Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ọnọdụ ndị mere ka Juda soro nwanyị o chere bụ́ akwụna nwee mmekọahụ, dị ka e kwuru na Jenesis 38:15, 16?

Ọ bụ ezie na Juda na nwanyị o chere bụ́ akwụna nwere mmekọahụ, n’eziokwu nwanyị ahụ abụghị akwụna. Dị ka Jenesis isi 38 si kọọ, nke a bụ ihe merenụ.

Mgbe diọkpara Juda na-enwetabeghị nwa ọ bụla site na nwunye ya bụ́ Tema, e mere ka ọ nwụọ, n’ihi na ọ “jọrọ njọ n’anya Jehova.” (Jenesis 38:7) N’oge ahụ, e nwere omenala nke alụmdi na nwunye nkuchi. Nke a chọrọ na ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’enweghị onye nketa, nwanne ya nwoke ga-enye nwunye nwanne ya ihe ndabere maka onye nketa. Ma nwa Juda nwoke nke abụọ bụ́ Ọnan, jụrụ ịrụ ọrụ ya. Ya mere, ọ nwụrụ n’ihi ikpe Chineke. Mgbe ahụ, Juda kpọlara nwunye nwa ya bụ́ Tema n’ụlọ nna ya ruo mgbe nwa Juda nwoke nke atọ bụ́ Shila ga-etoru ịlụ ya. Otú ọ dị, ka ọtụtụ afọ gafere, Juda ewereghị Tema nye Shila ka ọ lụọ. Ya mere, mgbe nwunye Juda nwụrụ, Tema chepụtara atụmatụ iji si n’aka Juda, onye Izrel, bụbu nna di ya, nweta onye nketa. O mere nke a site n’ime onwe ya ka o yie akwụna ụlọ arụsị, ma nọdụ n’ụzọ ebe ọ maara Juda ga-esi gafee.

N’amaghị onye Tema bụ, Juda soro ya nwee mmekọahụ. Maka ikwe ka ha abụọ nwee mmekọahụ, o ji amamihe nara Juda ihe ibé, o mechakwara jiri nke a gosi na ọ bụ Juda tụwara ya ime. Mgbe eziokwu pụtara ìhè, Juda ataghị ya ụta, kama o ji umeala n’obi, sị: “Ọ bụ onye ezi omume karịa mụ onwe m, n’ihi na eweghị m ya nye Shila, bụ́ nwa m.” Dịkwa nnọọ ka o kwesịrị, “ọ maghịkwa ya ọzọ ma ọlị.”—Jenesis 38:26.

Juda mere ihe ọjọọ n’ihi na o wereghị Tema nye nwa ya bụ́ Shila dị ka o kwere ná nkwa. O sokwaara nwanyị o chere bụ́ akwụna ụlọ arụsị nwee mmekọahụ. Nke ahụ megidere nzube Chineke, nke bụ́ ka nwoke na-enwe mmekọahụ nanị ná ndokwa alụmdi na nwunye. (Jenesis 2:24) Ka o sina dị, nke bụ́ eziokwu bụ na Juda esoghị akwụna nwee mmekọahụ. Kama n’amaghị ama, ọ nọchiri ọnọdụ nwa ya bụ́ Shila site n’ịrụ ọrụ dịịrị nwanne di, sikwa otú a bụrụ nna nke nwa iwu kwadoro.

A bịa n’ebe Tema nọ, ihe o mere abụghị omume rụrụ arụ. E wereghị ụmụ ejima ya dị ka ụmụ a mụtara n’ịkwa iko. Mgbe Boaz onye Betlehem kuchiri Rut onye Moab, ndị okenye Betlehem kwuru okwu ọma banyere nwa Tema bụ́ Pirez, na-agwa Boaz, sị: “Ka ụlọ gị dịkwa ka ụlọ Pirez, bụ́ onye Tema mụụrụ Juda, site n’ụmụ Jehova ga-enye gị site na nwa agbọghọ a.” (Rut 4:12) A gụnyekọtakwara Pirez ná ndị nna nna Jizọs Kraịst.—Matiu 1:1-3; Luk 3:23-33.