Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-enye Anyị Ihe Ndị Na-akpa Anyị Kwa Ụbọchị

Jehova Na-enye Anyị Ihe Ndị Na-akpa Anyị Kwa Ụbọchị

Jehova Na-enye Anyị Ihe Ndị Na-akpa Anyị Kwa Ụbọchị

“Kwụsịkwanụ ịnọ n’obi erughị ala; n’ihi na . . . Nna unu maara na ihe ndị a dị unu mkpa.”—LUK 12:29, 30.

1. Olee otú Jehova si enye ụmụ anụmanụ o kere eke nri?

Ì KIRITỤLA nza ma ọ bụ nnụnụ ndị ọzọ ka ha na-atụrị nri n’ihe yiri ka ọ bụ nanị ihe mkpofu? Eleghị anya ị nọ na-eche ihe ọ pụrụ ịchọta iri site n’ịtụ ọnụ n’ala. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs gosiri na anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ụzọ Jehova si enye ụmụ nnụnụ nri. O kwuru, sị: “Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya nke ọma, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ ma ọ bụ na-ekpokọta ihe n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ karịa ha?” (Matiu 6:26) N’ụzọ ndị magburu onwe ha, Jehova na-enye ihe nile o kere eke nri.—Abụ Ọma 104:14, 21; 147:9.

2, 3. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta n’ụzọ ime mmụọ site n’eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere maka nri ụbọchị anyị?

2 Gịnị meziri Jizọs ji gụnye n’ekpere nlereanya ya arịrịọ bụ́: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa”? (Matiu 6:11) A pụrụ ịmụta ihe ndị miri emi n’ụzọ ime mmụọ site n’arịrịọ a dị mfe. Nke mbụ, ọ na-echetara anyị na Jehova bụ Onye Ukwu Na-enye Ihe. (Abụ Ọma 145:15, 16) Ụmụ mmadụ pụrụ ịkụ na ilekọta ihe ọkụkụ, ma ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime ka ihe too, n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị. (1 Ndị Kọrint 3:7) Ihe anyị na-eri na ihe anyị na-aṅụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. (Ọrụ 14:17) Ịrịọ ya ka o nye anyị ihe na-akpa anyị n’ụbọchị na-egosi ya na anyị adịghị eleda ihe ndị dị otú ahụ ọ na-enye anyị anya. N’ezie, arịrịọ dị otú ahụ adịghị atọhapụ anyị n’ibu ọrụ nke ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị nwere ike ime otú ahụ.—Ndị Efesọs 4:28; 2 Ndị Tesalonaịka 3:10.

3 Nke abụọ, anyị ịrịọ maka ‘nri maka ụbọchị taa’ na-egosi na anyị ekwesịghị ichegbubiga onwe anyị ókè banyere ọdịnihu. Jizọs kwukwara, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile. N’ihi ya, unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya.” (Matiu 6:31-34) Ekpere maka ‘nri maka ụbọchị taa’ na-esetịpụ ụkpụrụ maka ibi ndụ dị mfe nke ‘nsọpụrụ Chineke ya na inwe afọ ojuju.’—1 Timoti 6:6-8.

