Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Chineke Adịghị Ebi N’ụlọ Nsọ Ndị E Ji Aka Mee’

‘Chineke Adịghị Ebi N’ụlọ Nsọ Ndị E Ji Aka Mee’

‘Chineke Adịghị Ebi N’ụlọ Nsọ Ndị E Ji Aka Mee’

IHE ịrụ ụka adịghị ya na Pọl onyeozi maara ụlọ nsọ nke Atena nke ọma ebe ọ bụ na ọ dị n’ọtụtụ n’ime obodo ukwu ndị o letara n’oge njem ozi ala ọzọ ya. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica si kwuo, a maara Atena dị ka chi nwanyị, ọ bụghị nanị nke agha na amamihe kamakwa, “nke ọrụ nkà na ọrụ ndị a na-arụ n’oge udo.”

Ụlọ nsọ Atena a kasị mara amara bụ Parthenon nke e wuru n’Atens, bụ́ obodo a gụrụ aha chi nwanyị ahụ. N’ịbụ nke e weere dị ka otu n’ime ụlọ nsọ ndị kasịnụ e nwere n’ụwa oge ochie, Parthenon nwere ihe oyiyi Atena nke e ji ọlaedo na ọdụ́ enyi kpụọ nke dị ihe dị ka mita 12. Mgbe Pọl letara Atens, ụlọ nsọ a e ji nkume mabụl ọcha wuo adịwo n’obodo ukwu ahụ ruo ihe dị ka afọ 500.

N’ịnọ n’ebe ọ na-ahụ Parthenon, Pọl kwusaara otu ìgwè ndị Atens ozi ọma banyere ‘Chineke nke na-adịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka mee.’ (Ọrụ 17:23, 24) Eleghị anya, ịdị ebube nke ụlọ nsọ Atena ma ọ bụ ịdị ebube nke arụsị ya mere ka o yie ihe na-adọrọ mmasị nye ndị na-ege Pọl ntị karịa Chineke nke a na-adịghị ahụ anya nke ha na-amaghị onye ọ bụ. Otú ọ dị, dị ka Pọl mere ka ọ pụta ìhè, e kwesịghị iche na Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ “yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ.”—Ọrụ 17:29.

Chi na chi nwanyị dị iche iche ndị dị ka Atena—bụ́ ndị ebube ha dabeere n’ụlọ nsọ ha na n’ọdịdị ha—abịala ma laa. Ihe oyiyi Atena pụrụ n’anya na Parthenon na narị afọ nke ise O.A., ọ bụkwa nanị mkpọmkpọ ebe nke ole na ole n’ime ụlọ nsọ ya fọdụrụ. Ònye taa na-elegara Atena anya maka amamihe na nduzi?

Lee ka nke a si dị iche n’ebe Jehova nọ, bụ́ “Chineke nke mgbe ebighị ebi,” nke ọ na-adịtụbeghị onye hụrụ ya anya. (Ndị Rom 16:26; 1 Jọn 4:12) Ụmụ Kora dere, sị: “Nke a bụ Chineke, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi; Ya onwe ya ga na-edu anyị.” (Abụ Ọma 48:14) Otu ụzọ isi nweta nduzi Jehova Chineke bụ ịmụ Okwu ya bụ́ Bible na itinye ndụmọdụ ndị dị na ya n’ọrụ ná ndụ anyị.