Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gosipụta Na Ị Bụ Onye Dị Njikere Maka Ụbọchị Jehova

Gosipụta Na Ị Bụ Onye Dị Njikere Maka Ụbọchị Jehova

Gosipụta Na Ị Bụ Onye Dị Njikere Maka Ụbọchị Jehova

“Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere, n’ihi na n’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—MATIU 24:44.

1. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-eche banyere ụbọchị Jehova?

Ọ GA-ABỤ ụbọchị agha na nrubiga ókè nke iwe, ụbọchị mkpagbu na ahụhụ, ụbọchị ọchịchịrị na ịtọgbọrọ n’efu. “Oké ụbọchị” Jehova aghaghị ịbịakwasị ajọ usoro ihe a, ọbụna dị ka Iju Mmiri ahụ rikpuru ajọ ụwa ahụ n’ụbọchị Noa. A pụghị ịgbanahụ ya agbanahụ. Ma, “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Joel 2:30-32; Emọs 5:18-20) Chineke ga-ebibi ndị iro ya ma zọpụta ndị ya. Zefanaịa onye amụma ji echiche nke ịdị ngwa kwupụta, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) Otú ọ dị, olee mgbe a ga-emezu ikpe Chineke a?

2, 3. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị kwadebe onwe anyị maka ụbọchị Jehova?

2 “Ọ dịghị onye maara banyere ụbọchị na awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama nanị Nna m maara,” ka Jizọs kwuru. (Matiu 24:36) Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem oge ahụ, ọ dị oké mkpa anyị iburu n’uche okwu nke isiokwu anyị dịịrị afọ 2004: “Nọrọnụ na nche . . . Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere.”—Matiu 24:42, 44.

3 N’igosi otú a ga-esi chịkọta ndị dị njikere gaa n’ebe dị nchebe na mberede, ebe a ga-ahapụ ndị ọzọ, Jizọs kwuru, sị: “Ndị ikom abụọ ga-anọ n’ubi: a ga-akpọrọ otu ma gbahapụ onye nke ọzọ; ndị inyom abụọ ga na-egwe nri n’ihe igwe nri: a ga-akpọrọ otu ma gbahapụ onye nke ọzọ.” (Matiu 24:40, 41) N’oge ahụ pụrụ iche, gịnị ga-abụ ọnọdụ anyị n’otu n’otu? Ànyị ga-adị njikere, ka ụbọchị ahụ ọ̀ ga-abịakwasị anyị na mberede? Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’ihe anyị na-eme ugbu a. Igosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova chọrọ ka anyị zere àgwà ụfọdụ juru ebe nile taa, ka anyị zere ịdaba n’ụdị ọnọdụ ime mmụọ ụfọdụ, nakwa ka anyị jụ ụzọ ndụ ụfọdụ.

Zere Àgwà nke Ịbụ Onye Onwe Ya Juru Afọ

4. Àgwà dị aṅaa ka ndị ụbọchị Noa nwere?

4 Tụlee ụbọchị Noa. “Site n’okwukwe, Noa, mgbe e nyesịrị ya ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Hibru 11:7) Ụgbọ ahụ ga-apụ iche ma bụrụ nke a ga-ahụ nke ọma. Ọzọkwa, Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ma ọrụ owuwu ihe nke Noa ma nkwusa ya adịghị nke kpaliri ndị oge ya ime ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di.” Ndị Noa kwusaara ozi ọma mikpuru nnọọ onwe ha n’ihe omume ha na n’ihe ụtọ nke na “ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.”—Matiu 24:38, 39.

5. Àgwà dị aṅaa ka ndị bi na Sọdọm n’oge Lọt nwere?

