Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Inyom Ndị Kraịst Kwesịrị Ntụkwasị Obi—Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-efe Chineke Ofufe

Ndị Inyom Ndị Kraịst Kwesịrị Ntụkwasị Obi—Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-efe Chineke Ofufe

Ndị Inyom Ndị Kraịst Kwesịrị Ntụkwasị Obi—Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-efe Chineke Ofufe

“Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.”—ILU 31:30.

1. Olee otú ụzọ Jehova si ele mma anya si dị iche na nke ụwa?

ỤWA ji ọdịdị elu ahụ́ akpọrọ oké ihe, karịsịa n’ihe metụtara ndị inyom. Otú ọ dị, Jehova nwere mmasị n’ụzọ bụ́ isi n’ihe mmadụ bụ n’ime, bụ́ nke pụrụ ọbụna ịmakwu mma ka onye ahụ na-emewanye okenye. (Ilu 16:31) N’ihi ya, Bible na-agba ndị inyom ume, sị: “Unu ekwekwala ka ịchọ mma unu bụrụ nke ịkpa isi efu na nke iyikwasị ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke.”—1 Pita 3:3, 4.

2, 3. Olee otú ndị inyom si tụnye ụtụ n’ime ka ozi ọma ahụ gaa n’ihu na narị afọ mbụ, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?

2 Ọtụtụ ndị inyom a kpọtụrụ aha n’ime Bible gosipụtara mmụọ dị otú ahụ kwesịrị ịja mma. Na narị afọ mbụ oge anyị, ụfọdụ n’ime ha nwetara ihe ùgwù nke ijere Jizọs na ndịozi ya ozi. (Luk 8:1-3) Mgbe e mesịrị, ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst ghọrọ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi ezisa ozi ọma; ndị ọzọ nyere ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst na-edu ndú, gụnyere Pọl onyeozi, nkwado bara uru; ụfọdụ gosipụtakwara mmụọ ile ọbịa pụrụ iche, ọbụna na-ewepụta ụlọ ha maka nzukọ ọgbakọ.

3 E buru amụma n’Akwụkwọ Nsọ na Jehova ga-eji ndị inyom mee ihe n’ụzọ dị ukwuu n’imezu nzube ya. Dị ka ihe atụ, Joel 2:28, 29 buru amụma na ma ndị ikom ma ndị inyom, ndị na-eto eto na ndị agadi ga-anata mmụọ nsọ ma kere òkè n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Amụma ahụ malitere imezu na Pentikọst 33 O.A. (Ọrụ 2:1-4, 16-18) E nyere ụfọdụ ndị inyom e ji mmụọ nsọ tee mmanụ onyinye ọrụ ebube, dị ka onyinye nke ibu amụma. (Ọrụ 21:8, 9) Site n’ịnụ ọkụ n’obi ha n’ozi, ìgwè ime mmụọ a bara ụba nke ụmụnna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi tụnyere ụtụ n’ime ka Iso Ụzọ Kraịst gbasaa ngwa ngwa na narị afọ mbụ. N’ezie, ihe dị ka n’afọ 60 O.A., Pọl onyeozi dere na ‘e kwusawo ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.’—Ndị Kọlọsi 1:23.

Ndị A Jara Mma n’Ihi Obi Ike, Ịnụ Ọkụ n’Obi, na Ile Ọbịa Ha

4. N’ihi gịnị ka Pọl ji nwee ezi ihe mere o ji jaa ọtụtụ ndị inyom nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ mma?

4 Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi nwere ekele n’ozi ndị inyom ụfọdụ jere—dị nnọọ ka ndị nlekọta bụ́ Ndị Kraịst taa si eji ozi ndị inyom na-anụ ọkụ n’obi na-eje akpọrọ ihe. Ụfọdụ n’ime ndị inyom Pọl kpọrọ aha bụ “Traịfina na Traịfosa, bụ́ ụmụ nwanyị na-arụsi ọrụ ike n’ime Onyenwe anyị,” na “Pesis onye anyị hụrụ n’anya, n’ihi na nwanyị a rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 16:12) Yuodia na Sintiki, ka Pọl dere, “bụ́ ndị [ya] na ha gbakọworo mbọ ọnụ n’ozi ọma.” (Ndị Filipaị 4:2, 3) Prisila na di ya bụ́ Akwịla sokwa Pọl jekọọ ozi. Ọbụna ya na Akwịla “tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ” n’ihi Pọl, bụ́ nke kpaliri ya ide, sị: “Ọ bụghị nanị mụ onwe m, kamakwa ọgbakọ nile nke ndị mba ọzọ na-enye ekele.”—Ndị Rom 16:3, 4; Ọrụ 18:2.

5, 6. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Prisila si setịpụrụ ụmụnna nwanyị ezi ihe nlereanya taa?

5 Gịnị mere Prisila ji nwee ịnụ ọkụ n’obi na obi ike? Ọrụ 18:24-26 tụpenyere anyị azụ, bụ́ ebe anyị gụtara na ọ kwadoro di ya n’inyere Apọlọs, bụ́ ọkà okwu nwere nkà, aka ịghọtakwu ihe ndị dị ọhụrụ banyere eziokwu ahụ e kpughere ekpughe. Ya mere, ihe àmà na-egosi na Prisila bụ onye ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke na ozizi ndịozi. N’ihi ya, ọ zụlitere àgwà ndị magburu onwe ha bụ́ ndị mere ka ọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke na di ya ma bụrụ onye bara uru n’ọgbakọ nke oge mbụ. Ọtụtụ ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike taa, bụ́ ndị ji ịdị uchu na-amụ Bible ma na-anara nri ime mmụọ nke Jehova na-enye site n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” dịkwa oké ọnụ ahịa.—Luk 12:42.

6 Akwịla na Prisila bụ ndị na-ele ọbịa n’ụzọ na-enweghị atụ. Pọl biri n’ụlọ ha mgbe o so ha rụọ ọrụ ha nke ịkpa ákwà ụlọikwuu na Kọrint. (Ọrụ 18:1-3) Mgbe di na nwunye ahụ kwagara Efesọs, mesịakwa kwaga Rom, ha nọgidere na-egosi omume ile ọbịa nke Ndị Kraịst, ọbụna wepụta ụlọ ha maka nzukọ ọgbakọ. (Ọrụ 18:18, 19; 1 Ndị Kọrint 16:8, 19) Nimfa na Meri nne Jọn Mak wepụtakwara ụlọ ha maka nzukọ ọgbakọ.—Ọrụ 12:12; Ndị Kọlọsi 4:15.

Ndị Bara Uru Dị Oké Ọnụ Ahịa Taa

7, 8. Ihe ndekọ dị aṅaa kwesịrị ịja mma nke ozi dị nsọ ka ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst n’oge a nwere, gịnịkwa ka ha pụrụ ijide n’aka?

7 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ndị Kraịst taa na-ekere òkè bụ́ isi n’imezu nzube Chineke, karịsịa n’ọrụ izisa ozi ọma. Leekwa ihe ndekọ mara mma ụmụnna nwanyị ndị a nwere! Tụlee ihe banyere Gwen, bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ihe karịrị afọ 50 ruo mgbe ọ nwụrụ na 2002. “Ịnụ ọkụ n’obi Gwen dị ka onye na-ezisa ozi ọma bụ ihe a maara nke ọma n’obodo anyị,” ka di ya na-ekwu. “Nye ya, mmadụ ọ bụla bụ onye pụrụ inweta ịhụnanya na nkwa Jehova. Iguzosi ike n’ihe ya nye Chineke, nzukọ ya, nakwa nye ezinụlọ anyị—tinyere agbamume ịhụnanya ọ na-enye anyị mgbe anyị nwere nkụda mmụọ—abụrụwo ihe nkwado dị ukwuu nye mụ na ụmụ anyị ná ndụ nke jupụtara n’ihe omume na nke na-enye afọ ojuju anyị na ya biri. Agụụ ya na-agụsi anyị ike.” Gwen na di ya lụrụ di na nwunye ruo afọ 61.

8 Ọtụtụ iri puku ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst, ma ndị na-alụghị di ma ndị lụrụ di, na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ, na-enwe afọ ojuju n’inwe nanị ihe ndị dị mkpa ná ndụ ka ha na-agbasa ozi Alaeze ahụ site n’obodo ndị na-ekwo ekwo ruo n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ. (Ọrụ 1:8) Ọtụtụ ahapụwo ịrụ ụlọ ma ọ bụ ịmụ ụmụ nke ha iji jeere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị. E nwere ndị na-akwado di ha bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ebe ọtụtụ puku ụmụnna nwanyị ndị ọzọ na-eje ozi n’ebe obibi Betel gburugburu ụwa. Obi abụọ adịghị ya na ndị inyom a na-achụ onwe ha n’àjà so ‘n’ihe a na-achọsi ike nke mba nile’ bụ́ ndị na-emejupụta ụlọ Jehova n’ebube.—Hagaị 2:7.

9, 10. Olee otú ndị òtù ezinụlọ siworo gosipụta ekele ha nwere maka ezi ihe nlereanya nke ndị nwunye na ndị nne bụ́ Ndị Kraịst setịpụrụ?

9 N’ezie, ọtụtụ ndị inyom Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ ezinụlọ ha na-elekọta; n’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ. (Matiu 6:33) Otu nwanna nwanyị na-alụghị di bụ́ onye ọsụ ụzọ dere, sị: “Mama m keere òkè bụ́ isi n’ime ka m ghọọ onye ọsụ ụzọ oge nile site n’okwukwe ya siri ike na ihe nlereanya ọma ya. N’ezie, ọ bụ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ kasị mma mụ na ha na-arụkọ ọrụ.” Otu di kwuru banyere nwunye ya, nne nke ụmụ nwanyị ise toworo eto, sị: “Ụlọ anyị na-adị ọcha ma na-adị mma n’anya mgbe nile. Bonnie na-ahụ na ọ bụ nke ngwongwo na-ejughị na nke kpakọrọ ọnụ ka ezinụlọ anyị wee nwee ike ilekwasị anyị ná nchụso nke ihe ime mmụọ. Ụtụ ọ tụnyere n’ịhazi ihe anyị na-akpata mere ka o kwe m omume ịrụ ọrụ nwa oge ruo ihe dị ka afọ 32, na-eme ka m nwekwuo oge maka ezinụlọ anyị na ihe ime mmụọ. Nwunye m kụzikwaara ụmụ anyị uru ịrụsi ọrụ ike bara. M na-aja ya mma nke ukwuu.” Taa, ma di ma nwunye ahụ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova.

10 Otu di dere banyere nwunye ya, nne nke ụmụ toworo eto, sị: “Àgwà Susan ndị kasị adọrọ mmasị m bụ ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe Chineke na ndị mmadụ nọ, tinyekwara nghọta, mmetụta ọmịiko, na ime ihe n’eziokwu ya. Ọ na-eche mgbe nile na o ruuru Jehova inweta ihe kasị mma anyị pụrụ inye ya—bụ́ ụkpụrụ o ji eme ihe n’onwe ya dị ka ohu Chineke na dị ka nne.” Site ná nkwado nke nwunye ya, di a enwewo ike ịnakwere ọtụtụ ihe ùgwù ime mmụọ, gụnyere ije ozi dị ka okenye, ọsụ ụzọ, onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ, na onye òtù Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. Lee otú ndị inyom dị otú ahụ si dị oké ọnụ ahịa nye di ha, nye Ndị Kraịst ibe ha, karịsịakwa, nye Jehova!—Ilu 31:28, 30.

Ndị Inyom Dị Oké Ọnụ Ahịa Bụ́ Ndị Na-enweghị Di

11. (a) Olee otú Jehova siworo kpughee nchegbu o nwere n’ebe ndị inyom na-ekwesị ntụkwasị obi nọ, karịsịa ndị inyom di ha nwụrụ? (b) Ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ Ndị Kraịst na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi na-enweghị di pụrụ inwe ihe mmesi obi ike dị aṅaa?

11 Jehova gosipụtara nchegbu o nwere maka ọdịmma nke ndị inyom di ha nwụrụ ọtụtụ ugboro. (Deuterọnọmi 27:19; Abụ Ọma 68:5; Aịsaịa 10:1, 2) Ọ gbanwebeghị. Ọ nọgidere na-enwe mmasị dị ukwuu ọ bụghị nanị n’ebe ndị inyom di ha nwụrụ nọ kamakwa n’ebe ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ tinyekwara ndị inyom họọrọ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ ndị na-achọtabeghị di bụ́ Onye Kraịst kwesịịrị ha nọ. (Malakaị 3:6; Jems 1:27) Ọ bụrụ na i so ná ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’enweghị nkwado onye òtù ọlụlụ bụ́ Onye Kraịst, ị pụrụ ijide n’aka na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.

12. (a) Olee otú ụfọdụ ụmụnna nwanyị Ndị Kraịst si egosipụta iguzosi ike n’ihe ha nye Jehova? (b) Mmetụta ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ụmụnna anyị ndị nwanyị na-anagide?

12 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-alụbeghị di n’ihi na ha ji iguzosi ike n’ihe na-erube isi na ndụmọdụ Jehova nke ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39; Ilu 3:1) Okwu Chineke na-emesi ha obi ike, sị: ‘N’ebe onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] nọ Jehova ga-egosi onwe ya onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW].’ (2 Samuel 22:26) Ma nye ọtụtụ n’ime ha, ịnọgide n’alụghị di bụ ihe ịma aka. Otu nwanna nwanyị na-ekwu, sị: “Ekpebiri m ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị, ma ebewo m ákwá ọtụtụ ugboro ka m na-ekiri ndị enyi m ka ha na-alụ ndị ikom bụ́ ezigbo Ndị Kraịst, ebe m ka nọ n’alụghị di.” Nwanna nwanyị ọzọ kwuru, sị: “Ejeworo m Jehova ozi ruo afọ 25. Ekpebisiri m ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya, ma m na-enwekarị mwute n’ihi owu ọmụma.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Agbamume na-agụsi ụmụnna nwanyị dị ka m agụụ ike.” Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ihe aka?

13. (a) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya ndị ahụ letara ada Jefta setịpụrụ? (b) N’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-egosi nchegbu maka ụmụnna nwanyị na-alụghị di n’ọgbakọ anyị?

13 Otu ihe atụ oge ochie gosiri otu ụzọ a pụrụ isi mee nke ahụ. Mgbe ada Jefta hapụrụ ohere o nwere ịlụ di, ndị mmadụ ghọtara na ọ chụrụ ihe n’àjà. Gịnị ka e mere iji gbaa ya ume? “Site n’afọ ruo n’afọ ụmụ ada Izrel na-aga aja ada Jefta onye Gilied mma, ụbọchị anọ n’afọ.” (Ndị Ikpe 11:30-40, NW) N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị iji obi anyị na-aja ụmụnna nwanyị ndị ji iguzosi ike n’ihe na-erubere iwu Chineke isi mma. * Olee ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi na-egosipụta nchegbu anyị? N’ekpere anyị, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka ọ kwado ụmụnna nwanyị dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi anyị hụrụ n’anya ịnọgide na-eji iguzosi ike n’ihe na-eje ozi ha. Ha kwesịrị ịbụ ndị e mesiri obi ike na Jehova na ọgbakọ Ndị Kraịst dum nwere ịhụnanya miri emi n’ebe ha nọ ma jiri ha kpọrọ ihe nke ukwuu.—Abụ Ọma 37:28.

Otú Ndị Nne Nanị Ha Na-azụ Ụmụ Si Enwe Ihe Ịga nke Ọma

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka ndị inyom Ndị Kraịst bụ́ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ kwesịrị iji na-akpọku Jehova maka enyemaka? (b) Olee otú ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ isi na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere ha?

