Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe

Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe

Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe

“ Jehova . . . dịkwa ukwuu n’obiọma sitere n’ịhụnanya.”—ABỤ ỌMA 145:8, NW.

1. Ruo ókè ha aṅaa ka ịhụnanya Chineke sara mbara?

“CHINEKE bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Okwu a na-enye ọṅụ na-agba akaebe na ụzọ Jehova si achị dabeere n’ịhụnanya. Leenụ, ọbụna ụmụ mmadụ ndị na-adịghị erubere ya isi na-erite uru site n’anyanwụ na mmiri ozuzo o ji ịhụnanya na-enye! (Matiu 5:44, 45) N’ihi ịhụnanya Chineke nwere maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọbụna ndị iro ya pụrụ ichegharị, chigharịkwuru ya ma nweta ndụ. (Jọn 3:16) Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị ajọ omume na-enweghị mmekwata ka ụmụ mmadụ hụrụ ya n’anya wee nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; 2 Pita 3:13.

2. Ịhụnanya dị aṅaa pụrụ iche ka Jehova na-egosi ndị ya na ha na-enwe mmekọrịta bụ́ ndị raara onwe ha nye ya?

2 Jehova na-egosi ndị na-efe ya ezi ofufe ịhụnanya n’ụzọ dị oké ọnụ ahịa na nke na-adịgide adịgide. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya,” ma ọ bụ “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe” na-egosi ịhụnanya dị otú ahụ. Eze Devid nke Izrel oge ochie ji obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ahụmahụ ya na ntụgharị uche ya n’otú Chineke si emeso ndị ọzọ ihe, Devid ji obi ike bụọ, sị: “Jehova . . . dị ukwuu n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” ma ọ bụ, “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe,” NW].”—Abụ Ọma 145:8.

Ịmata Ndị Chineke Na-eguzosi Ike n’Ihe

3, 4. (a) Olee otú Abụ Ọma nke 145 si enyere anyị aka ịmata ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe? (b) Olee otú ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe si ‘agọzi’ ya?

3 Banyere Jehova Chineke, nne Samuel onye amụma, bụ́ Hana, kwuru, sị: “Ụkwụ ndị ebere Ya [“ndị ya na-eguzosi ike n’ihe,” NW] ka Ọ na-edebe.” (1 Samuel 2:9) Ole ndị ka ‘ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ihe’ bụ? Eze Devid nyere azịza ya. Mgbe o tosịrị àgwà Jehova ndị magburu onwe ha, o kwuru, sị: “Ndị ebere gị [“ndị gị na-eguzosi ike n’ihe,” NW] na-agọzikwa gị.” (Abụ Ọma 145:10) Ị pụrụ iche otú ụmụ mmadụ pụrụ isi gọzie Chineke. Ha na-eme nke ahụ n’ụzọ bụ́ isi site n’ito ya ma ọ bụ site n’ikwu okwu ọma banyere ya.

4 A pụrụ iji ikwu okwu ọma banyere Jehova mata ndị ya na-eguzosi ike n’ihe. Gịnị na-abụ isiokwu nke mkparịta ụka ha ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ na ná nzukọ Ndị Kraịst? N’ezie, ọ bụ Alaeze Jehova! Ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe nwere mmetụta yiri nke Devid, bụ́ onye bụrụ, sị: “Nsọpụrụ nke alaeze Gị [Jehova] ka ha na-ekwupụta, ọ bụ ịdị ike Gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya.”—Abụ Ọma 145:11.

5. Olee otú anyị si mara na Jehova na-anụ mgbe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe na-ekwu okwu ọma banyere ya?

5 Jehova ọ̀ na-ege ntị mgbe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe na-eto ya? Ee, ọ na-ege ntị n’ihe ha na-ekwu. N’amụma e buru banyere ezi ofufe n’oge anyị, Malakaị dere, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” (Malakaị 3:16) Ọ na-atọ Jehova ụtọ nke ukwuu mgbe ndị ya na-eguzosi ike n’ihe na-ekwu okwu ọma banyere ya, ọ na-echetakwa ha.

6. Olee ọrụ anyị ji amata ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe?

6 A pụkwara iji obi ike na ibute ụzọ n’ịgwa ndị na-adịghị efe ezi Chineke ahụ ofufe okwu amata ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe. N’ezie, ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe ‘na-eme ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike Ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke [ịchịisi, NW] Ya.’ (Abụ Ọma 145:12) Ị̀ na-achọ ohere ma na-eji ya eme ihe n’ụzọ zuru ezu iji gwa ndị na-ekweghị ekwe banyere ịchịisi Jehova? N’adịghị ka ọchịchị ụmụ mmadụ bụ́ nke ga-apụ n’anya n’isi nso, ịchịisi ya na-adịru mgbe ebighị ebi. (1 Timoti 1:17) Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mụta banyere ịchịisi Jehova nke na-adịru mgbe ebighị ebi ma were nguzo ha dị ka ndị na-akwado ya. “[Ịchịisi, NW] Gị bụ [ịchịisi, NW] ruo mgbe nile ebighị ebi,” ka Devid bụrụ, “ọchịchị Gị dịkwa n’ọgbọ nile.”—Abụ Ọma 145:13.

7, 8. Gịnị mere na 1914, oleekwa ihe àmà e nwere na Chineke na-achị achị ugbu a site n’Alaeze nke Ọkpara ya?

7 Kemgbe 1914, e nwewo ihe ọzọ mere a ga-eji na-ekwu banyere ịchịisi Jehova. N’afọ ahụ, Chineke guzobere Alaeze eluigwe nke Mezaịa ahụ nke Jizọs Kraịst, bụ́ Nwa Devid, bụ Eze ya. Jehova si otú a mezuo nkwa ya bụ́ na ịchịisi Devid ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.—2 Samuel 7:12, 13; Luk 1:32, 33.

8 A na-ahụ ihe àmà na Jehova na-achị achị ugbu a site n’Alaeze nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ná mmezu na-aga n’ihu nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jizọs. Akụkụ kasị pụta ìhè nke ihe ịrịba ama ahụ bụ ọrụ Jizọs buru n’amụma maka ndị Chineke nile na-eguzosi ike n’ihe, mgbe ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:3-14) N’ihi na ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe ji ịnụ ọkụ n’obi na-emezu amụma a, ihe karịrị nde isii nke ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka na-ekere òkè ugbu a n’oké ọrụ a a na-agaghị arụghachi ọzọ. N’oge na-adịghị anya ọgwụgwụ nke ndị nile na-emegide Alaeze Jehova ga-abịa.—Mkpughe 11:15, 18.

Irite Uru n’Ọbụbụeze Jehova

9, 10. Olee ọdịiche dị n’etiti Jehova na ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ?

9 Ọ bụrụ na anyị bụ Ndị Kraịst raara onwe ha nye, mmekọrịta nke anyị na Eze Onyenwe anyị Jehova na-ewetara anyị ọtụtụ ngọzi. (Abụ Ọma 71:5; 116:12) Dị ka ihe atụ, n’ihi na anyị na-atụ egwu Chineke ma na-eme ezi omume, anyị na-enweta ihu ọma ya ma nọrọ ya nso n’ụzọ ime mmụọ. (Ọrụ 10:34, 35; Jems 4:8) N’ụzọ dị iche, ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ na-esokarị ndị a ma ama, dị ka ndị ọchịagha, ndị ọchụ ntá ego bara ọgaranya, ma ọ bụ ndị a ma ama n’egwuregwu na ntụrụndụ akpakọrịta. Dị ka otu akwụkwọ akụkọ Africa bụ́ Sowetan si kọọ, otu onye ọrụ gọọmenti kwuru ihe ndị na-esonụ banyere ebe ndị ịda ogbenye kpara aka ọjọọ n’ala ya: “Aghọtara m ihe mere na ọtụtụ n’ime anyị adịghị achọ ịga ebe ndị dị otú ahụ. Ọ bụ nnọọ n’ihi na anyị na-achọ ichefu na ọnọdụ ndị dị otú ahụ dị adị. Ọ na-enye akọ na uche anyị nsogbu, ihere na-emekwa anyị n’ihi [ụgbọala] dara oké ọnụ ndị anyị na-agba.”

10 N’ezie, ụfọdụ ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ nwere nchegbu sitere n’obi banyere ọdịmma nke ndị ha na-achị. Ma, ọbụna onye kasị bụrụ ezigbo mmadụ n’etiti ha amaghị ndị ọ na-achị nke ọma. N’ezie, anyị pụrụ ịjụ, sị: Ọ̀ dị onye ọchịchị nke na-echebara nnọọ ndị nile ọ na-achị echiche nke na ọ na-agbatara onye nke ọ bụla n’ime ha ọsọ enyemaka ngwa ngwa n’oge nsogbu? Ee, e nwere. Devid dere, sị: “Jehova na-akwagide ndị nile na-ada ada, Ọ na-ekulikwa ndị nile na-ehuda n’ala.”—Abụ Ọma 145:14.

