Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova Amatacha

A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova Amatacha

A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova Amatacha

“Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a ga-enye otuto dị ukwuu, ịdị ukwuu ya bụ nke a na-apụghị ịmatacha amata.”—ABỤ ỌMA 145:3, NW.

1, 2. Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Devid bụ, oleekwa otú o si lee onwe ya anya n’iji onwe ya atụnyere Chineke?

ONYE dere Abụ Ọma nke 145 bụ otu n’ime ndị a maara nke ọma n’akụkọ ihe mere eme. Mgbe ọ bụ nwa okoro, o chere otu dike ji ngwá agha ihu ma gbuo ya. Dịkwa ka eze bụ́ onye agha, ọbụ abụ a meriri ọtụtụ ndị iro ya. Aha ya bụ Devid, ọ bụkwa eze nke abụọ nke Izrel oge ochie. Aha Devid nọgidere na-ede ude mgbe ọ nwụsịrị, nke na ọbụna taa ọtụtụ nde mmadụ maara banyere ya.

2 N’agbanyeghị ihe ndị Devid rụzuru, o bulighị onwe ya elu. N’izo aka n’ebe Jehova nọ, ọ bụrụ, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke i doziworo; Gịnị ka mmadụ bụ, na ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na ị na-eleta ya?” (Abụ Ọma 8:3, 4) Kama ịdị na-eche na ya onwe ya dị ukwuu, Devid kwuru na ọ bụ Jehova napụtara ya n’aka ndị iro ya nile ma kwuo banyere Chineke, sị: “I nyewokwa m ọta nzọpụta Gị: umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (2 Samuel 22:1, 2, 36) Jehova na-egosipụta umeala n’obi n’imere ndị mmehie ebere, Devid nwekwara ekele maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke.

‘M Ga-eme Ka Chineke Bụ́ Eze Dị Elu’

3. (a) Olee otú Devid si lee ịchịisi Izrel anya? (b) Ruo ókè ha aṅaa ka Devid nweruru ọchịchọ ito Jehova?

3 Ọ bụ ezie na Devid bụ eze Chineke họpụtara, o lere Jehova anya dị ka onye bụ́ n’ezie Eze nke Izrel. Devid kwuru, sị: “Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onyeisi.” (1 Ihe E Mere 29:11) Leekwa otú Devid si kwanyere Chineke ùgwù dị ka Onye Ọchịchị! “M ga-eme Gị ka Ị dị elu, Chineke m, bụ́ Eze,” ka ọ bụrụ, “m ga-agọzikwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi. Kwa ụbọchị ka m ga-agọzi Gị; m ga-etokwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 145:1, 2) Ọ bụ ọchịchọ Devid ito Jehova Chineke kwa ụbọchị na ruo mgbe nile ebighị ebi.

4. Abụ Ọma nke 145 na-agba ụgha dị aṅaa n’anwụ?

4 Abụ Ọma nke 145 bụ azịza doro anya nye nzọrọ Setan bụ́ na Chineke bụ onye ọchịchị na-achọ ọdịmma onwe ya nanị nke na-adịghị achọ ka ndị o kere nwere onwe ha. (Jenesis 3:1-5) Abụ ọma a gbakwara n’anwụ ụgha Setan bụ́ na ndị na-erubere Chineke isi na-eme otú ahụ nanị n’ihi ihe ndị ha pụrụ inweta na ya, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Dị ka Devid, ezi Ndị Kraịst taa na-enye azịza maka ebubo ụgha Ekwensu. Ha ji olileanya ha nke ịdị ndụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ kpọrọ oké ihe n’ihi na ha chọrọ ito Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi. Ka ọ dịgodị, ọtụtụ nde mmadụ amalitewo ime otú ahụ site n’igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs na site n’iji nrubeisi na-ejere Jehova ozi n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ dị ka ndị na-efe ya ofufe raara onwe ha nye e mere baptizim.—Ndị Rom 5:8; 1 Jọn 5:3.

5, 6. Ohere ndị dị aṅaa ka e nwere iji na-agọzi ma na-eto Jehova?

