Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zụlite Mmụọ Inye Ihe

Zụlite Mmụọ Inye Ihe

Zụlite Mmụọ Inye Ihe

Ọ DỊGHỊ onye bu mmụọ inye ihe pụta ụwa. Ọchịchọ nwa ọhụrụ bu pụta ụwa bụ imeju ọchịchọ na mkpa nke onwe ya, n’achọghị ịma banyere ọdịmma nke ọbụna onye na-elekọta ya. Otú ọ dị, ka oge na-aga, nwata ahụ na-amụta na ọ bụghị nanị ya nọ n’ụwa. Ọ ghaghị iche banyere ndị ọzọ, ọ ghaghịkwa ịmụta, ọ bụghị nanị ịnara anara, kamakwa inye ihe na iso ndị ọzọ ekerịta ihe. Ọ dị mkpa ịzụlite mmụọ inye ihe.

Ọ bụghị ndị nile na-enye ihe—ọbụna n’ụba—nwere mmụọ nke inye ihe. Ụfọdụ pụrụ inye òtù ọrụ ebere onyinye iji kwalite ọdịmma nke onwe ha. Ndị ọzọ pụrụ inye ihe iji nweta otuto nke mmadụ. Otú ọ dị, inye ihe nke ezi Ndị Kraịst dị iche. Gịnịzi ka e ji amata inye ihe nke a gbara ume ya n’Okwu Chineke? Ntụle dị mkpirikpi nke inye ihe nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ ga-aza ajụjụ ahụ.

Ihe Atụ nke Inye Ihe Ndị Kraịst

Inye ihe Ndị Kraịst, dị ka a kọwara ya na Bible, na-abụkarị ‘iso ndị ọzọ nwere mkpa n’ezie na-ekerịta ihe.’ (Ndị Hibru 13:16; Ndị Rom 15:26) A gaghị eme ya ná mmanye. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka onye ọ bụla na-eme dị nnọọ ka o kpebiworo n’obi ya, ọ bụghị n’enweghị ọchịchọ ime ihe ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) A gajeghịkwa inye ihe iji mee ngosipụta. Ananaịas na Safaịra mere ngosipụta dị otú ahụ, ọ kpatakwaara ha oké ọdachi.—Ọrụ 5:1-10.

Mkpa ọ dị inye ihe bịara pụta ìhè mgbe ọtụtụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu si n’ebe ndị dị anya gbakọtara na Jeruselem maka ememe Pentikọst na 33 O.A. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ụmụazụ Jizọs ‘jupụtara na mmụọ nsọ wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.’ Ìgwè mmadụ buru ibu gbara ha gburugburu ma nụ okwu na-akpali akpali nke Pita kwuru banyere Jizọs Kraịst. Mgbe e mesịrị, ndị ahụ hụrụ otú Pita na Jọn si gwọọ otu nwoke dara ngwụrọ nke nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ, ha nụkwara ka Pita kwuru okwu ọzọ banyere Jizọs na mkpa ọ dị ichegharị. Ọtụtụ puku mmadụ chegharịrị, e meekwa ha baptizim dị ka ụmụazụ Kraịst.—Ọrụ isi nke 2 na nke 3.

Ndị ahụ a tọghatara ọhụrụ chọrọ ịnọgide na Jeruselem iji natakwuo ntụziaka site n’aka ndịozi Jizọs. Ma, olee otú ndịozi ahụ ga-esi ahụ maka mkpa nke ndị ọbịa ahụ nile? Ihe ndekọ Bible na-agwa anyị, sị: “Ndị nile nwere ala ma ọ bụ ụlọ na-ere ha ma na-eweta ọnụ ahịa nke ihe ndị e rere, ha ga-atọgbọkwa ha n’ụkwụ ndịozi. E mesịa, a ga-ekenye onye ọ bụla, dị nnọọ ka mkpa o nwere hà.” (Ọrụ 4:33-35) N’ezie, ọgbakọ Jeruselem ahụ e hiwere ọhụrụ nwere mmụọ inye ihe!

Mgbe e mesịrị, ọgbakọ ndị ọzọ gosipụtara otu mmụọ inye ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst nọ na Masedonia, ọ bụ ezie na ha dara ogbenye, mere karịa otú ikike ha hà n’ezie n’inye onyinye maka ụmụnna ha ndị nọ ná mkpa na Judia. (Ndị Rom 15:26; 2 Ndị Kọrint 8:1-7) Ọgbakọ dị na Filipaị pụtara ìhè ná nkwado o nyere ozi Pọl. (Ndị Filipaị 4:15, 16) Ọgbakọ dị na Jeruselem n’onwe ya kesara nri kwa ụbọchị nye ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa, ndịozi ahụ họpụtakwara ndị ikom asaa ruru eru ịhụ na ọ dịghị ndị inyom ọ bụla di ha nwụrụ ruru eru e leghaara anya.—Ọrụ 6:1-6.

Ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ ahụ dị ngwa n’ime ihe ọbụna n’atụmanya nke ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, mgbe onye amụma bụ́ Agabọs buru amụma banyere ọbịbịa nke oké ụnwụ nri, ndị na-eso ụzọ nọ n’ọgbakọ dị n’Antiọk nke Siria “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka onye ọ bụla nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.” (Ọrụ 11:28, 29) Lee mmụọ dị mma ha gosipụtara n’ịtụ anya na ndị ọzọ ga-enwe mkpa!

Gịnị kpaliri Ndị Kraịst oge mbụ igosipụta nnọọ mmesapụ aka na ịhụnanya? N’ezie, olee otú mmadụ si amalite inwe mmụọ inye ihe? Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịtụle ná mkpirikpi ihe atụ nke Eze Devid.

Nkwado Devid Ji Mmesapụ Aka Kwado Ezi Ofufe

Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500, igbe ọgbụgba ndụ ahụ—igbe dị nsọ nke nọchiri anya ọnụnọ Jehova—enweghị ebe na-adịgide adịgide ọ nọ. E debere ya n’ụlọikwuu nke a na-ebugharị ebugharị n’oge Izrel wagharịrị n’ọzara na ruo mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ. Eze Devid chọsiri ike isi n’ụlọikwuu ebe a na-edebe igbe ahụ bupụ ya ma wuoro Jehova ụlọ kwesịrị ekwesị bụ́ ebe a ga-edebe igbe ahụ dị nsọ. Mgbe Devid na-agwa Netan okwu, ọ sịrị: “Lee, mụ onwe m na-ebi n’ụlọ cedar, ma igbe ọgbụgba ndụ Jehova na-ebi n’okpuru ákwà nkwụba.”—1 Ihe E Mere 17:1.

Otú ọ dị, Devid bụ onye agha. N’ihi ya, Jehova kwuru na ọ bụ nwa ya bụ́ Solomọn, n’oge a ga-enwe ọchịchị udo, ga-ewu ụlọ nsọ ebe a ga-adọba igbe ọgbụgba ndụ ahụ. (1 Ihe E Mere 22:7-10) Otú ọ dị, nke a egbochighị mmụọ inye ihe nke Devid. N’ịhazi nnukwu òtù ọrụ gbalụ gbalụ, ọ malitere iwekọta ihe ndị a ga-eji ewu ụlọ nsọ ahụ. O mesịrị gwa Solomọn, sị: “Edoziworo m ụlọ Jehova [otu narị puku talent ọlaedo], na [otu nde talent ọlaọcha]; ma ọla na ígwè enweghị ọ̀tụ̀tụ̀; n’ihi na o hiri nne: edoziwokwa m osisi na nkume.” (1 Ihe E Mere 22:14) N’ịbụ onye nke ahụ na-ejughị afọ, Devid si n’akpa ya nye ọlaedo na ọlaọcha ndị ọnụ ego ha n’oge a karịrị $1,200,000,000. Ọzọkwa, ndị isi jikwa mmesapụ aka nye onyinye. (1 Ihe E Mere 29:3-9) N’ezie, Devid gosipụtara mmụọ iji mmesapụ aka enye ihe!

Gịnị kpaliri Devid iji mmesapụ aka nye ihe otú ahụ? Ọ ghọtara na ihe nile o nwere na ihe ndị ọ rụzuru bụ n’ihi ngọzi Jehova. O kwetara n’ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, ọtụtụ ihe nile a nke anyị doziworo iwuru Gị ụlọ n’ihi aha nsọ Gị, n’aka Gị ka o siri bịa, ọ bụkwa Gị nwe [ha] nile. Chineke m, amakwaara m na Gị onwe gị na-anwapụta obi, izi ezi na-atọkwa Gị ụtọ. Mụ onwe m, n’izi ezi obi m ka m weere afọ ofufo nye Gị ihe nile ndị a: ma ugbu a ndị gị, ndị a hụtara n’ebe a, ewerewo m ọṅụ hụ ha ka ha na-ewere afọ ofufo nye Gị onwe ha.” (1 Ihe E Mere 29:16, 17) Devid ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ ihe. Ọ ghọtara mkpa ọ dị iwere “obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi na-atọ ụtọ” na-ejere Chineke ozi, o nwekwara ọṅụ ime otú ahụ. (1 Ihe E Mere 28:9) Otu àgwà ndị a kpalikwara Ndị Kraịst oge mbụ igosipụta mmụọ inye ihe.

Jehova—Onye Kasị Enye Ihe

Ọ bụ Jehova bụ ihe atụ kasịnụ nke inye ihe. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-eche banyere ha nke ukwuu nke na “ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Ọ na-enye ihe nile a kpọrọ mmadụ “ndụ na ume na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) N’ezie, dị ka Jems onye na-eso ụzọ kwupụtara, “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa.”—Jems 1:17.

Onyinye kasịnụ Jehova nyere anyị bụ izite “Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ dịghị onye pụrụ ịzọrọ na ya ruru eru inweta onyinye dị otú ahụ, “n’ihi na mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23, 24; 1 Jọn 4:9, 10) Ihe mgbapụta Kraịst bụ ihe ndabere na ụzọ Chineke si enye “onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa,” ya bụ, “oké obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke.” (2 Ndị Kọrint 9:14, 15) N’inwe ekele maka onyinye Chineke, Pọl mere ka ọ bụrụ ọrụ ya bụ́ isi ná ndụ “ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke.” (Ọrụ 20:24) Ọ ghọtara na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.

Taa, a na-arụzu nke a site n’ọrụ nkwusa na nke izi ihe dị ukwuu nke gbasaworo ugbu a ruo n’ala 234 n’ụwa nile. Jizọs buru mgbasawanye a n’amụma mgbe o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ee, “a ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) N’afọ gara aga, ihe karịrị nde ndị nkwusa ozi ọma isii tinyere awa 1,202,381,302 n’ọrụ a ma duzie ihe karịrị ọmụmụ Bible 5,300,000. Ebe ọ bụ na ndụ ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ, ntụziaka a dị oké mkpa.—Ndị Rom 10:13-15; 1 Ndị Kọrint 1:21.

A na-ebipụta ọtụtụ nde akwụkwọ—gụnyere Bible, akwụkwọ ukwu, na broshuọ—kwa afọ iji nyere ndị agụụ eziokwu Bible na-agụ aka. Tụkwasị na nke ahụ, a na-ebipụta ihe karịrị nnọọ otu ijeri magazin Ụlọ Nche na Teta! Ka ndị mmadụ na-anabata ozi ọma ahụ, a na-ewukwu ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ndị a na-anọ anara ntụziaka ndị sitere na Bible. A na-eme ndokwa kwa afọ maka mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, tinyere mgbakọ distrikti. Ọzụzụ nke ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi, bụkwa ihe omume ndị na-aga n’ihu n’ihu. Anyị na-ekele Jehova maka ime ndokwa nile a site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Lee ka o si amasị anyị igosipụta obi ekele anyị nwere n’ebe Ọ nọ!

Igosi Obi Ekele n’Ebe Jehova Nọ

Dị ka ọ dị n’owuwu nke ụlọ nsọ ahụ na igbo mkpa nke ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, a na-enweta ego e ji ahụ maka ihe ndị a nanị site n’onyinye afọ ofufo. Otú ọ dị, a ghaghị icheta na ọ dịghị onye pụrụ ime ka Jehova, bụ́ Onye Nwe ihe nile, baa ọgaranya. (1 Ihe E Mere 29:14; Hagaị 2:8) N’ihi ya, inye onyinye bụ ihe àmà nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ọchịchọ anyị ime ka ezi ofufe na-aga n’ihu. Pọl na-ekwu na ngosipụta ndị dị otú a nke mmesapụ aka na-eme ka e nwee “okwu ekele nye Chineke.” (2 Ndị Kọrint 9:8-13) Jehova na-agba ume ka a na-enye ihe n’ụzọ dị otú ahụ n’ihi na nke ahụ na-egosi na anyị nwere mmụọ ziri ezi na ezi obi n’ebe ọ nọ. Jehova ga-agọzi ndị na-emesapụ aka ma na-adabere n’ebe ọ nọ, ha ga-enwekwa ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. (Deuterọnọmi 11:13-15; Ilu 3:9, 10; 11:25) Jizọs mesiri anyị obi ike na anyị ga-enweta obi ụtọ, na-asị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Ndị Kraịst nwere mmụọ inye ihe adịghị nnọọ echere ruo mgbe e nwere mkpa. Kama nke ahụ, ha na-achọ ohere iji “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ [ha] n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) N’ịgba ume ka a na-enye ihe n’ụzọ na-amasị Chineke, Pọl dere, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 13:16) Iji ihe ndị anyị nwere—oge, ume, ego—enyere ndị ọzọ aka ma na-akwalite ezi ofufe bụ ihe na-atọ Jehova Chineke ezi ụtọ. N’ezie, ọ hụrụ mmụọ inye ihe n’anya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28, 29]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta, ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo kpọmkwem na Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, c/o Office of the Secretary and Treasurer, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E kwesịrị ide akwụkwọ ndọrọ ego ka ọ bụrụ nke a ga-akwụnye “Watch Tower.” A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

A pụrụ inye onyinye ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a pụrụ inyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na ọ rịọ ka e nyeghachi ya ya. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Ọfịs Odeakwụkwọ na Odebe Ego n’adres e dere n’elu.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye kpam kpam na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze uru n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ, n’ọnọdụ ebe onye nwe ụlọ ahụ ka bi na ya, site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenye ala na ụlọ ọ bụla n’aha ya.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego e mere ka ọ baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego n’ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ inye aka n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, a kwadebewo otu broshuọ dị n’asụsụ Bekee na Spanish a kpọrọ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide (Atụmatụ Ọrụ Ebere Iji Baara Ozi Alaeze Uru n’Ụwa Nile). E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị a jụrụ banyere onyinye, ike ekpe, na atụmatụ ego. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. Ọ na-enye ndị mmadụ ihe ọmụma banyere ụzọ dịgasị iche iche a pụrụ isi nye onyinye ma ọ́ bụghị ugbu a, ọ bụrụ site n’ikenye ya n’ekpe maka mgbe ha nwụrụ. Mgbe ha gụsịrị broshuọ a ma soro ndị ndụmọdụ n’ihe metụtara iwu na ụtụ isi na ndị na-arụ ọrụ n’Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi n’ihi ime otú ahụ. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ maka ya kpọmkwem site n’aka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere.

Iji nwetakwuo ihe ọmụma, ị pụrụ ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba gị.

Charitable Planning Office

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive,

Patterson, New York 12563-9204

Telifon: (845) 306-0707

[Foto dị na peeji nke 26]

Gịnị kpaliri Ndị Kraịst oge mbụ imesapụ aka?