Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Inyom Ndị Mere Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Ndị Inyom Ndị Mere Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Ndị Inyom Ndị Mere Ka Obi Jehova Ṅụrịa

“Jehova kwụghachi gị ọrụ gị, ka ụgwọ ọrụ gị zuokwa ezuo site n’aka Jehova.”—RUT 2:12.

1, 2. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụgharị uche n’ihe atụ Bible nke ndị inyom mere ka obi Jehova ṅụrịa?

EGWU Chineke mere ka ndị inyom abụọ nupụrụ Fero isi. Okwukwe kwaliri otu nwanyị akwụna itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ iji chebe ndị nledo Izrel abụọ. Inwe ezi uche na obi umeala n’oge nsogbu nyeere otu nwanyị aka ịzọpụta ndụ ọtụtụ ndị na igbochi onye Jehova e tere mmanụ ịbụ onye ikpe ọbara mara. Okwukwe n’ebe Jehova Chineke nọ, tinyere mmụọ ile ọbịa kpaliri otu nwanyị di ya nwụrụ, onye bụkwa nne inye onye amụma Chineke nri ikpeazụ o nwere. Ndị a bụ nanị ụfọdụ n’ime ọtụtụ ihe atụ nke ndị inyom mere ka obi Jehova ṅụrịa bụ́ ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.

2 Àgwà Jehova n’ebe ụdị ndị inyom a nọ na otú o si gọzie ha na-egosi na ihe na-atọ ya ụtọ karịa ihe ọ bụla ọzọ bụ àgwà ime mmụọ, bụ́ ihe dị mkpa karịa ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. N’ụwa nke taa ihe anụ ahụ́ na-agba ara, mmadụ ibute ihe ime mmụọ ụzọ na-abụ ihe ịma aka. Ma a pụrụ imeri ihe ịma aka ahụ, dị ka ọtụtụ nde ndị inyom na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị mejupụtara akụkụ bara ụba nke ndị Chineke taa na-egosipụta. Ndị inyom Ndị Kraịst dị otú ahụ na-eṅomi okwukwe, ezi uche, ile ọbịa, na àgwà ọma ndị ọzọ nke ndị inyom na-atụ egwu Chineke a kpọtụrụ aha n’ime Bible gosipụtara. N’ezie, ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi àgwà ndị ahụ ndị inyom oge ochie dị otú ahụ bụ́ ezi ihe nlereanya gosipụtara. Iji hụ otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karị, ka anyị tụlee n’ụzọ zuru ezu karị ihe ndekọ banyere ndị inyom ndị ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite.—Ndị Rom 15:4; Jems 4:8.

Ndị Inyom Ndị Nupụụrụ Fero Isi

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka Shifra na Pua ji jụ irubere Fero isi mgbe o nyere ha iwu ka ha gbuo nwa ọhụrụ Izrel ọ bụla a mụrụ bụ́ nwoke? (b) Olee otú Jehova si kwụghachi ndị inyom abụọ ahụ na-ele ime ụgwọ n’ihi obi ike na egwu Chineke ha?

3 N’ikpe Nuremberg, nke e kpere na Germany mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ọtụtụ ndị a mara ikpe n’ihi igbu ìgwè mmadụ gbalịrị ịgọpụ mpụ ha mere site n’ịzọrọ na nanị ihe ha mere bụ irube isi n’iwu e nyere ha. Jirizie ndị a tụnyere ndị inyom Izrel abụọ ahụ na-ele ime, bụ́ Shifra na Pua, bụ́ ndị biri n’Ijipt oge ochie n’oge ọchịchị nke otu Fero dị aka ike nke a na-ekwughị aha ya. N’ihi ụjọ banyere ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị Hibru, Fero nyere ndị inyom abụọ ahụ na-ele ime iwu ịhụ na ha gburu nwa nwoke Hibru ọ bụla a mụrụ ọhụrụ. Olee otú ndị inyom ahụ si meghachi omume n’iwu obi ọjọọ ahụ? ‘Ha emeghị dị ka eze Ijipt gwara ha, ma ha debere ụmụ ndị ikom ndụ.’ Gịnị mere ndị inyom a ji ghara ịtụ egwu mmadụ? Ọ bụ n’ihi na ha “na-atụ egwu [ezi] Chineke.”—Ọpụpụ 1:15, 17; Jenesis 9:6.

4 Ee, ndị inyom ahụ na-ele ime mere Jehova ebe mgbaba ha, ya onwe ya n’aka nke ya, ghọọrọ ha “ọta,” na-echebe ha pụọ n’iwe Fero. (2 Samuel 22:31; Ọpụpụ 1:18-20) Nke ahụ abụghị nanị ngọzi Jehova nyere ha. Ọ kwụghachiri Shifra na Pua ụgwọ site n’ime ka ha nwee ezinụlọ nke aka ha. Ọbụna o nyere ndị inyom a ihe ùgwù nke ịbụ ndị e dere aha ha na ihe ndị ha mere n’Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee maka ọgbọ ndị dị n’ihu ịgụ banyere ha, ebe e chefuworo aha Fero ahụ ogologo oge gara aga.—Ọpụpụ 1:21; 1 Samuel 2:30b; Ilu 10:7.

5. Olee otú ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa si egosipụta otu ụdị àgwà ahụ Shifra na Pua gosipụtara, oleekwa otú Jehova ga-esi kwụghachi ha ụgwọ?

5 È nwere ndị inyom dị ka Shifra na Pua taa? Ee, e nwere! Kwa afọ, ọtụtụ puku ndị inyom dị otú a na-ezisa ozi Bible nke na-azọpụta ndụ n’atụghị egwu n’ala ebe ndị “iwu eze nyere” megidere ya, si otú a na-etinye nnwere onwe ma ọ bụ ọbụna ndụ ha n’ihe ize ndụ. (Ndị Hibru 11:23; Ọrụ 5:28, 29) N’ịbụ ndị ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi ha na-akwali, ndị inyom dị otú ahụ nwere obi ike adịghị ekwe ka onye ọ bụla kwụsị ha iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ihi ya, ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na-eche mmegide na mkpagbu ihu. (Mak 12:30, 31; 13:9-13) Dị ka ọ dị n’ihe banyere Shifra na Pua, Jehova maara nke ọma ọrụ ndị inyom dị otú ahụ nwere àgwà magburu onwe ha ma nwee obi ike na-arụ, ọ ga-egosipụtakwa ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ site n’ichebe aha ha “n’akwụkwọ nke ndụ” ma ọ bụrụhaala na ha atachie obi ruo ọgwụgwụ.—Ndị Filipaị 4:3; Matiu 24:13.

Onye Bụbu Nwanyị Akwụna Emee Ka Obi Jehova Ṅụrịa

6, 7. (a) Gịnị ka Rehab maara banyere Jehova na ndị ya, oleekwa otú ihe ọmụma a si metụta ya? (b) Olee otú e si kwanyere Rehab ùgwù n’Okwu Chineke?

6 N’afọ 1473 T.O.A., otu nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab biri n’obodo Kenan bụ́ Jeriko. Ihe àmà na-egosi na Rehab bụ nwanyị maara nke a na-akọ. Mgbe ndị nledo abụọ si Izrel gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ ya, ọ kọọrọ ha kpọmkwem ihe ndị mere n’Ọpụpụ ndị Izrel site n’Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube, ọ bụ ezie na nke ahụ mere ihe dị ka afọ 40 tupu mgbe ahụ! Ọ makwaara banyere mmeri ndị Izrel ka merisịrị ndị eze Amọraịt bụ́ Saịhọn na Ọg. Rịba ama otú ihe ọmụma ahụ si metụta ya. Ọ gwara ndị nledo ahụ, sị: “Amawo m na Jehova enyewo unu ala nke a, . . . n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke unu, Ya onwe ya bụ Chineke n’eluigwe dị n’elu na n’elu ụwa dị n’okpuru.” (Joshua 2:1, 9-11) Ee, ihe Rehab mụtara banyere Jehova na ihe ndị o meere ndị Izrel kpaliri obi ya ma mee ka o nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.—Ndị Rom 10:10.

7 Okwukwe Rehab kpaliri ya ime ihe. Ọ nabatara ndị nledo Izrel ahụ “n’ụzọ udo,” o rubekwara isi ná ntụziaka na-azọpụta ndụ ha nyere ya mgbe ndị Izrel wakporo Jeriko. (Ndị Hibru 11:31; Joshua 2:18-21) Obi abụọ adịghị ya na ọrụ okwukwe Rehab mere ka obi Jehova ṅụrịa, n’ihi na Ọ kpaliri Onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jems idekọta aha ya na Ebreham, bụ́ enyi Chineke, dị ka ihe nlereanya nke Ndị Kraịst ga-eṅomi. Jems dere, sị: “N’otu ụzọ ahụ, ọ̀ bụ na e siteghịkwa n’ọrụ kpọọ nwanyị akwụna ahụ bụ́ Rehab onye ezi omume, mgbe o jisịrị omume ile ọbịa nabata ndị ahụ na-eje ozi ma zipụ ha site n’ụzọ dị iche?”—Jems 2:25.

8. Olee otú Jehova si gọzie Rehab maka okwukwe na nrubeisi ya?

8 Jehova kwụghachiri Rehab ụgwọ n’ọtụtụ ụzọ. Tinyere ihe ndị ọzọ, o ji ụzọ ọrụ ebube zọpụta ndụ ya na ndụ ndị nile gbatara ọsọ ndụ n’ụlọ ya—“ụlọ nna ya na ihe nile o nwere.” O nyere ha ohere nke ibi “n’etiti ndị Izrel,” bụ́ ebe e mesoro ha ihe dị ka ụmụ afọ. (Joshua 2:13; 6:22-25; Levitikọs 19:33, 34) Ma ọ bụghị nanị nke ahụ. Jehova nyere Rehab ihe ùgwù nke ịghọ nne ochie Jizọs Kraịst. Lee ka nke ahụ sị bụrụ ngosipụta dị ukwuu nke obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe nwanyị bụbu onye Kenan na-ekpere arụsị nọ! *Abụ Ọma 130:3, 4.

9. Olee otú àgwà Jehova n’ebe Rehab na ndị inyom ụfọdụ bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ nọ si bụrụ ihe agbamume nye ụfọdụ ndị inyom taa?

9 Dị ka Rehab, ụfọdụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst, site na narị afọ mbụ ruo taa, ahapụwo ụzọ ndụ rụrụ arụ iji nwee ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha tolitere n’ebe ndị yiri Kenan oge ochie, bụ́ ebe omume rụrụ arụ jupụtara ma ọbụna bụrụ nke e lere anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha gbanwere ụzọ ha, n’ihi ịbụ ndị okwukwe dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ kpaliri. (Ndị Rom 10:17) N’ihi ya, a pụkwara ikwu banyere ndị inyom dị otú ahụ na “ihere ha adịghị eme Chineke, ịbụ onye a na-akpọku dị ka Chineke ha.” (Ndị Hibru 11:16) Lee ihe ùgwù ọ bụ!

Onye A Gọziri n’Ihi Ezi Uche Ya

10, 11. Ọnọdụ dị aṅaa metụtara Nebal na Devid kpaliri Abigail ime ihe?

10 Ọtụtụ ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie gosipụtara àgwà ezi uche n’ụzọ pụtara ìhè, na-eme ka ha bụrụ ndị baara nnọọ ndị Jehova uru. Otu n’ime ndị inyom dị otú ahụ bụ Abigail, nwunye Nebal, onye Izrel bụ́ aka ji akụ̀ nke nwere ala. Ezi uche Abigail zọpụtara ndụ ọtụtụ ndị ma gbochie Devid, bụ́ eze ọdịnihu nke Izrel, ịbụ onye ikpe ọbara mara. Anyị pụrụ ịgụ ihe ndekọ banyere Abigail nke dị na 1 Samuel isi 25.

11 Dị ka akụkọ ahụ si malite, Devid na ụmụazụ ya mara ụlọikwuu ha na nso ebe ìgwè atụrụ Nebal nọ, bụ́ nke ha chebere ehihie na abalị n’anaghị ego ọ bụla n’ihi obiọma ha nwere n’ebe nwanne ha onye Izrel bụ́ Nebal nọ. Mgbe ihe oriri Devid gwụwara, o zigaara Nebal ụmụ okoro iri iji rịọ ya ka o nye ha ihe oriri. Nebal nwere ohere ugbu a igosipụta ekele ya n’ebe Devid nọ na ịkwanyere ya ùgwù dị ka onye Jehova e tere mmanụ. Ma Nebal emeghị nke ahụ. N’oké iwe, ọ kparịrị Devid ma zilaga ụmụ okoro ahụ n’aka efu. Mgbe Devid nụrụ nke a, ọ chịkọtara ndị ikom 400 ji ihe agha ma gawa imegwara. Abigail nụrụ banyere omume aka ike di ya ma mee ihe ngwa ngwa na n’ụzọ ezi uche dị na ya iji mee ka obi jụrụ Devid site n’izigara ya ihe oriri buru ibu. Ọ gakwuziri Devid n’onwe ya.—Amaokwu nke 2-20.

12, 13. (a) Olee otú Abigail si nwee ezi uche ma bụrụ onye guzosiri ike n’ihe nye Jehova na onye ya e tere mmanụ? (b) Gịnị ka Abigail mere mgbe ọ laghachiri n’ụlọ, oleekwa otú ihe si dagharịara ya?

12 Mgbe Abigail zutere Devid, arịrịọ maka ebere o ji obi umeala rịọ kpughere nkwanye ùgwù miri emi o nwere maka onye Jehova e tere mmanụ. “Jehova aghaghị imere onyenwe m ụlọ kwesịrị ntụkwasị obi, n’ihi na ọ bụ agha nile nke Jehova ka onyenwe m na-ebu,” ka o kwuru, na-agbakwụnye na Jehova ga-eme ka Devid bụrụ onye ndú Izrel. (Amaokwu nke 28-30) N’otu oge ahụ, Abigail gosipụtara na o nwere obi ike site n’ịgwa Devid na mmegwara ọ na-achọ imegwara pụrụ ịrụpụta ikpe ọmụma ọbara ma ọ bụrụ na ọ chịkwaghị ya achịkwa. (Amaokwu nke 26, 31) Umeala n’obi, nkwanye ùgwù miri emi, na echiche ziri ezi nke Abigail mere ka Devid mata onwe ya. Ọ zaghachiri, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Izrel, bụ, Onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa, onye a gọziri agọzi ka ị bụkwa, onye gbochiworo m taa ka m ghara ịba n’ikpe ọmụma ọbara.”—Amaokwu nke 32, 33.

13 Mgbe Abigail laghachiri n’ụlọ, o jiri obi ike chọọ ụzọ ịkọrọ di ya banyere onyinye ahụ o nyere Devid. Otú ọ dị, mgbe ọ chọtara ya, ọ “ṅụbigakwara mmanya ókè nke ukwuu.” Ya mere, o cheere ruo mgbe anya doro ya, ma gwazie ya ihe merenụ. Olee otú Nebal si meghachi omume? Ọ kụjara nke na ọ dị ka ahụ́ ọ̀ kpọnwụrụ ya. Mgbe ụbọchị iri gasịrị, Chineke gburu ya. Mgbe Devid nụrụ banyere ọnwụ Nebal, ọ gwara Abigail, bụ́ onye o doro anya na o nwere mmasị na nkwanye ùgwù n’ebe ọ nọ, ka ọ lụọ ya. Abigail kweere ihe Devid kwuru.—Amaokwu nke 34-42.

Ị̀ Pụrụ Ịdị Ka Abigail?

14. Àgwà Abigail ndị dị aṅaa ka anyị ga-achọ ịzụlite n’ụzọ zuru ezu karị?

14 Ị̀ hụtara àgwà ụfọdụ ndị Abigail gosipụtara ndị ị ga-achọ ịzụlite n’ụzọ buru ibu karị—ma ị bụ nwoke ma ị bụ nwanyị? Ikekwe, ị ga-achọ ịdị na-ejikwu akọ na ezi uche eme ihe mgbe e nwere ihe isi ike. Ma ọ bụ ị pụrụ ịchọ ịdị na-ekwu okwu n’ụzọ dị nro na nke ezi uche dị na ya mgbe iwe na-ewe ndị gị na ha nọ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ma i kpegara Jehova ekpere maka nke ahụ? O kwere nkwa inye onye ọ bụla ‘nọgidere na-arịọ n’okwukwe’ amamihe, nghọta, na ikike iche echiche.—Jems 1:5, 6; Ilu 2:1-6, 10, 11.

15. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa karịsịa ka ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na-egosipụta àgwà ndị ahụ Abigail gosipụtara?

15 Àgwà ọma ndị dị otú ahụ dị mkpa karịsịa nye nwanyị nwere di na-ekweghị ekwe nke na-adịghị eji ụkpụrụ Bible eme ihe. Ikekwe ọ na-aṅụ oké mmanya. E nwere olileanya na ndị ikom dị otú ahụ ga-agbanwe ụzọ ha. Ọtụtụ ndị emewo otú ahụ—mgbe ụfọdụ n’imeghachi omume n’àgwà ịdị nwayọọ, nkwanye ùgwù miri emi, na nke dị ọcha ndị nwunye ha na-egosipụta.—1 Pita 3:1, 2, 4.

16. N’agbanyeghị ọnọdụ ndị ọ na-eche ihu n’ụlọ, olee otú nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst si egosipụta na o ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ ihe karịa ihe nile ọzọ?

16 N’agbanyeghị ihe isi ike ndị ị pụrụ ịtachi obi na ha n’ụlọ, cheta na Jehova nọ ya mgbe nile ịkwagide gị. (1 Pita 3:12) Ya mere, na-agbalịsi ike iwusi onwe gị ike n’ụzọ ime mmụọ. Na-ekpe ekpere maka amamihe na obi dị jụụ. Ee, na-abịarukwu Jehova nso site n’ịmụchi Bible anya, ikpe ekpere, ịtụgharị uche, na iso Ndị Kraịst ibe gị na-akpakọrịta. Omume ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke di ya emetụtaghị ịhụnanya Abigail nwere n’ebe Chineke nọ na omume ya n’ebe ohu Ya e tere mmanụ nọ. O mere ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume. Ọbụna n’ezinụlọ ebe di bụ ohu Chineke na-esetịpụ ezi ihe nlereanya, nwunye bụ́ Onye Kraịst na-aghọta na ọ dị ya mkpa ịnọgide na-arụsi ọrụ ike iji na-ewulite ọnọdụ ime mmụọ nke ya. Ọ bụ eziokwu na di ya nwere ibu ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke ilekọta ya n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ́, ma mee elu mee ala, ọ ghaghị ‘iji egwu na ọma jijiji na-arụpụta nzọpụta nke onwe ya.’—Ndị Filipaị 2:12; 1 Timoti 5:8.

Ọ Natara “Ụgwọ Ọrụ nke Onye Amụma”

17, 18. (a) Ule okwukwe dị aṅaa dị ịtụnanya chere nwanyị Zarefat ihu? (b) Olee otú nwanyị ahụ di ya nwụrụ si meghachi omume n’arịrịọ Ịlaịja, oleekwa otú Jehova si kwụghachi ya ụgwọ n’ihi nke a?

17 Ụzọ Jehova si lekọta onye ogbenye di ya nwụrụ n’oge Ịlaịja na-egosi na o ji ndị na-akwado ezi ofufe site n’inyefe onwe ha na ihe onwunwe ha kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ụkọ mmiri ozuzo nke dịtere aka mere n’oge Ịlaịja, agụụ mekpọrọ ọtụtụ ndị ọnụ, gụnyere otu nwanyị di ya nwụrụ na nwa ya nwoke na-eto eto bi na Zarefat. Mgbe nanị ihe fọdụụrụ ha bụ otu ugboro nri, otu ọbịa bịakwutere ha—Ịlaịja onye amụma. Ọ rịọrọ arịrịọ dị nnọọ ịtụnanya. Ọ bụ ezie na ọ maara ọnọdụ nwanyị ahụ, ọ rịọrọ ya ka o jiri mmanụ na ụtụ ọka ikpeazụ o nwere ‘meere ya ogbe achịcha nta.’ Ma ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi na otú a ka, Jehova bụ́ Chineke Izrel, sịrị, Okpokoro ụtụ ọka ahụ agaghị agwụ, ite mmanụ ahụ agaghị akọkwa gị, ruo ụbọchị Jehova ga-enye mmiri ozuzo n’elu ụwa.”—1 Ndị Eze 17:8-14.

18 Olee otú ị gaara esi meghachi omume n’arịrịọ ahụ dị ịtụnanya? Nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ, n’ịbụ onye o doro anya na ọ matara na Ịlaịja bụ onye amụma Jehova, ‘mere dị ka okwu Ịlaịja si dị.’ Olee ụzọ Jehova si meghachi omume n’omume ile ọbịa ya? O nyere nwanyị ahụ, nwa ya, na Ịlaịja nri n’oge ụkọ mmiri ozuzo ahụ n’ụzọ ọrụ ebube. (1 Ndị Eze 17:15, 16) Ee, Jehova nyere nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ “ụgwọ ọrụ nke onye amụma,” ọ bụ ezie na ọ bụghị onye Izrel. (Matiu 10:41) Ọkpara Chineke kwanyekwaara nwanyị a di ya nwụrụ ùgwù mgbe ọ kpọtụrụ ya aha dị ka onye nlereanya nye ndị obodo ya na-enweghị okwukwe, bụ́ ndị Nazaret.—Luk 4:24-26.

19. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa si egosipụta mmụọ nke nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ, oleekwa otú Jehova si ele ndị a anya?

19 Taa, ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst na-egosipụta mmụọ nke nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ. Dị ka ihe atụ, kwa izu, ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị—ọtụtụ n’ime ha dara ogbenye ma nwee ezinụlọ ha ga-elekọta—na-ele ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha ọbịa. Ndị ọzọ na-esoro ndị ozi oge nile nọ n’ógbè ha ekerịta nri ha, na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ na-enyefe onwe ha na ihe onwunwe ha iji na-akwado ọrụ Alaeze. (Luk 21:4) Jehova ọ̀ na-ahụta ụdị ịchụ àjà ahụ? Eenụ! “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.”—Ndị Hibru 6:10.

20. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị inyom na-atụ egwu Chineke nwetara ihe ùgwù nke ijere Jizọs na ndịozi ya ozi. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ndị inyom a si mee ka obi Jehova ṅụrịa, anyị ga-atụlekwa ihe atụ ndị inyom nke oge a bụ́ ndị ji obi ha dum na-ejere Jehova ozi, ọbụna n’ọnọdụ ndị siri ike.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Osuso ọmụmụ Jizọs, dị ka Matiu si dekọọ ya, kpọtụrụ ndị inyom anọ aha—Tema, Rehab, Rut, na Meri. A kwanyeere ha nile ùgwù n’Okwu Chineke.—Matiu 1:3, 5, 16.

Ná Ntụleghachi

• Olee otú ndị inyom ndị a si mee ka obi Jehova ṅụrịa?

• Shifra na Pua

• Rehab

• Abigail

• Nwanyị Zarefat di ya nwụrụ

• Olee otú ịtụgharị uche n’ihe nlereanya ndị ndị inyom a setịpụrụ pụrụ isi nyere anyị onwe anyị aka? Nye ihe atụ.

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ọtụtụ ndị inyom na-ekwesị ntụkwasị obi ejeworo Chineke ozi n’agbanyeghị “iwu eze nyere”

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ihi gịnị ka Rehab ji bụrụ ezi ihe nlereanya nke onye nwere okwukwe siri ike?

[Foto dị na peeji nke 10]

Àgwà ndị dị aṅaa Abigail gosipụtara ka ị ga-achọ iṅomi?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ọtụtụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst taa na-egosipụta mmụọ nke nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