Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gịnị Ka M Ga-akwụghachi Jehova?”

“Gịnị Ka M Ga-akwụghachi Jehova?”

Akụkọ Ndụ

“Gịnị Ka M Ga-akwụghachi Jehova?”

DI KA MARIA KERASINIS SI KỌỌ

Mgbe m dị afọ 18, abụ m oké ihe mmechuihu nye ndị mụrụ m, onye a jụrụ ajụ n’ezinụlọ m, na ihe ọchị nye ndị obodo m. E ji arịrịọ, mmanye, na iyi egwu nwaa imebi iguzosi ike n’ihe m nye Chineke—ma o nweghị isi. Obi siri m ike na iji iguzosi ike n’ihe rapara n’eziokwu Bible ga-eweta uru ime mmụọ. N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 50 nke ijere Jehova ozi, apụrụ m ikwughachi okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Gịnị ka m ga-akwụghachi Jehova n’ihi aka nile ọ na-enyere m?” —Abụ Ọma 116:12, NW.

A MỤRỤ m na 1930, n’Aggelokastro, bụ́ obodo nta dị ihe dị ka Kilomita 20 site n’ọdụ ụgbọ mmiri Senkrea, n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Isthmus nke Kọrint, bụ́ ebe e guzobere otu ọgbakọ ezi Ndị Kraịst na narị afọ mbụ.—Ọrụ 18:18; Ndị Rom 16:1.

Ezinụlọ m biri ndụ dị jụụ. Papa m bụ onyeisi obodo ahụ, bụrụkwa onye a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu. Abụ m nwa nke atọ n’ime ụmụ ise. Ndị mụrụ m zụlitere anyị dị ka ndị ji Chọọchị Ọtọdọks nke Gris kpọrọ ihe. Ana m aga Mas kwa Sunday. Ana m anata ọpịpịa n’ihu ihe oyiyi, na-amụ kandụl n’ụlọ ekpere obodo, na-ebuzukwa ọnụ. Echekwara m echiche ọtụtụ mgbe ịghọ onye nọn. Ka oge na-aga, aghọrọ m onye mbụ n’ezinụlọ anyị nke mechuru ndị mụrụ m ihu.

Onye Eziokwu Bible Kpaliri

Mgbe m dị ihe dị ka afọ 18, achọpụtara m na Katina, bụ́ nwanne di nwanne m nwanyị nke bi n’obodo dị nso, na-agụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova, nakwa na ọ naghịzi aga chọọchị. Nke a wutere m nke ukwuu, n’ihi ya, ekpebiri m inyere ya aka ịlọghachi n’ihe m chere na ọ bụ ezi ụzọ ahụ. Ya mere, mgbe ọ bịara ileta anyị, ahaziri m ka anyị kpagharịa, n’ebumnobi nke ịbanye n’ụlọ ụkọchukwu anyị. Ụkọchukwu ahụ ji ọtụtụ okwu ịkwa emo megide Ndịàmà Jehova malite mkparịta ụka ahụ, na-akpọ ha ndị jụrụ okwukwe bụ́ ndị duhieworo Katina. Mkparịta ụka ahụ gara n’ihu ruo abalị atọ sochiri onwe ha. Katina ji arụmụka Bible ọ kwadebere nke ọma gbaghaa ebubo ya nile. N’ikpeazụ, ụkọchukwu ahụ gwara ya na ebe ọ bụ nwa agbọghọ mara mma ile anya ma nwee ọgụgụ isi, o kwesịrị ịnụ ụtọ oge ntorobịa ya ma nwezie mmasị n’ebe Chineke nọ mgbe o mere agadi.

Agwaghị m ndị mụrụ m ihe ọ bụla banyere mkparịta ụka ahụ, ma na Sunday na-eso ya, agaghị m chọọchị. N’etiti ehihie, onye ụkọchukwu ahụ bịara kpọmkwem n’ụlọ ahịa anyị. Echepụtara m ihe ngọpụ bụ́ na aghaghị m ịnọ n’ụlọ ahịa iji nyere papa m aka.

“Ọ̀ gwụla nnọọ ihe mere ya, ka nwata nwanyị ahụ ò duhiewo gị?” ka ụkọchukwu ahụ jụrụ m.

“Nkwenkwe ndị a ka ndị nke anyị mma,” ka m kwuru n’ezoghị ọnụ.