Nri Ime Mmụọ Kwa Ụbọchị

4. Olee ihe ndị mere ná ndụ Jizọs na nke ndị Izrel bụ́ ndị mesiri ike mkpa ọ dị ịdị na-eri nri ime mmụọ?

4 Ekpere anyị maka nri ụbọchị kwesịkwara ichetara anyị mkpa anyị nwere maka nri ime mmụọ kwa ụbọchị. Ọ bụ ezie na ezigbo agụụ ji ya mgbe o busịrị ọnụ ruo ogologo oge, Jizọs guzogidere ọnwụnwa Setan nke ime ka nkume ghọọ achịcha, na-asị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’” (Matiu 4:4) N’ebe a, Jizọs hotara ihe Mozis onye amụma kwuru, bụ́ onye gwara ndị Izrel, sị: “[Jehova] wee weda gị n’ala, mee ka agụụ gụọ gị, O wee mee ka i rie mana ahụ, nke ị na-amaghị, nke nna gị hà na-amaghịkwa; ka O wee mee ka ị mara na ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:3) Ọ bụghị nanị na ụzọ Jehova si nye ndị Izrel mana ahụ mere ka ha nwee nri nkịtị kamakwa ọ kụziiri ha ihe n’ụzọ ime mmụọ. Otu ihe bụ na ha ‘ga-achịkọta ihe nke otu ụbọchị n’ụbọchị ya.’ Ọ bụrụ na ha achịkọta karịa ihe ga-ezuru ha n’ụbọchị, nke fọdụrụnụ na-amalite isi ísì ma gbaa ikpuru. (Ọpụpụ 16:4, 20) Ma, nke a emeghị n’ụbọchị nke isii bụ́ mgbe ha na-aghaghị ịchịkọta okpukpu abụọ nke ihe ha na-achịkọta n’ụbọchị iji gboo mkpa ha maka Ụbọchị Izu Ike. (Ọpụpụ 16:5, 23, 24) Ya mere, mana ahụ chetaara ha na ha aghaghị ịdị na-erube isi nakwa na ndụ ha dabeere ọ bụghị nanị n’achịcha kama ‘n’ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’

5. Olee otú Jehova si enye anyị nri ime mmụọ kwa ụbọchị?

5 N’otu aka ahụ, kwa ụbọchị, ọ dị anyị mkpa ịdị na-eri nri ime mmụọ nke Jehova na-enye site n’aka Ọkpara ya. N’ihi ya, Jizọs ahọpụtawo “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” inye ezinụlọ nke okwukwe “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” (Matiu 24:45) Ọ bụghị nanị na òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-enye nri ime mmụọ n’ụba n’ụdị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible kamakwa ọ na-agba anyị ume ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị. (Joshua 1:8; Abụ Ọma 1:1-3) Dị ka Jizọs, anyị pụkwara inweta nri ime mmụọ site n’itinye mgbalị kwa ụbọchị ịmụta uche Jehova na ime ya.—Jọn 4:34.

Mgbaghara Mmehie

6. Ụgwọ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịrịọ ka a gbaghara anyị, ọ̀ bụkwa mgbe anyị mere gịnị ka Jehova na-adị njikere ịkagbu ha?

6 Arịrịọ sochirinụ n’ekpere nlereanya ahụ bụ: “Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Matiu 6:12) N’ebe a, Jizọs adịghị ekwu banyere ụgwọ ego. Ihe o bu n’uche bụ mgbaghara nke mmehie anyị. N’ihe ndekọ Luk nke ekpere nlereanya ahụ, arịrịọ a na-agụ, sị: “Gbagharakwa anyị mmehie anyị, n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.” (Luk 11:4) Ya mere, mgbe anyị mere mmehie, ọ na-adị ka a ga-asị na anyị ji Jehova ụgwọ. Ma Chineke anyị na-ahụ n’anya dị njikere ‘ihichapụ,’ ma ọ bụ ịkagbu, ụgwọ ahụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị chegharịa, ‘chigharịa’ ma rịọ ya mgbaghara ná ndabere nke okwukwe e nwere n’àjà mgbapụta Kraịst.—Ọrụ 3:19; 10:43; 1 Timoti 2:5, 6.

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere maka mgbaghara mmehie kwa ụbọchị?

7 Ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ ọzọ, anyị na-eme mmehie mgbe anyị na-erughị akara nke ụkpụrụ ezi omume Jehova. N’ihi mmehie e ketara eketa, anyị nile na-ehie ụzọ n’okwu ọnụ, n’omume, na n’echiche ma ọ bụkwanụ ghara ime ihe anyị kwesịrị ime. (Eklisiastis 7:20; Ndị Rom 3:23; Jems 3:2; 4:17) N’ihi ya, ma ànyị maara na anyị emewo mmehie n’ụbọchị ma ọ bụ na anyị amaghị, ọ dị anyị mkpa ịgụnye arịrịọ maka mgbaghara mmehie anyị n’ekpere anyị kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 19:12; 40:12.

8. Gịnị ka ekpere maka mgbaghara mmehie kwesịrị ịkpali anyị ime, abamuru dị aṅaa ga-esi na ya pụta?

8 Ekpere maka mgbaghara mmehie kwesịrị isochi nnyocha onwe onye e ji ezi obi mee, nchegharị, na nkwupụta mmehie, dabere n’okwukwe e nwere n’ike mgbapụta nke ọbara Kraịst. (1 Jọn 1:7-9) Iji gosipụta na ekpere anyị sitere n’obi, anyị aghaghị iji “ọrụ kwesịrị nchegharị” kwado arịrịọ anyị. (Ọrụ 26:20) Mgbe ahụ, anyị pụrụ inwe okwukwe na Jehova ga-adị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị. (Abụ Ọma 86:5; 103:8-14) Ihe ga-esi na ya pụta bụ udo nke uche na-enweghị atụ, “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile” ‘ga-echezi obi anyị na ike iche echiche anyị nche site na Kraịst Jizọs.’ (Ndị Filipaị 4:7) Ma ekpere nlereanya Jizọs na-akụziri anyị ọbụna ihe ka ukwuu banyere ihe anyị na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara nke mmehie anyị.

Iji Bụrụ Ndị A Gbaghaara, Anyị Aghaghị Ịgbaghara Ndị Ọzọ

9, 10. (a) Gịnị ka Jizọs gbakwụnyere n’ekpere nlereanya ahụ, gịnịkwa ka nke a na-emesi ike? (b) Olee otú Jizọs si nyekwuo ihe atụ nke mkpa ọ dị ịdị na-agbaghara?

9 N’ụzọ na-akpali mmasị, arịrịọ bụ́ “gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ,” bụ nanị akụkụ nke ekpere nlereanya ahụ nke Jizọs kwuru okwu n’elu ya. Mgbe o kpesịrị ekpere ahụ, ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi na ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu nke eluigwe ga-agbagharakwa unu; ma ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa agbaghara unu njehie unu.” (Matiu 6:14, 15) Ya mere, Jizọs mere ka o doo anya na anyị ịbụ ndị Jehova gbaghaara dabeere n’anyị ịdị njikere ịgbaghara ndị ọzọ.—Mak 11:25.

10 N’oge ọzọ, Jizọs nyere ihe atụ nke na-egosi mkpa ọ dị anyị ịdị na-agbaghara ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ka Jehova na-agbaghara anyị. Ọ kọrọ banyere otu eze nke ji obiọma kagbuo ụgwọ buru ibu nke otu ohu ji. Eze ahụ mesịrị nye otu nwoke ahụ ntaramahụhụ siri ike mgbe ọ jụrụ ịkagburu ohu ibe ya ụgwọ dị nnọọ ala. Jizọs mechiri ihe atụ ya site n’ikwu, sị: “N’ụzọ yiri nke ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi unu.” (Matiu 18:23-35) Ihe mmụta dị na ya doro anya: Ụgwọ mmehie nke Jehova gbaghawooro onye ọ bụla n’ime anyị dị nnọọ ukwuu karịa mmehie onye ọ bụla pụrụ imewo megide anyị. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova na-agbaghara anyị kwa ụbọchị. N’ihi ya, anyị pụrụ n’ezie ịgbaghara mmehie ndị ọzọ na-eme megide anyị mgbe ụfọdụ.

11. Ndụmọdụ dị aṅaa nke Pọl onyeozi nyere ka anyị ga-agbaso ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ka Jehova gbaghara anyị, ezi ihe ndị dị aṅaa ga-esikwa na ya pụta?

11 Pọl onyeozi dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-emere ibe unu ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpam kpam dị nnọọ ka Chineke gbaghakwaara unu kpam kpam site na Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:32) Ịgbagharịtara ibe anyị na-eme ka udo dị n’etiti Ndị Kraịst. Pọl na-agbakwu ume, sị: “Dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị dị nsọ a hụkwara n’anya, yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi. Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Ihe ndị a nile pụtara ìhè n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị, bụ́: “Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.”

Nchebe Mgbe A Na-anwa Anyị

12, 13. (a) Gịnị ka arịrịọ na-esote nke ikpeazụ n’ekpere nlereanya ahụ na-apụghị ịpụta? (b) Ònye bụ Onye Ọnwụnwa ukwu ahụ, gịnịkwa ka ekpere anyị ka a ghara iweba anyị n’ime ọnwụnwa pụtara?

12 Arịrịọ na-eso nke ikpeazụ n’ekpere nlereanya Jizọs bụ: “Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Matiu 6:13) Jizọs ọ̀ na-ekwu na anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka ọ ghara ịnwa anyị? Nke a apụghị ịbụ ihe o bu n’uche n’ihi na e nyere Jems onye na-eso ụzọ ike mmụọ nsọ ide, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ọzọkwa, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Jehova adịghị arịba njehie nile anyị ama, n’eziekwa, ọ dịghị agbalị ịnwa anyị. Ya mere, gịnị ka akụkụ a nke ekpere nlereanya ahụ pụtara?

13 Onye na-agbalị ịnwa anyị, iji nzupụta aghụghọ eme ka anyị daa, na ọbụna iripịa anyị bụ Setan bụ́ Ekwensu. (Ndị Efesọs 6:11) Ọ bụ ya bụ Onye Ọnwụnwa ukwu ahụ. (1 Ndị Tesalonaịka 3:5) Site n’ikpe ekpere ka a ghara iweba anyị n’ime ọnwụnwa, anyị na-arịọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a na-anwa anyị. Anyị na-arịọ ya ka o nyere anyị aka ịghara ịbụ ndị ‘Setan ghọgburu,’ ka anyị ghara ịda n’ọnwụnwa. (2 Ndị Kọrint 2:11) Ekpere anyị bụ ka anyị nọgide “n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu,” na-enweta nchebe ime mmụọ nke a na-enye ndị nakweere ọbụbụeze Jehova n’ihe nile ha na-eme.—Abụ Ọma 91:1-3.

14. Olee otú Pọl onyeozi si emesi anyị obi ike na Jehova agaghị agbahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị elegara Ya anya mgbe a na-anwa anyị?

14 Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọchịchọ anyị sitere n’obi, anyị ekwupụta ya n’ekpere anyị, na-egosipụtakwa ya n’omume, Jehova agaghị agbahapụ anyị ma ọlị. Pọl onyeozi na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla bịakwasịworo unu ma e wezụga nke na-abịara ụmụ mmadụ. Ma Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.

“Gbapụta Anyị n’Aka Ajọ Onye Ahụ”

15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ikpe ekpere maka nnapụta pụọ n’aka ajọ onye ahụ?

15 Dị ka ihe odide oge ochie ndị a kasị tụkwasị obi nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst si kwuo, ekpere nlereanya Jizọs ji okwu a mechie: “Gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” * (Matiu 6:13) Nchebe pụọ n’aka Ekwensu dị mkpa karịsịa na mgbe ikpeazụ a. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ebu agha megide ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ, “bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs,” nakwa megide ndị enyi ha bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ. (Mkpughe 7:9; 12:9, 17) Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa. Ma guzogidenụ ya, sienụ ike n’okwukwe.” (1 Pita 5:8, 9) Ọ ga-amasị Setan ịkwụsị ọrụ ịgba àmà anyị, sitekwa n’aka ndị nnọchianya ya n’ụwa—ma hà bụ ndị okpukpe, ndị azụmahịa, ma ọ bụ ndị ọchịchị—ọ na-agbalị ịmaja anyị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị eguzosie ike, Jehova ga-anapụta anyị. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Ya mere, doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.

16. Gịnị ka Jehova nwere iji nyere ndị ohu ya a na-anwa ọnwụnwa aka?

16 Jehova kwere ka a nwaa Ọkpara ya. Ma mgbe Jizọs guzogidesịrị Ekwensu, na-eji Okwu Chineke emere ihe nchebe, Jehova zigara ndị mmụọ ozi iwusi ya ike. (Matiu 4:1-11) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe na-ekpe ekpere ma na-eme ya ebe mgbaba anyị. (Abụ Ọma 34:7; 91:9-11) Pita onyeozi dere, sị: “Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma na-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee gbupụ ha.”—2 Pita 2:9.

