Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nye Chineke Otuto—Ọ Bụghị Mmadụ

Nye Chineke Otuto—Ọ Bụghị Mmadụ

Nye Chineke Otuto—Ọ Bụghị Mmadụ

N’ỌNWA ndị na-adịbeghị anya, ndị hụrụ ezi omume n’anya gbaa gburugburu ụwa mụtara otú e si enye Chineke otuto ka ha gbakọtara ná Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke Ndịàmà Jehova. Ka anyị tụleghachi usoro nkụzi ihe weere ọnọdụ n’ebe ahụ.

Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị gara mgbakọ ahụ, usoro ihe omume ahụ dabeere na Bible were ụbọchị atọ sochiri onwe ha, ma nye ndị nwere ike ịga mgbakọ ndị pụrụ iche nke mba nile, o were ụbọchị anọ. Ná ngụkọta, ndị garanụ gere ntị n’ihe karịrị ihe omume 30 sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ndị gụnyere okwu ndị mere ka ha nwekwuo ekele maka ihe ime mmụọ, ahụmahụ ndị mere ka okwukwe ha sikwuo ike, ihe ngosi ndị mere ka ụzọ ndị dị irè e si etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụta ìhè, na ihe nkiri e yi uwe ihe nkiri zuru ezu mee nke gosiri ihe ịma aka ndị Ndị Kraịst narị afọ mbụ chere ihu. Ọ bụrụ na ị gara otu n’ime mgbakọ ndị ahụ, gịnị ma ị tụleghachi ihe ndị i deturu ka ị na-agụ isiokwu a? Anyị ji n’aka na nke a ga-echetaghachiri gị ihe ndị mara mma banyere oriri ime mmụọ ahụ, na ọ ga-abụkwa nke na-akụzi ihe.

Isiokwu Ụbọchị Mbụ: “I Kwesịrị Ekwesị, Jehova, . . . Ịnata Otuto”

Mgbe abụ mmeghe na ekpere gasịrị, ọkà okwu mbụ ji obi ụtọ nabata ndị nile bịaranụ site n’okwu lekwasịrị anya n’isi nzube nke mgbakọ ahụ, bụ́: “Ndị Gbakọtara Iji Nye Chineke Otuto.” N’ihota ihe site ná Mkpughe 4:11, ọkà okwu ahụ mesiri isiokwu bụ́ isi nke mgbakọ ahụ ike. Ọ kọwaziri ozugbo ihe inye Chineke otuto pụtara. N’iji akwụkwọ Abụ Ọma mee ihe, o mesiri ike na inye Chineke otuto gụnyere ‘ịkpọ isiala,’ ‘ekele,’ na ‘otuto.’—Abụ Ọma 95:6; 100:4, 5; 111:1, 2.

Isiokwu nke okwu sochirinụ bụ “Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ.” Ọkà okwu ya kwuru otu ihe na-akpali mmasị. Ebe ọ bụ na e nwere ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii n’ala 234 gburugburu ụwa, a pụrụ ikwu na chi adịghị eji eji n’iwetara Jehova otuto. (Mkpughe 7:15) Ajụjụ ọnụ a gbara ọtụtụ ụmụnna nwoke na ndị nwanyị Ndị Kraịst nọ n’ụdị ụfọdụ nke ozi oge nile pụrụ iche bụ otu akụkụ e nwere ekele banyere ya nke okwu a mere ndị na-ege ntị obi ụtọ.

“Ihe E Kere Eke Na-akpọsa Ebube Chineke” bụ okwu sochirinụ. Ọ bụ ezie na ha adịghị ekwu okwu, eluigwe na ala dum a na-ahụ anya na-akpọsa ịdị ukwuu Chineke, na-enyekwara anyị aka ime ka ekele anyị nwere maka nlekọta ịhụnanya ya mikwuo emie. E ji nlezianya kọwaa nke a n’ụzọ zuru ezu.—Aịsaịa 40:26.

Mkpagbu, mmegide, mmetụta nke ndị ụwa, na ọchịchọ ime mmehie bụ ihe ịma aka nye iguzosi ike n’ezi ihe nke ezi Ndị Kraịst. N’ihi ya, okwu bụ́ “Na-eje Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe” kwesịrị ekwesị ka ndị na-ege ntị ṅaa ntị nke ọma na ya. A malitere ịtụle Abụ Ọma nke 26 n’amaokwu n’amaokwu, a gbakwara otu Onyeàmà ruworo ogo ịga akwụkwọ bụ́ onye werewooro nguzo siri ike maka omume ọma na onye ọzọ bụ́ onye na-etinyebu oge buru ibu n’ụdị ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo ma bụrụ onye meworo ihe iji merie nsogbu ahụ ajụjụ ọnụ.

Okwu bụ́ isi bụ́, “Ọhụụ Amụma Ndị Dị Ebube Na-agba Anyị Ume Ịga n’Ihu!” mechiri usoro ihe omume ụtụtụ ahụ. Ọkà okwu ahụ zoro aka n’ihe nlereanya nke Daniel onye amụma nakwa ndịozi bụ́ Jọn na Pita dị ka ndị ịhụ ọhụụ amụma ndị dị ebube banyere nguzobe na ịrụ ọrụ nke Alaeze Mezaịa nke Chineke mere ka okwukwe ha sie ike. N’ikwu banyere ndị ọ bụla yiri ka ha adịkwaghị ahụ ihe àmà ahụ doro anya nke na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Anyị na-enwe olileanya na ndị dị otú ahụ ga-etinye uche ha ọzọ n’ịbụ ezie nke ọnụnọ Kraịst n’ebube Alaeze, na a ga-enyekwara ha aka inwetaghachi ume ime mmụọ.”

Usoro ihe omume nke ehihie ji isiokwu bụ́ “E Kpugheere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Jehova” malite. Ọkà okwu ya gosiri otú Jehova si esetịpụ ihe nlereanya n’ịdị umeala n’obi, ọ bụ ezie na ọ bụ ya bụ Onye kasịnụ n’eluigwe na ụwa. (Abụ Ọma 18:35) Jehova na-egosi ndị dị umeala n’obi n’ezie ihu ọma, ma ọ na-emegide ndị na-eme ka ha dị umeala n’obi nanị mgbe ha na ndị ọgbọ ha ma ọ bụ ndị ka ha elu na-emekọ ihe, ma ha na-emeso ndị ha na-elekọta ihe n’ụzọ obi ọjọọ.—Abụ Ọma 138:6.

Ihe sochirinụ bụ nkọwa nke amụma Bible n’okwu ọtụtụ ndị kwuru bụ́ ndị kọwapụtara akụkụ dị iche iche nke isiokwu bụ́ isi, bụ́: “Amụma Emọs—Ozi Ya Maka Ụbọchị Anyị.” N’ịrụtụ aka n’ihe nlereanya Emọs, ọkà okwu mbụ dọọrọ uche gaa n’ọrụ dịịrị anyị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ikpe Jehova nke na-abịanụ. Isiokwu nke okwu ya bụ “Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu.” Ọkà okwu nke abụọ jụrụ ajụjụ bụ́: “Ọ̀ dị mgbe Jehova ga-eme ka ajọ omume na nhụjuanya kwụsị n’ụwa a?” Akụkụ nke ya bụ́ “Ikpe Chineke Megide Ndị Ajọ Omume,” gosiri na ikpe Chineke na-ekwesị ekwesị mgbe nile, a pụghị ịgbanahụ ya n’ọsọ, nakwa na ọ bụ nanị ndị dara iwu ka a na-ekpe ya. Ọkà okwu ikpeazụ n’okwu ahụ ọtụtụ ndị kwuru tụlere isiokwu bụ́, “Jehova Na-enyocha Obi.” Ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ ga-erube isi n’okwu e dere n’Emos 5:15: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya.”

Ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya, ndị dị ka mmanya, bụ́ nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa, pụrụ ịbụ nke e ji mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’okwu ya bụ́, “Zere Ọnyà nke Ịṅụbiga Mmanya Ókè,” ọkà okwu ya kwupụtara ihe ize ndụ ime mmụọ na ndị nke anụ ahụ́ dị n’iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ gabigara ókè, ọbụna ma ọ bụrụ na mmanya egbughị onye ahụ. O nyere ụkpụrụ nduzi bụ́: Ebe ọ bụ na ókè ahụ́ mmadụ na-anagideru ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-adịgasị iche site n’otu onye gaa n’onye ọzọ, ókè ọ bụla nke ga-eme ka “ezi amamihe na ikike iche echiche” gị ghara ịrụ ọrụ nke ọma, gabigara ókè nye gị.—Ilu 3:21, 22.

Ebe anyị na-ebi n’oge pụrụ iche, isiokwu na-esonụ bụ́, “Jehova, ‘Ebe Anyị E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu,’” bụ nnọọ ihe nkasi obi. Ekpere, mmụọ nsọ na Ndị Kraịst ibe anyị pụrụ inyere anyị aka ịnagide nsogbu.

Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ́, “‘Ezi Ala Ahụ’—Ihe Atụ nke Paradaịs,” ji inye ihe dị ịtụnanya nke nyere mmadụ nile ọṅụ mechie—akwụkwọ ọhụrụ nwere ọtụtụ map Bible! Isiokwu ya bụ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ.’

Isiokwu Ụbọchị nke Abụọ: “Kpọsaanụ Ebube Ya n’Etiti Mba Nile”

Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, e nwere okwu nke abụọ ọtụtụ ndị kwuru ná mgbakọ ahụ, nke nwere isiokwu bụ́, “Na-egbukepụ Ebube Jehova Dị Ka Enyo.” Akụkụ nke mbụ kọwara “Ịgbasa Ozi Ọma ahụ n’Ebe Nile” n’ụzọ sara mbara, nweekwa mmeghachi nke ahụmahụ ndị mere eme e nwere n’ozi ubi. Okwu nke abụọ nwere ihe ngosi nke nletaghachi ka ọkà okwu ya na-akọwa isiokwu bụ́ “Ikpupụ Ákwà Mkpuchi Kpuchiri Ndị Kpuru Ìsì Ihu.” E mere ka akụkụ nke ikpeazụ nke isiokwu ya bụ, “Na-eme Otú ahụ n’Ụzọ Zuru Ezu Karị n’Ozi Anyị” tọkwuo ụtọ site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ banyere ahụmahụ ha n’ozi ubi.

Isiokwu nke akụkụ sochiri n’usoro ihe omume ahụ bụ “Ndị A Kpọrọ Asị n’Enweghị Ihe Kpatara Ya.” Ọ gụnyere ajụjụ ọnụ ndị na-agba ume a gbara ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị sitere n’ike Chineke na-enye guzosie ike n’ezi ihe n’okpuru mmegide.

Otu akụkụ nke mgbakọ a na-elepụkarị anya ịhụ bụ okwu baptizim nke ihe na-esochi ya bụ mmikpu ná mmiri kpam kpam maka ndị nile ruru eru. Baptizim ime mmiri na-egosipụta nrara mmadụ raara onwe ya kpam kpam nye Jehova. N’ihi ya, isiokwu bụ́: “Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị Na-ewetara Chineke Otuto” dabara nnọọ adaba.

Usoro ihe omume nke ehihie ji okwu bụ́ “Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu” malite bụ́ nke gbara ume mmadụ inyocha onwe ya. Ọkà okwu ahụ wepụtara isi ihe a na-adọrọ mmasị: Ịdị ukwuu na-abịa site n’iṅomi ịdị umeala n’obi nke Kraịst. N’ihi ya, Onye Kraịst ekwesịghị ịchọ ibu ọrụ iji mezuo ọchịchọ onwe onye. O kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Àdị m njikere ịrụ ọrụ ndị bara uru ndị a na-agaghị achọpụta ngwa ngwa?’

Ọ̀ dịtụwo mgbe ike gwụrụ gị? Azịza ya doro anya. Okwu bụ́ “Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà” tọrọ onye ọ bụla ụtọ. Ajụjụ ọnụ a gbara ndị bụworo Ndịàmà eri ogologo oge gosiri na Jehova pụrụ ime ka anyị ‘dị ike site na mmụọ ya.’—Ndị Efesọs 3:16.

Mmesapụ aka abụghị àgwà anyị bu pụta ụwa kama ọ bụ nke a na-aghaghị ịmụta amụta. E mere ka isi ihe a dị mkpa pụta ìhè n’akụkụ bụ́ “Na-emesapụ Aka, Na-adị Njikere Ikerịta Ihe.” A jụrụ ajụjụ a na-akpali echiche: “Ànyị dị njikere iji ụfọdụ n’ime oge anyị nwere n’ụbọchị soro ụmụnna anyị ndị agadi, ndị na-arịa ọrịa, ndị dara mbà n’obi, ma ọ bụ ndị owu na-ama nọkọọ?”

“Kpachara Anya Maka ‘Olu Ndị Bịara Abịa,’” dọọrọ mmasị nke ndị na-ege ntị. Okwu a ji ndị na-eso ụzọ Jizọs tụnyere ụmụ atụrụ na-anụ nanị olu ya dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma” na ndị nke na-adịghị anụ “olu onye bịara abịa” dị ka ndị a na-anụ n’ọnụ ọtụtụ òtù ndị Ekwensu na-achịkwa.—Jọn 10:5, 14, 27.

Ndị òtù ukwe aghaghị iji otu olu na-abụ abụ ka e wee nwee ike ịghọta ihe ha na-ekwu. Iji na-enye Chineke otuto, ndị na-efe ezi ofufe gburugburu ụwa aghaghị ịdị n’otu. N’ihi ya, “Jirinụ ‘Otu Ọnụ’ Na-enye Chineke Otuto” nyere ntụziaka bara uru banyere otú anyị nile pụrụ isi na-asụ otu ‘asụsụ dị ọcha’ ma na-ejere Jehova ozi “n’otu ubu.”—Zefanaịa 3:9.

Ndị mụrụ ụmụ, karịsịa ndị nwere ụmụaka na-eto eto, nwere nnọọ obi ụtọ n’okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ́, “Ụmụ Anyị—Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa.” E wepụtara akwụkwọ ọhụrụ nwere peeji 256 bụ́ nke tụrụ ndị na-ege ntị n’anya n’ụzọ na-enye ọṅụ. Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ bụ akwụkwọ ga-enyere ndị nne na nna aka iji oge bara uru n’ụzọ ime mmụọ soro ụmụ ha, bụ́ onyinye Chineke nyere ha, na-anọkọ.

Isiokwu Ụbọchị nke Atọ: “Na-emenụ Ihe Nile Iji Nye Chineke Otuto”

Ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ ji ihe ime mmụọ nke ihe ncheta ndị sitere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị malite. Akụkụ nke mbụ nke usoro ihe omume ụbọchị ahụ lekwasịrị anya n’ụzọ pụrụ iche ná ndokwa ezinụlọ. Okwu nke mbụ bụ́, “Ndị Nne na Nna, Wusienụ Ezinụlọ Unu Ike” malitere ya. Mgbe ọ tụleghachisịrị ibu ọrụ ndị nne na nna nke igbo mkpa ezinụlọ ha n’ụzọ ihe onwunwe, ọkà okwu ahụ gosiri na ibu ọrụ bụ́ isi ndị mụrụ ụmụ nwere bụ igbo mkpa ime mmụọ nke ụmụ ha.

Ọkà okwu sochirinụ lekwasịrị ụmụaka anya wee tụlee isiokwu bụ́, “Otú Ndị Ntorobịa Si Na-eto Jehova.” O kwuru na ndị na-eto eto dị ka “igirigi” n’ihi na ha bara ụba n’ọnụ ọgụgụ, ịnụ ọkụ n’obi ha dị ka ndị ntorobịa na-enyekwa ume ọhụrụ. Ndị toworo eto nwere obi ụtọ iso ha na-arụkọ ọrụ n’ozi Jehova. (Abụ Ọma 110:3) Akụkụ a gụnyere ajụjụ ọnụ na-enye obi ụtọ a gbara ndị na-eto eto na-esetịpụ ezi ihe nlereanya.

Ihe nkiri Bible e yi uwe ihe nkiri mee na-abụkarị akụkụ na-atọ ụtọ nke mgbakọ distrikti, mgbakọ nke a adịkwaghị iche. Ihe nkiri bụ́ “Ịgba Àmà n’Atụghị Egwu n’Agbanyeghị Mmegide” gosiri ndị na-eso Jizọs nke narị afọ mbụ. Ọ bụghị nanị na ọ tọrọ ụtọ, kama nke ka mkpa, ọ kụziri ihe. Okwu sochiri ihe nkiri ahụ bụ́ “Na-ekwusanụ Ozi Ọma ahụ ‘n’Esepụghị Aka’” mesiri isi ihe ndị dị n’ihe nkiri ahụ ike.

Ndị nile bịara mgbakọ ahụ nọ na-atụ anya ige okwu ihu ọha bụ́ “Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?” bụ́ isi ihe nke usoro ihe omume Sunday. Ọkà okwu ya kọwara nnọọ n’ụzọ pụtara ìhè otú ndị ọkà mmụta sayensị na ndị okpukpe n’ozuzu ha si bụrụ ndị na-adịghị enye Chineke otuto. Ọ bụ nanị ndị a kpọkwasịrị aha ya, ndị na-ekwusa ma na-akụzi eziokwu banyere Jehova, bụ ndị na-eto aha ya n’ezie taa.

Ihe sochiri okwu ihu ọha ahụ bụ nchịkọta nke ihe ọmụmụ magazin Ụlọ Nche dịịrị izu ahụ. Mgbe ahụzi e kwuru okwu ikpeazụ bụ́, “‘Nọgide Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu’ Iji Wetara Jehova Otuto.” Ọkà okwu ahụ wepụtara mkpebi nwere isi ihe iri ka ndị nile bịaranụ wee nakwere ya. Mkpebi ahụ lekwasịrị anya n’ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi nye Jehova, bụ́ Onye Okike, otuto. A nụrụ “Ee” a gbakọtara ọnụ zaa ná mgbakọ nile site n’otu nsọtụ ụwa ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa.

N’ihi ya, mgbe mgbakọ ahụ mechiri, isiokwu ahụ bụ́ “Nye Chineke Otuto” dịgidere n’uche nke onye ọ bụla bịaranụ. Sitekwa n’enyemaka nke mmụọ nsọ Jehova na nke ọgbakọ ya a na-ahụ anya, ka anyị na-achọ mgbe nile inye Chineke otuto, ọ bụghịkwa mmadụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 23]

Mgbakọ Mba Nile

E nwere mgbakọ mba nile were ụbọchị anọ n’Africa, Australia, Eshia, Europe, nakwa n’Ebe Ugwu na Ebe Ndịda America. A kpọrọ Ndịàmà a họọrọ site n’akụkụ dị iche iche nke ụwa ịbịa mgbakọ ahụ. N’ụzọ dị otú a, e nwere ‘mgbakọrịta ume’ n’etiti ndị ọbịa ahụ na ndị na-ele ha ọbịa. (Ndị Rom 1:12) A hụrụ ndị enyi a na-ahụbeghị eri ogologo oge, e metakwara ndị ọhụrụ. Otu akụkụ pụrụ iche nke mgbakọ mba nile ahụ bụ akụkụ ihe omume ahụ nke isiokwu ya bụ “Akụkọ Ndị Sitere ná Mba Ndị Ọzọ.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]

Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị Na-enye Chineke Otuto

E wepụtara akwụkwọ ọhụrụ abụọ ná Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto.” Akwụkwọ map Bible bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ nwere mkpo ga-adịte aka nakwa peeji 36 jupụtara na map na foto nke ebe dị iche iche a kpọtụrụ aha na Bible. Peeji nke ọ bụla nwere àgwà zuru ezu, nweekwa map alaeze ukwu Asiria, Babilọn, Midia na Peshia, Gris, na Rom. E nwere map ndị dịgasị iche iche na-egosi ije ozi Jizọs na otú Iso Ụzọ Kraịst si gbasaa.

Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ bụ akwụkwọ nwere peeji 256 na ihe osise 230. A pụrụ iji ya soro ụmụaka nwee nnọkọ ndị na-enye obi ụtọ nanị site n’ile ihe osise na ịza ajụjụ ndị na-akpali echiche dị n’akwụkwọ ahụ. A kwadoro akwụkwọ ọhụrụ a iji megide mwakpo Setan na-awakpo ụmụ anyị ndị na-eto eto, nke ọ na-eme iji mebie omume ọma ha.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị ozi ala ọzọ kọrọ ahụmahụ ndị na-ewusi okwukwe ike

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Baptizim bụ otu akụkụ dị mkpa nke mgbakọ “Nye Chineke Otuto”

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ihe nkiri Bible na-atọ ma ndị okenye ma ụmụaka ụtọ