5 Chee echiche banyere ọtụtụ ohere anyị nwere ịgọzi na ito Jehova dị ka ndị ohu ya. Anyị pụrụ ime nke ahụ n’ekpere mgbe ihe anyị gụtara n’Okwu ya, bụ́ Bible, metụrụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu. A pụrụ igosipụta otuto sitere n’obi na ekele mgbe ụzọ Chineke si emeso ndị ya ihe kpaliri anyị ma ọ bụ mgbe ihe ụfọdụ dị ebube o kere mere ka anyị nwee obi ụtọ. Anyị na-agọzikwa Jehova Chineke mgbe anyị na-eso ndị kwere ekwe ibe anyị ekwurịta banyere nzube ya ná nzukọ dị iche iche nke Ndị Kraịst ma ọ bụ mgbe anyị na mmadụ na-akparịta ụka. N’ezie, “ọrụ ọma” nile a rụrụ n’ihi Alaeze Chineke na-ewetara Jehova otuto.—Matiu 5:16.

6 Ihe atụ nke ọrụ ọma ndị dị otú ahụ e nwere n’oge ndị na-adịbeghị anya gụnyere iwu ọtụtụ ebe ndị Jehova na-anọ efe ofufe n’ala ndị ịda ogbenye kpara aka ọjọọ. A rụzuwo akụkụ dị ukwuu nke ọrụ a site n’enyemaka ego nke ndị kwere ekwe ibe ha nọ ná mba ndị ọzọ. Ụfọdụ Ndị Kraịst enyewo aka site n’iwepụta onwe ha n’afọ ofufo ịga ebe ndị dị otú ahụ iji kere òkè n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke kasịkwa mkpa n’ọrụ ọma nile bụ ito Jehova site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya. (Matiu 24:14) Dị ka amaokwu ndị ikpeazụ n’Abụ Ọma nke 145 na-egosi, Devid nwere ekele maka ọbụbụeze Chineke ma bulie ịchịisi Ya elu. (Abụ Ọma 145:11, 12) Ì nwere ekele yiri nke ahụ maka ụzọ ịhụnanya Chineke si achị? Ị̀ na-agwakwa ndị ọzọ banyere Alaeze ya mgbe nile?

Ihe Atụ nke Ịdị Ukwuu Chineke

7. Kwuo otu ihe bụ́ isi mere a ga-eji na-eto Jehova.

7 Abụ Ọma 145:3 (NW) kwuru otu ihe bụ́ isi mere a ga-eji na-eto Jehova. Devid bụrụ, sị: “Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a ga-enye otuto dị ukwuu, ịdị ukwuu ya bụ nke a na-apụghị ịmatacha amata.” Ịdị ukwuu Jehova enweghị nsọtụ. Ụmụ mmadụ apụghị ịmatacha, ịghọtacha, ma ọ bụ ịtụ ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ zuru ezu. Ma anyị ga-erite uru n’ezie site n’ịtụlezi ihe atụ nke ịdị ukwuu Jehova a na-apụghị ịmatacha amatacha.

8. Gịnị ka eluigwe na ala na-ekpughe banyere ịdị ukwuu na ike Jehova?

8 Gbalịa icheta otu oge ị na-anọghị n’obodo ukwu nke ọkụ na-egbukepụ egbukepụ na-enwu na ya, i wee lelie anya elu n’abalị na mbara igwe nke mmiri na-erughị na ya. Ọ́ tụghị gị n’anya ịhụ ìgwè kpakpando na mbara igwe ahụ gbara ọchịchịrị? Ọ̀ bụ na a kpalighị gị ito Jehova maka ịdị ukwuu ya n’ike ihe ndị a nile dị na mbara igwe? Otú ọ dị, ihe ị hụrụ bụ ọnụ ọgụgụ dị nta nke kpakpando dị n’ụyọkọ kpakpando nke ụwa dị n’ime ya. Tụkwasị na nke ahụ, e mere atụmatụ na e nwere ihe karịrị otu narị ijeri ụyọkọ kpakpando, ọ bụ nanị atọ n’ime ha ka a pụrụ ịhụ n’ejighị teliskop. N’ezie, kpakpando na ụyọkọ kpakpando a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị mejupụtara eluigwe na ala nke buru oké ibu bụ ihe akaebe nke ike ike ihe nke Jehova na ịdị ukwuu ya a na-apụghị ịmatacha amatacha.—Aịsaịa 40:26.

9, 10. (a) Akụkụ dị aṅaa nke ịdị ukwuu Jehova ka e gosipụtara n’ihe banyere Jizọs Kraịst? (b) Olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs kwesịrị isi metụta okwukwe anyị?

9 Tụlee akụkụ ndị ọzọ nke ịdị ukwuu Jehova—ndị metụtara Jizọs Kraịst. E gosipụtara ịdị ukwuu Chineke site na ya ike na iji Ọkpara ya mee ihe ruo ọtụtụ ijeri afọ dị ka “onye ọkà” Ya. (Ilu 8:22-31) E mere ka ịdị ukwuu nke ịhụnanya Jehova pụta ìhè mgbe o nyere Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya dị ka àjà mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 20:28; Jọn 3:16; 1 Jọn 2:1, 2) Ahụ́ mmụọ dị ebube na-adịghị anwụ anwụ nke Jehova meere Jizọs mgbe o si n’ọnwụ bilie karịkwara nnọọ ikike nghọta mmadụ.—1 Pita 3:18.

10 Mbilite n’ọnwụ Jizọs metụtara ọtụtụ akụkụ na-adọrọ mmasị nke ịdị ukwuu a na-apụghị ịmatacha amatacha nke Jehova. Obi abụọ adịghị ya na Chineke mere ka Jizọs chetaghachi ọrụ ndị dị n’ike ma ihe ndị a na-adịghị ahụ anya ma ndị a na-ahụ anya. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Ha gụnyere ndị mmụọ ndị ọzọ e kere eke, eluigwe na ala, na ụdị nile nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa anyị. Tụkwasị n’ime ka Ọkpara ya chetaghachi ihe ọmụma zuru ezu o nwere banyere ihe ndị dị ndụ n’eluigwe na n’ụwa bụ́ ndị Ọkpara ahụ hụrụ tupu ọ ghọọ mmadụ, Jehova mekwara ka o chetaghachi ahụmahụ ndị o nwere dị ka mmadụ zuru okè. Ee, ịdị ukwuu Jehova a na-apụghị ịmatacha amatacha pụtara ìhè ná mbilite n’ọnwụ Jizọs. Ọzọkwa, oké ọrụ ahụ na-eme ka e jide n’aka na mbilite n’ọnwụ nke ndị ọzọ ga-ekwe omume. O kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike na Chineke pụrụ iweghachi ndụ nke ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ n’ikike ncheta ya zuru okè.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 17:31.

Oké Ọrụ na Ịdị Ike

11. Oké ọrụ dị aṅaa nke Jehova malitere na Pentikọst 33 O.A.?

11 Kemgbe Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, Jehova arụwo ọtụtụ oké ọrụ ndị ọzọ dị ebube. (Abụ Ọma 40:5) Na Pentikọst 33 O.A., Jehova mere ka e nwee mba ọhụrụ, “Izrel nke Chineke,” bụ́ nke ndị na-eso ụzọ Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtara. (Ndị Galeshia 6:16) N’ụzọ dị ukwuu, mba ime mmụọ ọhụrụ a gbasara ruo ebe nile n’ụwa a maara n’oge ahụ. N’agbanyeghị ndapụ n’ezi ofufe nke dugara ná mpupụta nke Krisendọm mgbe ọnwụ ndịozi Jizọs gasịrị, Jehova nọgidere na-arụ ọrụ ndị dị ebube iji hụ na nzube ya mezuru.

12. Gịnị ka eziokwu bụ́ na e nwere Bible n’asụsụ nile bụ́ isi a na-asụ n’ụwa na-agba akaebe ya?

12 Dị ka ihe atụ, e chebere Bible dum ma mesịa sụgharịa ya gaa n’asụsụ nile bụ́ isi a na-asụ n’ụwa taa. Nsụgharị Bible weere ọnọdụ karịsịa n’okpuru ọnọdụ ndị siri ike na n’iyi egwu nke ịnwụ site n’aka ndị ozi Setan. N’ezie, ọ gaaraghị ekwe omume ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ 2,000 ma ọ bụrụ na nke a abụghị uche nke Chineke ukwu ahụ a na-apụghị ịmatacha ịdị ukwuu ya amatacha, bụ́ Jehova!

13. Kemgbe 1914, olee otú e siworo gosipụta ịdị ukwuu Jehova n’ihe metụtara nzube Alaeze ya?

13 E gosipụtawo ịdị ukwuu Jehova n’ihe metụtara nzube Alaeze ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1914, o mere ka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze eluigwe. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs mere ihe megide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. E si n’eluigwe chụpụ ha ma chụda ha n’ụwa, bụ́ ebe ha nọzi na-eche mgbe a ga-atụba ha n’abis. (Mkpughe 12:9-12; 20:1-3) Kemgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ enwetawo mkpagbu ka ukwuu. Otú ọ dị, Jehova akwagidewo ha n’oge a nke ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Kraịst.—Matiu 24:3; Mkpughe 12:17.

14. Ọrụ dị ebube dị aṅaa ka Jehova rụrụ na 1919, gịnịkwa ka nke a rụzuru?

14 N’afọ 1919, Jehova rụrụ ọrụ ọzọ dị ebube nke gosipụtara ịdị ukwuu ya. A tụtere ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ, bụ́ ndị e meworo ka ha nọrọ n’ọnọdụ arụghị ọrụ n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 11:3-11) N’afọ ndị gafeworonụ kemgbe ahụ, ndị e tere mmanụ ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma nke Alaeze eluigwe e guzobere eguzobe. A chịkọtawo ndị ọzọ e tere mmanụ iji mezuo ọnụ ọgụgụ nke 144,000. (Mkpughe 14:1-3) Sitekwa n’aka ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ, Jehova atọwo ntọala “ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume. (Mkpughe 21:1) Ma olee ihe ga-eme “ụwa ọhụrụ” ahụ mgbe ndị nile e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi gasịrị eluigwe?

15. Olee ọrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọworo na-eduzi, gịnịkwa si na ya pụta?

15 Na 1935, mbipụta magazin a nke August 1 na August 15 nwere isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-ekwu banyere “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ nke a kpọtụrụ aha ná Mkpughe isi 7. Ndị Kraịst e tere mmanụ jiri ịnụ ọkụ n’obi malite ịchọ na ịkpọbata n’etiti ha ndị a ha na ha na-efekọ ofufe site ná mba, agbụrụ, ndị na asụsụ nile. “Oké ìgwè mmadụ” a ga-alanarị “oké mkpagbu” na-abịanụ, na-enwe atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs dị ka ndị ga-anọgide na-abụ ndị òtù nke “ụwa ọhụrụ” ahụ. (Mkpughe 7:9-14) N’ihi ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ, bụ́ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eduzi, ugbu a ihe karịrị nde mmadụ isii nwere olileanya nke ịdị ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala. Ònye ka e kwesịrị ito n’ihi mmụba dị otú ahụ n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka Setan na ụwa ya rụrụ arụ? (1 Jọn 5:19) Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịrụzu ihe a nile, na-eji mmụọ nsọ ya eme ihe.—Aịsaịa 60:22; Zekaraịa 4:6.

Ịma Mma nke Nsọpụrụ na Ebube Jehova

16. N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-apụghị iji jiri anya nkịtị hụ ‘ịma mma dị ebube nke nsọpụrụ Jehova’?

