“Afọ Na-eju Osisi Nile nke Jehova”
Ịma Mma nke Ihe Okike Jehova
“Afọ Na-eju Osisi Nile nke Jehova”
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe i guzo n’ime oké ọhịa ka ìhè anyanwụ na-achabata? Ị̀ na-anụ mkpọtụ akwụkwọ osisi na-eme ka ikuku na-ekusa ha?—Aịsaịa 7:2.
N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa n’oge ụfọdụ n’afọ, akwụkwọ nke osisi dị iche iche na-enwe ụdị dị iche iche nke uhie, edo, odo na àgwà ndị ọzọ na-egbukepụ egbukepụ. N’ezie, ọ na-adị nnọọ ka a ga-asị na a mụnyere ọhịa ndị ahụ ọkụ! Nke a kwekọrọ nnọọ n’okwu bụ́: “Tiwenụ mkpu ọṅụ, gị oké ọhịa, na osisi ọ bụla dị n’ime ya.”—Aịsaịa 44:23. *
Ọ bụ oké ọhịa mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mbara Ụwa. N’ụzọ dị ebube, oké ọhịa na ihe ndị dị ndụ jupụtara ya na-enye Onye mere ha na Onye Okike ha bụ́ Jehova Chineke otuto. “Toonụ Jehova,” ka ọ bụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ bụrụ n’abụ, “osisi nile na-amị mkpụrụ na osisi cedar nile.”—Abụ Ọma 148:7-9.
“Osisi dị mkpa maka ịdị adị nke mmadụ ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ọchịchọ ya ịhụ ihe ndị mara mma,” ka akwụkwọ bụ́ The Trees Around Us kwuru. Oké ọhịa na-echebe, na-eme ka a nọgide na-enwe, ma na-emeziwanye ebe ndị e si enweta mmiri dị ọcha. Osisi na-emekwa ka ikuku dị ọcha. Site n’usoro photosynthesis magburu onwe ya, mkpụrụ ndụ nke ahịhịa na-agbanwe ikuku carbon dioxide, mmiri, ihe ndị dị n’ala na ìhè anyanwụ gaa n’ihe ndị na-edozi ahụ́ na ikuku oxygen.
Oké ọhịa bụ ihe na-egosipụta ịma mma na ọrụ nkà bụ́ ịgba. Osisi ndị gbara agba na-abụkarị ihe ndị kasị adọrọ mmasị n’oké ọhịa. Ihe ndị na-eto n’etiti ha bụ òvù égbé, ahịhịa ndị na-akwụ n’osisi, obere osisi na mkpá akwụkwọ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ. Osisi ndị dị otú ahụ na-adabere n’ọnọdụ ndị osisi ndị ahụ na-eme ka e nwee, na-eto n’okpuru ndò ha ma na-amịrị mmiri ndị oké ọhịa ahụ na-emepụta.
N’oké ọhịa ụfọdụ ebe e nwere osisi ndị na-agbụsị akwụkwọ, nde akwụkwọ osisi iri pụrụ ịda nanị n’otu hekta nke mbara ala oké ọhịa ahụ ná ngwụsị afọ ọ bụla. Gịnị na-emezi ha? Ahụhụ, nje fungus, idide, na ụmụ ihe ndị ọzọ dị ndụ na-agbanwe ahịhịa ndị a nile gaa ná nri ala, bụ́ ihe dị mkpa na-eme ka ala na-emepụta nri. Ee, ọ dịghị ihe na-ala n’iyi ka ndị ọrụ a na-adịghị eme mkpọtụ na-akwadebe ala maka ihe opupu ndị ọhụrụ.
E nwere ọtụtụ ihe ndị dị ndụ dị n’okpuru akwụkwọ osisi ndị ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Forest si kwuo, “a pụrụ ịhụ ihe ruru ihe okike 1,350 n’ebe dị sentimita 30 n’obosara na n’ogologo, dịkwa sentimita 2.5 n’omimi, nke ahụ adịghịkwa agụnye ọtụtụ ijeri ihe ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ bụ́ ndị dị na njuaka ọ bụla nke ájá.” Ọzọkwa, oké ọhịa jupụtara n’anụ ndị na-akpụ akpụ, nnụnụ, ahụhụ, na anụ ndị na-enye nwa ara. Ònye kwesịrị ịnara otuto maka ịma mma na ihe ndị a dịgasị iche? N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Onye Okike ha na-ekwu, sị: “Mụ nwe anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa, ya na anụ nile n’elu [otu puku] ugwu.”—Abụ Ọma 50:10.
E kere ụfọdụ anụmanụ inwe ikike dị ịrịba ama nke ịbanye n’ọnọdụ ezumike na ịlanarị oge ndị siri ike n’etiti oge oyi na oge ụkọ nri ndị dịtere aka. Otú ọ dị, ọ bụghị ụmụ anụmanụ nile na-abanye n’ọnọdụ ezumike. Ọbụna n’etiti oge oyi, ị pụrụ ịhụ ìgwè mgbada ka ha na-enufe n’etiti ọhịa. Mgbada adịghị abanye n’ọnọdụ ezumike, ọ dịghịkwa echekwa nri, kama ha na-achọgharị ma na-ata ahịhịa na okooko osisi ndị ka na-epupụta epupụta, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ihe osise dị n’isiokwu a bụ́ nke si Germany.
Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ndụ ihe ọkụkụ ọtụtụ ugboro. Dị ka otu ngụkọ sị kwuo, Bible kpọtụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ihe ọkụkụ 130 aha, gụnyere ihe dị ka ụdị osisi 30. N’ikwu otú izo aka ndị ahụ si dị ịrịba ama, ọkà mmụta ihe ọkụkụ bụ́ Micheal Zohary dere, sị: “Ọbụna n’akwụkwọ ọgụgụ nkịtị, a dịghị ahụkebe ebe e kwuru ọtụtụ ihe banyere ihe ọkụkụ dị ka otu akụkụ nke ihe ndị dị ndụ dị ka e kwuru na Bible.”
Osisi na oké ọhịa bụ onyinye ndị magburu onwe ha sitere n’aka Onye Okike na-ahụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị anọtetụla aka n’ọhịa, n’eziokwu, anyị ga-ekwenye n’okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Afọ na-eju osisi nile nke Jehova; bụ́ osisi cedar nke Lebanọn, nke Ọ kụworo; ebe ụmụ nnụnụ na-arụ akwụ́.”—Abụ Ọma 104:16, 17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, January/February.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
Otu n’ime osisi ndị na-amị mkpụrụ bụ́ ndị kasị adọrọ mmasị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ osisi almọnd. Ná mmalite afọ—ogologo oge tupu ihe ka ọtụtụ n’osisi ndị ọzọ amaa ifuru—ọ na-eteta n’ụra ya. Ndị Hibru oge ochie na-akpọ osisi almọnd onye nteta, na-ezo aka n’otú o si ama ifuru n’oge. Ọ na-adị nnọọ ka osisi ahụ ọ̀ na-eji ifuru ya ndị na-acha pinki pinki ma ọ bụ ndị na-acha ọcha eteta n’ụra.—Eklisiastis 12:5.
N’ime ụdị nnụnụ 9,000 a maara, a na-akpọ ihe dị ka ụdị 5,000 nnụnụ ndị na-abụ abụ. Abụ ha na-eme mkpọtụ n’oké ọhịa nke dị jụụ. (Abụ Ọma 104:12) Dị ka ihe atụ, nza ndị na-abụ abụ nwere nnọọ olu ụtọ. Nnụnụ na-abụ abụ ákwá a na-akpọ warbler, dị ka nke dị n’ihe osise a, bụ ụmụ nnụnụ ndị e ji àgwà ndị na-adọrọ mmasị na-acha ntụ ntụ, odo odo na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ chọọ mma.—Abụ Ọma 148:1, 10.
[Foto dị na peeji nke 9]
Oké ọhịa dị na Normandy, France