Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụta Ihe Site n’Ezinụlọ Jizọs n’Ụwa

Ịmụta Ihe Site n’Ezinụlọ Jizọs n’Ụwa

Ịmụta Ihe Site n’Ezinụlọ Jizọs n’Ụwa

GỊNỊ ka ị maara banyere ezinụlọ Jizọs, bụ́ ndị ya na ha biri ruo mgbe e mere ya baptizim, ruo afọ 30 mbụ nke ndụ ya n’ụwa? Gịnị ka ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-agwa anyị? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’inyocha ihe banyere ezinụlọ ya? Ị pụrụ irite uru site n’azịza ha.

À mụnyere Jizọs n’ikpo akụ̀ dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Josef, bụ́ nna nkuchi ya, bụ ọkwá nkà. Nke ahụ bụ ọrụ siri nnọọ ike, bụ́ nke na-agụnyekarị igbutu osisi iji wapụta osisi a ga-eji rụọ ihe. Mgbe nne na nna Jizọs n’ụwa gara Jeruselem ihe dị ka ụbọchị 40 ka a mụsịrị ya, ha chụrụ àjà nke e depụtara n’Iwu ahụ. Hà nyere ebule na nduru ma ọ bụ kpalakwukwu, dị ka e kwuru n’Iwu ahụ? Ee e. O yiri ka aka ha erughị àjà dị otú ahụ. Ma, Iwu ahụ mekwara ndokwa maka ndị ogbenye. N’ikwekọ na nke ahụ, Josef na Meri nyere “nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” Ịhọrọ anụmanụ ndị dị ọnụ ala karị gosiri na ha bụ ezinụlọ dara ogbenye.—Luk 2:22-24; Levitikọs 12:6, 8.

Ị pụrụ ịhụ na a mụnyere Jizọs Kraịst, bụ́ Onye ga-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ọdịnihu, n’etiti ndị ọnọdụ ha dị ala, n’etiti ndị na-aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji kpata ihe ha ga-eri. O tolitere ma ghọọ ọkwá nkà, dị nnọọ ka nna nkuchi ya. (Matiu 13:55; Mak 6:3) “Ọ bụ ezie na [Jizọs] bara ọgaranya” dị ka mmụọ e kere eke dị ike n’eluigwe, Bible na-ekwu na “ọ dara ogbenye” n’ihi anyị. O weere ọnọdụ dị ala dị ka mmadụ ma tolite n’ezinụlọ ndị nkịtị. (2 Ndị Kọrint 8:9; Ndị Filipaị 2:5-9; Ndị Hibru 2:9) A mụghị Jizọs n’ezinụlọ ndị aka ji akụ̀, nke a pụkwara imewo ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ọnọdụ ya adọpụghị uche ha. Ha pụrụ iji ya kpọrọ ihe n’ihi ozizi ya, àgwà ya ndị na-adọrọ mmasị, nakwa n’ihi ọrụ ya ndị dị ike. (Matiu 7:28, 29; 9:19-33; 11:28, 29) Anyị pụrụ ịhụ amamihe Jehova Chineke gosipụtara n’ikwe ka a mụọ Jizọs n’ezinụlọ ndị nkịtị.

Ugbu a, ka anyị tụlee ihe banyere ndị ezinụlọ Jizọs ma hụ ihe anyị pụrụ ịmụta n’aka ha.

Josef—Onye Ezi Omume

Mgbe Josef chọpụtara na nwanyị o kwere nkwa ịlụ dị ime “tupu e jikọọ ha,” ọ ghaghị isiworo ya ike ịhọrọ n’etiti ịhụnanya o nwere n’ebe Meri nọ na oyi ọ na-asọ ọbụna ihe yiri ka ọ̀ bụ omume rụrụ arụ. Ihe ahụ nile yiri ka ọ̀ bụ ịnapụ ya ihe ruuru ya dị ka di ya n’ọdịnihu. N’oge ya, a na-ele nwanyị e kwere nkwa ọlụlụ anya dị ka nwunye nwoke kwere ya nkwa. Mgbe o chebasịịrị okwu ahụ echiche, Josef kpebiri ịgba Meri alụkwaghịm na nzuzo ka a ghara ịtụ ya nkume dị ka nwanyị na-akwa iko.—Matiu 1:18; Deuterọnọmi 22:23, 24.

Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi bịakwutere Josef ná nrọ ma kwuo, sị: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ihe ahụ e meworo ka ọ dị ime ya bụ site na mmụọ nsọ. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ghaghịkwa ịkpọ aha ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” Mgbe ọ natasịrị ntụziaka ahụ sitere n’aka Chineke, Josef mere ihe kwekọrọ na nke ahụ ma kpọrọ Meri laa n’ụlọ ya.—Matiu 1:20-24.