16 N’agbanyeghị ihe ha bụ, ọ dịghị mgbe a ga-echefu “oké ọrụ” na “ịdị ike” Jehova. Devid dere, sị: “Otu ọgbọ ga-aja ọrụ Gị nile ná ntị ọgbọ ọzọ, wee gosi ịdị ike Gị nile. N’ịma mma nke nsọpụrụ na nke ebube Gị, na n’oké ọrụ Gị nile, ka m ga-atụgharị uche. Ọ bụkwa ike nke ọrụ Gị nile dị egwu ka ha ga-ekwupụta; ọ bụkwa ịdị ukwuu Gị ka m ga-akọ akụkọ ya.” (Abụ Ọma 145:4-6) Ma ihe ha aṅaa ka Devid pụrụ ịmata banyere ịma mma nke nsọpụrụ Jehova, ebe ọ bụ na “Chineke bụ Mmụọ,” n’ihi ya kwa bụrụ onye anya mmadụ na-apụghị ịhụ?—Jọn 1:18; 4:24.

17, 18. Olee otú Devid pụrụ isi mụbaa ekele o nwere maka ‘ịma mma dị ebube nke nsọpụrụ Jehova’?

17 Ọ bụ ezie na ọ pụghị ịhụ Chineke, e nwere ụzọ ndị Devid pụrụ isi mụbaa ekele o nwere maka ebube Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịgụ ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ banyere ịdị ike Chineke, dị ka mgbe o ji iju mmiri zuru ụwa ọnụ bibie otu ajọ ụwa. O yikarịrị ka Devid ọ̀ nụrụ otú e si weda chi ụgha dị iche iche nke Ijipt ala ka Chineke napụtara ụmụ Izrel site n’agbụ Ijipt. Ihe omume ndị dị otú ahụ na-agba akaebe banyere ebube na ịdị ukwuu Jehova.

18 Obi abụọ adịghị ya na ekele Devid nwere maka ebube Chineke mụbara ọ bụghị nanị site n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ kamakwa site n’ịtụgharị uche na ha. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ tụgharịrị uche n’ihe ndị mere mgbe Jehova nyere Izrel Iwu ahụ. E nwere égbè eluigwe, àmụ̀mà, igwe ojii dị arọ, na olu opì ike na-adasi nnọọ ike. Ugwu Saịnaị mara jijiji ma kwụọ anwụrụ ọkụ. Ka ha zukọrọ ná mkpọda ugwu ahụ, ọbụna ụmụ Izrel nụrụ “okwu iri ahụ” site n’etiti ọkụ ahụ na igwe ojii ahụ ka Jehova na-agwa ha okwu site n’aka mmụọ ozi na-anọchite anya ya. (Deuterọnọmi 4:32-36; 5:22-24; 10:4; Ọpụpụ 19:16-20; Ọrụ 7:38, 53) Lee ngosipụta dị ebube nke ịdị ukwuu Jehova ọ bụ! Ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya bụ́ ndị na-atụgharị uche n’ihe ndekọ ndị a aghaghị ịbụ ndị ‘ịma mma dị ebube nke nsọpụrụ Jehova’ kpaliri. Otú ọ dị, taa, anyị nwere Bible dum, bụ́ nke nwere ọhụụ dịgasị iche iche na-eme ka ịdị ukwuu Jehova na-emetụ anyị n’ahụ́.—Ezikiel 1:26-28; Daniel 7:9, 10; Mkpughe, isi 4.

19. Gịnị ga-eme ka ekele anyị nwere maka ebube Jehova na-amụba amụba?

19 Ụzọ ọzọ Devid pụrụ isi ghọtakwuo ebube Chineke bụ site n’ịmụ iwu ndị ahụ Chineke nyere ndị Izrel. (Deuterọnọmi 17:18-20; Abụ Ọma 19:7-11) Irube isi n’iwu Jehova mere ka mba Izrel nwee ùgwù ma mee ka ọ dị iche site ná ndị nile ọzọ. (Deuterọnọmi 4:6-8) Dị ka ọ dị n’ihe banyere Devid, ịgụchi Akwụkwọ Nsọ anya, ịtụgharị uche na ha n’ụzọ miri emi, na iji ịdị uchu na-amụ ha ga-eme ka ekele anyị nwere maka ebube Jehova na-amụba amụba.

Lee Ka Àgwà Chineke Si Dị Ukwuu!

20, 21. (a) Abụ Ọma 145:7-9 na-ebuli ịdị ukwuu Jehova elu n’ihe metụtara àgwà ndị dị aṅaa? (b) Mmetụta dị aṅaa ka àgwà Chineke ndị a kpọtụrụ aha n’ebe a na-enwe n’ahụ́ ndị nile hụrụ ya n’anya?

20 Dị ka anyị hụworo, amaokwu isii mbụ nke Abụ Ọma nke 145 na-enye anyị ezi ihe mere a ga-eji na-eto Jehova maka ihe ndị metụtara ịdị ukwuu ya a na-apụghị ịmatacha amatacha. Amaokwu nke 7 ruo nke 9 na-ebuli ịdị ukwuu Chineke elu site n’izo aka n’àgwà ya. Devid bụrụ, sị: “Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma Gị ka ha ga-ekwuwa, ọ bụkwa ezi omume gị ka ha ga-eti mkpu ọṅụ banyere ya. Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ; ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịkwa ukwuu n’ebere. Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ Ya nile.”

21 N’ebe a, Devid bu ụzọ mee ka ịdị mma na ezi omume Jehova pụta ìhè—àgwà ndị Setan bụ́ Ekwensu gbaghara. Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ndị a na-enwe n’ahụ́ ndị nile hụrụ Chineke n’anya ma na-erubere ọchịchị ya isi? N’ezie, ịdị mma Jehova na ụzọ ziri ezi o si achị na-ewetara ndị na-efe ya ofufe ọṅụ dị ukwuu nke na ha apụghị ịkwụsị ito ya. Ọzọkwa, ‘mmadụ nile’ na-enweta ịdị mma Jehova. Anyị nwere olileanya na nke a ga-enyekwuru ọtụtụ ndị aka ichegharị ma ghọọ ndị na-efe ezi Chineke ahụ tupu oge agafee.—Ọrụ 14:15-17.

22. Olee otú Jehova si emeso ndị ohu ya?

22 Devid jikwa àgwà ndị ahụ Chineke n’onwe ya mere ka ha pụta ìhè kpọrọ ihe mgbe Ọ ‘gabigara n’ihu Mozis, kpọọ òkù, sị, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.’ (Ọpụpụ 34:6) N’ihi ya, Devid pụrụ ikwupụta, sị: “Jehova nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” Ọ bụ ezie na a pụghị ịmatacha ịdị ukwuu Jehova amatacha, ọ na-akwanyere ndị ohu ya bụ́ mmadụ ùgwù site n’iji amara na-emeso ha ihe. O nwere obi ebere dị ukwuu, na-adị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị ná ndabere nke àjà mgbapụta Jizọs. Jehova adịghịkwa ewe iwe ọsọ ọsọ n’ihi na ọ na-enye ndị ohu ya ohere imeri adịghị ike ndị pụrụ igbochi ha ịba n’ụwa ọhụrụ ezi omume ya.—2 Pita 3:9, 13, 14.

23. Àgwà dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Devid toro obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe nke Chineke. N’ezie, amaokwu ndị ọzọ nke Abụ Ọma nke 145 na-egosi otú Jehova si egosipụta àgwà a nakwa otú ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe si emeghachi omume nye obiọma sitere n’ịhụnanya ya. A ga-atụle ihe ndị a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ohere ndị dị aṅaa ka e nwere iji na-eto Jehova “kwa ụbọchị”?

• Olee ihe atụ ndị na-egosi na a pụghị ịmatacha ịdị ukwuu Jehova amatacha?

• Olee otú anyị pụrụ isi mụbaa ekele anyị nwere maka ịma mma nke ebube Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe na-agba akaebe banyere ịdị ukwuu Jehova

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Anglo-Australian Observatory, foto David Malin sere

[Foto dị na peeji nke 12]

Olee otú e siworo gosipụta ịdị ukwuu Jehova n’ihe banyere Jizọs Kraịst?

[Foto dị na peeji nke 13]

Mgbe ndị Izrel natara Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị, ha hụrụ ihe ama nke ịma mma dị ebube nke Jehova