Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasịnụ Njide Onwe Onye n’Ihe Ọmụma Unu

Tụkwasịnụ Njide Onwe Onye n’Ihe Ọmụma Unu

Tụkwasịnụ Njide Onwe Onye n’Ihe Ọmụma Unu

“Tụkwasịnụ . . . n’ihe ọmụma unu njide onwe onye.”—2 PITA 1:5-8.

1. Enweghị ike ime gịnị bụ ya na-akpata ọtụtụ nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe?

N’OTU mkpọsa dị ukwuu e mere megide ịṅụ ọgwụ ọjọọ, a dụrụ ndị na-eto eto nọ na United States ọdụ, sị: “Jụnụ ya nnọọ.” Lee ka ihe ga-esi ka mma ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ajụ, ọ bụghị nanị ọgwụ ọjọọ, kamakwa ịṅụbiga mmanya ókè, ụzọ ndụ amamihe na-adịghị na ya ma ọ bụ nke rụrụ arụ, azụmahịa aghụghọ, nakwa “ihe anụ ahụ́ na-achọ”! (Ndị Rom 13:14) Ma, ònye ga-ekwu na ọ dị mfe mgbe nile ịjụ ihe ọjọọ?

2. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa dị na Bible na-egosi na ike ọ na-esi ịjụ ihe ọjọọ abụghị ihe ọhụrụ? (b) Gịnị ka ihe atụ ndị a kwesịrị ịkpali anyị ime?

2 Ebe ọ bụ na ọ na-esiri ụmụ mmadụ nile na-ezughị okè ike igosipụta njide onwe onye, anyị kwesịrị inwe mmasị ịmụta otú anyị pụrụ isi nwee mmeri n’ọgụ ọ bụla anyị na-alụso adịghị ike. Bible na-agwa anyị banyere ndị mmadụ n’oge gara aga bụ́ ndị gbalịsiri ike ijere Chineke ozi ma bụrụ ndị o siiri ike ịjụ ihe ọjọọ. Cheta Devid na mmehie ịkwa iko nke ya na Bat-sheba. O dugara n’ọnwụ nke nwa ha a tụtara ime ya site n’ịkwa iko nakwa n’ọnwụ nke di Bat-sheba, bụ́cha ndị aka ha dị ọcha. (2 Samuel 11:1-27; 12:15-18) Ma ọ bụ chee banyere Pọl onyeozi bụ́ onye kwupụtara n’ezoghị ọnụ, sị: “N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-adịghị eme, kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị ka m na-eme.” (Ndị Rom 7:19) Ị̀ na-enwe nkụda mmụọ yiri nke ahụ mgbe ụfọdụ? Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m. Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-anwụ ọnwụ a?” (Ndị Rom 7:22-24) Ihe atụ ndị dị na Bible kwesịrị ime ka mkpebi anyị ịghara ịda mbà ná mgbalị anyị na-eme inwekwu njide onwe onye sie ike.

Njide Onwe Onye, Ihe A Ga-amụta Amụta

3. Kọwaa ihe mere na anyị apụghị ịtụ anya na ọ ga-adị mfe igosipụta njide onwe onye.

3 A kpọtụkọtara njide onwe onye, bụ́ nke na-agụnye ikike ịjụ ihe ọjọọ, na okwukwe, omume ọma, ihe ọmụma, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, mmetụta ụmụnna na ịhụnanya, aha na 2 Pita 1:5-7. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime àgwà ọma ndị ọzọ a nke e bu nnọọ pụta ụwa. A ghaghị ịzụlite ha azụlite. Igosipụta ha n’ụzọ dị ukwuu chọrọ mkpebi siri ike na mgbalị. N’ihi ya, ànyị kwesịrị ịtụ anya na njide onwe onye ga-adị mfe nzụlite karịa ha?

4. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji eche na ha enweghị nsogbu n’ihe banyere njide onwe onye, ma gịnị ka nke a na-egosi?

4 N’eziokwu, ọtụtụ nde mmadụ pụrụ iche na ha enweghị nsogbu n’ihe banyere njide onwe onye. Ha na-ebiri ndụ ha otú masịrị ha, n’ịma ama ma ọ bụ n’amaghị ama, na-eme omume kwekọrọ n’ihe anụ ahụ́ ha na-ezughị okè chọrọ n’echeghị echiche banyere ihe ọ pụrụ ịrụpụtara ha ma ọ bụ ndị ọzọ. (Jud 10) Enweghị ike na adịghị njikere ịjụ ihe ọjọọ na-apụta ìhè ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ihe na-egosi na anyị bi n’ezie “n’ụbọchị ikpeazụ” bụ́ nke Pọl kwuru okwu ya mgbe o buru amụma, sị: “Oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, . . . ndị na-enweghị njide onwe onye.”—2 Timoti 3:1-3.

5. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji nwee mmasị n’okwu metụtara njide onwe onye, ndụmọdụ dịkwa aṅaa ka dị irè?

5 Ndịàmà Jehova maara nke ọma ihe ịma aka nke mkpa njide onwe onye dị na-eweta. Dị ka Pọl, ha maara banyere ọgụ dị n’etiti ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya na ụzọ ndụ nke anụ ahụ́ ha na-ezughị okè pụrụ ịkwali ha ịgbaso. N’ihi nke a, ọ dịwo anya ha nwewere mmasị n’otú e si emeri n’ọgụ a siri ike. Laa azụ na 1916, mbipụta mbụ nke magazin a ị na-agụ ugbu a kwuru banyere “ihe kwesịrị ekwesị anyị ga-eme iji chịkwaa onwe anyị, echiche anyị, okwu ọnụ anyị na omume anyị.” Ọ tụrụ aro iburu Ndị Filipaị 4:8 n’uche. Ndụmọdụ Chineke nke dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ka dị irè, ọ bụ ezie na mgbe e nyere ya bụ ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, ma eleghịkwa anya, o siri ike ịgbaso ugbu a karịa ka o siri n’oge ahụ ma ọ bụ na 1916. Otú o sina dị, Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịjụ ọchịchọ nke ụwa, na-amara na site n’ime otú ahụ, ha na-eme ihe Onye Okike ha na-achọ.

6. Gịnị mere na ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji nwee nkụda mmụọ ka anyị na-azụlite njide onwe onye?

6 A kpọtụrụ njide onwe onye aha ná Ndị Galeshia 5:22, 23 dị ka akụkụ nke “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Ọ bụrụ na anyị egosipụta àgwà a na “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, [na] ịdị nwayọọ,” ọ ga-abara anyị uru nke ukwuu. Dị ka Pita kọwara, ime otú a ga-egbochi anyị ịghọ “ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ” n’ozi anyị na-ejere Chineke. (2 Pita 1:8) Ma anyị ekwesịghị inwe nkụda mmụọ ma ọ bụ katọọ onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị egosipụlighị àgwà ndị a ngwa ngwa na n’ụzọ zuru ezu dị ka anyị ga-achọ ime. Eleghị anya ị chọpụtawo na n’ụlọ akwụkwọ, otu nwata akwụkwọ na-amụta ihe ngwa ngwa karịa ibe ya. Ma ọ bụ n’ebe ọrụ, otu onye na-amụta ọrụ ọhụrụ ngwa ngwa karịa ndị ọrụ ibe ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ na-amụta igosipụta àgwà Ndị Kraịst ngwa ngwa karịa ndị ọzọ. Ihe dị mkpa bụ ịnọgide na-azụlite àgwà nsọpụrụ Chineke n’ụzọ kasị mma anyị nwere ike. Anyị pụrụ ime nke a site n’iji enyemaka Jehova na-enye site n’Okwu ya na ọgbakọ ya na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu. Ime mgbalị siri ike ịnọgide na-enwe ọganihu dị mkpa karịa iru ihe mgbaru ọsọ anyị ngwa ngwa.

7. Gịnị na-egosi na njide onwe onye dị mkpa?

7 Ọ bụ ezie na e depụtara ya dị ka nke ikpeazụ n’ime àgwà ndị mmụọ nsọ na-amịpụta, n’ezie àgwà ndị ọzọ ahụ adịghị mkpa karịa njide onwe onye. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iburu n’uche na anyị pụrụ izere ‘ọrụ nile nke anụ ahụ́’ ma ọ bụrụ na anyị nwere nnọọ njide onwe onye. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe ọchịchọ ịrụ ụfọdụ “ọrụ nke anụ ahụ́ . . . , ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, ịrọ òtù.” (Ndị Galeshia 5:19, 20) N’ihi ya, anyị aghaghị ịnọgide na-agbasi mgba ike, na-ekpebisi ike iwepụ ọchịchọ ọ bụla na-ezighị ezi n’obi na n’uche anyị.

Ụfọdụ Nwere Ọgụ Pụrụ Iche

8. Ihe ndị dị aṅaa na-eme ka ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike karịsịa igosipụta njide onwe onye?

8 Ọ na-esiri ụfọdụ Ndị Kraịst ike igosipụta njide onwe onye karịa ndị ọzọ. N’ihi gịnị? Ọzụzụ nne na nna ma ọ bụ ahụmahụ ndị e nwere n’oge gara aga pụrụ iso akpata ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ na ịzụlite na igosipụta njide onwe onye eyibeghị ka ọ bụụrụ anyị nsogbu, nke ahụ kwesịrị inye anyị ọṅụ. Ma n’ezie anyị kwesịrị igosipụta ọmịiko na nchebara echiche mgbe anyị na-emeso ndị ọ na-esiri ike karị igosipụta ya, ọbụna ma a sị na njide onwe onye ha na-enweghị na-akpatara anyị onwe anyị nsogbu ụfọdụ. N’ihi ezughị okè nke anyị, ònye n’ime anyị nwere ihe mere ọ ga-eji bụrụ onye ezi omume n’anya onwe ya?—Ndị Rom 3:23; Ndị Efesọs 4:2.

9. Adịghị ike ndị dị aṅaa ka ụfọdụ nwere, oleekwa mgbe a ga-emeri adịghị ike ndị a kpam kpam?

9 Iji maa atụ: Anyị pụrụ ịma na ụfọdụ Ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị kwụsịworo ịkpọ ụtaba ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ “maka ntụrụndụ” pụrụ ịbụ ndị ka na-enwe agụụ siri ike maka ha mgbe ụfọdụ. Ma ọ bụ ya ana-esiri ụfọdụ ike ibelata otú ha si eri ihe ma ọ bụ aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Ndị ọzọ nwere nsogbu ịkwa ire ha nga, n’ihi ya, ha na-asụkarị ngọngọ n’okwu. Ime ihe banyere adịghị ike ndị dị otú ahụ chọrọ mgbalị siri ike n’ịzụlite njide onwe onye. N’ihi gịnị? Jems 3:2 kwetara nnọọ n’ezie, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” Ọzọkwa, ọ na-agụsi ndị ọzọ agụụ ike ịgba chaa chaa. Ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ isiri ha ike ịchịkwa iwe ha. Ọ pụrụ iwe oge ịmụta imeri adịghị ike ndị a ma ọ bụ ndị yiri ha. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ọganihu pụtara ìhè ugbu a, ọchịchọ ọjọọ ga-apụ kpam kpam nanị mgbe anyị zuru okè. Ka ọ dịgodị, ịgbalịsi ike igosipụta njide onwe onye ga-enyere anyị aka izere ịdaghachi azụ ná mmehie. Ka anyị na ya na-alụ, ka anyị na-enyerịtara ibe anyị aka ịghara ịda mbà.—Ọrụ 14:21, 22.

10. (a) N’ihi gịnị ka igosipụta njide onwe onye n’ihe metụtara mmekọahụ ji bụrụ nnọọ ihe ịma aka nye ụfọdụ ndị? (b) Mgbanwe dị aṅaa siri ike ka otu nwanna nwoke mere? (Lee igbe dị na peeji nke 16.)

