Nkwa Ndị Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
Nkwa Ndị Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
ONYE amụma Chineke bụ́ Maịka maara na ọtụtụ mgbe nkwa pụrụ ịbụ ndị a na-emezughị. N’oge ya, a pụghị ọbụna ịtụkwasị ezi ndị enyi obi mgbe nile na ha ga-emezu nkwa ha. N’ihi ya, Maịka dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwerela n’enyi, unu atụkwasịla enyi unu maara nke ọma obi: debe egbugbere ọnụ gị ghara ịgwa nwanyị na-edina n’obi gị okwu.”—Maịka 7:5.
Maịka ò kwere ka ọnọdụ a dị mwute mee ka ọ na-enyo nkwa nile enyo? Ee e! O kwupụtara obi ike o nwere ná nkwa dị iche iche nke Chineke ya, bụ́ Jehova. “Ma mụ onwe m,” ka Maịka dere, “n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; m ga-echere Chineke nke nzọpụta m.”—Maịka 7:7.
N’ihi gịnị ka Maịka ji nwee obi ike dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na Jehova na-emezu okwu ya mgbe nile. Ihe nile Chineke ṅụụrụ ndị nna ochie Maịka n’iyi mezuchara. (Maịka 7:20) Ikwesị ntụkwasị obi Jehova n’oge gara aga mere ka Maịka nwee ezi ihe mere ọ ga-eji kwere na Ọ ga-emezu nkwa Ya n’ọdịnihu.
“Ọ Dịghị Otu Ihe Dapụrụ”
Dị ka ihe atụ, Maịka maara na Jehova napụtara ndị Izrel n’ịbụ ohu n’Ijipt. (Maịka 7:15) Jọshụa, bụ́ onye so ná ndị ahụ a napụtara, gbara ndị Izrel ibe ya ume ka ha tụkwasị nkwa nile nke Chineke obi. N’ihi gịnị? “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile,” ka Jọshụa chetaara ha, “na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.
Ndị Izrel maara nke ọma na Jehova emeworo ha ihe ndị dị ebube. O mezuwo nkwa o kwere nna ha ochie na-atụ egwu Chineke bụ́ Ebreham na mkpụrụ ya ga-aba ụba dị ka kpakpando nakwa na ha ga-enweta ala Kenan. Jehova gwakwara Ebreham na ụmụ ya ga-ata ahụhụ ruo afọ 400 ma na ha ga-alọghachi Kenan “n’ọgbọ nke anọ.” Ihe a nile mezuru.—Jenesis 15:5-16; Ọpụpụ 3:6-8.
A nabatara ụmụ Izrel nke ọma n’Ijipt n’oge nwa Jekọb bụ́ Josef. Ndị Ijipt mesịrị jiri obi ọjọọ manye ha ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu, ma dị ka Chineke kwere ná nkwa, n’ime ọgbọ anọ sochiri nnọọ onwe ha malite mgbe ha banyere n’Ijipt, a tọhapụrụ ụmụ Ebreham ndị a n’agbụ ndị Ijipt. *
N’ime afọ 40 ndị sochirinụ, ndị Izrel hụkwuru ihe àmà ndị na-egosi na Jehova na-emezu nkwa ya mgbe nile. Mgbe ndị Amalek wakporo ụmụ Izrel n’enweghị ihe ndị Izrel mere ha, Chineke lụụrụ ndị ya agha ma chebe ha. O gboro mkpa anụ ahụ́ ha nile n’oge ha ji ụkwụ mee njem were afọ 40 n’ịkpa ma mesịa mee ka ha biri n’Ala Nkwa ahụ. Ka Jọshụa na-atụleghachi mmeso Jehova mesoworo ụmụ Ebreham ndị a, ọ pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Izrel; ha nile mere.”—Joshua 21:45.
Wulite Obi Ike ná Nkwa Chineke
Olee otú ị pụrụ isi wulite obi ike ná nkwa Jehova, dị ka Maịka na Jọshụa mere? Olee otú i si ewulite ntụkwasị obi n’ebe ndị ọzọ nọ? Ị na-agbalị ịmata ihe nile i nwere ike ịmata banyere ha. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịmata ma hà bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi site n’ịchọpụta ma hà na-eji ikwesị ntụkwasị obi agbalị imezu nkwa ha nile. Ka ị na-amatakwu ndị dị otú ahụ, ị na-eji nwayọọ nwayọọ ewulite ntụkwasị obi n’ebe ha nọ. Ị pụrụ ime otu ihe ahụ mgbe a bịara n’iwulite obi ike ná nkwa Chineke.
