Ebumnobi Ziri Ezi Maka Ikwere
Ebumnobi Ziri Ezi Maka Ikwere
AKWỤKWỌ Korea bụ́ 31 Reasons Why Young People Leave the Church (Ihe 31 Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ahapụ Chọọchị) na-ekwu na ọtụtụ na-akwụsị ịga chọọchị n’ihi na ha apụghị ịchọta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị ha nwere. Dị ka ihe atụ, ha na-ajụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka ndị kwere na Chineke ji ata ahụhụ?’ na ‘N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nakwere ihe nile chọọchị dị iche iche na-akụzi mgbe ọtụtụ n’ime ozizi ha na-agbagwoju anya ma na-emegiderịta onwe ha?’
N’ịbụ ndị na-enweghị afọ ojuju n’azịza ndị ụkọchukwu ha na-enye, ọtụtụ na-ekwubi na Bible enweghị azịza ọ bụla. Mgbe ụkọchukwu nyere nkọwa nke dabeere nanị n’echiche nke ya, ihe ọ na-arụpụtakarị bụ ịghọtahie, ọbụna ịjụ Chineke na Bible.
Otú ahụ ka ọ dị Abel, bụ́ onye a zụlitere dị ka onye òtù okpukpe Lutheran na South Africa. Ọ na-echeta, sị: “Chọọchị ahụ na-akụzi na ọ bụ Chineke ‘na-ewere’ onye ọ bụla nwụrụnụ. Ma apụghị m ịghọta ihe mere Chineke na-ahụ n’anya ga-eji ‘wenara’ ụmụaka ndị mụrụ ha. N’ime ime Africa bụ́ ebe m tolitere, anyị adịghị egbu nne ọkụkọ ruo mgbe ụmụ ya tolitesịrị. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na ehi dị ime, anyị agaghị egbu ya ruo mgbe ọ mụsịrị nwa ma napụ ya ara. Apụghị m ịghọta ihe mere Chineke na-ahụ n’anya ga-eji ghara igosi ụmụ mmadụ nchebara echiche dị otú ahụ.”
Aram, bụ́ onye Canada, nwekwara obi abụọ yiri nke ahụ. “Mgbe m dị afọ 13, papa m nwụrụ,” ka ọ na-akọ. “N’ụka olili ozu ya, otu ụkọchukwu a ma ama kọwara na Chineke chọrọ ka papa m nwụọ ka o wee nwee ike ịbịarukwu Chineke nso n’eluigwe. ‘Chineke na-ewere ndị ezi mmadụ,’ ka o kwuru, ‘n’ihi na
Chineke hụrụ ndị ezi omume n’anya.’ Aghọtaghị m ihe mere Chineke ga-eji bụrụ onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị otú ahụ.”Ka e mesịrị, ma Abel ma Aram zutere Ndịàmà Jehova, soro ha mụọ Bible ma n’ikpeazụ chọta azịza nye ajụjụ ha. Ha zụlitere ịhụnanya maka Chineke na okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ. N’ikpeazụ, ha raara ndụ ha nye Jehova ma ghọọ ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe.
Ezi Ihe Ọmụma—Ihe Dị Mkpa Iji Kwere na Chineke
Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ ndị a? Ha na-agwa anyị na a bịa n’ihe banyere ikwere na Chineke, ezi ihe ọmụma Bible dị mkpa. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ n’obodo Filipaị oge ochie, sị: “Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.” (Ndị Filipaị 1:9) N’ebe a, Pọl jikọtara ịhụnanya maka Chineke na maka ndị kwere ekwe ibe anyị na ezi ihe ọmụma nke Chineke nakwa ịghọta ihe bụ́ nzube ya.
Nke a bụ ihe ezi uche dị na ya ebe ọ bụ na ihe mbụ a chọrọ iji nwee ntụkwasị obi na obi ike n’ebe mmadụ nọ bụ ịmata onye ahụ—ka ị na-amatakwu onye ahụ n’ụzọ zuru ezu ma zie ezie, otú ahụ ka ị na-enwekwu ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ezi ihe ọmụma dị gị mkpa iji bụrụ onye a kpaliri ikwere na Chineke. “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya,” ka Pọl kwuru. (Ndị Hibru 11:1) Ikwere na Chineke n’enweghị ezi ihe ọmụma nke Bible dị ka ụlọ e ji ájá uzuzu wuo. Obere ihe ezuola ịkwatu ya.
Ịmụ Bible pụrụ inyere gị aka ịchọta azịza nye ajụjụ ndị yiri nke ahụ nyere Abel na Aram nsogbu n’obi ruo ogologo oge, Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ? Bible na-akọwa na “mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12) Ụmụ mmadụ na-aka nká ma nwụọ, ọ bụghị n’ihi na Chineke na-ewere ha ịbịa nọnyere ya, kama n’ihi na Adam mehiere. (Jenesis 2:16, 17; 3:6, 17-19) Ọzọkwa, Bible na-ekpughe ezi olileanya nke Jehova Chineke na-enye. Site n’Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ọ na-enye ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie olileanya nke mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
Iji nyere anyị aka ịghọta eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ, ihe ndekọ Bible nwere ihe atụ nke ndị Jizọs weghachiri ná ndụ. (Luk 7:11-17; 8:40-56; Jọn 11:17-45) Ka ị na-agụ ihe ndekọ Bible ndị a, rịba ama ọṅụ na obi ụtọ ndị enyi na ndị ezinụlọ nke ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ nwere. Rịbakwa ama na a kpaliri ha ito Chineke na inwe okwukwe na Jizọs.
Ezi ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya pụrụ inwe otu mmetụta ahụ n’ahụ́ ndị mmadụ taa. Ọtụtụ ndị bụbu ndị nwere mgbagwoju anya, ndị e boro ibu arọ, na ọbụna ndị sụrụ ngọngọ n’ihi ajụjụ ndị dị mkpa ha na-apụghị ịchọta azịza na-eju afọ maka ha. Ma ka ha mụrụ Bible, ha chọtara azịza ha, nke ahụ gbanwekwara ndụ ha kpam kpam.
Ịhụnanya Maka Chineke—Ihe Kasị Mkpa Mere A Ga-eji Jeere Ya Ozi
Ọ bụ ezie na ezi ihe ọmụma dị mkpa iji nwee okwukwe na Chineke, a chọrọ ihe karịrị nke ahụ iji kpalie mmadụ irubere ya isi na ijere ya ozi. Mgbe a jụrụ ya ihe bụ́ iwu kachasịnụ sitere n’aka Chineke, Jizọs kwuru, sị: “Ị ghaghịkwa iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Ọ bụrụ na mmadụ hụrụ Chineke n’anya otú ahụ Jizọs si kwuo, ọ ga-adị nnọọ njikere irubere Ya isi na ijere Ya ozi. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere gị?
Rachel, bụ́ onye jeworo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Korea ruo ọtụtụ iri afọ kwuru na ihe mere ya ji nwee okwukwe bụ nke a: “Ana m eche echiche banyere mmesapụ aka Jehova n’ebe ihe ndị o kere eke nọ, mgbaghara ya n’imeso ndị ya ihe, na ọchịchọ ya ime ka anyị rite uru site n’ime ka anyị mata ihe ndị ọ chọrọ n’aka anyị. Ihe ndị dị otú ahụ na-eme ka ịhụnanya m nwere n’ebe Chineke nọ na-eto eto.
Ịhụnanya ahụ na-emekwa ka m chọọ ijere ya ozi.”Martha, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke bi na Germany, ejeworo Jehova ozi ruo ihe dị ka afọ 48. Ọ na-ekwu, sị: “N’ihi gịnị ka m ji ejere Jehova ozi? Ọ bụ n’ihi na ahụrụ m ya n’anya. Kwa uhuruchi, m na-ekpeku Jehova ekpere ma na-agwa ya otú m si nwee ekele miri emi maka ngọzi ya nile, karịsịa maka àjà mgbapụta ahụ.”
Ee, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka anyị chọọ iji obi anyị na-ejere ya ozi. Ma olee otú mmadụ si azụlite ịhụnanya dị otú ahụ? Ihe nkwali kasịnụ iji zụlite ịhụnanya maka Chineke bụ inwe ekele miri emi maka ịhụnanya o gosiworo anyị. Rịba ama ihe ncheta a na-enye obi ụtọ bụ́ nke sitere na Bible: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amabeghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. Site na nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ọnọdụ anyị, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na anyị ahụwo Chineke n’anya, kama na ọ hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya dị ka àjà ime udo maka mmehie anyị.”—1 Jọn 4:8-10.
Ị̀ na-aghọta otú ịhụnanya a siruru n’ike? Weregodị ya na mmiri na-ekwo ekwo na-achọ iri gị, otu nwoke etinyekwa ndụ ya n’ihe ize ndụ iji zọpụta gị. Ị̀ ga-echefu ya, ka ị́ gaghị enwe ekele dị ukwuu n’ebe ọ nọ? Ị́ gaghị adị njikere imere ya ihe ọ bụla i nwere ike? Ịhụnanya Chineke gosipụtara site n’inye Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị ka ihe mgbapụta karịrị nke ahụ n’ụzọ na-enweghị atụ. (Jọn 3:16; Ndị Rom 8:38, 39) Mgbe ịhụnanya Chineke metụrụ gị n’obi, a ga-akpali gị iji obi gị dum hụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi.
Ngọzi Ugbu A na n’Ọdịnihu
Ọ bụ ezie na ịhụnanya maka Chineke kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji na-eme uche ya, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na Chineke na-akwụghachi ndị na-ejere ya ozi ụgwọ. Pọl onyeozi na-akọwapụta, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke Ndị Hibru 11:6.
nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—N’ezie, Chineke na-agọzi ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi. Ọtụtụ ndị nwere ahụ́ ike ka mma n’ihi itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (Ilu 23:20, 21; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ndị na-agbaso ụkpụrụ Bible banyere ịkwụwa aka ọtọ na ịdị uchu na-abụkarị ndị ndị were ha n’ọrụ na-atụkwasị obi, n’ihi nke ahụkwa, na-enwe ihe na-ezuru ha n’ụzọ akụ̀ na ụba karị. (Ndị Kọlọsi 3:23) Site n’ịtụkwasị Jehova obi, a na-eji udo nke obi agọzi ndị ohu Chineke ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ. (Ilu 28:25; Ndị Filipaị 4:6, 7) Karịsịa, ha na-eji obi ike elepụ anya n’ihu maka ngọzi nke ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs nke na-abịanụ.—Abụ Ọma 37:11, 29.
Olee mmetụta ndị na-enweta ngọzi ndị dị otú ahụ sitere n’aka Jehova na-enwe banyere Ya? Jacqueline, bụ́ Onye Kraịst na Canada, na-ekwupụta ekele o nwere n’ebe Chineke nọ, na-asị: “Ọ na-enye anyị onyinye ndị magburu nnọọ onwe ha, ọ na-enyekwa olileanya e ji n’aka maka ndụ ebighị ebi.” Abel, bụ́ onye anyị nụrụ ihe o kwuru na mbụ si otú a kọwaa mmetụta o nwere: “Atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs bụ ihe ọhụrụ nye m, m na-atụkwa anya ya. Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na e nweghị Paradaịs, ọ ka ga-abụ ihe ọṅụ nye m igosipụta ịhụnanya m nwere n’ebe Chineke nọ site n’ijere ya ozi.”
Gị Onwe Gị Kwa Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe
‘Jehova nke usuu nile nke ndị agha na-ekpe ikpe n’ezi omume, na-anwa akụrụ na obi,’ ka Bible na-ekwu. (Jeremaịa 11:20) Ee, Jehova na-enyocha ihe zoro ezo dị n’ala ala obi anyị. Onye ọ bụla kwesịrị inyocha ebumnobi o ji kwere na Chineke. Ọ pụrụ ịbụ na nkwenkwe na echiche ndị hiere ụzọ banyere Chineke emewo ka e mee ihe ndị na-adịghị mma n’oge gara aga. Ma ezi ihe ọmụma nke Bible pụrụ iduga n’iso Onye Okike anyị bụ́ Jehova Chineke nwee mmekọrịta dị mma.—1 Timoti 2:3, 4.
Site ná ndokwa ha nke ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke. (Matiu 28:20) Ọtụtụ ndị nataworo enyemaka dị otú ahụ abịawo hụ Chineke n’anya ma zụlite ezi okwukwe n’ebe ọ nọ. Site n’ọmụmụ Bible, ha enwetawo “ezi amamihe na ikike iche echiche,” bụ́ nke na-enyere ha aka ‘ije ije ná ntụkwasị obi’ n’ụbọchị ndị a dị ize ndụ. (Ilu 3:21-23, NW) Karịsịa, ha nweziri olileanya bụ́ “ma nke e ji n’aka ma nke guzosiri ike” maka ọdịnihu. (Ndị Hibru 6:19) Ị pụkwara inwe ezi okwukwe ma nụ ụtọ ngọzi ndị a.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ajụjụ Ndị Na-enye Nsogbu Ndị Chọrọ Azịza
“Ka m nọ na-anata ọzụzụ n’ụlọ ọgwụ dị ka nwa akwụkwọ na-amụ nkà ọgwụ na ahụ́ ike, ahụrụ m ka ndị ezi mmadụ na-asụ ude n’ihe mgbu n’ihi ọrịa na ọdachi. Ọ bụrụ na Chineke dị, n’ihi gịnị ka ihe ndị a ji na-eme? Okpukpe ọ̀ bụ nanị maka iji nweta udo nke obi?”—Onye bụbu onye chọọchị Presbyterian na Korea.
“M na-echekarị ma papa m, bụ́ onye aṅụrụma, ọ̀ gara na hel ka ọ bụ n’eluigwe. M na-atụ ndị nwụrụ anwụ na echiche nke ọkụ ala mmụọ egwu. Apụghị m ịghọta otú Chineke na-ahụ n’anya pụrụ isi ziga mmadụ ịga na-ata ahụhụ na hel ruo mgbe ebighị ebi.”—Onye bụbu onye chọọchị Katọlik na Brazil.
“Ọdịnihu dị aṅaa dịịrị ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ? Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi dị ndụ ebighị ebi? Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ ga-esi nweta ezi udo?”—Onye bụbu onye chọọchị Katọlik na Germany.
“Nye m, ozizi ịlọ ụwa abụghị ihe ezi uche dị na ya. Ụmụ anụmanụ adịghị efe ofufe, ya mere, ọ bụrụ na e nwere ihe mere ka ị lọ ụwa dị ka anụmanụ iji kwụọ ụgwọ mmehie gị, olee otú ị pụrụ isi meziwanye ihe iji si n’ọnọdụ ahụ pụta?”—Onye bụbu onye chọọchị Hindu na South Africa.
“Etolitere m n’ezinụlọ na-ekpe okpukpe Confucius, m na-esokwa n’ememe nke e ji eme ka ndị nna nna anyị ha zuru ike. Ka m na-eso n’idozi tebụl e ji achụ àjà ma na-akpọ isiala, m na-eche echiche ma ndị nna nna anyị nwụrụ anwụ hà na-abịa iri nri ahụ na ịhụ ka anyị na-akpọrọ ha isiala.”—Onye bụbu onye chọọchị Confucius na Korea.
Ndị a nile chọtara azịza nye ajụjụ ha mgbe ha sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible.