ga-egbochi ya ịbụ onye e mere baptizim ná ngosipụta nke nraranye ya? (Ọrụ 8:34-38) N’ezie, iji bụrụ onye Chineke nakweere, ọ ghaghị iji ọchịchọ obi na ọṅụ were nzọụkwụ a.—2 Ndị Kọrint 9:7.

Ụfọdụ pụrụ iche na ha enweghị ihe ọmụma zuru ezu iji rara ndụ ha nye Chineke. Ma onye ọ bụla nke na-amalite ụzọ ndụ ọhụrụ na-enwe ihe ọmụma dị nta. Olee ọkachamara ga-ekwu na ọ ma ihe ndị ọ maara taa mgbe ọ malitere ọrụ ya? Ikpebi ijere Chineke ozi chọrọ nanị ihe ọmụma bụ́ isi nke ozizi na ụkpụrụ Bible, ya na ọchịchọ sitere n’obi ibi ndụ kwekọrọ na ha.

Ụfọdụ hà na-egbu oge ime mkpebi n’ihi ịtụ ụjọ na ha apụghị ibi ndụ kwekọrọ na ya? A na-enwetụ nchegbu banyere ịkụ afọ n’ala n’ọtụtụ mkpebi nke ụmụ mmadụ. Nwoke kpebiri ịlụ nwanyị ma nwee ezinụlọ pụrụ iche na ya erughị eru, ma mkpebi siri ike o mere na-abụ ihe nkwali nye ya iji mee ihe nile o nwere ike ime. N’otu aka ahụkwa, onye na-eto eto nwetara akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala ọhụrụ pụrụ ịtụ ụjọ inwe ihe mberede ụgbọala—karịsịa ma ọ bụrụ na ọ maara banyere ihe ndekọ na-egosi na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala na-eto eto na-enwe ihe mberede karịa ndị ọkwọ ụgbọala kataworo ahụ́. Otú ọ dị, ihe ọmụma a pụrụ ịba uru, na-eme ka o jiri nlezianya na-akwọ ụgbọala. Ịghara inweta akwụkwọ ikike abụghị ngwọta ya ma ọlị!

Kpebie Ịdị Ndụ!

Bible na-egosi na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ̀ na ụba, na okpukpe nke zuru ụwa ọnụ na ndị na-akwado ya ga-apụ n’ụwa n’isi nso. Ma ndị jiworo amamihe kpebie ịdị ndụ ma na-ebi ndụ kwekọrọ na nke ahụ ga-anọgide. Dị ka ndị e ji tọọ ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ, ha ga-esonye n’ime ka ụwa ghọọ paradaịs, dị ka Chineke zubere ya na mbụ. Ọ̀ ga-amasị gị iso rụọ ọrụ a na-enye obi ụtọ n’okpuru nduzi Chineke?

Ọ bụrụ otú ahụ, kpebie ịmụ Okwu Chineke. Kpebie ịmụta ihe ndị a chọrọ iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ. Kpebie ime ha. Karịsịa, kpebie ịnọgide na-eme ihe ahụ i kpebiri ime ruo ná ngwụsị. N’ikwu ya na nkenke, kpebie ịdị ndụ!

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Wepụta oge zuru ezu iji mee mkpebi ndị dị oké mkpa

[Foto dị na peeji nke 5]

Na-anakwere ndụmọdụ n’ịhọrọ ọrụ ị ga-arụ

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndị kpebiri ijere Chineke ozi ugbu a ga-ekere òkè n’ime ka ụwa ghọọ paradaịs