Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnọdụ Ime Mmụọ na Ahụ́ Ịdị Mma Gị

Ọnọdụ Ime Mmụọ na Ahụ́ Ịdị Mma Gị

Ọnọdụ Ime Mmụọ na Ahụ́ Ịdị Mma Gị

MA ELEGHỊ anya, ị na-eji oge buru ibu elekọta ahụ́ ike gị. Kwa ụbọchị, ị pụrụ iji ihe ruru awa asatọ hie ụra, jiri ọtụtụ awa sie ma rie nri, jirikwa awa asatọ ma ọ bụ karịa rụọ ọrụ iji kwụọ ụgwọ maka ebe ị na-ehi ụra na nri ị na-eri. Ọ bụrụ na ọrịa abịa gị, ma eleghị anya, ị ga-ewepụta oge na ego iji hụ ọkà n’ihe banyere ahụ́ ike ma ọ bụ iji kwadebe ọgwụ Igbo. Ị na-ehicha ụlọ gị, na-asa ahụ́, ikekwe, ọbụna na-emega ahụ́ mgbe nile, ihe a nile bụ iji nwee ezi ahụ́ ike.

Otú ọ dị, ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike na-agụnye ihe karịrị nanị ilekọta mkpa anụ ahụ́ gị. E nwere ihe ọzọ na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’ahụ́ ịdị mma gị. Nnyocha ahụ́ ike egosipụtawo na ahụ́ ike ime mmụọ gị—gị inwe ma ọ bụ enweghị ọnọdụ ime mmụọ—na nke anụ ahụ́ gị nwere njikọ chiri anya.

Njikọ Chiri Anya

“Ihe ka ukwuu ná nnyocha ndị mmadụ mere n’onwe ha n’isiokwu a kwuru na e nwere njikọ chiri anya n’etiti inwekwu ọnọdụ ime mmụọ na ahụ́ ike ịka mma,” ka Prọfesọ Hedley G. Peach nke Mahadum Melbourne, Australia, na-ekwu. N’ikwu okwu banyere nchọpụta ndị a, akwụkwọ bụ́ The Medical Journal of Australia (MJA) na-ekwu, sị: “E jikọtawokwa iji okpukpe akpọrọ ihe na . . . mbelata nke ọbara mgbali elu, mbelata nke cholesterol . . . na ọbụna mbelata nke ohere e nwere ịrịa ọrịa cancer eriri afọ.”

N’ụzọ yiri nke ahụ, na United States, ihe ọmụmụ e ji mmadụ 6,545 mee na 2002 na Mahadum California (UC), Berkeley, chọpụtara na “ndị na-aga ihe omume okpukpe otu ugboro n’izu nwere ohere nke ịdị ogologo ndụ karị ma e jiri ha tụnyere ndị na-adịghị agaru otú ahụ ma ọ bụ ndị na-adịghị aga ma ọlị.” Doug Oman, onye duziri ihe ọmụmụ ahụ nakwa onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ UC Berkeley Na-akụzi Ihe Banyere Ahụ́ Ike Ọha na Eze, kwuru, sị: “Anyị hụrụ ọdịiche a ọbụna mgbe anyị nyesịrị ohere maka ihe ndị dị ka inwe ndị enyi na àgwà ndị na-emetụta ahụ́ ike, gụnyere ise siga na imega ahụ́.”

N’ịkọwa uru ndị ọzọ nke ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ná ndụ ha na-enweta, akwụkwọ MJA na-ekwu, sị: “Ihe ọmụmụ ndị e nwere n’Australia egosipụtawo na a na-enwekwu nkwụsi ike nke alụmdi na nwunye, mbelata nke iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ eme ihe, ọnụ ọgụgụ dị ala nke ndị na-egbu onwe ha na ọnụ ọgụgụ dịkwu ukwuu nke ndị na-adịghị eche echiche igbu onwe ha, mbelata nke nchegbu na ịda mbà n’obi, nakwa ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke achọghị ọdịmma onwe onye n’etiti ndị ji okpukpe kpọrọ ihe.” Tụkwasị na nke ahụ, akwụkwọ bụ́ BMJ (nke a mabu dị ka The British Medical Journal) na-akọ, sị: “Ndị nwere nkwenkwe ime mmụọ siri ike karị yiri ka ha na-akwụsị iru újú ngwa ngwa mgbe ọnwụ nke onye nọ ha nso gasịrị karịa ndị na-enweghị nkwenkwe okpukpe.”

E nwere echiche dịgasị iche iche banyere ihe ezi ọnọdụ ime mmụọ bụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ ime mmụọ gị na-emetụta ahụ́ ike na mmetụta uche gị. Ihe àmà a kwekọrọ n’ihe Jizọs Kraịst kwuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ebe ọ bụ na ọnọdụ ime mmụọ gị na-emetụta ahụ́ ike na obi ụtọ gị, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, sị: ‘Olee ebe m pụrụ ịchọta nduzi ime mmụọ a pụrụ ịtụkwasị obi? Gịnịkwa ka ịbụ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe gụnyere?’

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Ebe Ndị E Si Nweta Foto: Peeji nke 18: Mao Tse-tung na Golda Meir: Hulton/⁠Archive site n’aka Getty Images; Francis Ferdinand: Site n’akwụkwọ bụ́ The War of the Nations; Hirohito, Lindbergh, & Einstein: Foto U.S. National Archives; Stalin: Foto Ndị Agha U.S.; Roosevelt: Ọ́bá Akwụkwọ Franklin D. Roosevelt; Churchill: Ndị Nlekọta nke Ebe Ndebe Ihe Agha Oge Ochie nke Britain (MH 26392)