Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Onye A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Ọ̀ Dị Onye A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Ọ̀ Dị Onye A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

MGBE Mgbidi Berlin dara na 1989, ọtụtụ ihe ndị e zochiri nke ọma gbara n’anwụ. Dị ka ihe atụ, Lydia * chọpụtara na n’oge Ọchịchị Aka Ike nke East Germany, ndị Stasi, ma ọ bụ Ụlọ Ọrụ Nchebe Obodo, chịkọtara ihe ọmụma banyere ihe omume onwe onye ya. Ọ tụrụ Vera n’anya ịnụ banyere nke ahụ, ọ wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́ ịmata onye nyere ndị Stasi ihe ọmụma ahụ—di ya. Onye o kwesịrị nnọọ ịtụkwasị obi ararawo ya nye.

Robert bụ nwa amadị meworo agadi nke nwere “nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na ntụkwasị obi dị ukwuu” n’ebe dọkịta ya nọ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-akọ. E kwuru na dọkịta ahụ nwere “obiọma na ọmịiko.” Robert nwụziri n’ụzọ a na-atụghị anya ya. Ọ̀ bụ nkụchi obi ka ọ̀ bụ ọrịa strok gburu ya? Ee e. Ndị ọchịchị obodo ahụ kwubiri na dọkịta ahụ letara Robert n’ebe obibi ya, n’emeghịkwa ka Robert na ndị ezinụlọ ya mara, gbaa ya ọgwụ na-egbu mmadụ. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ onye Robert tụkwasịrị nnọọ obi gburu ya.

E mebiri nnọọ ntụkwasị obi Lydia na Robert n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, nke kpatara oké ọdachi. N’ihe atụ ndị ọzọ, ihe ndị ọ na-arụpụta adịchaghị adị njọ ka ndị a. Otú o sina dị, mmadụ ịbụ onye onye ọ tụkwasịrị obi mebiri ntụkwasị obi ya abụghị ihe ọhụrụ. Akụkọ nke òtù a kasị mara amara n’ime nnyocha na Germany, Allensbacher Jahrbuch der Demoskopie 1998-2002, bipụtara kpughere n’otu nnyocha o mere na pasent 86 nke ndị kwere ka a gbaa ha ajụjụ ọnụ abụwo ndị ndị ha tụkwasịrị obi mebiri ntụkwasị obi ha. Eleghị anya i nwewo ahụmahụ yiri nke ahụ. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na akwụkwọ akụkọ Switzerland bụ́ Neue Zürcher Zeitung kọrọ na 2002 na “ná mba ndị mepere emepe dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, mmekọrịta ndị dabeere ná ntụkwasị obi anọwo na-adalata kemgbe ọtụtụ iri afọ.”

Ọ Na-ewe Oge Ịzụlite, A Pụrụ Ibibi Ya n’Otu Ntabi Anya

Gịnị bụ ntụkwasị obi? Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ịtụkwasị ndị ọzọ obi pụtara “ikwere na ha na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme ihe n’eziokwu nakwa na ha agaghị ama ụma mee ihe pụrụ iwute gị.” Ọ na-ewe oge ịzụlite ntụkwasị obi, ma a pụrụ ibibi ya n’otu ntabi anya. Ebe e nwere ọtụtụ ndị chere na e mebiwo ntụkwasị obi ha, ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ na-ala azụ ịtụkwasị ndị ọzọ obi? Dị ka otu nnyocha e bipụtara na Germany na 2002 si gosi, “ọ bụ ihe na-erughị 1 n’ime ndị na-eto eto 3 nwere ntụkwasị obi bụ́ isi n’ebe ndị ọzọ nọ.”

Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọ̀ dị onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie? Ò kwesịrị ekwesị ịtụkwasị onye ọ bụla obi n’agbanyeghị na a pụrụ imebi ntụkwasị obi gị?’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwere aha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Otu nnyocha e mere kpughere na pasent 86 nke ndị kwere ka a gbaa ha ajụjụ ọnụ abụwo ndị ndị ha tụkwasịrị obi mebiri ntụkwasị obi ha