Otu ụzọ ị pụrụ isi mee nke a bụ site n’ịtụgharị uche n’ihe ndị e kere eke na iwu ndị na-achịkwa ha. Ndị ọkà mmụta sayensị tụkwasịrị iwu ndị a obi, dị ka ndị nke na-achịkwa ụzọ otu mkpụrụ ndụ nke mmadụ si ekewa ma na-amụba iji mepụta ọtụtụ ijeri mkpụrụ ndụ ndị mejupụtara ahụ́ gị. N’ezie, iwu ndị na-achịkwa irighiri ihe ndị mejupụtara ihe e kere eke na ike ndị dị n’eluigwe na ala dum aghaghị ịbụwo nke Onye Omeiwu a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam guzobere. Ị pụrụ nnọọ ịtụkwasị nkwa ya obi, ọbụna dị ka ị tụkwasịrị iwu ndị na-achịkwa ihe ndị o kere eke obi.Abụ Ọma 139:14-16; Aịsaịa 40:26; Ndị Hibru 3:4.
—Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, bụ́ onye ya na Maịka dịkọrọ ndụ, Jehova ji otú oge ndị a na-enwe n’afọ si bụrụ nnọọ ihe ndị na-abịa n’oge ha na nrugharị dị ịtụnanya nke mmiri mee ihe atụ otú okwu ya si bụrụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. Kwa afọ, mmiri na-ezo. Ọ na-ede ala ma mee ka o kwe ndị mmadụ omume ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi. N’ikwekọ na nke a, Jehova kwuru, sị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:10, 11.
Nkwa Ndị E Ji n’Aka nke Paradaịs
Inyocha ihe ndị e kere eke pụrụ iwulite ntụkwasị obi anyị n’ebe Onye Okike nọ, ma ọ dị ihe ọzọ dị mkpa ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụta banyere nkwa ndị so ‘n’okwu nke na-esi n’ọnụ ya pụta.’ Iji mụta banyere nkwa ndị a ka i wee nwee ike ịtụkwasị ha obi, ọ dị gị mkpa inyocha ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke banyere nzube Chineke maka ụwa na otú o si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe.—2 Timoti 3:14-17.
Maịka onye amụma nwere obi ike ná nkwa Jehova. I nwere ọtụtụ ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke karịa ka Maịka nwere. Ka ị na-agụ Bible ma na-atụgharị uche na ya, ị pụkwara iwulite okwukwe ná mmezu nke nkwa Chineke. Nkwa ndị a metụtara ọ bụghị nanị ụmụ anụ ahụ́ nke Ebreham kamakwa, ihe nile a kpọrọ mmadụ. Jehova kwere nna ochie a na-atụ egwu Chineke nkwa, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) Akụkụ bụ́ isi nke “mkpụrụ,” ma ọ bụ ụmụ, Ebreham bụ Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst.—Ndị Galeshia 3:16.
Site n’aka Jizọs Kraịst, Jehova ga-ahụ na a gọziri ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Gịnịkwa ka Chineke kweworo nkwa ime n’oge anyị? Maịka 4:1, 2 ji okwu amụma ndị a na-aza, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ugwu ahụ elu karịa ugwu nta nile; ndị dị iche iche ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruokwa ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”
Ndị na-amụta ụzọ Jehova ‘na-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ Àgwà ọ bụla yiri nke agha na-apụ n’anya. N’oge na-adịghị anya, ndị ziri ezi ga-ejupụta ụwa, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji n’ụjọ. (Maịka 4:3, 4) Ee, Okwu Chineke na-ekwe nkwa na n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ nke ga-adị n’aka Jizọs Kraịst, Jehova ga-ekpochapụ ndị mmegbu nile n’ụwa.—Aịsaịa 11:6-9; Daniel 2:44; Mkpughe 11:18.
Ọbụna a ga-akpọlite ndị taworo ahụhụ ma nwụọ n’ihi nnupụisi nke mmadụ megide Chineke, na-enye ha olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 5:28, 29) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị na-akpalite ajọ omume, ga-apụ n’anya, a ga-ejikwa àjà mgbapụta Jizọs wepụ ihe mmehie Adam kpataworo. (Matiu 20:28; Ndị Rom 3:23, 24; 5:12; 6:23; Mkpughe 20:1-3) Gịnị ga-abụ ọnọdụ nke ụmụ mmadụ na-erube isi? N’ezie, a ga-eji ndụ ebighị ebi n’ahụ́ ike zuru okè na paradaịs elu ala gọzie ha!—Abụ Ọma 37:10, 11; Luk 23:43; Mkpughe 21:3-5.
Lee nkwa magburu onwe ha ha bụ! Ma ị̀ pụrụ ikwere na ha? N’ezie ị pụrụ. Ha abụghị nkwa ụmụ mmadụ bụ́ ndị pụrụ ibu ezi ihe n’obi ma ha enweghị ike imezu ha. Ha bụ nkwa nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye na-apụghị ịgha ụgha na onye ‘na-adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya.’ (2 Pita 3:9; Ndị Hibru 6:13-18) Ị pụrụ inwe ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa nile dị na Bible, n’ihi na ha sitere n’aka “Jehova, Chineke nke eziokwu.”—Abụ Ọma 31:5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 911-912, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu.”—JOSHUA 23:14
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Jehova mezuru nkwa o kwere Izrel n’Oké Osimiri Uhie na n’ịkpa
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Jehova mezuru nkwa o kwere Ebreham. Mkpụrụ ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi