Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
IRI nri bu nje na-akpata ọrịa adịtụghị mma. Ọ dị onye o metụtaworo ugboro ugboro mkpa ilezikwu anya n’otú o si eri ihe. Ma ọ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya ịhọrọ ịkwụsị iri nri kpam kpam iji zere iri nri bu nje. Ime otú ahụ ga-akpatakwu nsogbu karịrị nke ọ ga-agwọta. Ọ dịghị onye ga-adị ndụ ruo ogologo oge n’erighị nri.
N’ụzọ yiri nke ahụ, mmadụ ịbụ onye e mebiri ntụkwasị obi ya na-agbawa obi. Ịbụ ndị e mebiri ntụkwasị obi ha ugboro ugboro pụrụ ime ka anyị chee echiche nke ọma banyere ụdị ndị anyị na ha na-akpakọrịta. Otú ọ dị, izere ndị mmadụ kpam kpam iji ghara ịbụ ndị e mebiri ntụkwasị obi ha abụghị ihe ngwọta ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ịghara ịtụkwasị ndị ọzọ obi na-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ. Iji na-ebi ndụ na-eju afọ, ọ dị anyị mkpa inwe mkpakọrịta nke dabeere ná ntụkwasịrịta obi.
“Ntụkwasị obi bụ otu n’ime isi ihe ndị na-eme ka mmadụ soro ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta na-aga were were kwa ụbọchị,” ka akwụkwọ bụ́ Jugend 2002 na-ekwu. “Onye ọ bụla na-achọ onye ọ ga-atụkwasị obi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Neue Zürcher Zeitung na-akọ. “Ntụkwasị obi na-eme ka ndụ ka mma” ruo n’ókè nke na “ọ dị oké mkpa maka mmadụ ịdị ndụ.” N’ezie, akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu na, ma e nweghị ntụkwasị obi, “mmadụ apụghị ịnagide ihe isi ike nke ndụ.”
Ebe anyị nwere mkpa bụ́ isi nke ịtụkwasị mmadụ obi, ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi n’atụghị egwu ịbụ ndị e mebiri ntụkwasị obi ha?
Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile
“Tụkwasị Jehova obi gị nile,” ka Bible na-agwa anyị. (Ilu 3:5) N’ezie, Okwu Chineke na-agba anyị ume ugboro ugboro ịtụkwasị Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, obi.
N’ihi gịnị ka a pụrụ iji tụkwasị Chineke obi? Nke mbụ, ọ bụ n’ihi na Jehova Chineke dị nsọ. Aịzaịa onye amụma dere, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova . . . dị.” (Aịsaịa 6:3) Ọ̀ bụ na echiche nke ịdị nsọ adịghị adọta gị? N’ezie, o kwesịrị ịdọta gị n’ihi na ịdị nsọ Jehova na-apụta na ọ dị ọcha, ọ dịghị etinye aka n’ihe ọjọọ ọ bụla, nakwa na o kwesịrị ka a tụkwasị ya obi kpam kpam. A pụghị imebi omume ya ma ọ bụ ya emee ihe ga-emerụ anyị ahụ́, ọ pụghịkwa ikwe omume ya imebi ntụkwasị obi anyị.
1 Jọn 4:8) Ịhụnanya Chineke na-achịkwa ihe nile ọ na-eme. Ịdị nsọ Jehova na àgwà ya ndị ọzọ dị ịrịba ama na-eme ka ọ bụrụ Nna zuru okè, onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam. Ọ dịtụghị ihe ma ọ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi karịa Jehova.
Ọzọkwa, anyị pụrụ ịtụkwasị Chineke obi n’ihi ikike na ọchịchọ o nwere ịkwado ndị na-ejere ya ozi. Dị ka ihe atụ, ike ya kasịnụ na-enyere ya aka ime ihe. Ikpe ziri ezi na amamihe ya zuru okè na-achịkwa ụzọ o si eme ihe. Ịhụnanya ya na-enweghị atụ na-akpalikwa ya ime ihe. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi dere. (Tụkwasị Jehova Obi Ma Nwee Obi Ụtọ
Ezi ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-atụkwasị Jehova obi bụ na ọ na-aghọta anyị nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ maara na mmadụ ọ bụla nwere mkpa bụ́ isi nke iso Onye Okike ya na-enwe mmekọrịta e ji n’aka, nke na-adịgide adịgide na nke dabeere ná ntụkwasị obi. Ahụ́ na-eru ndị nwere mmekọrịta dị otú ahụ ala karị. “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke meworo Jehova ka Ọ bụrụ ihe ntụkwasị obi ya,” ka Eze Devid kwubiri. (Abụ Ọma 40:4) Ọtụtụ nde mmadụ taa ji obi ha dum ekwughachi echiche ahụ Devid nwere.
Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Doris ebiwo na Dominican Republic, Germany, Gris, na United States. Ọ na-ekwu, sị: “Obi dị m ụtọ ịtụkwasị Jehova obi. Ọ maara otú e si elekọta m n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ ime mmụọ, na n’ụzọ mmetụta uche. Ọ bụ enyi kasị mma mmadụ pụrụ inwe.” Wolfgang, bụ́ onye ndụmọdụ n’ihe metụtara iwu, na-akọwa, sị: “Ọ bụ ihe magburu onwe ya inwe ike ịdabere n’ebe onye bu ọdịmma gị kasịnụ n’obi nọ, onye pụrụ imere gị ihe kasị mma—onye ga-emekwa nke ahụ n’ezie!” Ham, bụ́ onye a mụrụ n’Eshia nke bi na Europe ugbu a, na-ekwu, sị: “Obi siri m ike na ọ dịghị ihe karịrị Jehova, ọ dịghịkwa emehie ihe, n’ihi ya, enwere m obi ụtọ ịdabere n’ebe ọ nọ.”
N’ezie, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa, ọ bụghị nanị ịtụkwasị Onye Okike anyị obi kamakwa ịtụkwasị ndị mmadụ obi. N’ihi ya, Jehova, dị ka enyi maara ihe na nke nwere ahụmahụ, na-enye anyị ndụmọdụ banyere ụdị ndị anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Site n’iji nlezianya na-agụ Bible, anyị pụrụ ịhụ ihe bụ́ ndụmọdụ ya n’okwu a.
Ndị Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
“Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere,” ka ọbụ abụ ahụ dere. (Abụ Ọma 146:3) Okwu a sitere n’ike mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịmata na ọtụtụ mmadụ erughị eru ka anyị tụkwasị ha obi. Ọbụna ndị a na-akwanyere ùgwù dị ka “ndị a maara aha ha” n’ụwa a, dị ka ndị ọkachamara na nkà ihe ọmụma ma ọ bụ ihe omume ụfọdụ, erughị nnọọ eru ka a tụkwasị ha obi nanị n’ihi ihe ha bụ. Nduzi ha na-eduhiekarị eduhie, ntụkwasị obi e nwekwara n’ebe ndị dị otú ahụ ‘a maara aha ha’ nọ pụrụ iduga ná mmechuihu ngwa ngwa.
N’ezie, nke a ekwesịghị ime ka anyị kwụsị ịtụkwasị mmadụ nile obi. Otú ọ dị, n’ụzọ doro Ọpụpụ 18:21) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
anya, ọ dị anyị mkpa ime nhọrọ mgbe a bịara ná ndị anyị ga-atụkwasị obi. Olee ihe anyị kwesịrị iji kpebie ndị anyị ga-atụkwasị obi? Ihe atụ sitere ná mba Izrel oge ochie pụrụ inyere anyị aka. Mgbe ọ dị mkpa ịhọpụta ndị ga-ebu ibu ọrụ ndị dị mkpa n’Izrel, a dụrụ Mozis ọdụ ka o “lepụta ndị dimkpa, ndị na-atụ egwu Chineke, [“ndị a pụrụ ịtụkwasị obi,” NW], ndị na-akpọ uru na-ezighị ezi asị.” (Ndị a bụ ndị ikom gosipụtaworo ụfọdụ àgwà nsọpụrụ Chineke tupu a họpụta ha ịnọ n’ọnọdụ ndị chọrọ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. Ha enyeworị ihe àmà na ha na-atụ egwu Chineke; ha nwere nsọpụrụ ziri ezi maka Onye Okike ha ma na-atụ egwu imejọ ya. O doro onye ọ bụla anya na ndị ikom a mere ike ha nile ịgbaso ụkpụrụ Chineke. Ha kpọrọ uru na-ezighị ezi asị, bụ́ nke gosiri na ha nwere ikike ime omume ziri ezi nke ga-egbochi ha ịbụ ndị ike ga-emerụ. Ha agaghị emebi ntụkwasị obi e nwere n’ebe ha nọ iji mezuo ọdịmma onwe ha ma ọ bụ nke ndị ikwu ma ọ bụ ndị ibe ha.
Ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya anyị iji ihe ndị yiri nke ahụ eme ihe taa mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị ga-atụkwasị obi? Ànyị maara ndị akparamàgwà ha na-egosi na ha na-atụ egwu Chineke? Hà kpebisiri ike idebe ụkpụrụ ya banyere akparamàgwà? Hà na-eguzosi ike n’ihe ruo n’ókè nke izere ime ihe ndị na-ezighị ezi? Hà na-eme ihe n’eziokwu nke na ha agaghị eji ọnọdụ dapụtaranụ eme ihe maka ọdịmma nke ha ma ọ bụ iji nweta ihe ha chọrọ? N’ezie, ndị ikom na ndị inyom na-egosipụta àgwà ndị dị otú ahụ kwesịrị ka anyị tụkwasị ha obi.
Ekwela Ka Mmebi Ntụkwasị Obi A Na-enwe Mgbe Ụfọdụ Kụda Gị Obi
N’ikpebi ndị anyị pụrụ ịtụkwasị obi, anyị aghaghị inwe ndidi, ebe ọ bụ na ọ na-ewe oge iji chọpụta onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Ihe amamihe dị na ya ime bụ ịtụkwasị mmadụ obi nke nta nke nta. N’ụzọ dị aṅaa? Anyị pụrụ ịdị na-ele àgwà mmadụ ruo oge ụfọdụ, na-achọpụta otú o si eme ihe n’ọnọdụ ụfọdụ. Onye ahụ ò kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe ndị dị nta? Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-eweghachi ihe ndị ọ gbaziiri ma na-edebe àgbà e yiri eyi? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ, anyị pụrụ iche na anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi n’ihe ndị dị mkpa n’enweghị nsogbu. Nke a bụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ a: “Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’oké ihe.” (Luk 16:10) Ime nhọrọ na inwe ndidi pụrụ inyere anyị aka izere ịbụ ndị e mebiri ntụkwasị obi ha n’oké ihe.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ emebie ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ? Ndị na-amụ Bible ga-echeta na n’abalị ahụ e jidere Jizọs Kraịst, ndịozi ya mebiri nnọọ ntụkwasị obi o nwere n’ebe ha nọ. Judas Iskarịọt raara ya nye, ndị ọzọ gbalagakwara n’ụjọ. Ọbụna Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ. Ma Jizọs ghọtara na ọ bụ nanị Judas ma ụma mee ihe o mere. Ịbụ onye e mebiri ntụkwasị obi ya n’oge ahụ egbochighị Jizọs ịtụkwasịghachi ndịozi 11 fọdụrụnụ obi nanị mgbe izu ole na ole gasịrị. (Matiu 26:45-47, 56, 69-75; 28:16-20) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị echee na onye anyị tụkwasịrị obi emebiela ntụkwasị obi anyị, anyị ga-eme nke ọma ịghọta ma ihe ahụ anyị chere na ọ bụ imebi ntụkwasị obi ọ̀ bụ ihe àmà nke mmụọ ekwesịghị ntụkwasị obi ka ọ̀ bụ adịghị ike anụ ahụ́ nke na-adịru nwa oge.
À Pụrụ Ịtụkwasị M Obi?
Onye kpebiri ime nhọrọ banyere onye ọ ga-atụkwasị obi kwesịrị inwe ezi uche ma jụọ onwe ya, sị: ‘À pụrụ ịtụkwasị m obi? Ọ̀tụ̀tụ̀ ikwesị ntụkwasị obi ha aṅaa ka m kwesịrị ịtụ anya ya n’aka onwe m nakwa n’aka ndị ọzọ?’
N’ezie, onye a pụrụ ịtụkwasị obi na-ekwu eziokwu mgbe nile. (Ndị Efesọs 4:25) Ọ dịghị agbanwe okwu ya iji kwuo ihe ga-amasị ndị na-ege ya ntị iji nweta uru onwe onye. Ọ bụrụkwa na onye a pụrụ ịtụkwasị obi ekwee nkwa, ọ na-eme ihe nile o nwere ike ime iji mezuo ihe o kwuru. (Matiu 5:37) Ọ bụrụ na mmadụ agbanyere ya izu, onye a pụrụ ịtụkwasị obi na-ezochi izu nzuzo ahụ ma ghara ịgba asịrị. Onye a pụrụ ịtụkwasị obi na-ekwesị ntụkwasị obi nye onye òtù ọlụlụ ya. Ọ dịghị ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ọ dịghị eche banyere ihe ndị rụrụ arụ, ọ dịghịkwa eme mfegharị. (Matiu 5:27, 28) Onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi na-arụsi ọrụ ike ịkpata ihe ya na ezinụlọ ya ga-eji ebi ndụ, ọ dịghịkwa achọ inweta ego aka ọkụ site n’irigbu ndị ọzọ. (1 Timoti 5:8) Iburu n’uche ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ ezi uche dị na ha ga-enyere anyị aka ịmata ndị anyị pụrụ ịtụkwasị obi. Ọzọkwa, ịgbaso otu ụkpụrụ omume ahụ ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịbụ onye ndị ọzọ pụrụ ịtụkwasị obi.
Ọ ga-abụ ihe na-enye obi ụtọ ibi n’ụwa ebe mmadụ nile bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi ebe a na-agaghịkwa enwe obi mgbawa n’ihi mmebi nke ntụkwasị obi! Nke ahụ ọ̀ bụ nrọ nkịtị? Ọ bụghị nye ndị ji nkwa Bible kpọrọ ihe, n’ihi na Okwu Chineke na-ebu amụma banyere ọbịbịa nke “ụwa ọhụrụ” mara mma nke aghụghọ, ụgha, na mmegbu nile na-agaghị adị na ya, nakwa nke iru újú, ọrịa, na ọbụna ọnwụ na-agaghị adị na ya! (2 Pita 3:13; Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:3-5) Ọ́ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị imekwu nchọpụta banyere olileanya a? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyekwu gị ihe ọmụma banyere isiokwu a na isokwu ndị ọzọ dị oké mkpa.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ịbụ ndị na-adịghị atụkwasị ndị ọzọ obi na-eme ka anyị ghara inwe obi ụtọ
[Foto dị na peeji nke 5]
Jehova kasị kwesị ekwesị anyị ịtụkwasị ya obi
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Mmekọrịta nke dabeere ná ntụkwasịrịta obi dị anyị nile mkpa