5 Otú ahụ ka ọ dị n’ụbọchị Lọt. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha nọ na-azụ, ha nọ na-ere, ha nọ na-akụ ihe, ha nọ na-ewu ihe. Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ sitere n’eluigwe zoo ma bibie ha nile.” (Luk 17:28, 29) Mgbe ndị mmụọ ozi dọsịrị Lọt aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ, ọ gwara ndị di ụmụ ya banyere ihe na-aga ime. Otú ọ dị, “ọ dị ka onye na-akwa emo” n’anya ha.—Jenesis 19:14.

6. Àgwà dị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere?

6 Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa na Lọt, “otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ” ga-adị, ka Jizọs kwuru. (Matiu 24:39; Luk 17:30) N’ezie, àgwà ọtụtụ ndị nwere taa bụ nke onwe onye iju ya afọ. Anyị aghaghị ịnọ na nche megide ịbụ ndị àgwà dị otú ahụ metụtara. Ọ dịghị njọ iri nri dị ụtọ na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ruo n’ókè. N’otu aka ahụ, alụmdi na nwunye bụ ndokwa Chineke mere. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ihe ndị dị otú ahụ aghọọla ihe kasị mkpa ná ndụ anyị, e wezụgakwa ihe ime mmụọ n’ụsọ, ànyị dị njikere n’onwe anyị maka oké ụbọchị Jehova?

7. Ajụjụ dị aṅaa dị oké mkpa ka anyị kwesịrị ịjụ tupu anyị ana-etinye aka n’ihe omume ọ bụla, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

7 “Oge fọdụrụnụ dị ntakịrị,” ka Pọl onyeozi kwuru. “Site ugbu a gaa n’ihu, ka ndị nwere nwunye dịrị ka à ga-asị na ọ dịghị nke ha nwere.” (1 Ndị Kọrint 7:29-31) Ọ bụ nanị ntakịrị oge fọdụrụ ka anyị rụzuo ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke Chineke nyere anyị. (Matiu 24:14) Pọl dụrụ ọbụna ndị lụrụ di na nwunye ọdụ ka ha ghara ịdị na-eche banyere onye òtù ọlụlụ ha gabiga ókè nke na ha na-edebe ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ ha. N’ụzọ doro anya, àgwà Pọl na-atụ aro ka e nwee megidere mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume [Chineke].” (Matiu 6:33) Mgbe ị na-eme mkpebi ọ bụla ma ọ bụ na-etinye aka n’ihe omume ọ bụla, ajụjụ dị mkpa ịjụ bụ, ‘Olee otú nke a ga-esi metụta idebe ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ m?’

8. Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị aghọwo nchegbu anyị bụ́ isi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

8 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị etinyeworị aka n’ihe omume a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị ruo n’ókè nke na a dịghị elebaziri ihe ime mmụọ anya? È nwere ntakịrị ọdịiche n’etiti ụzọ ndụ anyị na nke ndị agbata obi anyị bụ́ ndị na-enweghị ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ nakwa ndị na-abụghị ndị nkwusa Alaeze? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ọ dị anyị mkpa itinye nke a n’ekpere. Jehova pụrụ inyere anyị aka inwe echiche ziri ezi. (Ndị Rom 15:5; Ndị Filipaị 3:15) Ọ pụrụ inyere anyị aka ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ, ime ihe ziri ezi, na ịrụzu ọrụ dịịrị anyị n’ebe ọ nọ.—Ndị Rom 12:2; 2 Ndị Kọrint 13:7.

Guzogide Iro Ụra Ime Mmụọ

9. Dị ka Mkpughe 16:14-16 si kwuo, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa izere iro ụra ime mmụọ?

9 Otu amụma ahụ kwuru banyere ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’ ga-ada n’Amagedọn dọkwara aka ná ntị na ụfọdụ ndị pụrụ ịghara ịmụrụ anya. “Lee! Ana m abịa dị ka onye ohi,” ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-ekwu. “Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya ma na-edebe uwe elu ya, ka o wee ghara ịgba ọtọ na-ejegharị, ndị mmadụ ewee na-elekwasị anya n’ihe ihere ya.” (Mkpughe 16:14-16) Uwe elu nke a kpọtụrụ uche n’ebe a na-ezo aka n’ihe e ji mara anyị dị ka Ndịàmà Jehova bụ́ Ndị Kraịst. Nke a na-agụnye ọrụ anyị dị ka ndị nkwusa Alaeze na àgwà anyị dị ka Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị adaba n’ọnọdụ arụghị ọrụ yiri ụra, a pụrụ ịnapụ anyị ihe e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst. Nke ahụ na-eme ihere ma dị ize ndụ. Anyị aghaghị izere iro ụra ma ọ bụ umengwụ ime mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi zere àgwà dị otú ahụ?

10. N’ihi gịnị ka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị ji enyere anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

10 Bible na-emesi ike ugboro ugboro mkpa ọ dị ịmụrụ anya na ịnọgide na-enwe uche ziri. Dị ka ihe atụ, ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-echetara anyị, sị: “Nọrọnụ na nche” (Matiu 24:42; 25:13; Mak 13:35, 37); “gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere” (Matiu 24:44); “nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya” (Mak 13:33); “dịrịnụ njikere” (Luk 12:40). Mgbe o kwusịrị na ụbọchị Jehova gaje ịbịakwasị ụwa a na mberede, Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi, kama ka anyị mụrụ anya ma nọgide na-enwe uche ziri ezi.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:6) N’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, Kraịst Jizọs ahụ e mere ka ọ dị ebube mesiri ike otú ọnụnọ ya ga-esi were ọnọdụ na mberede, na-asị: “Ana m abịa ọsọ ọsọ.” (Mkpughe 3:11; 22:7, 12, 20) Ọtụtụ n’ime ndị amụma Hibru kọwakwara oké ụbọchị Jehova ma dọọ aka ná ntị banyere ya. (Aịsaịa 2:12, 17; Jeremaịa 30:7; Joel 2:11; Zefanaịa 3:8) Ịgụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, kwa ụbọchị na ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ bụ ezigbo ihe enyemaka n’ịnọgide na-amụ anya n’ụzọ ime mmụọ.

11. N’ihi gịnị ka ọmụmụ Bible onwe onye ji dị oké mkpa maka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

11 Ee, lee ka iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’iji akwụkwọ ndị dabeere na Bible ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye na-eme ihe si bụrụ ihe ga-akpali anyị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ! (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, ka e wee rite uru n’ọmụmụ ihe onwe onye, a ghaghị ịdị na-eme ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ma chie anya. (Ndị Hibru 5:14–6:3) Anyị aghaghị ịdị na-erichi nri ime mmụọ siri ike anya. Iwepụta oge maka ya n’ụbọchị ndị a pụrụ ịbụ ihe ịma aka. (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’agbanyeghị nke ahụ, ịgụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nanị mgbe anyị nwere ohere ya ezughị. Inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide “na-adị ike n’okwukwe” ma nọgide na-amụ anya.—Taịtọs 1:13.

12. Olee otú nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ ukwu na ndị nta si enyere anyị aka ịlụso iro ụra ime mmụọ ọgụ?

12 Nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ ukwu na ndị nta na-enyere anyị aka ịlụso iro ụra ime mmụọ ọgụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site ná ntụziaka ndị anyị na-anata. Ná mgbakọ ndị a, á dịghị echetara anyị mgbe nile ịdị nso nke ụbọchị Jehova? Nzukọ Ndị Kraịst a na-enwe kwa izu na-enyekwa anyị ohere ‘ịkpali ibe anyị inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Mkpali dị otú ahụ, na-enyere mmadụ aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Ka a sịkwa ihe mere e ji nye anyị iwu ka anyị na-ezukọ mgbe nile ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

13. Olee otú ozi Ndị Kraịst si enyere anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

13 A na-enyekwara anyị aka ịnọgide na-amụrụ anya mgbe anyị ji obi anyị dum na-ekere òkè n’ozi Ndị Kraịst. Olee ụzọ ọzọ kasị mma isi buru n’uche ihe ịrịba ama nke oge ndị a na ihe ha pụtara karịa ịgwa ndị ọzọ banyere ha? Mgbe anyị na-ahụkwa ndị anyị na-amụrụ Bible ka ha na-enwe ọganihu ma malite ime ihe kwekọrọ n’ihe ha na-amụta, echiche ịdị ngwa anyị na-adịkwu nkọ. “Meenụ ka obi unu sie ike maka ịrụ ọrụ,” ka Pita onyeozi kwuru, “nọgidenụ na-enwe uche ziri nnọọ ezi.” (1 Pita 1:13) ‘Inwe ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị’ bụ ihe ngwọta dị mma maka iro ụra ime mmụọ.—1 Ndị Kọrint 15:58.

Jụ Ụzọ Ndụ Ndị Na-akpata Mbibi n’Ụzọ Ime Mmụọ

14. Dị ka a kọwara na Luk 21:34-36, ụzọ ndụ ndị dị aṅaa ka Jizọs dọrọ aka ná ntị megide?

14 N’oké amụma ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya, Jizọs nyekwara ịdọ aka ná ntị ọzọ. Ọ sịrị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) Jizọs kọwara n’ụzọ ziri ezi ụdị ndụ ndị mmadụ n’ozuzu ha ga na-ebi: iribiga ihe ókè, ịṅụbiga mmanya ókè, na ụzọ ndụ ndị na-eweta nchegbu.

15. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè?

15 Iribiga ihe ókè na ịṅụbiga mmanya ókè ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible, a ghaghịkwa izere ha. “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vaịn ókè; n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 23:20) Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ tupu ya adị ize ndụ. Ha pụrụ ime ka mmadụ na-ero ụra, meekwa ka ọ dị umengwụ ogologo oge tupu e mebiga ha ókè. ‘Mkpụrụ obi onye umengwụ na-achọsi ihe ike,’ ka ilu Bible na-ekwu, “ma ọ dịghị ihe o nwere.” (Ilu 13:4) Onye dị otú ahụ pụrụ ịchọ ime uche Chineke, ma ọchịchọ ya adịghị emezu n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe.

16. Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị nchegbu banyere ezinụlọ anyị na-anyịgbu?

16 Gịnị bụ nchegbu nke ndụ ndị Jizọs dọrọ aka ná ntị banyere ha? Ha gụnyere nchegbu onwe onye, ịkpata ihe ezinụlọ ga-eri, na ihe ndị dị ka ha. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwe ka ihe ndị a na-anyịgbu anyị! “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” ka Jizọs jụrụ. Ọ dụrụ ndị na-ege ya ntị ọdụ, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa.” Ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị na inwe obi ike na Jehova ga-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị ga-achịkwa nchegbu anyị ma nyere anyị aka ịmụrụ anya.—Matiu 6:25-34.

17. Olee otú nchụso ihe onwunwe pụrụ isi weta nchegbu?

17 Nchụso ihe onwunwe pụkwara ịkpata nchegbu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eme ka ndụ siere ha ike site n’ikowe akpa ha ebe aka ha na-agaghị eru. Ndị ọzọ abụrụwo ndị atụmatụ ịba ọgaranya ọkụ ọkụ na achụmnta ego ndị dị ize ndụ dọọrọ. Nye ndị ọzọ, ịgụ akwụkwọ iji nwee ego aghọworo ha ọnyà. N’ezie, ịgụ akwụkwọ ruo n’ókè ụfọdụ pụrụ ịba uru iji nweta ọrụ. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ka ụfọdụ ndị na-achụso oké agụmakwụkwọ bụ́ nke na-eri oge, ha emerụwo onwe ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Lee ọnọdụ dị ize ndụ ọ bụ ịnọ na ya ka ụbọchị Jehova na-eru nso! Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.”—1 Timoti 6:9.

18. Iji zere ịbụ ndị ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya dọtara, ikike dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịzụlite?

18 Ihe dị oké mkpa iji zere ịbụ onye a dọbara n’ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ ịzụlite ikike ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe ọjọọ mgbe a na-eme mkpebi. A na-azụlite ikike dị otú a site n’irichi ‘nri siri ike nke dịịrị ndị tozuru okè’ anya nakwa site ‘n’ịzụ ikike nghọta anyị site n’iji ya na-eme ihe.’ (Ndị Hibru 5:13, 14) Ijide “ihe ndị ka mkpa” n’aka mgbe anyị na-esetịpụ ihe ndị ka mkpa ná ndụ ga-echebekwa anyị pụọ n’ime nhọrọ ndị na-ezighị ezi.—Ndị Filipaị 1:10.

19. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị nwere oge dị nnọọ nta maka ihe ime mmụọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

19 Ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ ime ka anyị kpuo ìsì, na-eme ka anyị nwee ntakịrị oge ma ọ bụ gharadị inwe enwe maka ihe ime mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa onwe anyị iji zere ịbụ ndị ụzọ ndụ dị otú ahụ matara n’ọnyà? Ọ dị anyị mkpa iji ekpere tụlee otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ anyị dị mfe na ókè anyị pụrụ imeru ya. Eze Solomọn nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-ala ọrụ ubi bụ, ma ọ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:12) Ilekọta ihe onwunwe ndị na-adịghị mkpa hà na-ewekọrọ oge na ume anyị? Ka ihe onwunwe anyị na-ebukwu ibu, otú ahụ ka anyị na-enwekwu ihe ndị anyị ga-elekọta, ihe ndị anyị ga-akwụrụ ụgwọ ịnshọransị na ihe ndị anyị ga-echebe. Ọ̀ pụrụ ịbara anyị uru ime ka ndụ anyị dị mfe site n’ịhapụ ihe onwunwe ụfọdụ?

Gbalisie Ike Igosipụta na Ị Bụ Onye Dị Njikere

20, 21. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Pita onyeozi na-enye banyere ụbọchị Jehova? (b) Omume ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịnọgide na-eme ka anyị na-egosipụta na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova?

20 Oge gwụnahụrụ ụwa nke ụbọchị Noa, ọ ga-agwụnahụkwa usoro ihe dị ugbu a. Pita onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ma ihe ndị dị n’ígwé, n’ịbụ ndị dị oké ọkụ, ga-agbaze, a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị dị n’ime ya.” Ma eluigwe ihe atụ—ọchịchị ọjọọ—ma ụwa ihe atụ—ihe a kpọrọ mmadụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ—adịghị nke ga-alanarị iwe dị ọkụ nke Chineke. N’igosi otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị dị njikere maka ụbọchị ahụ, Pita kwupụtara, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!”—2 Pita 3:10-12.

21 Anyị ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya na anyị ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ so n’omume nke ịsọpụrụ Chineke. Ka anyị jiri nraranye sitere n’obi dum nye Chineke na-eme otú ahụ ka anyị ji ndidi na-echere oké ụbọchị Jehova. Ka anyị na-eme “ike [anyị] nile ka [Chineke] wee hụ [anyị] n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo.”—2 Pita 3:14.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị igosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova?

• Ọ bụrụ na nchụso nke ihe e ji ebi ndụ aghọwo nchegbu anyị bụ́ isi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

• Gịnị ga-enyere anyị aka izere iro ụra ime mmụọ?

• Ụzọ ndụ dị aṅaa na-emebi ihe ka anyị na-aghaghị izere, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Ndị ụbọchị Noa amaghị banyere ikpe na-aga ịbịakwasị ha—ị̀ maara?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ pụrụ ime ka ndụ gị dị mfe iji nwekwuo oge maka ihe ime mmụọ?