Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gosikwanụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele”

“Gosikwanụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele”

“Gosikwanụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele”

“Kwenụ ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi unu . . . Gosikwanụ onwe unu ịbụ ndị nwere ekele.”—NDỊ KỌLỌSI 3:15.

1. Ọdịiche dị aṅaa ka anyị na-ahụ n’etiti ọgbakọ Ndị Kraịst na ụwa nke Setan na-achị?

N’ỌGBAKỌ 94,600 nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, anyị na-ahụ mmụọ obi ekele. Nzukọ ọ bụla na-eji ekpere nke na-agụnye okwu ekele nye Jehova amalite ma na-emechi. Anyị na-anụkarị “i meela,” “ndeewo,” ma ọ bụ okwu ndị yiri ha n’ọnụ ndị na-eto eto na ndị agadi tinyekwara ndị ọhụrụ na ndị bụworo Ndịàmà ruo ogologo oge, ka ha na-efekọ ofufe ma na-enwe mkpakọrịta na-enye obi ụtọ. (Abụ Ọma 133:1) Lee ka nke a si dị nnọọ iche n’omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ọtụtụ ndị bụ́ ‘ndị na-amaghị Jehova na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma’ ahụ! (2 Ndị Tesalonaịka 1:8) Anyị bi n’ụwa nke na-enweghị ekele. Nke ahụ abụghị ihe ijuanya ma ọ bụrụ na anyị echeta onye bụ chi nke ụwa a—Setan bụ́ Ekwensu, onye kasị akwalite mmụọ iche nanị banyere onwe onye, bụ́ onye mmụọ mpako na nke nnupụisi ya jupụtara n’etiti ọha mmadụ!—Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19.

2. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka anyị ṅaa ntị na ya, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka anyị ga-atụle?

2 Ebe ụwa Setan gbara anyị gburugburu, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya iji ghara ịbụ ndị àgwà ya metụtara. Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, sị: “Unu jere ije . . . n’otu mgbe dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku ahụ si dị, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi. Ee, n’etiti ha ka anyị nile n’otu mgbe mere omume n’ikwekọ n’ọchịchọ anụ ahụ́ anyị, na-eme ihe ndị anụ ahụ́ na echiche chọrọ, anyị bụkwa ụmụ ọnụma site n’ọmụmụ ọbụna dị ka ndị ọzọ.” (Ndị Efesọs 2:2, 3) Nke ahụ bụkwa eziokwu banyere ọtụtụ ndị taa. Oleezi otú anyị pụrụ isi nọgide na-egosipụta mmụọ obi ekele? Enyemaka dị aṅaa ka anyị na-enweta site n’aka Jehova? N’ụzọ ndị dị aṅaa pụtara ìhè ka anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele n’ezie?

Ihe Ndị Mere Anyị Ga-eji Na-enwe Ekele

3. Maka gịnị ka anyị na-ekele Jehova?

3 Ọ bụ Jehova Chineke, Onye Okike anyị na Onye Na-enye anyị Ndụ, ka anyị ji ụgwọ ekele, karịsịa ka anyị na-atụle ụfọdụ onyinye bara ụba ndị ọ na-enye anyị. (Jems 1:17) Kwa ụbọchị, anyị na-ekele Jehova na anyị dị ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Anyị na-ahụ ihe àmà nke aka ọrụ Jehova, dị ka anyanwụ, ọnwa, na kpakpando gburugburu anyị. Akụ̀ ndị dị n’ime ala bụ́ ndị na-enyere ndụ aka ndị jupụtara n’ụwa anyị, ngwakọta zuru nnọọ ezu nke ikuku ndị dị mkpa, na usoro dị mgbagwoju anya dị n’okike na-agbacha akaebe ụgwọ anyị ji Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya. “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m,” ka Eze Devid bụrụ n’abụ, “bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro; a sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha, ha karịrị ịgụ ọnụ.”—Abụ Ọma 40:5.

4. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ikele Jehova maka mkpakọrịta na-enye obi ụtọ anyị na-enwe n’ọgbakọ anyị?

4 Ọ bụ ezie na ha ebighị na paradaịs nkịtị, ndị ohu Jehova taa na-enwe obi ụtọ ibi na paradaịs ime mmụọ. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na ná mgbakọ ukwu na ndị nta, anyị na-ahụ ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke na-arụ ọrụ n’ahụ́ ndị kwere ekwe ibe anyị. N’ezie, mgbe ha na-ekwusara ndị na-enwechaghị ma ọ bụ ndị na-enwetụghị ihe ha maara banyere okpukpe ozi ọma, ụfọdụ Ndịàmà na-ezo aka n’ihe Pọl kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia. Ha na-ebu ụzọ adọrọ uche gaa ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́’ ma jụọ ndị na-ege ha ntị ihe ha na-ahụ. (Ndị Galeshia 5:19-23) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ekweta ngwa ngwa na e ji ihe ndị a mara ọha mmadụ taa. Mgbe e gosiri ọtụtụ ndị nkọwa nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke nakwa mgbe a kpọrọ ha òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iji anya ha hụ ihe àmà nke a, ọtụtụ na-ekwere ngwa ngwa, sị: “Chineke nọ n’etiti unu n’ezie.” (1 Ndị Kọrint 14:25) Ọ bụghịkwa nanị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka a na-ahụ nke a. Gaa ebe ọ bụla masịrị gị, mgbe i zutere nke ọ bụla n’ime ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii, ị ga-ahụ otu mmụọ obi ụtọ na nke ọṅụ ahụ. N’ezie, mkpakọrịta a na-ewuli elu bụ ihe mere a ga-eji na-enye Jehova ekele, bụ́ onye na-enye mmụọ nsọ ya ka nke a wee kwe omume.—Zefanaịa 3:9; Ndị Efesọs 3:20, 21.

5, 6. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị nwere ekele maka onyinye kasịnụ nke Chineke nyere bụ́ ihe mgbapụta ahụ?

5 Onyinye kasịnụ, nke kasị zuo okè Jehova nyeworo anyị, bụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs, bụ́ onye e si n’aka ya nye àjà mgbapụta ahụ. “Ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya,” ka Jọn onyeozi dere, “anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:11) Ee, anyị na-egosipụta onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele maka ihe mgbapụta ahụ ọ bụghị nanị site n’ịhụ Jehova n’anya na ikele ya ekele kamakwa site n’ibi ndụ anyị n’ụzọ na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya.—Matiu 22:37-39.

6 Anyị pụrụ ịmụtakwu banyere igosipụta ekele site n’ịtụle ụzọ Jehova si mesoo ndị Izrel oge ochie ihe. Site n’Iwu ahụ, bụ́ nke o nyere mba ahụ site n’aka Mozis, Jehova kụziiri ndị ahụ ọtụtụ ihe. Site ‘n’ụkpụrụ nke ihe ọmụma na nke eziokwu dị n’Iwu ahụ,’ anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu nke ga-enyere anyị aka ịgbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Gosikwanụ onwe unu ịbụ ndị nwere ekele.”—Ndị Rom 2:20; Ndị Kọlọsi 3:15.

Ihe Mmụta Atọ Sitere n’Iwu Mozis

7. Olee otú ndokwa maka inye otu ụzọ n’ụzọ iri si nye ndị Izrel ohere igosipụta ekele ha nye Jehova?

7 N’Iwu Mozis, Jehova kwuru ụzọ atọ ndị Izrel pụrụ isi gosipụta ezi ekele ha nwere maka ịdị mma ya. Nke mbụ, e nwere otu ụzọ n’ụzọ iri. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe a kọtara n’ala, tinyere “otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè atụrụ,” gaje ịbụ “ihe nsọ dịịrị Jehova.” (Levitikọs 27:30-32) Mgbe ndị Izrel rubere isi, Jehova gọziri ha n’ụba. “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ̀ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma M gaghị emeghere unu windo nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.”—Malakaị 3:10.

8. Gịnị dị iche n’onyinye afọ ofufo na inye otu ụzọ n’ụzọ iri?

8 Nke abụọ, tụkwasị n’otu ụzọ n’ụzọ iri nke a chọrọ ka a na-enye, Jehova mere ndokwa ka ụmụ Izrel na-enye onyinye afọ ofufo. O nyere Mozis ntụziaka ịgwa ụmụ Izrel, sị: “Mgbe unu ga-aba n’ala ahụ ebe Mụ onwe m na-eme ka unu baa, ọ ga-erukwa, mgbe unu na-eri n’ime nri ala ahụ, na unu [“ga-enye Jehova onyinye,” NW].” Ụfọdụ n’ime mkpụrụ mbụ nke “ógbè achịcha nke ụtụ ọka” ka ha ‘ga-enye Jehova n’onyinye’ n’ọgbọ ha nile. Rịba ama na ọ dịghị ihe a kapịrị ọnụ a ga-enye n’ime mkpụrụ mbụ ndị a a chọrọ. (Ọnụ Ọgụgụ 15:18-21) Ma mgbe ndị Izrel nyere onyinye iji gosipụta ekele, e mesiri ha obi ike na ha ga-enweta ngọzi Jehova. E mekwara ndokwa yiri nke ahụ n’ihe banyere ụlọ nsọ nke dị n’ọhụụ Izikiel. Anyị na-agụ, sị: “Ihe mbụ nke mkpụrụ mbụ nile nke ihe ọ bụla, na [“onyinye,” NW] ọ bụla nke ihe ọ bụla, site [“n’onyinye,” NW] nile unu, ndị nchụàjà ga-enwe ya: ọ bụkwa ụtụ ọka mbụ unu ka unu ga-enye onye nchụàjà, ime ka ngọzi dakwasị ụlọ gị.”—Ezikiel 44:30.

9. Gịnị ka Jehova kụziri site ná ndokwa nke ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi?

9 Nke atọ, Jehova mere ndokwa maka ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi. “Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu,” ka Chineke nyere ná ntụziaka, “ewesịla ihe dị n’akụkụ ubi gị, achịkọtakwala ihe nchịkọta nke owuwe ihe ubi gị fọdụrụ. Atụtụkọkwala mkpụrụ ubi vaịn gị fọdụrụ, achịkọtakwala mkpụrụ dara ada n’ubi vaịn gị; ogbenye na ọbịa ka ị ga-ahapụrụ ha: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Levitikọs 19:9, 10) N’ebe a kwa, ọ dịghị ihe a kapịrị ọnụ. Ọ dịịrị onye Izrel ọ bụla ikpebi ihe ọ ga-ahapụrụ ndị nọ ná mkpa. Eze Solomọn maara ihe kọwara n’ụzọ dabara adaba, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) N’ụzọ dị otú a, Jehova kụziri ka a na-egosi ọmịiko na nchebara echiche n’ebe ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha nọ.

10. Gịnị mere ndị Izrel mgbe ha na-egosipụtaghị na ha nwere ekele?

10 Jehova gọziri ụmụ Izrel mgbe ha ji nrubeisi webata otu ụzọ n’ụzọ iri, nye onyinye afọ ofufo ma nye ndị ogbenye ihe. Ma mgbe ndị Izrel na-egosipụtaghị na ha nwere ekele, ha kwụsịrị inwe ihu ọma Jehova. Nke a kpatara ọdachi, mesịakwa mee ka ha jee biri n’ala ọzọ. (2 Ihe E Mere 36:17-21) Oleezi ihe ndị anyị na-amụta?

Ụzọ Ndị Anyị Si Egosipụta na Anyị Nwere Ekele

11. Gịnị bụ ụzọ bụ́ isi anyị pụrụ isi na-gosipụta ekele anyị nye Jehova?

11 Ụzọ bụ́ isi anyị pụrụ isi na-enye Jehova otuto ma na-egosipụta ekele anyị na-agụnyekwa “onyinye.” N’ezie, dị ka Ndị Kraịst, anyị anọghị n’okpuru Iwu Mozis, na-abụ ndị iwu ji iji ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ihe ubi achụ àjà. (Ndị Kọlọsi 2:14) Otú o sina dị, Pọl onyeozi gbara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị site na ya chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) Site n’iji ikike na ihe onwunwe anyị achụrụ Jehova àjà otuto, ma ọ bụ n’ihu ọha ma ọ bụ “n’ime mkpọkọta” nke Ndị Kraịst ibe anyị, anyị pụrụ igosipụta ekele sitere n’obi anyị nwere n’ebe Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya bụ́ Jehova Chineke nọ. (Abụ Ọma 26:12) N’ime otú ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ ndị Izrel ga-esi na-gosipụta ekele ha nye Jehova?

12. A bịa n’ibu ọrụ anyị dị ka Ndị Kraịst, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná ndokwa nke inye otu ụzọ n’ụzọ iri?

12 Nke mbụ, dị ka anyị hụworo, ndokwa nke inye otu ụzọ n’ụzọ iri abụghị ihe mmadụ ga-eme ma ọ masị ya; iwu ji onye Izrel ọ bụla ime nke a. Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere ibu ọrụ nke ikere òkè n’ozi na ịga nzukọ Ndị Kraịst. Anyị enweghị nhọrọ ọ bụla n’ihe omume ndị a. N’oké amụma ya banyere oge ọgwụgwụ, Jizọs kwuru hoo haa, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14; 28:19, 20) Banyere nzukọ Ndị Kraịst, e nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ ndị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị na-egosipụta ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ mgbe anyị ji ọṅụ na-anakwere ibu ọrụ anyị nke ime nkwusa na izi ihe nakwa iso ụmụnna anyị akpakọrịta mgbe nile ná nzukọ ọgbakọ, na-ele nke ahụ anya dị ka ihe ùgwù.

13. Gịnị ka anyị na-amụta site ná ndokwa nke inye onyinye afọ ofufo na ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi?

13 Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ irite uru site n’ịtụle ndokwa abụọ ndị ọzọ e mere bụ́ ndị ụmụ Izrel pụrụ iji gosipụta ekele ha—inye onyinye na ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi. N’ụzọ dị iche n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri, bụ́ nke a kapịrị ihe a chọrọ ọnụ, ndokwa inye onyinye na ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi enweghị ihe a kapịrị ọnụ. Kama nke ahụ, ha na-enye ohere ka ekele miri emi ohu Jehova nwere n’obi ya kpalie ya ime ihe. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ ezie na anyị ghọtara na ikere òkè n’ozi na ịga nzukọ Ndị Kraịst bụ ibu ọrụ bụ́ isi nke ohu Jehova ọ bụla, ànyị na-eji obi dum na ọchịchọ obi ekere òkè na ha? Ànyị na-ele ha anya dị ka ohere iji gosipụta ekele anyị sitere n’obi maka ihe nile Jehova mewooro anyị? Ànyị na-ekere òkè dị ukwuu n’ihe omume ndị a, ruo ókè ọnọdụ anyị n’otu n’otu kwere anyị? Ka ànyị na-ele ihe a nile anya dị ka ibu ọrụ nke anyị na-aghaghị ịrụzu? N’ezie, ndị a bụ ajụjụ ndị anyị na-aghaghị ịza n’onwe anyị. Pọl onyeozi si otú a kwuo ya: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.

14. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị n’ozi anyị na-ejere ya?

14 Jehova Chineke maara ọnọdụ anyị nke ọma. Ọ maara erughị eru anyị. O ji àjà ndị ohu ya ji ọchịchọ obi ha achụ akpọrọ ihe, ma àjà ha hà buru ibu ma hà pere mpe. Ọ dịghị atụ anya ka anyị nile nye ihe ha nhata, anyị apụghịkwa ime otú ahụ. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere inye ihe, ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “Ọ bụrụ na ịdị njikere ahụ bu ụzọ dịrị, a na-anara ya nke ọma karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.” (2 Ndị Kọrint 8:12) Ụkpụrụ a metụtakwara ozi anyị na-ejere Chineke. Ọ bụghị otú ihe anyị mere hà na-ekpebi ma Jehova ọ̀ ga-anakwere ozi anyị na-ejere ya kama ọ bụ ụzọ anyị si mee ya—jiri ọṅụ na obi anyị dum mee ya.—Abụ Ọma 100:1-5; Ndị Kọlọsi 3:23.

Zụlite Ma Nọgide Na-enwe Mmụọ Ịsụ Ụzọ

15, 16. (a) Gịnị jikọrọ ịsụ ụzọ na inwe ekele? (b) Olee otú ndị na-enweghị ike ịsụ ụzọ pụrụ isi na-egosipụta mmụọ ịsụ ụzọ?

15 Ụzọ na-enye afọ ojuju isi gosipụta ekele anyị nye Jehova bụ ịbanye n’ozi oge nile. N’ịbụ ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ na ekele maka obiọma ya na-erughịrị mmadụ kpaliri, ọtụtụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye emewo mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha iji wepụtakwuo oge iji na-ejere Jehova ozi. Ụfọdụ enwewo ike ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile, na-etinye nkezi nke awa 70 kwa ọnwa n’ikwusa ozi ọma ahụ na ịkụziri ndị mmadụ eziokwu ahụ. Ndị ọzọ, bụ́ ndị ọnọdụ dịgasị iche iche pụrụ ịkpaworo ihe ha pụrụ ime ókè, na-eme ndokwa site n’oge ruo n’oge itinye awa 50 n’ọnwa n’ime nkwusa dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka.

16 Ma gịnị banyere ndị ohu Jehova bụ́ ndị na-apụghị ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka? Ha pụrụ igosipụta ekele ha site n’ịzụlite na ịnọgide na-enwe mmụọ ịsụ ụzọ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgba ndị pụrụ ịsụ ụzọ ume, site n’ịkụnye n’ime ụmụ ha ọchịchọ nke ịbanye n’ozi oge nile, nakwa site n’ikerechi òkè anya n’ime nkwusa dị ka ọnọdụ ha nyere ha ohere. Ihe anyị na-eme n’ozi anyị na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ókè anyị nweruru ekele n’obi anyị maka ihe Jehova mewooro anyị, ihe ọ na-emere anyị, na ihe ọ ka ga-emere anyị.

Igosipụta Ekele Site “n’Akụ̀” Anyị

17, 18. (a) Olee otú anyị pụrụ isi site “n’akụ̀” anyị gosi na anyị nwere ekele? (b) Olee otú Jizọs si lee onyinye otu nwanyị di ya nwụrụ nyere anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

17 “Sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị,” ka Ilu 3:9 na-ekwu, “sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile.” Ọ dịghịzi ndị ohu Jehova mkpa inye otu ụzọ n’ụzọ iri. Kama nke ahụ, Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ, sị: “Ka onye ọ bụla na-eme dị nnọọ ka o kpebiworo n’obi ya, ọ bụghị n’enweghị ọchịchọ ime ihe ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji mgbasapụ ihu na-enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Inye onyinye iji kwado ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ na-egosipụtakwa na anyị nwere ekele. Ekele sitere n’obi na-akpali anyị ime nke a mgbe nile, ikekwe na-ewepụta ihe iche kwa izu, dị ka Ndị Kraịst oge mbụ mere.—1 Ndị Kọrint 16:1, 2.

18 Ọ bụghị ego ole anyị nyere na-egosipụta ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ anyị ji nye ya. Nke a ka Jizọs chọpụtara mgbe ọ nọ na-ekiri ndị na-atụnye onyinye n’igbe onyinye dị n’ụlọ nsọ. Mgbe Jizọs hụrụ ka otu nwanyị di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa tụnyere “obere mkpụrụ ego abụọ nke ihe ha ga-azụtali dị nnọọ nta,” o kwuru, sị: “N’eziokwu asị m unu, Nwanyị a di ya nwụrụ, ọ bụ ezie na ọ dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ka ha nile tụnyere. N’ihi na ndị a nile sitere n’ihe mafọọrọ ha wee tụnye onyinye, ma nwanyị a sitere n’ụkọ ya wee tụnye ihe nile e ji ebi ndụ o nwere.”—Luk 21:1-4.

19. N’ihi gịnị ka o ji dị mma inyochagharị ụzọ ndị anyị si egosipụta ekele anyị?

19 Ka ntụle a nke otú anyị pụrụ isi na-egosipụta na anyị nwere ekele kpalie anyị inyochagharị ụzọ ndị anyị si egosipụta ekele anyị. Ànyị pụrụ ịmụba àjà otuto anyị nye Jehova ma eleghị anya, nakwa nkwado anyị na-akwado ọrụ a zuru ụwa ọnụ n’ụzọ ihe onwunwe? Ruo n’ókè anyị na-eme otú ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na Nna anyị na-emesapụ aka ma na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ga-enwe obi ụtọ na anyị na-egosi onwe anyị ịbụ ndị nwere ekele.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị inwe ekele nye Jehova?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri, inye onyinye, na ịchịkọta ihe ndị a hapụrụ n’ubi?

• Olee otú anyị si azụlite mmụọ ịsụ ụzọ?

• Olee otú anyị pụrụ isi jiri ‘akụ̀’ anyị na-ekele Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

“Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu”

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ihe atọ dị aṅaa ndị anyị pụrụ ịmụta n’Iwu ahụ ka e gosiri n’ebe a?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Àjà ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịchụ?