Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Ịlaịsha ji rịọ “òkè abụọ” nke mmụọ Ịlaịja?

Ka ọ fọrọ nke nta ka Ịlaịja rụchaa ọrụ ya dị ka onye amụma n’Izrel, onye amụma nke ọ tọrọ bụ́ Ịlaịsha rịọrọ ya, sị: “Biko, ka òkè abụọ nke mmụọ gị dakwasị m.” (2 Ndị Eze 2:9) N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, ihe àmà na-egosi na Ịlaịsha na-arịọ òkè abụọ, ụdị nke a na-enye onye bụ́ diọkpara. (Deuteronomi 21:17) Ịtụle ihe ndekọ a ná mkpirikpi ga-eme ka nke a doo anya ma nyere anyị aka ịmụta ihe site n’ihe merenụ.

N’ikwekọ ná ntụziaka Jehova, Ịlaịja onye amụma tere Ịlaịsha mmanụ dị ka onye nnochite anya ya. (1 Ndị Eze 19:19-21) Ruo ihe dị ka afọ isii, Ịlaịsha jeere Ịlaịja ozi dị ka oje ozi kwesịrị ntụkwasị obi ma kpebie ime ya ruo n’isi. Ọbụna n’ụbọchị ikpeazụ nke Ịlaịja dị ka onye amụma n’Izrel, Ịlaịsha nọgidere na-eso onye nduzi ya. Ọ bụ ezie na Ịlaịja gbara Ịlaịsha ume ka ọ kwụsị iso ya, onye amụma ahụ ọ tọrọ kwuru ugbo atọ, sị: “M gaghị ahapụ gị.” (2 Ndị Eze 2:2, 4, 6; 3:11) N’eziokwu, Ịlaịsha lere onye amụma nke okenye ahụ anya dị ka nna ime mmụọ ya.—2 Ndị Eze 2:12.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị Ịlaịsha bụ nwa ime mmụọ Ịlaịja nwere. Ịlaịja na Ịlaịsha nwere ìgwè ndị ikom ha na ha na-akpakọ ndị a maara dị ka “ụmụ ndị amụma.” (2 Ndị Eze 2:3) Ihe ndekọ dị ná Ndị Eze nke Abụọ na-egosi na “ụmụ” ndị a na nna ime mmụọ ha, bụ́ Ịlaịja nwekwara mmekọrịta chiri anya. (2 Ndị Eze 2:3, 5, 7, 15-17) Ka o sina dị, dị ka onye e tere mmanụ ga-anọchi ya, Ịlaịsha bụ onye mbụ n’etiti ụmụ ime mmụọ nke Ịlaịja—ọ dị ka diọkpara. N’Izrel oge ochie, onye bụ́ diọkpara n’ụzọ nkịtị na-anata òkè abụọ nke ihe nketa nna ya, ebe ụmụ ndị nwoke ndị ọzọ na-anata, otu òkè otu òkè. N’ihi ya, Ịlaịsha rịọrọ òkè abụọ nke ihe nketa ime mmụọ nke Ịlaịja.

Gịnị mere Ịlaịsha ji rịọ nnọọ ihe a n’oge ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ na-achọ ibido ọrụ siri ike—nke ịnọchi Ịlaịja dị ka onye amụma n’Izrel. Ịlaịsha ghọtara na ka o wee rụzuo ibu ọrụ ndị metụtara ọrụ a tara akpụ e nyere ya, na ọ dị ya mkpa inwe ike ime mmụọ karịrị nnọọ ikike nke ya onwe ya, ike nanị Jehova pụrụ inye. Ọ dị ya mkpa ịbụ onye na-adịghị atụ ụjọ dị ka Ịlaịja. (2 Ndị Eze 1:3, 4, 15, 16) Ya mere, ọ rịọrọ maka òkè abụọ nke mmụọ Ịlaịja, mmụọ nke obi ike na nke ‘ikworo Jehova ekworo nke ukwuu’—bụ́ omume ndị kwesịrị nṅomi mmụọ nsọ Chineke na-arụpụta. (1 Ndị Eze 19:10, 14) Olee otú Ịlaịja si zaghachi?

Ịlaịja maara na Ịlaịsha arịọwo ihe ya onwe ya na-enweghị ike inye ma nanị Chineke nwere ike inye. Ya mere, Ịlaịja ji obi umeala, sị: “Ị rịọwo ihe siri ike. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m n’ebe ị nọ, ọ ga-adịrị gị otú a.” (2 Ndị Eze 2:10) N’ezie kwa, Jehova kwere ka Ịlaịsha hụ Ịlaịja mgbe ọ rigoro n’oké ifufe. (2 Ndị Eze 2:11, 12) Ịlaịsha nwetara ihe ọ rịọrọ. Jehova nyere ya mmụọ dị ya mkpa iji bido ọrụ ọhụrụ ya na iji chee ule ndị ga-abịara ya ihu.

Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ (ndị a na-akpọ ndị òtù Ịlaịsha mgbe ụfọdụ) na ndị ohu Chineke n’ozuzu pụrụ inweta agbamume buru ibu site n’ihe ndekọ Bible a. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ iche na ọrụ ọhụrụ anyị nwetara karịrị anyị, nakwa na anyị erughị eru ịrụ ya, ma ọ bụ anyị pụrụ ịghọ ndị na-enwekwaghị obi ike zuru ezu iji nọgide n’ọrụ nkwusa Alaeze anyị ka anyị na-eche mmụba nke enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide n’ókèala anyị ihu. Ma, ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova maka nkwado ya, ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya dị ka ọ dị anyị mkpa iji nagide ihe ịma aka na ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe. (Luk 11:13; 2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Filipaị 4:13) Ee, dị nnọọ ka Jehova gbara Ịlaịsha ume iji buo ibu ọrụ ya siri ike, ọ ga-enyere anyị nile aka, ma okenye ma nwata, iji jee ozi anyị n’ụzọ zuru ezu.—2 Timoti 4:5.