11. Ule ndị dị aṅaa na-adakwasị ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe, enyemaka dịkwa aṅaa ka ha na-enweta?

11 Ọtụtụ ule na ọdachi na-adakwasị ndị Jehova Chineke na-eguzosi ike n’ihe n’ihi ezughị okè ha na n’ihi na ha bi n’ụwa nke dị n’ike Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; Abụ Ọma 34:19) Ndị Kraịst na-enweta mkpagbu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ n’ihi ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Mgbe ụfọdụ, ihie ụzọ nke ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe pụrụ ime ka ha ‘huda ala’ n’ihi nkụda mmụọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ule bịakwasịrị ha, Jehova na-adị njikere mgbe nile ịkasi onye nke ọ bụla n’ime ha obi na inye ya ume n’ụzọ ime mmụọ. Eze ahụ bụ́ Jizọs Kraịst nwere otu mmasị ịhụnanya ahụ n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe ọ na-achị nọ.—Abụ Ọma 72:12-14.

Nri Na-eju Afọ na Mgbe Ya

12, 13. Ruo ókè ha aṅaa ka Jehova na-egbo mkpa nke “ihe ọ bụla dị ndụ”?

12 N’ihi obiọma sitere n’ịhụnanya ya dị ukwuu, Jehova na-egbo mkpa nile nke ndị ohu ya. Nke a na-agụnye iji nri ndị na-edozi ahụ́ enyeju ha afọ. Eze Devid dere, sị: “Anya ihe nile na-ele anya Gị [Jehova]; Gị onwe gị na-enyekwa ha ihe oriri ha na mgbe ya. Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:15, 16) Ọbụna n’oge ndị e nwere ọdachi, Jehova pụrụ ịchịkwa ọnọdụ iji mee ka ndị ya na-eguzosi ike n’ihe nweta “nri maka taa.”—Luk 11:3; 12:29, 30.

13 Devid kwuru na afọ na-eju “ihe ọ bụla dị ndụ.” Nke ahụ na-agụnye ụmụ anụmanụ. E wezụga ụbara nke ahịhịa nke ala na ndị dị n’oké osimiri, ihe e kere eke ndị bi na mmiri, nnụnụ, na ụmụ anụmanụ bi n’ala agaraghị enwe ikuku oxygen ha ga na-ekuru ma ọ bụ nri ha ga na-eri. (Abụ Ọma 104:14) Otú ọ dị, Jehova na-ahụ na e gboro mkpa nile ha.

14, 15. Olee otú e si enye nri ime mmụọ taa?

14 N’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ụmụ mmadụ nwere mkpa ime mmụọ. (Matiu 5:3) Lee ụzọ magburu onwe ya Jehova si emeju mkpa ime mmụọ nke ndị ya na-eguzosi ike n’ihe! Tupu ọnwụ ya, Jizọs kwere nkwa na “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ga-enye ụmụazụ Jizọs ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Matiu 24:45) Ọ bụ ihe fọdụrụ na 144,000 ahụ e tere mmanụ mejupụtara òtù ohu ahụ taa. Site n’aka ha, Jehova enyewo nri ime mmụọ n’ụba n’ezie.

15 Dị ka ihe atụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị Jehova ugbu a na-erite uru site ná nsụgharị ọhụrụ ziri ezi nke Bible n’asụsụ ha. Lee ngọzi magburu onwe ya New World Translation of the Holy Scriptures bụworo! Ọzọkwa, a nọgidere na-ebipụta ọtụtụ nde akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ihe karịrị asụsụ 300. Nri ime mmụọ a nile abụrụwo ngọzi nye ezi ndị na-efe ofufe gburugburu ụwa. Ònye ka e kwesịrị ito n’ihi ihe a nile? Ọ bụ Jehova Chineke. N’ihi obiọma sitere n’ịhụnanya ya dị ukwuu, o mewo ka o kwe òtù ohu ahụ omume inye “ihe oriri . . . na mgbe ya.” Site ná ndokwa ndị dị otú ahụ, a na-ewere “ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ” mee ka afọ ju ya na paradaịs ime mmụọ dị ugbu a. Leekwa otú ndị ohu Jehova si enwe ọṅụ n’olileanya nke ịhụ ka e mere ka ụwa ghọọ paradaịs a na-ahụ anya n’oge na-adịghị anya!—Luk 23:42, 43.

