Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Unu Ekekọtala Onwe Unu n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’

‘Unu Ekekọtala Onwe Unu n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’

‘Unu Ekekọtala Onwe Unu n’Ụzọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’

DỊ KA ị pụrụ ịhụ n’ebe a, ahụ́ erughị nnọọ kamel na oké ehi ndị ahụ na-akọ ugbo ala. Yok ahụ e ji kekọta ha—nke e bu anụmanụ abụọ ha nhata ma nwee ume ha nhata n’uche mee—na-eme ka anụmanụ abụọ ahụ na-ahụsi anya. N’inwe nchegbu banyere ọdịmma nke ụdị anụmanụ ndị ahụ e ji akọ ugbo, Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Ejikọtala ehi na ịnyịnya ibu ịdọ ihe e ji egwu ala ubi.” (Deuterọnọmi 22:10) Otu ụkpụrụ ahụ ga-emetụtakwa oké ehi na kamel.

Dị ka ọ na-adịkarị, onye ọrụ ugbo agaghị eme ka anụmanụ ya nwee ihe isi ike dị otú ahụ. Ma ọ bụrụ na o nweghị oké ehi abụọ, ọ pụrụ ijikọta anụmanụ abụọ o nwere. Eleghị anya, ọ bụ ihe onye ọrụ ugbo nke narị afọ nke 19 nọ n’ihe osise a kpebiri ime. N’ihi na ha abụọ ahaghị nhata n’ibu na n’ịdị arọ, anụmanụ nke na-adịghị ike karị ga na-agbalịsi ike ime ka ya na nke ahụ dị ike na-aga ụkwụ na ụkwụ, anụmanụ nke dịkwa ike karị ga na-arụ ọrụ ka ukwuu.

Pọl onyeozi ji ihe atụ nke ikekọta ihe n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ kụziere anyị ihe dị mkpa. “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ,” ka o dere. “N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?” (2 Ndị Kọrint 6:14) Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi bụrụ onye e kekọtara n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ?

Otu ụzọ ga-abụ ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ahọrọ onye òtù ọlụlụ nke ya na ya na-enweghị otu nkwenkwe. Ụdị nkekọ ahụ ga-eme ka ahụ́ ghara iru ha abụọ ala, di na nwunye ahụ agaghị adị na-enwe nkwekọrịta n’okwu ndị bụ́ isi.

Mgbe Jehova malitere alụmdi na nwunye, o nyere nwunye ọrụ dị ka “onye inyeaka.” (Jenesis 2:18) N’otu aka ahụ, site n’ọnụ Malakaị onye amụma, Chineke zoro aka n’ebe nwanyị nọ dị ka “nwanyị e jikọtara gị na ya.” (Malakaị 2:14) Onye Okike anyị chọrọ ka ndị lụrụ di na nwunye na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ụzọ ime mmụọ, na-ebukọ ibu ha ọnụ ma na-erite uru si na ya apụta n’ụzọ ha nhata.

Site n’ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” Onye Kraịst na-egosi na ya na-akwanyere ndụmọdụ Nna anyị nke eluigwe ùgwù. (1 Ndị Kọrint 7:39) Nke a na-atọ ntọala maka alụmdi na nwunye dị n’otu, bụ́ nke pụrụ iwetara Chineke otuto na nsọpụrụ ka di na nwunye ahụ na-ejere ya ozi dị ka ‘ezigbo ndị so ya nyara yok’ n’echiche pụrụ iche.—Ndị Filipaị 4:3.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

Kamel na oké ehi: Site n’akwụkwọ bụ́ La Tierra Santa, Mpịakọta nke Mbụ, 1830