N’ichigharịkwuru papa m, ụkọchukwu ahụ kwuru, sị: “Mazị Economos, chụpụ ọgọ gị nwanyị; ọ mụnyewo ọkụ n’ụlọ gị.”

Ezinụlọ M Amalite Imegide M

Nke a bụ ná ngwụsị nke afọ ndị 1940 bụ́ mgbe ndị Gris nọ n’ihe mgbu nke agha obodo. N’ihi ụjọ na ndị agha okpuru nwere ike ịtọrọ m, papa m haziri ka m hapụ obodo nta ahụ ma gaa n’ụlọ nwanne m nwanyị, n’obodo nta ebe Katina bi. Ruo ọnwa abụọ ahụ m nọrọ n’ebe ahụ, e nyeere m aka ịghọta ihe Bible na-ekwu n’ọtụtụ ihe. O wutere m ịhụ na ọtụtụ n’ime ozizi ndị Chọọchị Ọtọdọks esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ. Aghọtara m na Chineke adịghị anakwere ofufe e ji ihe oyiyi efe ya, na omenala okpukpe dị iche iche—dị ka ịsọpụrụ obe—amaliteghị n’ebe Ndị Kraịst nọ, nakwa na mmadụ aghaghị ife Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu” iji wee mee ihe ga-atọ ya ụtọ. (Jọn 4:23; Ọpụpụ 20:4, 5) Karịsịa, amụtara m na Bible na-enye olileanya na-egbukepụ egbukepụ nke ndụ ebighị ebi n’elu ala! Eziokwu Bible ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa so n’uru mbụ ndị m ritere site n’aka Jehova.

Ka ọ dịgodị, nwanne m nwanyị na di ya chọpụtara na mụ anaghịzi eme akara nke obe n’oge nri, nakwa na mụ anaghịzi ekpe ekpere n’ihu ihe oyiyi okpukpe. Otu abalị, ha abụọ tiri m ihe. N’echi ya, ekpebiri m ịhapụ ụlọ ha ma gaa n’ụlọ nwanne mama m. Di nwanne m nwanyị gwara papa m. N’oge na-adịghị anya, papa m beere ákwá bịa ma nwaa ịgbanwe echiche m. Di nwanne m nwanyị sekpuuru ala n’ihu m, na-arịọ ka m gbaghara ya, emekwara m otú ahụ. Ka okwu wee bie, ha rịọrọ m ka m lọghachi na chọọchị, ma ajụwapụrụ m isi.

Mgbe m laghachiri n’obodo papa m, nrụgide gara n’ihu. Ọ dịghị otú m ga-esi kpọtụrụ Katina, enweghịkwa m akwụkwọ m ga-agụ, ọbụnadị Bible. Enwere m nnọọ obi ụtọ mgbe nwa nwanne papa m gbalịrị inyere m aka. Mgbe ọ gara Kọrint, ọ chọtara otu Onyeàmà ma jiri akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” lọta, ya na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ ndị m malitere ịgụ na nzuzo.

Ndụ Agbanwee n’Ụzọ A Na-atụghị Anya Ya

Mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ gara n’ihu ruo afọ atọ. Ọ dịghị Ndịàmà m hụrụ, enwetaghịkwa m akwụkwọ ọ bụla. Otú ọ dị, amaghị m na mgbanwe dị ukwuu na-aga iwere ọnọdụ ná ndụ m.

Papa m gwara m na m ga-aga na nke nwanne mama m na Tesalọnaịka. Tupu mụ agawa Tesalọnaịka, agara m n’ụlọ ọrụ nwanyị na-akwa ákwà na Kọrint ka a kwatara m kootu. Lee ihe ịtụnanya ọ bụ ịhụ na Katina na-arụ ọrụ n’ebe ahụ! Anyị nwere obi ụtọ ịhụ onwe anyị ka ogologo oge ha otú ahụ gafeworo. Ka anyị abụọ so si n’ebe ahụ a na-akwa ákwà na-apụ, anyị zutere otu nwa okorobịa nwere nnọọ omume enyi ka o ji ịnyịnya ígwè si ọrụ na-ala. Aha ya bụ Charalambos. Mgbe mụ na ya matasịrị onwe anyị, anyị kpebiri na anyị ga-alụ. Ọ bụkwa ihe dị ka n’oge a, na January 9, 1952, ka m gosipụtara nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptizim.

E meela Charalambos baptizim tupu oge ahụ. Ndị ezinụlọ ya na-emegidekwa ya. Charalambos na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu. O jere ozi dị ka onye na-enyere ohu ọgbakọ aka, duziekwa ọtụtụ ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, ụmụnne ya ndị nwoke natara eziokwu, taakwa, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ ha na-ejekwara Jehova ozi.

Papa m nwere nnọọ mmasị n’ebe Charalambos nọ, n’ihi ya o kwetara ka anyị lụọ, ma ọ dịghị mfe ime ka mama m kweta. N’agbanyeghị ihe a nile, mụ na Charalambos lụrụ na March 29, 1952. Ọ bụ nanị diọkpara anyị na otu n’ime ụmụ nwanne papa m bịara agbamakwụkwọ anyị. Amatụghị m mgbe ahụ ụdị ngọzi na-enweghị atụ—ezi onyinye sitere n’aka Jehova—Charalambos ga-emesị bụụrụ m! Dị ka onye ibe ya, emere m ka ndụ m hiwe isi n’ozi Jehova.

Iwusi Ụmụnna Anyị Ike

Na 1953, mụ na Charalambos kpebiri ịkwaga Atens. N’ịchọ ịmụbawanye ozi ya, Charalambos hapụrụ achụmnta ego ndị ezinụlọ ha ma nweta ọrụ nwa oge. Anyị na-eji oge ehihie ejekọ ozi Ndị Kraịst ọnụ, na-eduzikwa ọtụtụ ọmụmụ Bible.

N’ihi mgbochi ndị ọchịchị na-egbochi ozi anyị, anyị aghaghị iji akọ na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, anyị kpebiri ịdị na-edebe otu magazin Ụlọ Nche n’elu windo nke otu obere ụlọ ahịa anyị dị n’etiti Atens, bụ́ ebe di m na-arụ ọrụ nwa oge. Otu onye uwe ojii ọkwá ya dị elu gwara anyị na a machibidoro magazin ahụ iwu. Otú ọ dị, ọ jụrụ ma ọ̀ pụrụ iwere otu ma jụta banyere ya n’ụlọ ọrụ nchebe. Mgbe ha mesiri ya obi ike na iwu kwadoro magazin ahụ, ọ lọghachiri ma kọọrọ anyị. Ozugbo ụmụnna ndị nwere ụdị obere ụlọ ahịa ahụ nụrụ ya, ha malitekwara idebe Ụlọ Nche na windo nke obere ụlọ ahịa ha. Otu nwoke nwetara Ụlọ Nche site n’obere ụlọ ahịa anyị, ghọọ Onyeàmà, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka okenye.

Anyị nwekwara ọṅụ nke ịhụ ka nwanne m nwoke nke ikpeazụ mụtara eziokwu ahụ. Ọ bịara Atens ịgụ akwụkwọ na kọleji ebe a na-amụ otú e si anya ụgbọ mmiri na-ebu ndị ahịa, anyị wee kpọrọ ya gaa otu mgbakọ anyị. Anyị na-eme mgbakọ anyị na nzuzo n’ime ọhịa. Ihe ọ nụrụ masịrị ya, ma n’oge na-adịghị anya, ọ malitere ime njem. N’otu n’ime njem ya, o ruru n’otu ọdụ ụgbọ mmiri dị n’Argentina. N’ebe ahụ, otu onye ozi ala ọzọ banyere ụgbọ ahụ iji zie ozi ọma, nwanne m rịọkwara ya ka o nye ya magazin anyị. Anyị nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe anyị nwetara akwụkwọ ozi ya nke na-agụ, sị: “Achọtawo m eziokwu ahụ. Tụọrọnụ m ọda magazin.” Taa, ya na ezinụlọ ya ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova.

Na 1958, a kpọrọ di m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ anyị iwu nakwa na ihe siri oké ike, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị adịghị akpọkarị nwunye ha. N’October 1959, anyị jụrụ ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ ma m pụrụ isonyere ya. Ha kwetara. Anyị ga na-eleta ma na-ewusi ọgbakọ ndị dị n’etiti na n’ebe ugwu Gris ike.

Njem ndị ahụ adịghị mfe. Ụzọ ndị e tere agba dị ole na ole ma dị anya site n’ibe ha. Ebe ọ bụ na anyị enweghị ụgbọala, anyị na-esokarị ụgbọ njem ọha na eze ma ọ bụ pikọp, bụ́ ndị na-ebukwa ụmụ ọkụkọ na ngwa ahịa ndị ọzọ. Anyị na-eyi buutu rọba iji gafee ụzọ ndị apịtị dị na ha. Ebe ọ bụ na e nwere ndị agha obodo n’ime obodo nta ọ bụla, anyị na-abanye n’obodo nta ndị ahụ n’oge abalị iji zere ajụjụ.

Nleta ndị a masịrị ụmụnna ahụ nke ukwuu. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-arụsi ọrụ ike n’ugbo ha, ha na-agbalịsi ike ịhụ na ha bịara nzukọ ndị a na-enwe n’ime abalị n’ebe obibi dịgasị iche iche. Ụmụnna ahụ lekwara anyị ọbịa nke ọma, nyekwa anyị ihe ndị kasị mma ha nwere, ọ bụ ezie na ha nwere ihe dị nnọọ nta. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eso mmadụ nile nọ n’otu ezinụlọ rahụ n’otu ọnụ ụlọ. Okwukwe, ntachi obi, na ịnụ ọkụ n’obi nke ụmụnna ahụ bụụrụ anyị nnukwu uru ọzọ.

Ịmụba Ozi Anyị

Na February 1961, mgbe anyị jere ileta alaka ụlọ ọrụ dị n’Atens, a jụrụ anyị ma anyị ga-achọ ije ozi na Betel. Anyị jiri okwu Aịzaịa zaghachi, ndị bụ́: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, anyị nwetara akwụkwọ ozi nke gwara anyị ka anyị bịa Betel ngwa ngwa o kwere mee. N’ihi ya, na May 27, 1961, anyị malitere ije ozi na Betel.

Ọrụ ọhụrụ anyị masịrị anyị, ahụ́ rukwara anyị ala ozugbo ahụ. Di m rụrụ ọrụ ná ngalaba Ije Ozi na nke Ịtụ Ọda Magazin, mgbe e mesịrị, o jekwara ozi ruo oge ụfọdụ na Kọmitii Alaka. Arụrụ m ọrụ dị iche iche n’ebe obibi ahụ. Ezinụlọ Betel nwere mmadụ 18 n’oge ahụ, ma ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise, e nwere ihe dị ka mmadụ 40 n’ihi na a na-eduzi ụlọ akwụkwọ ndị okenye na Betel. N’ụtụtụ, ana m asa efere, nyere ndị na-esi nri aka, dozie ihe ndina 12 ma dozie tebụl maka nri ehihie. N’ehihie, ana m ede akwa ma hichaa ụlọ mposi na ime ụlọ. Otu ugboro n’izu, ana m arụkwa n’ebe a na-asa ákwà. E nwere ọtụtụ ọrụ, ma obi dị m ụtọ na m nwere ike inye aka.

Anyị na-eji nnọọ ọrụ n’aka mgbe nile n’ọrụ Betel anyị nakwa n’ozi ubi. Ọtụtụ oge, anyị na-eduzi ihe ruru ọmụmụ Bible asaa. Ná ngwụsị izu, ana m esonyere Charalambos ka ọ na-aga ikwu okwu n’ọgbakọ dị iche iche. Anyị abụọ na-eso mgbe nile.

Anyị duziiri otu di na nwunye ji Chọọchị Ọtọdọks nke Gris kpọrọ ihe nke ukwuu ọmụmụ Bible, ndị bụ́kwa ezigbo enyi nke onye ụkọchukwu bụ́ onyeisi nke òtù na-emegide ndị jụrụ okwukwe nke chọọchị ahụ. N’ụlọ ha, ha nwere otu ọnụ ụlọ nke ihe oyiyi jupụtara na ya, bụ́ ebe ha na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ mgbe nile, na-akpọnyekwa ukwe Byzantium n’ime ya kwa ụbọchị. Ruo oge ụfọdụ, anyị na-aga na nke ha na Thursday ọ bụla iji duziere ha ọmụmụ Bible, ebe onye ụkọchukwu ahụ bụ́ enyi ha na-eleta ha na Friday ọ bụla. Otu ụbọchị, ha gwara anyị ka anyị ghara ịhapụ ịbịa na nke ha n’ihi na ha nwere ihe pụrụ iche ha chọrọ igosi anyị. Ihe mbụ ha gosiri anyị bụ ọnụ ụlọ ahụ. Ha ebibisiwo ihe oyiyi nile dị n’ime ya ma wuzigharịa ya. Di na nwunye a nwekwuru ọganihu, e meekwa ha baptizim. Ná ngụkọta, anyị enwewo ọṅụ nke ịhụ ihe dị ka mmadụ 50 n’ime ndị anyị duziiri ọmụmụ Bible ka ha raara ndụ ha nye Jehova, e meekwa ha baptizim.

Iso ụmụnna e tere mmanụ na-emekọ ihe bụ uru pụrụ iche m ritere. Nleta nke ndị so n’Òtù Na-achị Isi, dị ka Nwanna Knorr, Franz na Henschel, na-agba ume nke ukwuu. Mgbe ihe karịrị afọ 40 gasịrị, m ka chere na ije ozi na Betel bụ nsọpụrụ na ihe ùgwù dị ukwuu.

Ịnagide Ọrịa na Mfu

Na 1982, a malitere ịhụ ihe àmà nke ọrịa Alzheimer n’ahụ́ di m. N’afọ 1990, ọrịa ya kawanyere njọ, o mesịkwara chọọ nlekọta chiri anya. N’ime afọ asatọ ikpeazụ nke ndụ ya, anyị apụghị isi na Betel pụọ ma ọlị. Ọtụtụ ụmụnna anyị hụrụ n’anya nọ na Betel, gụnyere ndị nlekọta nwere ibu ọrụ, haziri inyere anyị aka. Otú ọ dị, n’agbanyeghị enyemaka obiọma ha, aghaghị m iji ọtụtụ awa, ehihie na abalị, na-elekọta ya. Mgbe ụfọdụ, ihe na-esibiga ike ókè, m na-amụkwa anya ọtụtụ abalị.

Na July 1998, di m m hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ bụ ezie na agụụ ya na-agụsi m ike, eziokwu ahụ bụ́ na ọ nọ ná ncheta Jehova na-akasi m obi, amakwa m na Jehova ga-echeta ya na ọtụtụ nde ndị ọzọ ná mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

Ekele Maka Uru Ndị M Ritere n’Aka Jehova

Ọ bụ ezie na di m nwụnahụrụ m, anọghị m nanị m. Aka m nwere ihe ùgwù nke ije ozi na Betel, ndị ezinụlọ Betel nile hụkwara m n’anya ma na-elekọta m. Ezinụlọ m gbasapụrụ agbasapụ gụnyekwara ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ bụ́ ndị bi n’akụkụ nile nke Gris. Ọ bụ ezie na agafewo m afọ 70 ugbu a, m ka pụrụ ịrụ ọrụ kwa ụbọchị na kichin na n’ebe a na-eri nri.

Na 1999, ihe m rọworo nrọ ya eri ndụ m mezuru mgbe m letara isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na New York. Apụghị m ịkọwa otú obi dị m mgbe ahụ. Ọ bụ ahụmahụ na-ewuli elu na nke m na-apụghị ichefu echefu.

Ka m na-eleghachi anya azụ, ekwetara m n’ezie na agaraghị m ejiwo ndụ m mee ihe n’ụzọ ka mma karịa nke a. Ọrụ kasịnụ mmadụ pụrụ ịrụ bụ ijere Jehova ozi oge nile. Apụrụ m iji obi ike kwuo na ọ dịbeghị mgbe ihe kọrọ m. Jehova ji ịhụnanya lekọta mụ na di m ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́. Site n’ahụmahụ onwe onye, aghọtawo m ihe mere ọbụ abụ ahụ ji jụọ, sị: “Gịnị ka m ga-akwụghachi Jehova n’ihi aka nile ọ na-enyere m?”—Abụ Ọma 116:12, NW.

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na Charalambos na-eso mgbe nile

[Foto dị na peeji nke 27]

Di m n’ọfịs ya n’alaka ahụ

[Foto dị na peeji nke 28]

Echere m na ozi Betel bụ ihe ùgwù dị ukwuu