Onye Jehova Ziri Ihe Site na Nwata
Akụkọ Ndụ
Onye Jehova Ziri Ihe Site na Nwata
DỊ KA RICHARD ABRAHAMSON SI KỌỌ
“Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile.” Ka m kọwaa ihe mere okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 71:17 ji nwee ihe pụrụ iche ha pụtaara m.
NDỊ MMỤTA BIBLE, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, zutere mama m bụ́ Fannie Abrahamson na 1924. Adị m nanị otu afọ. Ka a na-akụziri mama m eziokwu Bible, ọ na-agbakwuru ndị agbata obi ya ma kọọrọ ha ihe ndị ọ mụtara, ọ kụzikwaara mụ na nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị bụ́ ndị tọrọ m ihe. Tupu mụ amata ka e si agụ ihe, o nyeworo m aka iburu ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ banyere ngọzi Alaeze Chineke n’isi.
Ná ngwụsị nke afọ ndị 1920, ìgwè Ndị Mmụta Bible anyị nke dị na La Grande, na steeti Oregon, U.S.A., bụ́ ebe a mụrụ ma zụlite m, nwere ndị inyom ole na ole na ụmụaka. Ọ bụ ezie na anyị nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ, ndị ozi na-ejegharị ejegharị a na-akpọ ndị pilgrim na-eleta anyị otu ugboro ma ọ bụ abụọ n’afọ. Ndị a kwuru okwu ndị na-agba ume, sonyere anyị n’ozi ụlọ n’ụlọ, ma jiri obiọma gosi mmasị n’ebe ụmụaka nọ. Shield Toutjian, Gene Orrell, na John Booth so ná ndị ahụ anyị hụrụ n’anya.
Na 1931, ọ dịghị onye si n’ìgwè anyị pụrụ ịga mgbakọ na Columbus, Ohio, bụ́ ebe Ndị Mmụta Bible nọ nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. Ma kọmpịnị, dị ka a na-akpọ ọgbakọ dị iche iche n’oge ahụ, na ìgwè ndị dị n’ebe dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị na-agaghị mgbakọ ahụ zukọtara n’ógbè n’ógbè n’August iji
kpebie ịnakwere aha ahụ. Obere ìgwè anyị nke dị na La Grande mekwara nke a. Mgbe ahụ, ná mkpọsa e mere na 1933 ikesa akwụkwọ bụ́ The Crisis, ebuuru m otu ụzọ iche n’ihu dabeere na Bible n’isi, na nke mbụ ya kwa, agbara m àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ nanị m.N’afọ ndị 1930, mmegide a na-emegide ọrụ anyị kawanyere njọ. Iji nagide nke a, e jikọtara kọmpịnị dị iche iche ọnụ gaa n’ìgwè dị iche iche, bụ́ ndị nwekọrọ mgbakọ ọnụ, meekwa nkwusa ndị a maara dị ka mkpọsa ìgwè, otu ugboro ma ọ bụ abụọ n’afọ. Ná mgbakọ ndị a, a kụziiri anyị ụzọ dị iche iche e si eme nkwusa, gosikwa anyị ụzọ anyị pụrụ isi jiri nkwanye ùgwù mesoo ndị uwe ojii na-egbochi anyị ihe. Ebe ọ bụ na a na-akpụpụ Ndịàmà n’ihu onye ọkàikpe bụ́ onye uwe ojii ma ọ bụ n’ụlọikpe nkịtị mgbe mgbe, anyị na-amụgharị ihe ndị e dere ná mpempe akwụkwọ a kpọrọ Usoro Okwu Ikpe. Nke a kwadebere anyị ịnagide mmegide.
Ịmalite Ito Eto n’Eziokwu Bible
Ihe ọmụma m nwere banyere eziokwu Bible na olileanya dabeere na Bible nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa n’okpuru Alaeze eluigwe nke Chineke nọgidere na-amụba. N’oge ahụ, a dịghị ekwusicha okwu ike banyere baptizim maka ndị na-enweghị olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpughe 5:10; 14:1, 3) Otú ọ dị, a gwara m na ọ bụrụ na mụ ekpebiwo n’obi m ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, ọ ga-adị mma ka m mee baptizim. Nke a ka m mere n’August 1933.
