Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Otu n’Ime Ọrụ Nkà Ndị Kasịnụ”

“Otu n’Ime Ọrụ Nkà Ndị Kasịnụ”

“Otu n’Ime Ọrụ Nkà Ndị Kasịnụ”

MGBE e wuru ụlọ nsọ Jehova na Jeruselem n’oge ọchịchị nke Eze Solomọn n’ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, e ji ọla kọpa wuo ọmarịcha ihe nchekwa mmiri ma debe ya n’ihu ebe mbata ụlọ nsọ ahụ. Ịdị arọ ya karịrị tọn 30, ọ na-anagidekwa ihe dị ka lita mmiri 40,000. A kpọrọ nnukwu ọkwá a oké osimiri a wụrụ awụ. (1 Ndị Eze 7:23-26) “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ otu n’ime ọrụ nkà ndị kasịnụ a rụtụrụla ná mba ndị Hibru,” ka onye bụ́bu onyeisi ndị na-ahụ maka ngwá electronic na Kansụl Na-eme Nnyocha nke Mba Canada, bụ́ Albert Zuidhof, na-ekwu na magazin bụ́ Biblical Archeologist.

Olee otú e si wuo oké osimiri ahụ? “Na gburugburu ala Jọdan ka eze wuru [ngwá ọla kọpa],” ka Bible na-ekwu. (1 Ndị Eze 7:45, 46) “Usoro e ji wuo ya aghaghị iyiworị usoro a ka ji akpụ mgbịrịmgba ọla nchara,” ka Zuidhof na-ekwu. Ọ na-akọwa, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, nke a ga-agụnye iji wax mee oyiyi nke oké osimiri ahụ ma kpọdo ya isi n’ala n’ebe a ga-awụ ya bụ́ nke dị nnọọ akọrọ. . . . Mgbe e mesịrị nke a, ndị na-awụ ya aghaghị iwulite akụkụ nke ihe nchekwa mmiri ahụ n’ịgbaso oyiyi wax ahụ ma hapụ ya ka ọ kpọọ. Ihe ikpeazụ ha mere ga-abụ ịgbaze wax ahụ na ịwụnye ọla nchara a gbazere agbaze n’oghere ebe wax ahụ dịbu.”

Oké ibu na ịdị arọ nke oké osimiri ahụ a wụrụ awụ chọrọ ezigbo nkà n’owuwu ya. Ala ala ya na mpụta ya aghaghị ịnagide ịdị arọ nke kọpa dị ihe dị ka tọn 30 n’arọ, a ghaghịkwa ịwụ ya otu mgbe iji gbochie ya inwe mgbawa ma ọ bụ ịgba ọrụ. Ma eleghị anya, nke a chọrọ inwe ọdọ ọkụ dị iche iche ndị na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ịwụnye ọla ahụ a gbazere agbaze n’ime oghere ahụ. Nke ahụ bụ nnọọ nnukwu ọrụ!

N’ekpere o kpere n’oge nraranye nke ụlọ nsọ ahụ, Eze Solomon nyere Jehova Chineke otuto maka ọrụ ụlọ nsọ ahụ, na-ekwu, sị: “I wee were ọnụ Gị kwuo, werekwa aka Gị mezuo ya.”—1 Ndị Eze 8:24.