Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ịdị Njikere Maka Ezi Ọrụ Ọ Bụla”

“Ịdị Njikere Maka Ezi Ọrụ Ọ Bụla”

“Ịdị Njikere Maka Ezi Ọrụ Ọ Bụla”

“NỌGIDE na-echetara ha ido onwe ha n’okpuru na irubere ọchịchị na ikike dị iche iche isi dị ka ndị na-achị achị, ịdị njikere maka ezi ọrụ ọ bụla.” (Taịtọs 3:1) Ezi ọrụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o degaara ndị kwere ekwe ibe ya okwu ndị a? Ọkà mmụta Bible bụ́ E. F. Scott rụtụrụ aka n’otu ụdị ezi ọrụ, na-asị: “Ọ bụghị nanị na Ndị Kraịst ga-erubere ndị na-achị achị isi, kama ha aghaghị ịdị njikere maka ezi ọrụ ọ bụla. . . . Mgbe ọnọdụ chọrọ ya, Ndị Kraịst kwesịrị iso ná ndị na-ebute ụzọ n’igosi mmụọ nke imere ọha ihe ọma. A ga na-enwe ọkụ ọgbụgba, ihe otiti, ọdachi dịgasị iche iche, mgbe ndị ezi ụmụ amaala nile ga-achọ inyere ndị agbata obi ha aka.”

Ndị Kraịst na-eso arụ ọrụ ụfọdụ ndị bụ́ maka ọdịmma ọha na eze ma ọ bụrụhaala na ọrụ ndị ahụ emegideghị iwu Chineke. (Ọrụ 5:29) Dị ka ihe atụ, n’ịgbaso ntụziaka ụlọ ọrụ mgbanyụ ọkụ ógbè, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ebina, Japan, na-amụgharị kwa afọ ihe a ga-eme ma ọkụ malite ịgba. N’oge ndị ahụ, ndị nile so n’ezinụlọ Betel na-agbakọta ọnụ igere ntụziaka onye nnọchiteanya nke ụlọ ọrụ mgbanyụ ọkụ ógbè ahụ na-enye.

Tụkwasị na nke a, ruo ihe karịrị afọ iri, alaka ụlọ ọrụ a esorowo ndị ọchịchị ógbè ahụ rụkọọ ọrụ n’ihe ngosi a na-ahazi iji mekwuo ka ọha na eze mara ụzọ e si egbochi ọkụ ọgbụgba. N’ebe ihe ngosi ahụ, ụlọ ọrụ dị iche iche dị n’obodo ahụ na-egosi ịdị njikere ha n’ịgbanyụ ọkụ na ibelata ọkụ ọgbụgba. E nyewo alaka a ihe nrite maka nkà ha na imekọ ihe ọnụ nke ndị ọrụ ya ọtụtụ mgbe. Na 2001, e nyere ha ihe nrite nke mbụ n’ihe ngosi ahụ. Ha dị njikere ịrụ ezi ọrụ nke pụrụ ịzọpụta ndụ ma e nwee ọkụ ọgbụgba.

Ije Ozi Bara Uru

Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova nwere mmasị n’ụdị ezi ọrụ ka mkpa, bụ́ nke na-azọpụtakwa ndụ. Ha na-akpọtụrụ ndị agbata obi ha mgbe mgbe ikerịta ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ndịàmà na-agba ndị mmadụ ume ịmụ na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha ka ha wee mee ka ndụ ha na-ebi ugbu a ka mma ma nwee olileanya nke ibi ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ebe ezi udo na ịnọ ná nchebe ga-adịgide.

Ụfọdụ nwere ike ghara ịghọta uru ozi Ndịàmà Jehova na-eje bara, na-ewere ha dị ka ndị na-enye mmadụ nsogbu. Otú ọ dị, Ọkàikpe Jean Crepeau nke Ụlọikpe Ka Elu nke Quebec dị na Canada nwere echiche dị iche. Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ mere mkpesa banyere iwu obodo Blainville, Quebec tiri, nke chọrọ ka ha nweta ikike iji na-eme nleta ụlọ n’ụlọ ha. Ná mkpebi ụlọikpe ahụ, Ọkàikpe Crepeau kwuru, si: “Nleta Ndịàmà Jehova na-eme bụ ije ozi ọha nke Ndị Kraịst . . . akwụkwọ Ndịàmà na-enyefe ụmụ amaala ndị nwere mmasị bụkwa akwụkwọ ndị dị mkpa, ndị na-emetụta isiokwu ndị dị ka okpukpe, Bible, ọgwụ ọjọọ, aṅụrụma, ịkụziri ndị ntorobịa ihe, nsogbu alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm.” Mkpebi ikpe ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ụlọikpe a pụrụ nanị ikpebi na iji Ndịàmà Jehova na-atụnyere ndị na-ere ihe bụ mkparị, nleda anya, ihe mkpasu iwe, na nkwutọ.”

Ndịàmà Jehova na-atụnye ụtụ n’ịkwalite ọdịmma nke ógbè ebe ha bi site n’inyere ndị mmadụ aka imeri nsogbu ndị ha na-enweta ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị na iwetara ha olileanya maka ọdịnihu. Bible na-akwadebe ha ịrụzu ọrụ ahụ. “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

Ị̀ ga-achọ ịmata otú Ndịàmà Jehova si adị “njikere maka ezi ọrụ ọ bụla”? Anyị na-akpọ gị òkù ka ị nabata enyemaka ha iji mụtakwuo banyere Bible wee si otú a rite uru n’ozi a bara uru ha na-ejere ọha n’ógbè unu na n’ụwa nile.

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

Ndịàmà Jehova na-achọ iso ndị ọchịchị na-arụkọ ọrụ

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

A maara Ndịàmà maka inyere ndị agbata obi ha aka