Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Ihe Omume Telivishọn Dugara Ya n’Ito Chineke

Otu Ihe Omume Telivishọn Dugara Ya n’Ito Chineke

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Otu Ihe Omume Telivishọn Dugara Ya n’Ito Chineke

PỌL onyeozi kwuru na “ụfọdụ sitere n’anyaụfụ na ịma aka na-ekwusa Kraịst, ma ndị ọzọ na-ekwusakwa ya site n’ezi obi.” (Ndị Filipaị 1:15) Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị na-agbalị imebi aha ndị Jehova emewo ihe iji dọta ndị obi ha ziri ezi n’eziokwu ahụ n’amaghị ama.

Na November 1998, otu ihe ngosi nke gosiri Betel, bụ́ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Louviers, France, pụtara n’ụlọ ọrụ telivishọn mba France. N’agbanyeghị mmeghachi omume dịgasị iche e nwetara n’ihi ya, ihe omume ahụ rụpụtara ezi ihe n’ụzọ a na-atụghị anya ya.

Otu n’ime ndị kiriri ihe omume ahụ bụ Anna-Paula, onye bi nanị kilomita 60 site na Betel. Anna-Paula, bụ́ nne a gbara alụkwaghịm nke nwere ụmụ atọ, nọ na-achọ ọrụ. Ya mere, n’echi ya, ọ kpọrọ Betel na fon iji jụta ma ọ pụrụ ịchọta ọrụ ebe ahụ. “Echere m na ọ bụ ebe dị mma nakwa na ọrụ a na-arụ ebe ahụ bara uru,” ka o kwuru. Lee ihe ijuanya o nwere mgbe ọ matara na ndị nile na-eje ozi na Betel bụ ndị ozi na-enye oge ha n’afọ ofufo! Mgbe e sosịrị ya nwee mkparịta ụka dị mkpirikpi banyere ọrụ Ndịàmà Jehova, o kwetara ka otu Onyeàmà bịa na nke ya.

Mgbe Léna, bụ́ onye ozi oge nile nọ n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ gara na nke ya, ha nwere mkparịta ụka were ogologo oge, Anna-Paula natara akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. * Ka ọ na-erule ná nleta ọzọ, Anna-Paula agụchawo akwụkwọ ahụ ma nwee ọtụtụ ajụjụ. Ọ nakweere ọmụmụ Bible n’egbughị oge. Anna-Paula kwuru, sị: “Nye m, ọ bụ ohere ịghọta Okwu Chineke. Aka m emetụbeghị Bible mbụ.”

Na January, Anna-Paula letara Betel, n’izu na-esonụ ọ gakwara nzukọ Ndị Kraịst nke mbụ ya. Nwa oge ka nke ahụ gasịrị, ọ malitere ịmụrụ ụmụ ya Bible na ịgbara ndị enyi ya àmà. “Apụghị m izochiri ndị ọzọ ihe m na-amụta,” ka ọ na-ekwu. “Achọrọ m iso ndị mmadụ na-ekerịta eziokwu Bible ma na-agba ha ume.” Ka ọ gbalịsiri ike imeri ọtụtụ nsogbu ndị o nwere, Anna-Puala malitere ịgachi nzukọ anya. O nwere ọganihu ngwa ngwa, e mekwara ya baptizim na May 5, 2002.

Tụkwasị na nke ahụ, n’ihi ezi ihe nlereanya na ịnụ ọkụ n’obi Anna-Paula n’ime nkwusa, nne ya malitere ịmụ Bible, e mekwara ya baptizim n’oge na-adịghị anya. “Ọ dịghị okwu m pụrụ iji kọwaa ụdị ọṅụ m nwere,” ka Anna-Paula na-ekwu. “Ana m ekele Jehova kwa ụbọchị n’ihi ime ka m mara ya na ijere ya ozi nakwa maka ngọzi nile o nyeworo m.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

N’elu: Anna-Paula

N’okpuru: Ụzọ mbata nke alaka ụlọ ọrụ France