Mgbe m dị afọ 12, onye nkụzi m chere na m na-eme nke ọma n’ikwu okwu n’ihu ọha, n’ihi ya, ọ gbara mama m ume ka o mee ndokwa ka m nwetakwuo ọzụzụ. Mama m chere na nke a pụrụ inyere m aka ijere Jehova ozi n’ụzọ ka mma. N’ihi ya, ọ kwụrụ ụgwọ ihe ọmụmụ m site n’ịsara onye na-akụziri m ihe ọmụmụ ahụ ákwà ya ruo otu afọ. Ọzụzụ ahụ nyeere m aka n’ozi m. Mgbe m dị afọ 14, ọrịa àgbà jidere m, nke mere ka m kwụsị ihe ọmụmụ m ruo ihe karịrị otu afọ.
N’afọ 1939, otu onye ozi oge nile aha ya bụ Warren Henschel bịara n’ógbè anyị. * Ọ bụ deede m n’ụzọ ime mmụọ, na-akpọ m aga ozi ubi ọtụtụ ụbọchị. N’oge na-adịghị anya, o nyeere m aka ịmalite ozi ọsụ ụzọ oge ezumike, nke bụ́ ụdị ozi ọsụ ụzọ oge nile a na-arụ nwa oge. N’oge okpomọkụ ahụ, a haziri ìgwè anyị ịghọ kọmpịnị. A họpụtara Warren dị ka ohu kọmpịnị, họpụtakwa m dị ka onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Mgbe Warren gara ije ozi na Betel, n’isi ọrụ ụlọ mba nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, aghọrọ m ohu kọmpịnị.
Ịmalite Ozi Oge Nile
Ibu ọrụ ka ukwuu nke ije ozi dị ka ohu kọmpịnị wusikwuru ọchịchọ m ịbanye n’ozi oge nile ike, bụ́ nke m mere mgbe m dị afọ 17 ka m gụsịrị klas nke atọ nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Anyị na papa m anọghị n’otu okpukpe, ma ọ bụ ezi onye nlekọta, bụrụkwa nwoke nwere ụkpụrụ dị elu. Ọ chọrọ ka m gaa
ụlọ akwụkwọ dị elu. Ma o kwuru na ọ bụrụhaala na m adabereghị n’ebe ọ nọ maka ụlọ na nri, enwere m ike ime ihe m chọrọ ime. N’ihi ya, amalitere m ịsụ ụzọ na September 1, 1940.Mgbe m na-ahapụ ụlọ, mama m gwara m ka m gụọ Ilu 3:5, 6: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Itinye ndụ m n’aka Jehova mgbe nile abụworo m n’ezie ihe enyemaka dị ukwuu.
N’oge na-adịghị anya, esonyeere m Joe na Margaret Hart n’ozi n’etiti ebe ugwu Washington State. Ókèala ahụ nwere akụkụ dịgasị iche iche—ubi ebe a na-azụ ehi na atụrụ, ógbè ndị India, nakwa ọtụtụ obodo na obodo nta dị iche iche. N’oge opupu ihe ubi nke 1941, e nyere m ọrụ dị ka ohu kọmpịnị n’ọgbakọ dị na Wenatchee, Washington.
N’otu n’ime mgbakọ ndị anyị gara na Walla Walla, Washington, ejere m ozi dị ka onye atendantị, na-anabata ndị mmadụ n’ime ụlọ mgbakọ ahụ. Ahụrụ m otu nwanna nwoke na-eto eto ka ọ na-agbalị ime ka ígwè na-ekwu okwu rụwa ọrụ, ma o kweghị. N’ihi ya, m gwara ya ka o were ọrụ nke m, ka m were nke ya. Mgbe ohu ógbè ahụ bụ́ Albert Hoffman bịaghachiri ma hụ na m hapụrụ ọrụ m, o ji mmụmụ ọnụ ọchị kọwaara m uru ọ bara mmadụ ịnọgidesi ike n’ọrụ ya ruo mgbe a gwara ya ka o mee ihe ọzọ. M ka na-echeta ndụmọdụ ya ahụ.
N’August 1941, Ndịàmà Jehova haziri mgbakọ ukwu na St. Louis, Missouri. Ndị ezinụlọ Hart ji ihe kpuchie azụ ụgbọala pikọp ha ma dọnye ya bench. Anyị itoolu ji ụgbọala ahụ mee njem dị kilomita 2,400 iji ruo St. Louis. Njem ahụ were anyị ihe dị ka izu abụọ, uje na ụla. Ndị uwe ojii mere atụmatụ na mmadụ 115,000 bịara mgbakọ ahụ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ erughị otú ahụ, o doro anya na ha karịrị mmadụ 65,000 bụ́ ọnụ ọgụgụ Ndịàmà e nwere na United States n’oge ahụ. Mgbakọ ahụ na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ n’ezie.
Ije Ozi na Betel Brooklyn
Mgbe anyị laghachiri Wenatchee, enwetara m akwụkwọ ozi nke gwara m ka m bịa Betel Brooklyn. Mgbe m rutere n’October 27, 1941, a kpọgara m n’ọfịs Nathan H. Knorr, bụ́ onye nlekọta nke ebe obibi akwụkwọ. O ji obiọma kọwaara m otú Betel dị ma mesie ike mkpa ọ dị ịrapara Jehova n’ahụ́ iji nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ n’ebe ahụ. A kpọgaziri m ná Ngalaba Mbupụ Akwụkwọ ma tinye m n’ebe a na-ekekọta katọn maka mbupụ.
Na January 8, 1942, Joseph Rutherford, bụ́ onye nọworo na-edu ndú n’etiti Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, nwụrụ. Ụbọchị ise ka e mesịrị, ndị nduzi Society họpụtara Nwanna Knorr ịnọchi ya. Mgbe W. E. Van Amburgh, bụ́ onye nọworo na-eje ozi eri oge dị ka odeakwụkwọ na oche ego Society maara ezinụlọ
Betel ọkwa ya, o kwuru, sị: “Apụrụ m icheta mgbe C. T. Russell nwụrụ [na 1916], e jirikwa J. F. Rutherford dochie ya. Onyenwe anyị nọgidere na-eduzi ma na-eme ka ọrụ Ya na-aga n’ihu. Ugbu a, ana m atụ nnọọ anya na ọrụ a ga na-aga n’ihu ka Nathan H. Knorr na-eje ozi dị ka onyeisi oche n’ihi na ọrụ a bụ nke Onyenwe anyị, ọ bụghị nke mmadụ.”Na February 1942, a mara ọkwa na a ga-amalite “Ọzụzụ Dị Elu n’Ije Ozi Ọchịchị Chineke.” A haziri ya iji zụọ ndị nọ na Betel imeziwanye ikike ha ime nnyocha n’isiokwu Bible, ihazi ihe omume ha nke ọma, na ime ya n’ụzọ dị irè. N’ịbụ onye ọzụzụ m nwetara n’ikwu okwu n’ihu ọha n’oge gara aga nyeere aka, enwere m ọganihu ngwa ngwa n’ihe omume ahụ.
N’oge na-adịghị anya, e kenyere m ịrụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, bụ́ nke na-ahụ maka ozi Ndịàmà na United States. Ná ngwụsị nke afọ ahụ, e kpebiri iguzobeghachi ihe omume nke ndị ozi ịga leta kọmpịnị dị iche iche nke Ndịàmà. Ka oge na-aga, a malitere ịkpọ ndị ozi a na-ejegharị ejegharị a na-akpọ ndị ohu ụmụnna, ndị nlekọta sekit. N’oge okpomọkụ nke 1942, a haziri otu ihe omume na Betel iji zụọ ụmụnna n’ụdị ozi a, enwekwara m ihe ùgwù nke iso ná ndị na-enweta ọzụzụ. Ana m echeta karịsịa na Nwanna Knorr, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi anyị, mesiri isi ihe a ike: “Anwala ime ndị mmadụ obi ụtọ. N’ikpeazụ, ọ dịghị onye ị ga-eme obi ụtọ. Mee Jehova obi ụtọ, ị ga-emekwa ndị nile hụrụ Jehova n’anya obi ụtọ.”
Ọrụ njegharị ahụ malitere n’October 1942. Ụfọdụ n’ime anyị nọ na Betel keere òkè na ya ná ngwụsị izu ụfọdụ, na-eleta ọgbakọ ndị dị kilomita 400 site na New York City. Anyị na-atụle ọrụ nkwusa na ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ n’ọgbakọ, soro ndị na-elekọta ibu ọrụ ọgbakọ nwee nzukọ, kwuo okwu otu ugboro ma ọ bụ abụọ, ma soro Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ jee ozi.
Na 1944, eso m ná ndị e si ná Ngalaba Ije Ozi ziga n’ọrụ njegharị ruo ọnwa isii, na-eje ozi na Delaware, Maryland, Pennsylvania, na Virginia. Mgbe e mesịrị, n’ime ọnwa ole na ole, eletara m ọgbakọ ndị dị na Connecticut, Massachusetts, na Rhode Island. Mgbe m lọghachiri na Betel, mụ na Nwanna Knorr na odeakwụkwọ ya bụ́ Milton Henschel rụkọrọ ọrụ n’ọfịs ruo nwa oge, bụ́ ebe m nọ mata otú ọrụ anyị si na-aga n’ụwa nile. Arụkwara m nwa oge n’Ọfịs Oche Ego n’okpuru nlekọta nke W. E. Van Amburgh na onye inyeaka ya bụ́ Grant Suiter. Mgbe ahụ, na 1946, e mere m onye nlekọta nke ọtụtụ ọfịs na Betel.
Oké Mgbanwe ná Ndụ M
Mgbe m na-eleta ọgbakọ dị iche iche na 1945, mụ na Julia Charnauskas matara na Providence, Rhode Island. Ka ọ na-erule etiti afọ 1947, anyị ekwuwela okwu ọlụlụ. Enwere m nnọọ mmasị n’ozi Betel, ma n’oge ahụ, ọ dịghị ndokwa e mere maka mmadụ ịkpọbata onye òtù ọlụlụ ya ije ozi n’ebe ahụ. Ya mere, na January 1948, ahapụrụ m Betel, mụ na Julia (Julie) alụọkwa. Enwetara m ọrụ nwa oge n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị na Providence, anyị malitekọtakwara ozi ọsụ ụzọ anyị.
Na September 1949, a kpọrọ m ịga ọrụ sekit n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Wisconsin. Ọ bụ nnukwu mgbanwe nye mụ na Julie ije ozi n’ebe ndị e nwekarịrị obodo nta na ime ime obodo ebe ndị a na-emepụta mmiri ara ehi. Oge oyi na-adịte aka ma na-ajụ oké oyi, na-enwekwa ọtụtụ izu nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ha na-amụba karịa nke mmiri ji akpụkọ, na ọtụtụ snow. Anyị enweghị ụgbọala. Otú ọ dị, a na-enwekarị onye ga-ebufe anyị n’ọgbakọ nke ọzọ.
Obere oge ka m malitesịrị ọrụ sekit, anyị nwere mgbakọ sekit. Echetara m inyocha nnọọ ihe nile iji hụ na ha na-aga nke ọma, bụ́ nke mere ka ahụ́ ghara irucha ụfọdụ ala. N’ihi ya, onye nlekọta distrikti bụ́ Nicholas Kovalak ji obiọma kọwaara m na ọ marala ụmụnna ndị nọ n’ógbè ahụ ahụ́ ime ihe otú ha sibu eme ya nakwa na ọ dịghị mkpa ka m nwaa ilebara ihe nile anya otú ahụ. Ndụmọdụ ahụ anọwo na-enyere m aka n’ịhụ maka ọtụtụ ihe omume kemgbe ahụ.
Na 1950, enwetara m ọrụ ga-ewe nwa oge
—ịhụ maka inwetara ndị ga-abịa nke mbụ n’ime ọtụtụ mgbakọ ukwu ndị anyị ga-enwe na Yankee Stadium nke dị na New York City, ụlọ. Mgbakọ ahụ tọrọ ụtọ site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ, na-enwe ndị si obodo 67 bịa, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya dịkwa 123,707! Mgbe mgbakọ ahụ gwụsịrị, mụ na Julie maliteghachiri ozi njegharị anyị. Anyị nwere nnọọ obi ụtọ n’ọrụ sekit. Otú ọ dị, anyị chere na anyị kwesịrị ịnọgide na-ewepụta onwe anyị. N’ihi ya, kwa afọ, anyị na-etinye akwụkwọ maka ozi Betel nakwa maka ozi ala ọzọ. Na 1952, anyị nwere obi ụtọ ịnata ọkpụkpọ òkù ịga klas nke 20 nke Watchtower Bible School of Gilead, bụ́ ebe anyị nwetara ọzụzụ maka ozi ala ọzọ.Ije Ozi ná Mba Ọzọ
Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na 1953, e zigara anyị Britain, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ distrikti n’ebe ndịda England. Mgbe anyị nọworo ihe na-erughị otu afọ n’ọrụ a nke tọrọ mụ na Julie ụtọ nke ukwuu, ọ tụrụ anyị n’anya na e zigara anyị Denmark. E nwere mkpa nke nlekọta n’alaka ụlọ ọrụ Denmark. Ebe ọ bụ na m nọ nso, nwetakwa ọzụzụ maka ọrụ dị otú ahụ na Brooklyn, e zigara m ebe ahụ. Anyị jiri ụgbọ mmiri gaa Netherlands, sikwa ebe ahụ banye ụgbọ okporo ígwè ruo Copenhagen, Denmark. Anyị garuru n’August 9, 1954.
Otu n’ime nsogbu ndị a ga-ahụ maka ha bụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ ibu ọrụ ndị dị elu jụrụ ịnakwere ntụziaka sitere n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn. Ọzọkwa, atọ n’ime mmadụ anọ na-asụgharị akwụkwọ anyị gaa n’asụsụ Danish hapụrụ Betel ma mesịa kwụsị iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Ma Jehova zara ekpere anyị. Ndị ọsụ ụzọ abụọ bụ́ Jørgen na Anna Larsen, bụ́ ndị rụworo ọrụ nsụgharị
nwa oge, wepụtara onwe ha ịrụ ya oge nile. Nsụgharị nke akwụkwọ anyị gaa n’asụsụ Danish si otú a gaa n’ihu n’enweghị mbipụta ọ bụla a hapụrụ. Ezinụlọ Larsen ka nọ na Betel Denmark ruo ugbu a, Jørgen na-ejekwa ozi dị ka onye nhazi nke Kọmitii Alaka.Isi iyi nke agbamume anyị n’afọ ndị mbụ ahụ bụ nleta nke Nwanna Knorr na-eleta anyị mgbe nile. Ọ na-ewepụta oge iji soro ndị mmadụ kwurịta okwu, na-akọ ahụmahụ ndị pụrụ inyere anyị aka imeri nsogbu dị iche iche. N’otu nleta ya na 1955, e kpebiri na anyị ga-ewu alaka ọhụrụ nke ga-enwe ebe obibi akwụkwọ ka anyị wee nwee ike ịdị na-ebipụtara Denmark magazin. E nwetara ala n’ógbè dịpụrụ adịpụ nke Copenhagen, n’oge okpomọkụ nke 1957 kwa, anyị kwabara n’ụlọ ahụ e wuru ọhụrụ. Harry Johnson, na nwunye ya bụ́ Karin, bụ́ ndị bịara ọhụrụ na Denmark ka ha gụsịrị akwụkwọ na klas nke 26 nke Gilead, nyere aka ịhụ na e gwunyere ígwè obibi akwụkwọ anyị ma mee ka ọ malite ịrụ ọrụ.
Anyị mere ka ụzọ anyị si ahazi mgbakọ ukwu na Denmark ka mma, ahụmahụ m nwetara mgbe m so ndị nhazi nke mgbakọ rụọ ọrụ na United States nyekwaara m aka. Na 1961, ndị si mba 30 bịara nnukwu mgbakọ mba nile anyị nwere na Copenhagen. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya bụ 33,513. Na 1969, anyị nwere mgbakọ kachasịnụ nke anyị nwetụrụla na Scandinavia, nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya bụ 42,073!
Na 1963, a kpọrọ m ịga klas nke 38 nke Gilead. Nke a bụ ọmụmụ ihe were ọnwa iri nke a haziri nanị maka ịzụ ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịnọnyere ezinụlọ Betel Brooklyn ọzọ na irite uru site n’ahụmahụ nke ndị nọworo na-elekọta ihe ndị a na-eme n’isi ụlọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ.
Mgbe ihe ọmụmụ a gasịrị, alaghachiri m Denmark iji nọgide na-ahụ maka ọrụ ndị dị ebe ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye nlekọta zoonu, na-eleta alaka dị iche iche n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ugwu Europe iji gbaa ndị ọrụ nọ n’ebe ndị ahụ ume ma nyere ha aka ịrụzu ọrụ ha. N’oge na-adịchabeghị anya, arụwo m ọrụ a n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na Caribbean.
Ná ngwụsị nke afọ ndị 1970, ụmụnna ndị nọ na Denmark malitere ịchọ ebe a ga-ewu ihe owuwu ka ibu n’ihi ọrụ nsụgharị na obibi akwụkwọ na-amụbawanye amụbawanye. A chọtara ezigbo ala nke dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ọdịda anyanwụ nke Copenhagen. Eso m ndị ọzọ rụọ ọrụ n’ịtụ ụkpụrụ na ise ihe osise maka ihe owuwu ọhụrụ a, mụ na Julie tụkwara anya iso ezinụlọ Betel ahụ bie n’ụlọ ọhụrụ ya ga-ama mma. Otú ọ dị, ihe agaghị otú e si chee ya.
Ịlaghachi Brooklyn
Na November 1980, a kpọrọ mụ na Julie òkù ije ozi na Betel dị na Brooklyn, bụ́ ebe anyị bịarutere ná mmalite nke January 1981. N’oge ahụ, anyị nọ ná ngwụsị afọ ndị nke 50 anyị, mgbe anyị na ezigbo ụmụnna anyị ndị nọ na Denmark jewokwara ozi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara afọ ndụ anyị, ọ dịghịrị anyị mfe ịlaghachi United States. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị amaliteghị iche banyere ebe kasị masị anyị ịnọ, kama anyị gbalịrị itinye uche n’ọrụ ọhụrụ ndị anyị nwetara n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị ha pụrụ iweta.
Anyị bịarutere na Brooklyn ma biri n’ebe ahụ. E kenyere Julie ọrụ n’ọfịs ngụzigharị ego, na-arụ ọrụ yiri nke ọ rụrụ na Denmark. E
kenyere m ọrụ ná Ngalaba Ide Ihe iji nye aka n’ịhazi oge a ga-ebipụta akwụkwọ anyị. Mmalite nke afọ ndị 1980 bụ oge mgbanwe nke otú anyị si arụ ọrụ na Brooklyn, bụ́ mgbe anyị si n’iji ígwè typewriter na ígwè e ji ahazi akara edemede eme ihe gaa n’iji kọmputa na ígwè obibi akwụkwọ offset eme ihe. Ọ dịghị ihe m maara banyere kọmputa, ma amatụ m banyere nhazi na otú e si eso ndị ọzọ arụkọ ọrụ.Mgbe nwa oge gasịrị, a bịara nwee mkpa nke iwusi nhazi nke Ngalaba Ihe Osise ike ka anyị na-abanye n’ígwè obibi akwụkwọ offset zuru ezu na iji ihe osise tụrụ àgwà eme ihe. Ọ bụ ezie na amaghị m ka e si ese ihe, apụrụ m inye aka ná nhazi. N’ihi ya, enwere m ihe ùgwù nke ilekọta ngalaba ahụ ruo afọ itoolu.
Na 1992, e kenyere m ọrụ na Kọmitii Mbipụta nke Òtù Na-achị Isi ma wega m n’Ọfịs Oche Ego. Anọgidere m na-eje ozi n’ebe a a na-ahụ maka ihe metụtara ego Ndịàmà Jehova.
Ije Ozi Site na Nwata
Malite n’oge m ka bụ nnọọ nwatakịrị nakwa n’ime afọ 70 nke ozi a raara nye, Jehova ejiriwo ndidi zi m ihe site n’Okwu ya, bụ́ Bible, na ụmụnna ndị pụrụ inyere anyị aka, bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ ya dị ebube. Anọwo m ihe karịrị afọ 63 n’ozi oge nile, mụ na nwunye m bụ́ Julie jekọkwara ozi n’ihe karịrị afọ 55 n’ime afọ ndị ahụ. N’eziokwu, ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova gọziworo n’ụba.
Laa azụ n’afọ 1940 bụ́ mgbe m hapụrụ ụlọ iji banye n’ozi ọsụ ụzọ, papa m kwara mkpebi m emo ma sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị hapụ ụlọ iji mee ihe a, echekwala na ị pụrụ ịgbaghachikwute m maka enyemaka.” N’ime afọ ndị a nile, ọ dịbeghị mgbe ọ dịrị m mkpa ime otú ahụ. Jehova ejiriwo mmesapụ aka na-enye m ihe ndị dị m mkpa, ọtụtụ mgbe site n’aka ụmụnna m Ndị Kraịst na-enye aka. Ka e mesịrị, nna m malitere ịkwanyere ọrụ anyị ùgwù, ọbụna nwee ọganihu n’ịmụta eziokwu Bible tupu ọnwụ ya na 1972. Mama m, bụ́ onye nwere olileanya ndụ n’eluigwe nọgidere na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya na 1985, mgbe ọ dị afọ 102.
Ọ bụ ezie na nsogbu dị iche iche na-ebilite n’ozi oge nile, ọ dịghị mgbe mụ na Julie nwara ịhapụ ọrụ anyị. Jehova anọgidewo na-akwagide anyị ná mkpebi a. Ọbụna mgbe ndị mụrụ m mere okenye, nwanne m nwanyị bụ́ Victoria Marlin gara ma jiri obiọma nyere ha aka. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu maka enyemaka ya nke mere ka anyị nọgide n’ozi oge nile anyị.
Julie ejiriwo iguzosi ike n’ihe kwado m n’ọrụ anyị nile, na-ewere ya dị ka akụkụ nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova. Ọ bụkwa ezie na m dị afọ 80 ugbu a, na-enwekwa nsogbu ahụ́ ike, ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova gọziri n’ụba. Ana m achọta agbamume dị ukwuu site n’ihe ọbụ abụ ahụ kwuru bụ́ onye, mgbe o kwupụtasịrị na Chineke eziwo ya ihe site na nwata, rịọrọ, sị, ‘Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.’—Abụ Ọma 71:17, 18.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Warren bụ deede Milton Henschel, bụ́ onye jere ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ afọ.
[Foto dị na peeji nke 20]
Mụ na mama m na 1940, mgbe m malitere ịsụ ụzọ
[Foto dị na peeji nke 21]
Mụ na ndị ọsụ ụzọ ibe m bụ́ Joe na Margaret Hart
[Foto dị na peeji nke 23]
Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na January 1948
[Foto dị na peeji nke 23]
Anyị na ndị klas anyị na Gilead n’afọ 1953. Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Don na Virginia Ward, Geertruida Stegenga, Julie na mụ
[Foto dị na peeji nke 23]
Mụ na Frederick W. Franz na Nathan H. Knorr na Copenhagen, Denmark, na 1961
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na Julie taa