16, 17. (a) Olee ihe atụ nke nri ime mmụọ ndị bịara na mgbe ha? (b) Olee otú Abụ Ọma nke 145 si egosipụta mmetụta nke ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe na-enwe n’ihe banyere ihe iseokwu ahụ bụ́ isi Setan welitere?

16 Tụlee otu ihe atụ pụtara ìhè nke nri ime mmụọ e nyere n’oge kwesịrị ekwesị. Na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Europe. N’otu afọ ahụ, mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1 nwere otu isiokwu bụ́ “Nnọpụiche.” N’ihi ihe ọmụma doro anya e nyere, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa hụrụ mkpa ọ dị ịnọgide na-anọpụ iche kpam kpam n’ihe omume nke mba ndị ahụ na-eburịta agha. Nke a mere ka gọọmenti nke akụkụ abụọ ahụ na-eburịta agha n’agha ahụ a lụrụ afọ isii wesa ha iwe. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ịbụ ndị a machibidoro iwu ma kpagbuo, ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe nọgidere na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Site na 1939 ruo 1946, e ji mmụba dị ịtụnanya nke pasent 157 gọzie ha. Ọzọkwa, ihe ndekọ na-enweghị atụ nke iguzosi ike n’ezi ihe ha n’oge agha ahụ nọgidere na-enyere ndị mmadụ aka ịmata ezi okpukpe ahụ.—Aịsaịa 2:2-4.

17 Ọ bụghị nanị na nri ime mmụọ nke Jehova na-enye na-abịa n’oge kwesịrị ekwesị kamakwa, ọ na-eju nnọọ afọ. Ọ bụ ezie na mba dị iche iche nọ na-alụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’Agha Ụwa nke Abụọ, e nyeere ndị Jehova aka ilekwasị anya n’ihe ka nnọọ mkpa karịa nzọpụta nke onwe ha. Jehova nyeere ha aka ịghọta na ihe iseokwu ahụ bụ́ isi, nke metụtara eluigwe na ala dum, bụ banyere oruru o ruuru Jehova ịbụ eze. Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ bụ ịmara na site n’iguzosi ike n’ihe ya Onyeàmà ọ bụla nke Jehova na-ekere òkè n’igosi na o ruuru Jehova ịbụ eze na n’ime Ekwensu onye ụgha! (Ilu 27:11) N’adịghị ka Setan, bụ́ onye na-ekwutọ Jehova na ụzọ o si achị, ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe na-anọgide na-ekwusa n’ihu ọha, sị: “Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile.”—Abụ Ọma 145:17.

18. Ihe atụ dị aṅaa nke nri ime mmụọ bịara n’oge ya na nke na-eju afọ ka e nwere n’oge na-adịbeghị anya?

18 Ihe atụ ọzọ nke nri ime mmụọ na-eju afọ nke bịara n’oge kwesịrị ekwesị bụ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, bụ́ nke e wepụtara n’ọtụtụ narị Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” e nwere gburugburu ụwa na 2002/2003. Akwụkwọ a, bụ́ nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” kwadebere ma bụrụ nke Ndịàmà Jehova bipụtara, na-elekwasị anya n’àgwà Jehova Chineke ndị magburu onwe ha, gụnyere ndị a kpọtụrụ aha n’Abụ Ọma nke 145. Ọmarịcha akwụkwọ a ga-enye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe bịaruo ya nso ọbụna karị.

Oge Ịbịarukwu Jehova Nso

19. Oge dị aṅaa dị mkpa na-abịaru nso, oleekwa ihe anyị ga-eme banyere ya?

19 Oge dị mkpa iji dozie ihe iseokwu banyere oruru o ruuru Jehova ịbụ eze na-abịaru nso. Dị ka e buru n’amụma n’Ezikiel isi 38, Setan ga-arụzu ọrụ ya dị ka “Gọg, nke ala Megọg” n’isi nso. Nke a ga-agụnye mwakpo zuru ụwa ọnụ ọ ga-awakpo ndị Jehova. Ọ ga-abụ mgbe Setan ga-eme oké mgbalị iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe. Ọ ga-adị ndị na-efe Jehova ofufe mkpa dị ka ọ na-adịbeghị mbụ iji ịdị uchu na-akpọkusi ya ike, ọbụna na-etiku ya maka enyemaka. Egwu nsọpụrụ ha na-atụ Chineke na ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ ọ̀ ga-abụ n’efu? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na Abụ Ọma nke 145 na-ekwu, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha. Jehova na-edebe ndị nile na-ahụ Ya n’anya; ma ndị nile na-emebi iwu ka Ọ ga-ekpochapụ.”—Abụ Ọma 145:18-20.

20. Olee otú okwu ndị dị n’Abụ Ọma 145:18-20 ga-esi mezuo n’ọdịnihu dị nso?

20 Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ inwe mmetụta na Jehova nọ anyị nso nakwa ịhụ ikike nzọpụta ya mgbe ọ ga-ekpochapụ ndị ajọ omume nile! N’oge ahụ dị mkpa nke dị nnọọ nso ugbu a, Jehova ga-ege nanị “ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu” ntị. Ọ gaghị ege ndị ihu abụọ ntị ma ọlị. Okwu Chineke na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị na-emebi iwu iji aha Chineke eme ihe mgbe oge gafeworo abụwo mgbe nile ihe efu.—Ilu 1:28, 29; Maịka 3:4; Luk 13:24, 25.

21. Olee otú ndị Jehova na-eguzosi ike n’ihe si egosi na ọ na-atọ ha ụtọ iji aha Chineke eme ihe?

21 Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ugbu a bụ oge ndị na-atụ Jehova egwu ‘ga-akpọku ya n’eziokwu.’ Ọ na-atọ ndị ya na-eguzosi ike n’ihe ụtọ iji aha ya eme ihe n’ekpere ha na mgbe ha na-aza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ ha. Ha na-eji aha Chineke eme ihe ná mkparịta ụka ha. Ha na-ejikwa obi ike akpọsa aha Jehova n’ozi ha na-eje maka ọha.—Ndị Rom 10:10, 13-15.

22. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịnọgide na-eguzogide àgwà na ọchịchọ ụwa?

22 Iji nọgide na-erite uru ná mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova Chineke, ọ dịkwa anyị mkpa ịnọgide na-eguzogide ihe ndị na-emerụ ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ, ndị dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, ntụrụndụ na-adịghị mma, mmụọ nke enweghị mgbaghara, ma ọ bụ echebaraghị ndị nọ ná mkpa echiche. (1 Jọn 2:15-17; 3:15-17) Ọ bụrụ na a kwụsịghị ha, nchụso na àgwà ndị dị otú ahụ pụrụ iduba n’ime mmehie dị oké njọ na mmadụ ịbụ onye na-enwekwaghị ihu ọma Jehova. (1 Jọn 2:1, 2; 3:6) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iburu n’uche na Jehova ga-anọgide na-egosi anyị obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe nanị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.—2 Samuel 22:26.

23. Ọdịnihu dị ebube dị aṅaa na-echere ndị Chineke nile na-eguzosi ike n’ihe?

23 Ya mere, ka anyị nọgide na-eburu n’uche ọdịnihu ahụ dị ebube nke na-echere ndị Jehova nile na-eguzosi ike n’ihe. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-enwe atụmanya magburu onwe ya nke ịbụ ndị a gụnyere n’etiti ndị ga-ebuli Jehova elu, ndị ga-agọzi na ndị ga-eto ya “kwa ụbọchị” na “ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 145:1, 2) Ya mere, ka anyị ‘na-edebe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke, na-ele anya ndụ ebighị ebi.’ (Jud 20, 21) Ka anyị nọgidere na-erite uru n’àgwà ndị magburu onwe ha nke Nna anyị nke eluigwe, gụnyere obiọma sitere n’ịhụnanya ọ na-egosi ndị hụrụ ya n’anya, ka echiche anyị dịrị mgbe nile ka ndị ahụ Devid depụtara n’okwu ndị ikpeazụ nke Abụ Ọma nke 145: “Otuto Jehova ka ọnụ m ga-ekwu; ka anụ ahụ́ nile gọziekwa aha nsọ Ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Abụ Ọma nke 145 si enyere anyị aka ịmata ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe?

• Olee otú Jehova si ewere ‘ihe dị ihe ndị dị ndụ ụtọ’ mee ka afọ ju ha?

• N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịbịarukwu Jehova nso?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ na-atọ ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe ụtọ ikwurịta banyere ịdị ike ya

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ohu Jehova na-eji obi ike enyere ndị na-ekweghị ekwe aka ịmụta banyere ebube nke ịchịisi ya

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jehova na-enye “ihe ọ bụla dị ndụ” nri

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụmụ anụmanụ: Parque de la Naturaleza de Cabárceno

[Foto dị na peeji nke 19]

Jehova na-enye ndị ya na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị na-arịọ ya maka enyemaka n’ekpere ike na nduzi