Nnapụta Zuru Ezu Dị Nso

17. Site n’ịkụziri anyị ekpere nlereanya ahụ, olee otú Jizọs si debe ihe ọ bụla n’ọnọdụ kwesịrị ya?

17 N’ekpere nlereanya ahụ, Jizọs debere ihe ọ bụla n’ọnọdụ kwesịrị ha. Nchegbu anyị bụ́ isi kwesịrị ịbụ ido aha ukwu dị nsọ nke Jehova nsọ. Ebe ngwá ọrụ a ga-eji emezu nke a bụ Alaeze Mezaịa ahụ, anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa bibie alaeze ma ọ bụ ọchịchị nile na-ezughị okè nke ụmụ mmadụ ma hụ na uche Chineke na-eme n’ụzọ zuru ezu n’eluigwe nakwa n’ụwa. Olileanya anyị nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs dabeere n’ido aha Jehova nsọ na ịnakwere ọbụbụeze ezi omume ya n’eluigwe na ala dum. Mgbe anyị kpesịrị ekpere maka ihe ndị a kasị mkpa, anyị pụrụ ikpe ekpere maka ihe ndị na-akpa anyị n’ụbọchị, mgbaghara nke mmehie anyị, na nnapụta pụọ n’ọnwụnwa na aghụghọ ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu.

18, 19. Olee otú ekpere nlereanya Jizọs si enyere anyị aka ịnọgide na nche na ime ka olileanya anyị ‘sie ike ruo ọgwụgwụ’?

18 Ịnapụta anyị kpam kpam pụọ n’aka ajọ onye ahụ na usoro ihe ya rụrụ arụ na-akpụdewe nso. Setan maara nke ọma na ya nwere nanị “oge dị mkpirikpi” fọdụụrụ ya ‘iwesa ụwa oké iwe,’ karịsịa ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. (Mkpughe 12:12, 17) N’ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke “ngwụsị nke usoro ihe a,” Jizọs buru ihe omume ndị na-akpali mmasị n’amụma, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha ka ga-eme n’ọdịnihu. (Matiu 24:3, 29-31) Ka anyị na-ahụ ka ihe ndị a na-eme, olileanya anyị maka nnapụta ga na-egbukepụkwu egbukepụ. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ihe ndị a nile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:25-28.

19 Ekpere nlereanya ahụ dị mfe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na-enye anyị nduzi bụ́ ịgba banyere ihe ndị anyị ga-etinye n’ekpere anyị ka ọgwụgwụ na-eru nso. Ka anyị nọgide na-enwe obi ike na ruo ná ngwụsị, Jehova ga-anọgide na-enye anyị ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị, ma ndị nke ime mmụọ ma ndị nke anụ ahụ́. Anyị iji ekpere na-anọ na nche ga-enyere anyị aka ‘ijidesi aka ike n’obi ike ahụ anyị nwere ná mmalite ruo ọgwụgwụ.’—Ndị Hibru 3:14; 1 Pita 4:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ụfọdụ Bible ndị katụ ochie, dị ka King James Version, ji ihe a maara dị ka okwu otuto nye Chineke mechie Ekpere Onyenwe Anyị: “N’ihi na alaeze bụ nke gị, ike na ebube ruo mgbe ebighị ebi. Amen.” Akwụkwọ bụ́ The Jerome Biblical Commentary na-ekwu, sị: “Okwu otuto ahụ . . . adịghị [n’ihe odide] ndị a kasị tụkwasị obi.”

Ná Ntụleghachi

• Gịnị ka arịrịọ anyị maka ‘nri maka ụbọchị taa’ pụtara?

• Kọwaa ekpere ahụ bụ́ “gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.”

• Gịnị ka ọ pụtara mgbe anyị na-arịọ Jehova ka ọ ghara iweba anyị n’ime ọnwụnwa?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-ekpe ekpere, sị, “gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Anyị aghaghị ịgbaghara ndị ọzọ ma ọ bụrụ na a ga-agbaghara anyị

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 13]

Lydekker