14 Ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst nanị ha na-azụ ụmụ na-echekwa ọtụtụ ihe ịma aka ihu. Otú ọ dị, ha pụrụ ilegara Jehova anya maka enyemaka n’ịzụlite ụmụ ha n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. N’eziokwu, ọ bụrụ na ị bụ nne nanị ya na-azụ ụmụ, ị gaghị abụ ma nne ma nna n’akụkụ nile. Otú o sina dị, Jehova ga-enyere gị aka n’ilekọta ọtụtụ ibu ọrụ gị ma ọ bụrụ na ị na-akpọku ya n’okwukwe. Iji maa atụ: Ka e were ya na i bu akpa dị arọ nke jupụtara n’ihe e ji esi nri nke ị chọrọ ibugo n’ọnụ ụlọ nke gị n’ụlọ elu nwere ọtụtụ okpukpu. Ị̀ ga-adọgbu onwe gị isi na steepụ bugoo ya ma ọ bụrụ na e nwere ígwè mbugo? Ọ dịghị ma ọlị! N’otu aka ahụ, nanị gị anwala ibu ibu mmetụta uche dị arọ ebe ị pụrụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka. N’ezie, ọ na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ ya. Abụ Ọma 68:19 na-ekwu, sị: ‘Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu.’ N’otu aka ahụ, 1 Pita 5:7 na-agba gị ume ka ị na-atụkwasị Jehova nchegbu gị nile ‘n’ihi na ọ na-eche banyere gị.’ Ya mere, mgbe nsogbu na nchegbu na-anyịgbu gị, bugara ya Nna gị nke eluigwe, na-eme otú ahụ “n’esepụghị aka.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:17; Abụ Ọma 18:6; 55:22.

15 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ nne, obi abụọ adịghị ya na ị na-enwe nchegbu banyere mmetụta ndị ọgbọ pụrụ inwe n’ahụ́ ụmụ gị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ule iguzosi ike n’ezi ihe ha pụrụ ịdị na-eche ihu. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ndị a bụ nchegbu ziri ezi. Ma ha bụkwa ihe ndị ị ga-ekpe ekpere maka ha. N’ezie, gịnị ma i soro ụmụ gị kpee ekpere banyere ihe ndị a tupu ha agawa ụlọ akwụkwọ, ikekwe mgbe unu tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị? Ekpere ndị e ji ezi obi kpee na ndị a kpọrọ ihe aha na ha na-enwe mmetụta siri ike n’uche ndị na-eto eto. Karịsịa, ị ga-enweta ngọzi Jehova mgbe i ji ndidi na-agbalị ịkụnye Okwu ya n’obi ụmụ gị. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Ilu 22:6) Cheta, “anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.”—1 Pita 3:12; Ndị Filipaị 4:6, 7.

16, 17. (a) Gịnị ka otu nwa nwoke kwuru banyere ịhụnanya nne ya gosiri? (b) Olee otú iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe nke nne ahụ si metụta ụmụ ya?

16 Tụlee ihe banyere Olivia, nne nke nwere ụmụ isii. Di ya na-ekweghị ekwe gbahapụrụ ezinụlọ ya mgbe ha mụsịrị nwa ikpeazụ ha, ma n’egbughị oge, o weghaara ibu ọrụ nke ịzụlite ụmụ ya n’ụzọ Chineke. Darren, bụ́ nwa nwoke Olivia dị afọ 31 ugbu a ma na-eje ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye na ọsụ ụzọ dị ihe dị ka afọ 5 n’oge ahụ. Tụkwasị ná nchegbu Olivia nwere, Darren malitere ịrịa ọrịa siri ike bụ́ nke ka na-enye ya nsogbu. N’icheghachi echiche azụ n’oge ọ bụ nwata, Darren dere, sị: “M ka na-echeta mgbe m nọ n’àkwà ụlọ ọgwụ na-eche mama m. Ọ na-anọ n’akụkụ m ma na-agụrụ m Bible kwa ụbọchị. Mgbe e mesịrị, ọ na-abụ abụ Alaeze bụ́ ‘Anyị Na-ekele Gị Jehova.’ * Nke ahụ bụ abụ Alaeze kasị amasị m ruo taa.”

17 Ntụkwasị obi na ịhụnanya Olivia nwere n’ebe Jehova nọ tụnyere ụtụ n’ime ka o nwee ihe ịga nke ọma dị ka nne nanị ya na-azụ ụmụ. (Ilu 3:5, 6) Àgwà ọma ya pụtara ìhè n’ihe mgbaru ọsọ o setịpụụrụ ụmụ ya. “Mama m na-agbakarị anyị ume ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ozi oge nile,” ka Darren na-ekwu. “N’ihi ya, mụ na anọ n’ime ụmụnne m ndị nwanyị ise banyere n’ozi oge nile. N’agbanyeghị nke ahụ, mama m adịghị eji ihe ndị a eturu ndị ọzọ ọnụ. M na-agbalịsi ike iṅomi àgwà ya ndị magburu onwe ha.” N’eziokwu, ọ bụghị ụmụaka nile na-etolite ma na-ejere Chineke ozi dị ka ụmụ Olivia. Ma mgbe nne na-agbalị ike ya nile iji na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, ọ pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-eduzi ya ma na-akwado ya n’ụzọ ịhụnanya.—Abụ Ọma 32:8.

18. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosi na anyị nwere ekele maka ndokwa Jehova nke ọgbakọ Ndị Kraịst?

18 A na-enweta nkwado Chineke n’ụzọ dị ukwuu n’ọgbakọ Ndị Kraịst, site n’usoro nri ime mmụọ ya chiri anya, òtù ụmụnna Ndị Kraịst ya na “onyinye n’ụdị mmadụ” ya ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 4:8) Ndị nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi na-arụsi ọrụ ike iji na-ewulite ndị nile nọ n’ọgbakọ, na-elebara mkpa “ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha” anya n’ụzọ pụrụ iche. (Jems 1:27) Ya mere nọrọ ndị Chineke nso, ma ghara ịkpa iche.—Ilu 18:1; Ndị Rom 14:7.

Ịma Mma nke Ido Onwe Onye n’Okpuru

19. Gịnị mere na nwunye ido onwe ya n’okpuru apụtaghị na ọ bụ onye dị ala, oleekwa ihe atụ Bible nke na-akwado nke a?

19 Jehova kere nwanyị dị ka onye ga-eme ka nwoke zuo ezuo. (Jenesis 2:18, NW) N’ihi ya, nwunye ido onwe ya n’okpuru di ya adịtụghị apụta na ọ bụ onye dị ala. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka nwanyị nwee ùgwù, na-enye ya ohere iji ọtụtụ onyinye na nkà ya na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. Ilu isi 31 na-akọwa ọrụ dịgasị iche iche nke nwanyị na-ejide onwe ya n’Izrel oge ochie. Ọ na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, na-akụ ubi vaịn ma na-azụta ala. Ee, “obi di ya atụkwasịwo ya obi, ọ dịghịkwa ihe nkwata na-akọ nwoke ahụ.”—Amaokwu nke 11, 16, 20.

20. (a) Olee otú nwanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị isi lee ikike, ma ọ bụ onyinye ndị Chineke nyere ya anya? (b) Àgwà ọma ndị dị aṅaa ka Esta gosipụtara, oleekwa otú Jehova si jiri ya mee ihe n’ihi ya?

20 Nwanyị na-atụ egwu Chineke nke ma ebe ike ya ruru adịghị eji oké ọchịchọ ebuli onwe ya elu ma ọ bụ na-ama di ya aka. (Ilu 16:18) Ọ dịghị achọ inweta afọ ojuju nanị site n’ịchụso ihe ụwa kama ọ na-eji onyinye ndị Chineke nyere ya eme ihe n’ụzọ bụ́ isi iji na-ejere ndị ọzọ—ndị ezinụlọ ya, Ndị Kraịst ibe ya, ndị agbata obi, ma karịsịa, Jehova—ozi. (Ndị Galeshia 6:10; Taịtọs 2:3-5) Tụlee ihe atụ Bible banyere Eze Nwanyị Esta. Ọ bụ ezie na ọ mara mma elu ahụ́, ọ ma ebe ike ya ruru ma na-edo onwe ya n’okpuru. (Esta 2:13, 15) Mgbe ọ lụrụ dị, o gosipụtara nkwanye ùgwù dị ukwuu n’ebe di ya, bụ́ Eze Ahasuerọs nọ, n’adịghị ka Vashti onye bụbu nwunye eze. (Esta 1:10-12; 2:16, 17) Esta jikwa nkwanye ùgwù kwenyere Mọdekaị, bụ́ deede ya, n’okwu ndị kwesịrị ekwesị—ọbụna mgbe ọ ghọsịrị eze nwanyị. Ma ọ bụghị onye na-adịghị ike! O ji obi ike kpughee Heman, nwoke dị ike, nke obi takwara mmiri onye kpara nkata ikpochapụ ndị Juu. Jehova ji Esta mee ihe n’ụzọ dị ukwuu iji chebe ndị ya.—Esta 3:8–4:17; 7:1-10; 9:13.

21. Olee otú nwanyị bụ́ Onye Kraịst pụrụ isi ghọọ onye dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova karị?

21 N’ụzọ doro anya, ndị inyom na-atụ egwu Chineke egosipụtawo na ha na-enye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa n’oge ndị gara aga na n’oge a. Ya mere, ndị inyom na-atụ egwu Chineke dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst, kwenụ ka Jehova nọgide jiri mmụọ ya na-eme ka unu na-aghọwanye “arịa” a na-achọsi ike, nke “a kwadebere maka ezi ọrụ ọ bụla.” (2 Timoti 2:21; Ndị Rom 12:2) Banyere ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa na-efe ofufe, Okwu Chineke na-asị: “Nyenụ ya ihe sitere na nke aka ya abụọ rụtara; ka ọrụ ya nile tookwa ya n’ọnụ ụzọ ámá nile.” (Ilu 31:31) Ka nke ahụ bụrụ eziokwu nye onye ọ bụla n’ime unu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Maka ụzọ a pụrụ isi nye ịja mma dị otú ahụ, Lee Ụlọ Nche nke March 15, 2002, peeji nke 26-28.

^ par. 16 Abụ nke 212 na Sing Praises to Jehovah, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú ụfọdụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ si ghọọ ndị dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova?

• Olee otú ọtụtụ ụmụnna nwanyị n’oge anyị a siworo mee onwe ha ndị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si akwado ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ na-alụghị di?

• Olee otú nwanyị pụrụ isi gosipụta nrubeisi sitere n’obi maka ndokwa ịbụisi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE ATỤ NDỊ A GA-ATỤGHARỊ UCHE NA HA

Ị̀ ga-achọ ịtụle ụfọdụ ihe atụ ndị ọzọ nke ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi a kpọtụrụ aha n’ime Bible? Ọ bụrụ otú ahụ, biko gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’okpuru ebe a. Ka ị na-atụgharị uche banyere ndị dịgasị iche iche e deturu aha ha n’ebe a, gbalịa ịhụta ụkpụrụ ndị ị pụrụ itinye n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị ná ndụ gị.—Ndị Rom 15:4.

Sera: Jenesis 12:1, 5; 13:18a; 21:9-12; 1 Pita 3:5, 6.

Ndị inyom Izrel na-emesapụ aka: Ọpụpụ 35:5, 22, 25, 26; 36:3-7; Luk 21:1-4.

Debọra: Ndị Ikpe 4:1–5:31.

Rut: Rut 1:4, 5, 16, 17; 2:2, 3, 11-13; 4:15.

Nwanyị Shunem: 2 Ndị Eze 4:8-37.

Nwanyị Fonishia: Matiu 15:22-28.

Mata na Meri: Mak 14:3-9; Luk 10:38-42; Jọn 11:17-29; 12:1-8.

Tabita: Ọrụ 9:36-41.

Ụmụ nwanyị anọ Filip: Ọrụ 21:9.

Fibi: Ndị Rom 16:1, 2.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ị̀ na-aja ụmụnna nwanyị ndị na-alụghị di bụ́ ndị ji iguzosi ike n’ihe na-erubere iwu Chineke isi mma?

[Foto dị na peeji nke 16]

Arịrịọ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọ aha n’ekpere tupu ụmụaka ana-aga ụlọ akwụkwọ?