Site n’ime mkpebi a, nwoke ezi omume ahụ kwesịrị ntụkwasị obi keere òkè ná mmezu nke ihe Jehova kwuworo site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Lee, nwa agbọghọ ahụ dị ime, ọ gajekwa ịmụ nwa nwoke, ọ ga-akpọkwa aha ya Immanuel.” (Aịsaịa 7:14) Josef bụ n’ezie nwoke na-adịghị eji ihe ime mmụọ egwuri egwu onye ji ihe ùgwù nke ịghọ nna nkuchi nke Mezaịa ahụ kpọrọ ihe n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na nwa mbụ nke Meri agaghị abụ nke ya.

Josef zeere iso Meri nwee mmekọahụ ruo mgbe ọ mụsịrị nwa ọ di ime ya. (Matiu 1:25) Nye ndị a ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ, ịghara inwe mmekọahụ pụrụ ịbụwo ihe ịma aka, ma o doro anya na ha achọghị ka e nwee nghọtahie ọ bụla banyere onye bụ Nna nwa ahụ. Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe atụ magburu onwe ya nke njide onwe onye! Josef butere ihe ime mmụọ ọzọ karịa ọchịchọ anụ ahụ́ ya.

Ugboro anọ, Josef natara ntụziaka sitere n’aka mmụọ ozi banyere otú ọ ga-esi zụlite nwa nkuchi ya. Atọ n’ime ha bụ banyere ebe a ga-anọ zụlite nwa ahụ. Irube isi ozugbo dị mkpa maka ndụ nke nwa ahụ. Na nke ọ bụla, Josef mere ihe ozugbo, buru ụzọ kpọrọ nwata ahụ gaa Ijipt ma mesịa kpọrọ ya lọghachi n’Izrel. Nke a chebere Jizọs na-eto eto pụọ ná mgbuchapụ Herọd gbuchapụrụ ụmụ ọhụrụ. Ọzọkwa, nrubeisi Josef rụpụtara mmezu nke amụma ndị e buru banyere Mezaịa ahụ.—Matiu 2:13-23.

Josef kụziiri Jizọs ọrụ ka o wee nwee ike ilekọta onwe ya. N’ụzọ dị otú a, a maara Jizọs ọ bụghị nanị dị ka “nwa ọkwá nkà ahụ” kamakwa dị ka “ọkwá nkà ahụ.” (Matiu 13:55; Mak 6:3) Pọl onyeozi dere na ‘a nwalere Jizọs n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị.’ Dị ka o kwesịrị ịdị, nke a gaara agụnyewo ịrụsi ọrụ ike iji nye aka ịkwado ezinụlọ ahụ.—Ndị Hibru 4:15.

N’ikpeazụ, anyị hụrụ ihe àmà na-egosi na Josef ji ezi ofufe kpọrọ ihe n’ihe ndekọ ikpeazụ ebe a kpọtụrụ ya aha n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Josef kpọọrọ ezinụlọ ya gaa Jeruselem maka Ememe Ngabiga. Ọ bụ nanị ndị ikom ka a chọrọ ka ha na-aga, ma Josef mere ka ọ bụrụ omume ya ịkpọ ezinụlọ ya aga Jeruselem “site n’afọ ruo n’afọ.” Ọ chụrụ nnukwu ihe n’àjà, n’ihi na ha aghaghị ije ije ihe dị ka 100 kilomita site na Nazaret ruo Jeruselem. Otú ọ dị, n’oge ahụ a kọrọ banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ, Jizọs anọghị n’ìgwè ndị na-ala ala. A hụrụ ya n’ụlọ nsọ ebe ọ nọ na-ege ndị nkụzi Iwu ahụ ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. Ọ bụ ezie na ọ dị nanị afọ 12, Jizọs gosipụtara na ya nwere amamihe dị ukwuu na ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Site n’ihe a merenụ, anyị hụrụ na ndị mụrụ Jizọs aghaghị ịkụziworo ya ihe nke ọma, na-azụlite ya ịbụ nwa okoro ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (Luk 2:41-50) Eleghị anya Josef nwụrụ obere oge mgbe nke a gasịrị, ebe ọ bụ na a kpọtụghị ya aha ọzọ n’ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ.

Ee, Josef bụ onye ezi omume nke lekọtara ezinụlọ ya nke ọma, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́. Dị ka Josef, ị̀ na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ gị mgbe ị ghọtara ihe bụ uche Chineke maka anyị taa? (1 Timoti 2:4, 5) Ị̀ na-eji ọchịchọ obi gị erube isi n’ihe Chineke na-ekwu dị ka e dekọrọ ya n’Okwu Chineke, si otú ahụ na-egosi nrubeisi yiri nke Josef? Ị̀ na-akụziri ụmụ gị ihe ka ha wee nwee ike iso ndị ọzọ na-enwe mkparịta ụka ndị bara uru dabeere n’ihe ime mmụọ?

Meri—Ohu Chineke nke Na-adịghị Achọ Ọdịmma Onwe Ya Nanị

Meri, nne Jizọs, bụ ezigbo ohu Chineke. Mgbe mmụọ ozi Gebriel mara ọkwa na ọ gaje ịmụ nwa, ọ tụrụ ya n’anya. Ebe ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ya na ‘nwoke ọ bụla enwebeghị mmekọahụ.’ Mgbe ọ nụrụ na a ga-amụ nwa ahụ site n’ike mmụọ nsọ, o ji obi umeala nakwere ozi ahụ, na-asị: “Lee! Nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova ka m bụ! Ka o mee dị ka okwu i kwupụtaworo si dị.” (Luk 1:30-38) O ji ihe ùgwù ime mmụọ ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ọ dị njikere ịnagide ihe isi ike ọ bụla mkpebi ya pụrụ ịkpata.

N’ezie, ịnakwere ọrụ ahụ gbanwere ndụ ya kpam kpam dị ka nwanyị. Mgbe ọ gara Jeruselem maka ime onwe ya ka ọ dị ọcha, otu agadi nwoke na-atụ egwu Chineke aha ya bụ Simiọn gwara ya, sị: “A ga-amanye ogologo mma agha n’ime mkpụrụ obi nke gị onwe gị.” (Luk 2:25-35) O yiri ka ọ̀ na-ezo aka ná mmetụta Meri ga-enwe mgbe ọ hụrụ ka ọtụtụ ndị jụrụ Jizọs, e mesịakwa kpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ.

Ka Jizọs na-etolite, Meri rịbara ihe ndị na-eme ná ndụ Jizọs ama, “na-eru ná nkwubi okwu n’ime obi ya.” (Luk 2:19, 51) Dị ka Josef, ọ bụ onye na-adịghị eji ihe ime mmụọ egwuri egwu na onye ji ihe omume na okwu ndị mezuru amụma kpọrọ ihe. Ihe mmụọ ozi Gebriel gwara ya dịgidere n’uche ya: “Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.” (Luk 1:32, 33) Ee, o ji ihe ùgwù nke ịbụ nne elu ala nke Mezaịa ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu.

Na Meri ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụtakwara ìhè ọzọ mgbe o zutere Elizabet, bụ́ onye ikwu ya nke dịkwa ime n’ụzọ ọrụ ebube. Mgbe Meri hụrụ ya, o toro Jehova ma kpughee ịhụnanya o nwere n’ebe Okwu Chineke dị. O zoro aka n’ekpere Hana bụ́ nke e dekọrọ na 1 Samuel isi 2 ma hota okwu ụfọdụ site n’akwụkwọ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe ọmụma dị otú ahụ nke Akwụkwọ Nsọ gosiri na o ruru eru ịbụ nne ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na nke na-atụ egwu Chineke. Ọ ga-enyere Josef aka n’ịzụlite nwa ya n’ụzọ ime mmụọ.—Jenesis 30:13; 1 Samuel 2:1-10; Malakaị 3:12; Luk 1:46-55.

Meri nwere okwukwe siri ike n’ebe nwa ya nọ dị ka Mezaịa ahụ, nke ahụ ajụghịkwa oyi ọbụna mgbe Jizọs nwụsịrị. N’oge na-adịghị anya ka Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, o so ná ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị so ndịozi zukọọ maka ikpe ekpere. (Ọrụ 1:13, 14) Ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe mgbu nke ịhụ ka nwa ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ.

Olee otú ị pụrụ isi rite uru site n’ịmụ ihe banyere ndụ Meri? Ị̀ na-anakwere ihe ùgwù nke ijere Chineke ozi n’agbanyeghị àjà ndị ọ gụnyere? Ị̀ na-eji ịdị mkpa nke ihe ùgwù a akpọrọ ihe taa? Ị̀ na-eburu n’uche ihe Jizọs buru n’amụma ma jiri nke ahụ tụnyere ihe na-eme taa, ‘na-eru ná nkwubi okwu n’ime obi gị’? (Matiu, isi 24 na 25; Mak, isi 13; Luk, isi 21) Ị̀ na-eṅomi Meri n’ịghọ onye maara Okwu Chineke nke ọma, na-eji ya eme ihe mgbe mgbe ná mkparịta ụka gị? Ị̀ ga-anọgide na-enwe okwukwe na Jizọs n’agbanyeghị ihe mgbu nke uche ị pụrụ inwe n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ ya?

Ụmụnne Jizọs—Mgbanwe Ga-ekwe Omume

O yiri ka ụmụnne Jizọs egosipụtaghị okwukwe n’ebe Jizọs nọ ruo mgbe ọ nwụsịrị. O yiri ka ọ̀ bụ nke a mere ha anọghị ya mgbe ọ na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ nke mere ka o nyefee Jọn onyeozi nne ya ilekọta. Ndị ikwu Jizọs gosiri na ha ejighị ya kpọrọ ihe, ọbụna na-ekwu n’otu oge na ‘uche ezukwaghị Jizọs okè.’ (Mak 3:21) Ebe Jizọs nwere ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe, ndị nwere ndị na-ekweghị ekwe n’ezinụlọ ha pụrụ ijide n’aka na Jizọs na-aghọta mmetụta ha na-enwe mgbe ndị ikwu ha na-akwa ha emo n’ihi okwukwe ha.

Otú ọ dị, mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, o doro anya na ụmụnne ya malitere igosipụta okwukwe n’ebe ọ nọ. Ha so n’ìgwè ndị gara Jeruselem na Pentikọst 33 O.A. ma soro ndịozi kpesie ekpere ike. (Ọrụ 1:14) N’ụzọ doro anya, mbilite n’ọnwụ nke nwanne ha kpaliri ha ịgbanwe obi, ruo n’ókè nke ịghọ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị ekwesịghị ịkwụsị inwe olileanya banyere ndị ikwu anyị na-ekweghị n’ihe anyị kweere.

E kwuru okwu banyere Jems, onye nne ji ya na Jizọs bụ́ onye Ọ pụtara n’ihu ya, n’Akwụkwọ Nsọ dị ka onye nwere ọnọdụ pụtara ìhè n’ọgbakọ Ndị Kraịst. O degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke ka ha nọgidesie ike n’okwukwe ha. (Ọrụ 15:6-29; 1 Ndị Kọrint 15:7; Ndị Galeshia 1:18, 19; 2:9; Jems 1:1) Onye ọzọ nne ji ya na Jizọs, bụ́ Jud, dere akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ iji gbaa ndị kwere ekwe ibe ya ume ịdị na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ahụ ike. (Jud 1) O kwesịrị ịrịba ama na ma Jems ma Jud adịghị nke zoro aka n’ịbụ nwanne nke ha na Jizọs iji mee ka Ndị Kraịst ibe ha kwenye n’ihe ha na-ekwu. Lee ihe magburu onwe ya banyere ịdị umeala n’obi anyị pụrụ ịmụta n’aka ha!

Ya mere, gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị anyị na-amụta site n’ezinụlọ Jizọs? N’ezie, ọ bụ ihe mmụta banyere ịrara onwe onye nye bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ ndị dị ka ndị a: (1) Jiri ikwesị ntụkwasị obi na-erube isi n’uche Chineke ma chee ule ndị ime otú ahụ ga-eweta ihu. (2) Na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ, ọbụna mgbe nke ahụ pụtara ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. (3) Zụlite ụmụ gị n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. (4) Akwụsịla inwe olileanya banyere ndị ezinụlọ gị bụ́ ndị na-ekweghị n’ihe i kweere. (5) Etula ọnụ n’ihi inwe ihe jikọrọ gị na ndị a ma ama n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ee, ịmụ ihe banyere ezinụlọ Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa na-adọtakwu anyị nso n’ebe ọ nọ ma na-eme ka anyị nwekwuo ekele na Jehova họọrọ ezinụlọ nkịtị ịzụlite Jizọs n’oge ọ bụ nwata.

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

Josef kpọọrọ Meri dị ka nwunye ya ma kere òkè ná mmezu nke amụma ndị metụtara Mezaịa ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Josef na Meri kụziiri ụmụ ha ihe ime mmụọ nakwa mkpa ịrụ ọrụ dị

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọ bụ ezie na a zụlitere ha n’ezinụlọ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ụmụnne Jizọs egosipụtaghị okwukwe n’ebe ọ nọ ruo mgbe ọ nwụsịrị

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Ndị otu nne ji ha na Jizọs bụ́ Jems na Jud gbara Ndị Kraịst ibe ha ume