10 Ebe ọzọ igosipụta njide onwe onye na-esiri ụfọdụ ndị ike bụ n’ihe metụtara mmekọahụ. N’onwe ya, mmekọahụ nke mmadụ so n’otú Jehova Chineke si mee anyị. Otú ọ dị, ọ na-esiri ụfọdụ ike karịsịa idebe mmekọahụ n’ọnọdụ kwesịrị ya, n’ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke. Ọ pụrụ ịdị na-esiri ha ike karịsịa n’ihi na ha nwere agụụ mmekọahụ siri ike gabiga ókè. Anyị bi n’ụwa nke ara mmekọahụ na-agba bụ́ nke na-eme n’ọtụtụ ụzọ ka agụụ mmekọahụ sie nnọọ ike. Nke a pụrụ ịkpatara Ndị Kraịst ụfọdụ nsogbu bụ́ ndị na-achọ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo oge ụfọdụ—iji jeere Chineke ozi n’enweghị ihe ndọpụ uche nke alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 7:32, 33, 37, 38) Ma n’ikwekọ n’iwu Akwụkwọ Nsọ na “ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwunye kama ịbụ onye agụụ mmekọahụ na-agụgbu,” ha pụrụ ikpebi ịlụ, bụ́ nke kwesịrị ekwesị n’ezie. N’otu oge ahụ, ha na-ekpebisi ike ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” dị ka Akwụkwọ Nsọ dụrụ ọdụ. (1 Ndị Kọrint 7:9, 39) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ihi mmasị ha nwere n’ịgbaso ụkpụrụ ezi omume ya. Ndị Kraịst ibe ha na-agụ ya dị ka ihe ọṅụ iso ndị dị otú ahụ na-efe ezi ofufe bụ́ ndị nwere ụkpụrụ omume dị elu ma na-eguzosi ike n’ezi ihe na-akpakọrịta.

11. Olee otú anyị pụrụ isi nyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị nke nwere mmasị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma o nwebeghị ike ime otú ahụ aka?

11 Gịnị ma ọ bụrụ na a pụghị ịchọta onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị? Cheedị echiche banyere obi nkoropụ nke onye chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma o nwebeghị ike ime otú ahụ pụrụ inwe! Ọ pụrụ ịhụ ndị enyi ya ka ha na-alụ di ma ọ bụ nwunye ma na-enwetụ obi ụtọ, ebe ya onwe ya ka na-achọ onye kwesịrị ekwesị ọ ga-alụ. Nye ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, omume ọjọọ nke imetọ onwe onye pụrụ ịghọrọ ha nsogbu na-adịghị akwụsị akwụsị. N’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ dịghị Onye Kraịst kwesịrị n’amaghị ama ịkụda mmụọ nke onye ọ bụla nke na-agbasi mbọ ike ịnọgide na-adị ọcha. Anyị pụrụ ịkpata nkụda mmụọ n’amaghị ama ma ọ bụrụ na anyị ana-ekwu okwu ndị a na-echeghị eche kwuo, dị ka, “Olee mgbe ị ga-alụ di?” ma ọ bụ “Olee mgbe ị ga-alụ nwunye?” Ọ pụrụ ịbụ na e bughị ajọ ihe n’obi jụọ ha, ma lee ka ọ ga-esi ka mma anyị igosipụta njide onwe onye n’echiche nke ịkwa ire anyị nga! (Abụ Ọma 39:1) Ndị nọ n’etiti anyị nọgidere na-adị ọcha mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị nnọọ ịja mma. Kama ikwu ihe pụrụ ịkụda ha mmụọ, anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịdị na-agba ha ume. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ime mgbalị ịkpọ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye òkù mgbe ntakịrị ìgwè nke ndị tozuru okè gbakọtara maka nri ma ọ bụ maka mkpakọrịta na-ewuli elu nke Ndị Kraịst.

Njide Onwe Onye n’Alụmdi na Nwunye

12. N’ihi gịnị ka o ji dị ọbụna ndị lụrụ di na nwunye mkpa ịdị na-egosipụta njide onwe onye ruo n’ókè ụfọdụ?

12 Ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’onwe ya adịghị akagbu mkpa ọ dị inwe njide onwe onye n’ihe metụtara mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, mkpa mmekọahụ nke di na nwunye pụrụ ịdịrịta nnọọ iche. Ma ọ bụ, ọnọdụ ahụ́ ike nke otu onye òtù ọlụlụ pụrụ ime ka o sie ike inwe mmekọahụ e kwesịrị inwe ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ ghara ikwe omume. Ma eleghị anya n’ihi ahụmahụ ndị o nweburu, ọ pụrụ isiri otu onye òtù ọlụlụ ike irube isi n’iwu bụ́: “Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ma ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.” N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị onye nke ọzọ mkpa igosipụtakwu njide onwe onye. Ma ha abụọ pụrụ iburu n’uche ndụmọdụ Pọl ji ịhụnanya nye Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye: “Unu adịla na-ajụ inye ya ibe unu, ọ gwụla ma ùnu kwekọrịtara maka oge a kara aka, ka unu wee tinye oge n’ikpe ekpere wee bịakọọkwa ọnụ ọzọ, ka Setan wee ghara ịnọgide na-anwa unu ọnwụnwa maka na unu enweghị ike ịchịkwa onwe unu.”—1 Ndị Kọrint 7:3, 5.

13. Gịnị ka anyị pụrụ imere ndị na-adọga igosipụta njide onwe onye?

13 Lee ka ndị lụrụ di na nwunye pụrụ isi nwee ekele ma ọ bụrụ na ha amụta igosipụta njide onwe onye kwesịrị ekwesị ná mmekọrịta a kasị chie anya. N’otu oge ahụ, ha kwesịrị igosipụta nchebara echiche n’ebe ndị ha na ha na-efekọ ofufe nọ bụ́ ndị ka na-adọga igosipụta ya n’akụkụ ahụ. Anyị ekwesịghị ichezọ ikpe ekpere ka Jehova nye ụmụnna ime mmụọ anyị nghọta, obi ike ma mee ka ha nwee mkpebi siri ike ịnọgide n’ọgụ ha na-alụ iji na-egosipụta njide onwe onye na ime ihe iji merie ọchịchọ ndị na-ekwesịghị ekwesị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Nọgidenụ Na-enyerịtara Ibe Unu Aka

14. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ọmịiko na nchebara echiche na-emeso Ndị Kraịst ibe anyị ihe?

14 Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri anyị ike igosi nchebara echiche n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ bụ́ ndị na-adọga igosipụta njide onwe onye n’akụkụ ndị na-abụghịrị anyị nsogbu. Ma ndị mmadụ dịrịta iche dị ka e si kee ha. Ụfọdụ bụ ndị mmetụta na-achịkwa n’ụzọ dị mfe; ndị ọzọ abụghị. Ọ na-adịtụrụ ụfọdụ mfe ịchịkwa onwe ha, njide onwe onye abụghịkwara ha nnukwu nsogbu. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike karị. Ma, cheta, onye ya na ihe na-alụ abụghị onye ọjọọ. Ọ dị Ndị Kraịst ibe anyị mkpa ka anyị na-echebara ha echiche ma nwee ọmịiko n’ahụ́ ha. Anyị onwe anyị ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-egosipụta obi ebere n’ebe ndị ka na-adọga igosipụtakwu njide onwe onye nọ. Anyị pụrụ ịhụ nke ahụ n’okwu Jizọs nke e dekọrọ na Matiu 5:7.

15. N’ihi gịnị ka okwu ndị dị n’Abụ Ọma 130:3 ji bụrụ ihe na-akasi obi n’ihe banyere njide onwe onye?

15 Anyị ekwesịghị ịghọtahie Onye Kraịst ibe anyị bụ́ onye pụrụ ịda mgbe ụfọdụ n’igosipụta àgwà Ndị Kraịst. Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịmara na, tụkwasị n’ịhụ otu oge anyị dara ada, Jehova na-ahụ ọtụtụ mgbe anyị na-adaghị, ọbụna ma a sị na Ndị Kraịst ibe anyị ahụghị ha. Ọ bụ ihe na-akasi nnọọ obi iburu n’uche okwu ndị dị n’Abụ Ọma 130:3: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?”

16, 17. (a) Olee otú anyị pụrụ isi tinye Ndị Galeshia 6:2, 5 n’ọrụ n’ihe banyere njide onwe onye? (b) Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle banyere njide onwe onye?

16 Iji bụrụ ndị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịzụlite njide onwe onye, ma anyị pụrụ ijide n’aka na ụmụnna anyị Ndị Kraịst ga-enyere anyị aka. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla n’ime anyị ga-ebu ibu ọrụ dịịrị ya, otú o sina dị, a gbara anyị ume inyerịtara ibe anyị aka ịnagide adịghị ike. (Ndị Galeshia 6:2, 5) Anyị pụrụ iji nne ma ọ bụ nna, onye òtù ọlụlụ, ma ọ bụ enyi bụ́ onye na-egbochi anyị ịga ebe ndị anyị na-ekwesịghị ịga, ịhụ ihe ndị anyị na-ekwesịghị ịhụ, ma ọ bụ ime ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime kpọrọ ihe. Ọ na-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye, bụ́ ikike nke ịjụ ihe ọjọọ ma kwụsie ike!

17 Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ Ndị Kraịst na-eme ihe ndị anyị tụleworo ka ọ dị ugbu a banyere njide onwe onye, ma ọ pụrụ ịdị ha ka ha pụrụ imekwu ihe. Ọ ga-amasị ha igosipụta njide onwe onye n’ụzọ zuru ezu karị, ruo n’ókè ha kweere na a pụrụ ịtụ anya ya n’ụzọ ezi uche dị na ya n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ̀ dị gị otú ahụ? Gịnịzi ka ị pụrụ ime mgbe a bịara n’ịzụlite akụkụ a nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke? Oleekwa otú gị ime otú ahụ pụrụ isi nyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị na-adịte aka dị ka Onye Kraịst? Ka anyị hụ nke ahụ n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

N’ihi Gịnị Ka Njide Onwe Onye Ji . . .

• dị mkpa ka Ndị Kraịst na-azụlite ya

• esiri ụfọdụ ndị ike karịsịa?

• dị mkpa n’alụmdi na nwunye?

• bụrụ àgwà nke anyị pụrụ inyere ibe anyị aka ịzụlite?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

Ọ Mụtara Ịjụ Ihe Ọjọọ

E were otu n’ime Ndịàmà Jehova bi na Germany n’ọrụ dị ka onye na-edozi nsogbu a na-enwe n’ụzarị mgbasa ozi. Ọrụ ya gụnyere inyocha ihe dị ka usoro ihe omume telivishọn na redio 30. Mgbe e nwere ihe mgbochi n’ụzarị, ọ ghaghị ilekwasị anya n’usoro ihe omume nke ahụ iji chọpụta kpọmkwem ihe bụ́ nsogbu. Ọ na-ekwu, sị: “O yiri ka ọ na-afọ nke nta ka a na-enwe ihe mgbochi nanị n’oge na-ekwesịghị ekwesị, kpọmkwem mgbe a na-egosi akụkụ ihe nkiri nke na-egosi ime ihe ike na mmekọahụ. Akụkụ ihe nkiri ndị ahụ jọrọ njọ yiri ka hà na-anọgide n’uche m ruo ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụrụdị na ọ bụghị ruo ọtụtụ izu, dị ka a ga-asị na a kanyere ha n’ụbụrụ m.” Ọ na-ekweta na nke a nwere mmetụta ọjọọ n’ọnọdụ ime mmụọ ya: “M na-ewekarị iwe ọkụ, n’ihi ya akụkụ ihe nkiri ndị na-egosikwa ime ihe ike na-eme ka o siere m ike igosipụta njide onwe onye. Akụkụ ndị na-egosi mmekọahụ kpataara mụ na nwunye m esemokwu. Mụ na nsogbu ahụ na-alụ kwa ụbọchị. Iji ghara ịbụ onye o meriri, ekpebiri m ịchọ ọrụ ọzọ, ọbụna ma a sị na nke ahụ pụtara ịdị na-enweta ego dị ala. N’oge na-adịbeghị anya, achọtara m otu. Ọchịchọ m emezuwo.”

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ihe ọmụma e nwetara site n’ọmụmụ Bible na-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye