Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Isiakwụkwọ ole dị n’akwụkwọ Maịka, olee mgbe e dere ya, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka e nwere n’oge ahụ?

Akwụkwọ Maịka nwere isiakwụkwọ asaa. Maịka onye amụma dere akwụkwọ ahụ na narị afọ nke asatọ T.O.A., bụ́ oge e kewara ndị Chineke ha na ya nọ ọgbụgba ndụ ịbụ mba abụọ—Izrel na Juda.—8/15, peeji nke 9.

Dị ka Maịka 6:8 si kwuo, gịnị ka Chineke na-achọ n’aka anyị?

Anyị ga “na-ekpe ikpe ziri ezi.” Ụzọ Chineke si eme ihe bụ ụkpụrụ nke ikpe ziri ezi, ya mere anyị aghaghị ịgbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ ya nke ime ihe n’eziokwu na iguzosi ike n’ezi ihe. Ọ na-agwa anyị ka anyị “hụ obiọma n’anya.” Ndị Kraịst egosiwo obiọma sitere n’ịhụnanya site n’inyere ndị nọ ná mkpa aka, dị ka mgbe e nwesịrị ọdachi. Ka anyị wee bụrụ ndị ‘ji obi umeala soro Jehova na-eje ije,’ anyị aghaghị ịmata otú ike anyị ha ma dabere n’ebe ọ nọ.—8/15, peeji nke 20-22.

Ọ bụrụ na a chụrụ Onye Kraịst n’ọrụ, gịnị ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka o mee?

Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya mmadụ inyochagharị ụzọ ndụ ya. Ọ pụrụ ikwe omume mmadụ ime ka ndụ ya dị mfe site n’ịkwaga n’ebe obibi dịtụ nta ma ọ bụ iwepụ ihe onwunwe ndị na-adịchaghị mkpa. N’ezie, ọ dị mkpa ịkwụsị ichegbu onwe onye banyere mkpa a na-enwe kwa ụbọchị, na-enwe ntụkwasị obi na Chineke pụrụ ime ka o kwe omume ịnọgide na-enweta ihe ndị dị mkpa. (Matiu 6:33, 34)—9/1, peeji nke 14-15.

Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-enye ma ọ bụ na-anara onyinye agbamakwụkwọ?

Onyinye ndị dị oké ọnụ adịghị mkpa, e kwesịghịkwa ịtụ anya ha. Ọnọdụ obi onye na-enye ihe bụ ihe kasị dị oké ọnụ ahịa. (Luk 21:1-4) Ọ naghị egosi obiọma bụ́ ịkpọ aha onye nyere onyinye. Ime nke ahụ pụrụ ibute ihere. (Matiu 6:3)—9/1, peeji nke 29.

N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị?

Ikpechi ekpere anya pụrụ inye aka mee ka mmekọrịta anyị na Chineke chie anya ma kwadebe anyị ịnagide ọnwụnwa ndị siri ike. Ekpere anyị pụrụ ịdị mkpirikpi ma ọ bụ too ogologo na-adabere ná mkpa na ọnọdụ e nwere. Ekpere na-ewulite okwukwe anyị ma na-enyere anyị aka idozi nsogbu.—9/15, peeji nke 15-18.

Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta 1 Ndị Kọrint 15:29, bụ́ nke a sụgharịrị na Bible ụfọdụ ịbụ “ndị a na-eme baptizim n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ”?

Ihe Pọl onyeozi bu n’uche bụ na e mere Ndị Kraịst e tere mmanụ baptizim, ma ọ bụ mikpuo ha ná mmiri, ịgbaso ụzọ ndụ nke ga-eduga ha n’ịnwụ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, dị ka Kraịst nwụrụ. Mgbe e mesịrị, a ga-akpọlite ha ịghọ ndị mmụọ dị ka Kraịst.—10/1, peeji nke 29.

Olee otú anyị si mara na ịbụ Onye Kraịst na-agụnye ihe karịrị izere ihe ọjọọ ndị a kpọtụrụ uche na 1 Ndị Kọrint 6:9-11?

Pọl onyeozi akwụsịghị n’ịkpọtụ ihe ọjọọ ndị dị ka ịkwa iko, ikpere arụsị, na aṅụrụma aha. N’igosi na imekwu mgbanwe pụrụ ịdị mkpa, ọ gara n’ihu ikwu n’amaokwu na-esonụ, sị: “Nye m, iwu kwadoro ihe nile, ma ọ bụghị ihe nile bara uru.”—10/15, peeji nke 18-19.

Olee ụfọdụ ndị inyom oge ochie bụ́ ndị mere ka obi Chineke ṅụrịa?

Ha gụnyere ndị inyom na-ele ime bụ́ Shifra na Pua, bụ́ ndị jụrụ irubere Fero isi igbu nwa ọhụrụ Izrel ọ bụla a mụrụ bụ́ nwoke. (Ọpụpụ 1:15-20) Nwanyị akwụna Kenan bụ́ Rehab chebere ndị nledo Izrel abụọ. (Joshua 2:1-13; 6:22, 23) N’igosipụta ezi uche, Abigail nyere aka zọpụta ndụ ọtụtụ ndị ma gbochie Devid ịbụ onye ikpe ọbara mara. (1 Samuel 25:2–35) Ha bụ ihe nlereanya nye ndị inyom taa.—11/1, peeji nke 8-11.

Olee otú o si bụrụ na kpakpando si n’eluigwe buso Sisera agha,’ dị ka e kwuru ná Ndị Ikpe 5:20?

Ụfọdụ na-eche na nke a na-ezo aka n’enyemaka Chineke. Ndị ọzọ na-arụtụ aka n’enyemaka nke ndị mmụọ ozi, iberibe nkume ndị si n’eluigwe na-ada, ma ọ bụ ná ndabere Sisera dabeere n’ihe ndị na-agụ kpakpando kwuru ga-eme. Ebe Bible na-enyechaghị anyị nkọwa zuru ezu, anyị pụrụ iwere okwu a dị ka ihe na-egosi na e nwere otú Chineke si tinye aka n’ihi usuu ndị agha Izrel.—11/15, peeji nke 30.

Ebe enweghị mmasị n’okpukpe jupụtara n’ụwa, n’ihi gịnị ka ọtụtụ ka ji na-ekwu na ha kweere na Chineke?

Ụfọdụ na-aga chọọchị ịchọ udo nke obi. Ndị ọzọ na-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ha nwụsịrị, ma ọ bụ nke ahụ́ ike, akụ̀ na ụba, na ihe ịga nke ọma. N’ụfọdụ ebe, ndị mmadụ na-achọ ihe ha ga-eji mejuo ịtọgbọ chakoo ime mmụọ ha nwere ka atụmatụ ndị dabeere n’usoro nke akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị na-anọchi echiche ọchịchị Kọmụnist. Ịmara ihe ndị a pụrụ inyere Onye Kraịst aka ịmalite nkwurịta okwu ndị dị mma.—12/1, peeji nke 3.