Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Chọrọ Ụzọ ahụ Dị Mkpagide

Ha Chọrọ Ụzọ ahụ Dị Mkpagide

Ha Chọrọ Ụzọ ahụ Dị Mkpagide

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 550 gara aga, ìgwè nta dị iche iche kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst bi na Prague, Chelčice, Vilémov, Klatovy na n’obodo ukwu ndị ọzọ dị n’ebe bụzi Czech Republic hapụrụ ebe obibi ha. Ha gara biri n’obodo nta Kunwald, na ndagwurugwu dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Bohemia, bụ́ ebe ha rụgasịrị obere ụlọ, kọọ ugbo, gụọ Bible ha ma kpọọ onwe ha ndị òtù okpukpe Unity of Brethren (Òtù Ụmụnna Dị n’Otu), ma ọ bụ Unitas Fratrum n’asụsụ Latin.

Ndị ahụ gara biri n’ebe ahụ gụnyere ndị si ná nzụlite dịgasị iche iche. Ha bụ ndị nkịtị, ndị a ma ama, ụmụ akwụkwọ mahadum, ndị ọgaranya na ndị ogbenye, ndị ikom na ndị inyom, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ na ụmụ mgbei, bụ́ ndị nwere otu ọchịchọ. “Anyị na-ekpegara Chineke n’Onwe Ya ekpere,” ka ha dere, “ma na-arịọ Ya ka o kpugheere anyị uche Ya n’ihe nile. Anyị chọrọ ije ije n’ụzọ Ya.” N’ezie, òtù okpukpe Unity of Brethren a, ma ọ bụ Czech Brethren, dị ka e mesịrị na-akpọ òtù ndị a kwere ekwe, chọrọ ‘ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduga ná ndụ.’ (Matiu 7:13, 14) Eziokwu Bible ndị dị aṅaa ka nnyocha ha mere kpughere? Olee otú nkwenkwe ha si dị iche ná ndị a nakweere n’oge ahụ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta n’aka ha?

Ha Emeghị Ihe Ike—Ha Ajụghị Okwukwe Ha

Ọtụtụ òtù okpukpe tụnyere ụtụ ná nhiwe nke okpukpe Unity of Brethren n’etiti narị afọ nke 15. Otu n’ime ha bụ ndị òtù okpukpe Waldo, òtù malitere laa azụ na narị afọ nke 12. Na mbụ, ndị òtù okpukpe Waldo si

n’okpukpe Roman Katọlik, bụ́ okpukpe mba ndị dị n’Ebe Etiti Europe, kewapụ onwe ha. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ha laghachitụrụ n’ozizi Katọlik. Òtù ọzọ nwere mmetụta n’ahụ́ ha bụ òtù okpukpe Hus, bụ́ ụmụazụ Jan Hus. Ọ bụ okpukpe nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Czechoslovakia na-ekpe, ma ha adịghị n’otu ma ọlị. Otu akụkụ lụrụ ọgụ banyere okwu ndị metụtara ọha na eze, ebe akụkụ nke ọzọ ji okpukpe mee ihe iji kwalite ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Òtù ndị kweere na narị afọ iri nakwa ndị ọkà mmụta Bible si n’ógbè ahụ na ndị si mba ndị ọzọ nwekwara mmetụta n’ahụ́ òtù okpukpe Brethren.

Peter Chelčický (ihe dị ka 1390-ihe dị ka 1460), onye Czechoslovakia bụ́ ọkà mmụta Bible na onye na-eme mgbanwe, maara ozizi òtù okpukpe Waldo na nke Hus nke ọma. Ọ jụrụ ndị òtù okpukpe Hus n’ihi ihe ike ndị òtù ha malitere ime, ọ jụkwara ndị òtù okpukpe Waldo n’ihi na ha eguzosighị ike n’okwukwe ha. Ọ katọrọ agha dị ka ihe na-ekwesịghịrị Ndị Kraịst. O chere na “iwu nke Kraịst ahụ” kwesịrị ịchịkwa Onye Kraịst n’agbanyeghị ihe nke ahụ ga-arụpụtara ya. (Ndị Galeshia 6:2; Matiu 22:37-39) Na 1440, Chelčický dere ozizi ya n’akwụkwọ bụ́ Net of the Faith.

Ozizi Chelčický nwere nnọọ mmetụta n’ahụ́ Gregory onye Prague, bụ́ onye na-akatabeghị ahụ́ nke ya na ọkà mmụta Chelčický dịkọrọ ndụ, nke na ọ hapụrụ òtù okpukpe Hus. Na 1458, Gregory mere ka ìgwè nta dị iche iche nke ndị bụbu ndị òtù okpukpe Hus kweta ịhapụ ebe obibi ha n’akụkụ dị iche iche nke Czechia. Ha so ná ndị ahụ sooro ya gaa n’obodo nta Kunwald, bụ́ ebe ha hiwere okpukpe ọhụrụ. Ka e mesịrị, ìgwè dị iche iche nke ndị òtù okpukpe Waldo si Czechoslovakia na Germany sonyeere ha n’ebe ahụ.

Ihe Na-eme Ka A Mata Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga

Site na 1464 ruo 1467, òtù a malitere ọhụrụ nke na-amụbakwa amụba nwere ọtụtụ nzukọ ndị isi n’ógbè Kunwald ma nakwere ọtụtụ mkpebi ndị ga-achịkwa òtù okpukpe ọhụrụ ha. E ji nlezianya dekọọ mkpebi nile ahụ n’ọtụtụ akwụkwọ, bụ́ ndị a maara ugbu a dị ka Acta Unitatis Fratrum (Ọrụ Ndị Òtù Unity of Brethren), bụ́ ndị ka dị taa. Akwụkwọ Acta ndị a bụ ihe ndị na-eme ka a mata ihe ndị mere n’oge gara aga, na-egosi n’ụzọ doro anya ihe ndị òtù okpukpe Brethren ahụ kweere. Akwụkwọ ozi, okwu ndị e dere ede, na ọbụna nkọwa zuru ezu nke esemokwu ndị ha nwere dị n’akwụkwọ ndị ahụ.

Banyere nkwenkwe ndị òtù okpukpe Brethren, akwụkwọ Acta ndị ahụ na-ekwu, sị: “Anyị kpebisiri ike na nhazi nke òtù anyị ga-adabere nanị n’Ịgụ Ihe na n’ihe nlereanya nke Onyenwe anyị na nke ndịozi dị nsọ n’ịnọrọ duu, ịdị umeala n’obi na ntachi obi, ịhụ ndị iro anyị n’anya, imere na ichere ha ihe ọma, na ikpere ha ekpere.” Ihe ndị ahụ e dere gosikwara na ndị òtù okpukpe Brethren mere nkwusa na mbụ. Ha na-aga abụọ abụọ, ndị inyom nwekwara ihe ịga nke ọma n’ozi ala ọzọ n’ógbè ebe ha bi. Ndị òtù okpukpe Brethren anaraghị ọkwá ọchịchị, ha aṅụghị iyi, ha etinyeghị aka n’ọrụ agha, ha ebughịkwa ngwá agha.

Site n’Ịdị n’Otu Gaa n’Adịghị n’Otu

Otú ọ dị, ka ọtụtụ iri afọ gasịrị, òtù okpukpe Unity of Brethren emezughị ihe aha ya pụtara. Esemokwu banyere otú e kwesịrị isi na-etinye nkwenkwe ha n’ọrụ dugara ná nkewa. Na 1494, òtù okpukpe Brethren kewara gaa n’òtù abụọ—òtù nke Ukwu na nke Nta. Ebe Òtù nke Ukwu nọ na-ebelata ike nke nkwenkwe mbụ ya, Òtù nke Nta nọ na-ekwusa na ndị òtù okpukpe Brethren kwesịrị ịkwụsi ike n’ịjụ ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụwa.—Lee igbe bụ́ “Gịnị Banyere Òtù nke Ukwu Ahụ?”

Dị ka ihe atụ, otu onye Òtù nke Nta dere, sị: “Ndị na-aga n’ụzọ abụọ ejighị n’aka na ha na Chineke ga-anọ, ebe ọ bụ nanị mgbe ụfọdụ na n’obere ihe ka ha na-adị njikere inyefe Ya onwe ha na ido onwe ha n’okpuru Ya, ma na-eme ihe masịrị ha n’oké ihe. . . . Ndị nwere uche na-eguzosi ike n’ihe na ezi akọ na uche—buru obe ha na-eso Onyenwe anyị bụ́ Kraịst n’ụzọ ahụ dị mkpagide kwa ụbọchị—ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịbụ ndị a gụnyere n’etiti ha.”

Ndị so n’Òtù nke Nta na-ele mmụọ nsọ anya dị ka ike Chineke nke nọ n’ọrụ, “mkpịsị aka” ya. Nghọta ha nwere banyere ihe mgbapụta Jizọs bụ na nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs ji ndụ mmadụ ya kwụọ ụgwọ ihe onye mmehie ahụ bụ́ Adam tụfuru. Ha adịghị efe Meri, bụ́ nne Jizọs. Ha weghachiri nkwenkwe nke ndị kwere ekwe nile ịbụ ndị nchụàjà n’anọghị ná nkwa nke ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ha gbara ume ka ndị òtù nile nke ọgbakọ na-eme nkwusa ihu ọha, ha chụpụkwara ndị mmehie na-enweghị nchegharị. Ha nọpụrụ nnọọ iche n’ihe metụtara agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Lee igbe bụ́ “Ihe Ndị Brethren nke Òtù nke Nta Kweere.”) Ebe ọ bụ na Òtù nke Nta gbasochiri mkpebi ahụ dị n’akwụkwọ Acta anya, o lere onwe ya anya dị ka ezi ihe nnọchianya nke òtù okpukpe Unity of Brethren mbụ ahụ.

Ha Nwere Nkwuwa Okwu, A Kpagbukwara Ha

Òtù nke Nta ji nkwuwa okwu katọọ okpukpe ndị ọzọ, gụnyere Òtù nke Ukwu. “Unu na-akụzi ka a na-eme ụmụntakịrị na-enweghị okwukwe nke ha baptizim,” ka ha dere banyere okpukpe ndị dị otú ahụ, “n’ụzọ dịkwa otú a unu na-agbaso ozizi nke bishọp a na-akpọ Dionysius, onye mesiri baptizim ụmụ ọhụrụ ike n’ihi nrụgide o nwetara site n’aka ụfọdụ ndị na-amaghị ihe . . . Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nkụzi na ndị ọkà mmụta okpukpe nile, Luther, Melanchthon, Bucerus, Korvín, Jiles̆, Bullinger, . . . Òtù nke Ukwu, kwenyechara na ya, ha nile gbakọtara aka n’ime otú ahụ.”

Ọ bụghị ihe ijuanya na a kpagburu Òtù nke Nta ahụ. Na 1524, a pịara otu n’ime ndị ndú ya, bụ́ Jan Kalenec ihe ma ree ya ọkụ. Ka e mesịrị, a gbara mmadụ atọ so n’Òtù nke Nta ọkụ n’elu osisi. O yiri ka Òtù nke Nta ọ̀ pụrụ n’anya n’ihe dị ka afọ 1550 mgbe onye ndú ikpeazụ ha nwụsịrị.

N’agbanyeghị nke ahụ, a maara ndị kwere ekwe nke Òtù nke Nta ahụ nke ọma n’okpukpe ndị e nwere n’oge Europe na-emepechabeghị anya. N’ezie, ebe ọ bụ na ‘ezi ihe ọmụma’ ababeghị ụba n’oge Òtù nke Nta ahụ, ha ewepụlighị ọchịchịrị ime mmụọ ahụ dịruworo ogologo oge. (Daniel 12:4) Ka o sina dị, ọchịchọ siri ike ha nwere ịchọ ụzọ ahụ dị mkpagide na ịgbaso ya n’agbanyeghị mmegide bụ ihe Ndị Kraịst taa ga-arịba ama.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

E kwuru na ọ bụ ndị òtù okpukpe Unity of Brethren biri 50 n’ime akwụkwọ 60 ndị obodo Bohemia (Czechoslovakia) bipụtara site na 1500 ruo 1510

[Igbe dị na peeji nke 11]

Gịnị Banyere Òtù nke Ukwu Ahụ?

Gịnị meziri Òtù nke Ukwu ahụ? Mgbe Òtù nke Nta pụsịrị n’anya, Òtù nke Ukwu nọgidere bụrụ òtù okpukpe, bụ́ nke a ka maara dị ka òtù okpukpe Unity of Brethren. Ka oge na-aga, òtù a mezigharịrị ozizi mbụ ya. Ná ngwụsị narị afọ nke 16, òtù okpukpe Unity of Brethren na ndị Czech Utraquist, * ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha sitere n’okpukpe Lutheran, jikọrọ aka. Otú ọ dị, òtù okpukpe Brethren nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ịsụgharị na ibipụta Bible tinyekwara akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ. N’ụzọ na-akpali mmasị, peeji ndị bu aha akwụkwọ ndị mbụ ahụ ha bipụtara nwere Tetragrammaton ahụ, dị ka e si mara mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ na-anọchi anya aha aka Chineke.

Na 1620, a manyere alaeze Czechoslovakia ịlaghachi n’okpuru okpukpe Roman Katọlik. N’ihi ya, ọtụtụ ndị òtù okpukpe Brethren nke Òtù nke Ukwu ahụ hapụrụ mba ahụ ma gaa n’ihu n’ọrụ ha ná mba ndị ọzọ. N’ebe ndị ahụ, e mesịrị mara òtù ahụ dị ka Chọọchị Moravia (Moravia so n’ala ndị dị na Czechoslovakia), bụ́ nke ka dị taa.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 O sitere n’okwu Latin bụ́ utraque, nke pụtara “nke ọ bụla n’ime abụọ.” N’adịghị ka ndị ụkọchukwu Roman Katọlik, bụ́ ndị na-adịghị enye ndị nkịtị mmanya n’oge ha na-eri Oriri Nsọ, ndị Utraquist (òtù dị iche iche nke òtù okpukpe Hus) na-enye ha achịcha na mmanya.

[Igbe dị na peeji nke 12]

Ihe Ndị Brethren nke Òtù nke Nta Kweere

Nhota ndị na-esonụ sitere n’akwụkwọ Acta Unitatis Fratrum nke narị afọ nke 15 ruo na nke 16 na-egosi ụfọdụ nkwenkwe nke Òtù nke Nta ahụ. N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ Òtù nke Ukwu ka ndị isi Òtù nke Nta bu n’uche dee ihe ndị ahụ.

Atọ n’Ime Otu: “Ọ bụrụ na ị tụlee Bible dum, ị gaghị ahụ na e kewara Chineke gaa n’ihe dị ka Atọ n’Ime Otu, ndị atọ nwechara aha, dị ka ndị mmadụ chepụtara.”

Mmụọ nsọ: “Mmụọ nsọ bụ mkpịsị aka Chineke na onyinye nke Chineke, ma ọ bụ ihe nkasi obi, ma ọ bụ Ike Chineke, bụ́ nke Nna ahụ na-enye ndị kwere ekwe n’ihi Kraịst. Anyị ahụghị n’ime Akwụkwọ Nsọ na e kwesịrị ịkpọ mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ Onye; Ozizi ndịozi egosighịkwa nke ahụ.”

Òtù ndị ụkọchukwu: “N’ụzọ na-ezighị ezi, ha nyere gị aha ahụ bụ́ “ụkọchukwu” (onye nchụàjà); ọ bụrụ na i kpupụ okpu ụkọchukwu gị ma wepụ mmanụ nsọ gị, ọ dịghị ihe i ji karịa onye dịkarịsịrị ala n’ime ndị nkịtị. Senti Pita gbara Ndị Kraịst nile ume ịbụ ndị ụkọchukwu, na-asị: unu bụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ na-achụ àjà ime mmụọ. (1 Pita 2)”

Baptizim: “Onyenwe anyị Kraịst gwara ndịozi ya, sị: Gaanụ n’ụwa nile, kwusaara ihe nile e kere eke Oziọma ahụ, kwusaara ndị nile ga-ekwere. (Mak, isi nke 16) Ọ bụkwa nanị mgbe e mezuru okwu ndị a: meekwa ha baptizim, ka a ga-azọpụta ha. Unu na-akụzikwa ka a na-eme ụmụntakịrị baptizim bụ́ ndị na-enweghị okwukwe nke ha.”

Nnọpụiche: “Ihe ụmụnna unu ndị mbụ lere anya dị ka ihe ọjọọ na ihe na-adịghị ọcha, isonyere ndị agha na igbu mmadụ ma ọ bụ iji ihe agha na-agagharị n’okporo ụzọ, ihe a nile ka unu na-ele anya dị ka ihe dị mma . . . Ya mere anyị na-eche na unu, tinyere ndị nkụzi ndị ọzọ aghọtachaghị okwu amụma ahụ kwuru, sị: Ya mere ọ gbajiri ike nke ụta, ọta na mma agha na agha. (Abụ Ọma nke 75) Ọzọkwa: Ha agaghị eme ihe ọjọọ ma ọ bụ bibie n’ugwu nsọ m nile, n’ihi na ihe ọmụma Chineke ga-ekpuchi ụwa nke Onyenwe anyị, nakwa ihe ndị ọzọ. (Aịsaịa, isi nke 11).”

Ime nkwusa: “Anyị maara nke ọma na na mbụ ndị inyom mere ka ọtụtụ mmadụ chegharịa karịa ka ndị ụkọchukwu nile tinyere bishọp mere. Ugbu a kwa, ndị ụkọchukwu na-anọ n’ụlọ ha na n’ụlọ chọọchị nyere ha. Lee ka o si bụrụ ihie ụzọ! Gaanụ n’ụwa dum. Na-ekwusaranụ . . . ihe nile e kere eke ozi ọma.”

[Map dị na peeji 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GERMANY

POLAND

CZECH REPUBLIC

BOHEMIA

Osimiri Elbe

PRAGUE

Osimiri Vltava

Klatovy

Chelčice

Kunwald

Vilémov

MORAVIA

Osimiri Danube

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

N’aka ekpe: Peter Chelčický; n’okpuru: peeji sitere n’akwụkwọ bụ́ “Net of the Faith”

[Foto dị na peeji nke 11]

Gregory nke Prague

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 13]

Ihe osise nile: S laskavým svolením knihovny Národního muzea v Praze, C̆esko